Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g25 Nke 1 p. 10-11
  • Ka Ihe Ndị I Nwere Ju Gị Afọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ka Ihe Ndị I Nwere Ju Gị Afọ
  • Teta!—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE IHE ANYỊ NWERE JI KWESỊ IJU ANYỊ AFỌ
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Ị̀ Mụtala Otú Ihe I Nwere Ga-esi Na-eju Gị Afọ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Mmadụ Ò Nwere Ike Inwe Afọ Ojuju?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ihe Ga-eme Ka Ihe Ndị I Nwere Na-eju Gị Afọ
    Teta!—2021
  • Otú Ị Pụrụ Isi Nagide Nsogbu nke Ibi n’Etiti Ọha Mmadụ Na-atụfukarị Ihe
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2025
g25 Nke 1 p. 10-11
Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nna na-amụmụ ọnụ ọchị mgbe o si n’ebe ọ na-arụ ọrụ na-ala n’oge ọ rụchara ọrụ. 2. Mgbe e mechara, ya na ụmụ ya abụọ na nkịta ha nọ na-egwuri egwu n’ihu ụlọ ha, nwunye ya ana-enwekwa obi ụtọ ka ọ na-ekiri ha.

OTÚ A IHE SI ARỊ ELU ỌJỊ, GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME?

Ka Ihe Ndị I Nwere Ju Gị Afọ

Ndị ihe ha nwere juru afọ na-enwe obi ụtọ. Ka ihe na-agbanwe ná ndụ ha, ha na-agbanwekwa otú ha si ebi ndụ ka ha ghara ikowe akpa ha n’ebe aka ha na-erughị.

IHE MERE IHE ANYỊ NWERE JI KWESỊ IJU ANYỊ AFỌ

Otu ọkachamara n’ihe banyere àgwà ụmụ mmadụ, bụ́ Jessica Koehler, kwuru na obi na-aka esi ndị ihe ha nwere juru afọ ike. Ọ chọpụtakwara na ha anaghị emechara ndị ọzọ anyaụfụ. N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na ndị ihe ha nwere juru afọ na-enwekarị obi ụtọ, ha anaghịkwa echegbukarị onwe ha. N’eziokwu, ụfọdụ n’ime ndị kacha enwe obi ụtọ bụ ndị na-enwechaghị ego, karịchaa, ndị ji ihe ndị kacha mkpa ná ndụ, bụ́ ihe ndị ego na-enweghị ike ịzụta, kpọrọ ihe. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ha ji kpọrọ ihe bụ obi ụtọ mmadụ na-enweta ma ya na ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya na-anọrị.

“Ihe oriri na uwe anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ.”​—1 Timoti 6:8.

IHE I NWERE IKE IME

Ejila onwe gị atụnyere ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i jiri obere ihe i nwere na-atụnyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ nwere, o nwere ike ime ka ihe ndị i nwere gharazie ịna-eju gị afọ, ma ọ bụdị mee ka i mewere ndị ọzọ anyaụfụ. Ihe ọzọ bụ na ụda akị ilu abụghị ụtọ ya. E nwere ụfọdụ ndị nwere ọtụtụ ihe, ma ha ji ezigbo ụgwọ. Nicole, onye bi na Senigal, kwuru, sị: “Ọ dịghị m mkpa inwe ọtụtụ ihe iji nwee obi ụtọ. Ihe m nwere juhaala m afọ, ana m enwe obi ụtọ, ọ bụrụgodị na ihe ndị ọzọ nwere ka nke m.”

Megodị ihe a: Ghara ịna-ele ebe ndị mmadụ na-egosi ihe ndị ha nwere ma ọ bụ ebe ha na-etinye ihe n’Ịntanet iji gosi otú ha nweruru ego ma ọ bụ ndụ okomoko ha na-ebi.

“Mmadụ nwegodị ọtụtụ ihe, ihe o nwere anaghị eme ka ọ dị ndụ.”​—Luk 12:15.


Gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị i nwere. Ọ bụrụ na obi na-adị mmadụ ụtọ maka ihe ndị o nwere, ihe o nwere na-eju ya afọ, ọ naghịkwa echekarị na o kwesịrị inwetakwu ihe. Roberton, onye si Heiti, kwuru, sị: “M na-ewepụta oge echebara ihe ọma ndị ọzọ meere mụ na ndị ezinụlọ m echiche. M na-agwazi ha na obi dị m ezigbo ụtọ maka ihe ha meere anyị. M na-akụzikwara nwa m nwoke dị afọ asatọ ka ọ na-ekele onye ọ bụla meere ya ihe ọma.”

Megodị ihe a: Nwee ebe ị ga na-ede ihe ọma meere gị. Kwa ụbọchị, dee ihe ọ bụla mere gị obi ụtọ na ya. O nwere ike ịbụ na ahụ́ siri gị ike, na gị na ndị ezinụlọ gị dị ná mma, na i nwere ezigbo ndị enyi, ma ọ bụ na ị hụrụ otú anyanwụ si maa mma mgbe ọ na-ada.

“Onye obi na-adị mma na-enwe obi ụtọ mgbe niile.”​—Ilu 15:15.

Ọ bụghị mgbe niile ka ihe anyị nwere na-eju anyị afọ. Ma, mbọ ọ bụla anyị gbara ka ihe anyị nwere ju anyị afọ kwesịrị ekwesị. Anyị kpebie na ihe anyị nwere ga-eju anyị afọ, ọ pụtara na anyị ekpebiela na anyị ga na-enwe obi ụtọ. A naghịkwanụ azụta obi ụtọ n’ahịa.

Erik.

“Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ihe anyị nwere n’ezinụlọ anyị na-ejuzi anyị afọ. N’ihi ya, anyị anaghịzi ebi ndụ gbalụ gbalụ, anyị na-enwezi ohere maka ibe anyị, ihe anyị nwere na-ezuru anyị, na-emekwa anyị obi ụtọ.”​—Erik, Amerịka

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya