Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g25 Nke 1 p. 12-13
  • Na-emesapụ Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-emesapụ Aka
  • Teta!—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊNA-EMESAPỤ AKA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Ndị Na-emesapụ Aka Na-enwe Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Gịnị Mere M Ga-eji Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Ghọta na Jehova Na-emesapụ Aka, Nweekwa Ezi Uche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Otú Anyị na Ndị Ọzọ Ga-esi Na-adị n’Udo
    Teta!—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2025
g25 Nke 1 p. 12-13
Ebe otu ezinụlọ na onye ọbịa ha nọ na tebụl ma jiri obi ụtọ na-erikọ nri ọnụ.

OTÚ A IHE SI ARỊ ELU ỌJỊ, GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME?

Na-emesapụ Aka

Ọ bụrụ na otú ihe sị arị elu ọjị emeela ka ọ na-esiri gị ike ịzụta ihe ndị dị gị mkpa, o nwere ike ịdị gị ka imesapụ aka agbasaghị gị. Ma, i nwere ike ịchọpụta na ọ bụrụ na ị na-emesapụ aka n’oge ihe siri ike, ọ ga-abara gị uru. N’ihi ya, i nwere ike ịna-echekwa ego gị, na-emesapụkwa aka.

IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊNA-EMESAPỤ AKA

Ọ bụrụ na anyị na-emesapụ aka, ma n’obere ihe, obi ga na-adị anyị ụtọ, onwe anyị ga-ejukwa anyị afọ. N’eziokwu, nchọpụta ndị e mere gosiri na inye ndị ọzọ ihe na-eme ka ahụ́ sie mmadụ ike, ụbụrụ akpakọọkwa ya ọnụ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka nchegbu, ọbara mgbali elu, isi ọwụwa, nakwa ahụ́ mgbu belata. O nwekwara ike ime ka mmadụ na-ehikwu ụra nke ọma.

“A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”​—Ọrụ Ndịozi 20:35.

Ọ bụrụ na anyị na-enye ndị ọzọ ihe, ma ọ̀ bụ ego ma ọ̀ bụ ihe ọzọ, ọ na-adịkwuru anyị mfe ịnabata aka ndị ọzọ na-enyere anyị mgbe o ji anyị n’olu. Howard, onye bi n’Ịngland, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na mụ na nwunye m na-emesapụrụ ndị ọzọ aka, ọ naghị adị anyị ka ànyị bụụrụ ndị ọzọ ibu arọ ma ha nyere anyị aka ma ọ gbajuo dọrọ.” N’eziokwu, ndị na-esi n’obi ha emesapụ aka anaghị atụ anya ka a kwụọ ha ụgwọ ihe ọma ha meere ndị ọzọ. Ma, ha ga-enweta ezigbo ndị enyi ndị dị njikere ịgbatara ha ọsọ enyemaka n’oge nsogbu.

“Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.”​—Luk 6:38.

IHE I NWERE IKE IME

Na-enyetụ ndị ọzọ ihe. Ọ bụrụ na ihe i nwere ebughị ibu, ị ka nwere ike ịna-enyetụ ndị ọzọ ihe, ọ bụrụgodị inye ha obere nri. Duncan na ndị ezinụlọ ya, bụ́ ndị bi na Yuganda, bụ ogbenye ọnụ ntụ, ma ha na-emesapụ aka. Duncan sịrị: “N’ụbọchị Sọnde ọ bụla, mụ na nwunye m na-akpọ mmadụ ka ọ bịa n’ụlọ anyị metụ obere ihe ọnụ. Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị na ndị mmadụ nọrịa.”

Ma, i nyewe ndị ọzọ ihe, i kwesịrị icheta otú akpa gị hà. I kwesịghị ime ka ihe sikwuoro ndị ezinụlọ gị ike maka na ị chọrọ imesapụ aka.​—Job 17:5.

Megodị ihe a: Nye mmadụ obere nri ma ọ bụ ihe ọ ga-eji megharịa ọnụ. Ọ bụrụ na e nwere ihe i nwere na-adịghịzi gị mkpa, lee ma ị̀ ga-enye ya ndị enyi gị ma ọ bụ ndị agbata obi gị ọ ga-abara uru, ndị ga-ekelekwa gị maka ya.


Si n’ụzọ ndị ọzọ na-enye ihe. Onyinye ụfọdụ kacha mma ị ga-enyeli ndị ọzọ anaghị efu ego. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike inye ha oge anyị, na-emekwara ha ihe ndị ọzọ iji gosi ha na anyị hụrụ ha n’anya. Okwu ọma anyị gwara mmadụ nwekwara ike ịbụ onyinye. N’ihi ya, na-agwa ndị ọzọ na ị hụrụ ha n’anya, jirikwa ha kpọrọ ihe.

Megodị ihe a: Nyere ndị ọzọ aka rụọ ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọ, rụzie ihe n’ụlọ ha, ma ọ bụkwanụ gaara ha ozi ndị ọzọ. Zigara enyi gị kaadị ma ọ bụ gị esi n’ekwentị zigara ya ozi, ọ bụrụgodị naanị iji sị ya na ị na-echeta ya.

Ọ bụrụ na ị na-achọta ụzọ ndị ị ga-esi na-emesapụ aka, ị ga-erite ọtụtụ uru.

“Echefukwala ịna-eme ihe ọma na ịna-enye ndị ọzọ ihe.”​—Ndị Hibru 13:16.

Ebe di na nwunye na-azachara otu nwaanyị katarala ahụ́ ihu èzí ya. O nyere ha ihe dị ọkụ ha ga-aṅụrụtụ.
Trey.

“Ọ bụ eziokwu na ụlọ anyị bi na ya dị obere, ọ na-amasị anyị isi nri ka anyị na ndị enyi anyị rikọọ ya ọnụ. Obi na-adị anyị ụtọ na anyị na-enyere ndị enyi anyị aka. Mgbe ụfọdụ, anyị na-enye ha ego. Ma, ọtụtụ mgbe anyị na-enye ha oge anyị. Anyị esila n’ihe ndị merela anyị mụta ugboro ugboro na a na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”​—Trey, Izrel.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya