OTÚ A IHE SI ARỊ ELU ỌJỊ, GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME?
Na-emesapụ Aka
Ọ bụrụ na otú ihe sị arị elu ọjị emeela ka ọ na-esiri gị ike ịzụta ihe ndị dị gị mkpa, o nwere ike ịdị gị ka imesapụ aka agbasaghị gị. Ma, i nwere ike ịchọpụta na ọ bụrụ na ị na-emesapụ aka n’oge ihe siri ike, ọ ga-abara gị uru. N’ihi ya, i nwere ike ịna-echekwa ego gị, na-emesapụkwa aka.
IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊNA-EMESAPỤ AKA
Ọ bụrụ na anyị na-emesapụ aka, ma n’obere ihe, obi ga na-adị anyị ụtọ, onwe anyị ga-ejukwa anyị afọ. N’eziokwu, nchọpụta ndị e mere gosiri na inye ndị ọzọ ihe na-eme ka ahụ́ sie mmadụ ike, ụbụrụ akpakọọkwa ya ọnụ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka nchegbu, ọbara mgbali elu, isi ọwụwa, nakwa ahụ́ mgbu belata. O nwekwara ike ime ka mmadụ na-ehikwu ụra nke ọma.
Ọ bụrụ na anyị na-enye ndị ọzọ ihe, ma ọ̀ bụ ego ma ọ̀ bụ ihe ọzọ, ọ na-adịkwuru anyị mfe ịnabata aka ndị ọzọ na-enyere anyị mgbe o ji anyị n’olu. Howard, onye bi n’Ịngland, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na mụ na nwunye m na-emesapụrụ ndị ọzọ aka, ọ naghị adị anyị ka ànyị bụụrụ ndị ọzọ ibu arọ ma ha nyere anyị aka ma ọ gbajuo dọrọ.” N’eziokwu, ndị na-esi n’obi ha emesapụ aka anaghị atụ anya ka a kwụọ ha ụgwọ ihe ọma ha meere ndị ọzọ. Ma, ha ga-enweta ezigbo ndị enyi ndị dị njikere ịgbatara ha ọsọ enyemaka n’oge nsogbu.
IHE I NWERE IKE IME
Na-enyetụ ndị ọzọ ihe. Ọ bụrụ na ihe i nwere ebughị ibu, ị ka nwere ike ịna-enyetụ ndị ọzọ ihe, ọ bụrụgodị inye ha obere nri. Duncan na ndị ezinụlọ ya, bụ́ ndị bi na Yuganda, bụ ogbenye ọnụ ntụ, ma ha na-emesapụ aka. Duncan sịrị: “N’ụbọchị Sọnde ọ bụla, mụ na nwunye m na-akpọ mmadụ ka ọ bịa n’ụlọ anyị metụ obere ihe ọnụ. Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị na ndị mmadụ nọrịa.”
Ma, i nyewe ndị ọzọ ihe, i kwesịrị icheta otú akpa gị hà. I kwesịghị ime ka ihe sikwuoro ndị ezinụlọ gị ike maka na ị chọrọ imesapụ aka.—Job 17:5.
Megodị ihe a: Nye mmadụ obere nri ma ọ bụ ihe ọ ga-eji megharịa ọnụ. Ọ bụrụ na e nwere ihe i nwere na-adịghịzi gị mkpa, lee ma ị̀ ga-enye ya ndị enyi gị ma ọ bụ ndị agbata obi gị ọ ga-abara uru, ndị ga-ekelekwa gị maka ya.
Si n’ụzọ ndị ọzọ na-enye ihe. Onyinye ụfọdụ kacha mma ị ga-enyeli ndị ọzọ anaghị efu ego. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike inye ha oge anyị, na-emekwara ha ihe ndị ọzọ iji gosi ha na anyị hụrụ ha n’anya. Okwu ọma anyị gwara mmadụ nwekwara ike ịbụ onyinye. N’ihi ya, na-agwa ndị ọzọ na ị hụrụ ha n’anya, jirikwa ha kpọrọ ihe.
Megodị ihe a: Nyere ndị ọzọ aka rụọ ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọ, rụzie ihe n’ụlọ ha, ma ọ bụkwanụ gaara ha ozi ndị ọzọ. Zigara enyi gị kaadị ma ọ bụ gị esi n’ekwentị zigara ya ozi, ọ bụrụgodị naanị iji sị ya na ị na-echeta ya.
Ọ bụrụ na ị na-achọta ụzọ ndị ị ga-esi na-emesapụ aka, ị ga-erite ọtụtụ uru.