OTÚ A IHE SI ARỊ ELU ỌJỊ, GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME?
Ka Ihe Ndị I Nwere Ju Gị Afọ
Ndị ihe ha nwere juru afọ na-enwe obi ụtọ. Ka ihe na-agbanwe ná ndụ ha, ha na-agbanwekwa otú ha si ebi ndụ ka ha ghara ikowe akpa ha n’ebe aka ha na-erughị.
IHE MERE IHE ANYỊ NWERE JI KWESỊ IJU ANYỊ AFỌ
Otu ọkachamara n’ihe banyere àgwà ụmụ mmadụ, bụ́ Jessica Koehler, kwuru na obi na-aka esi ndị ihe ha nwere juru afọ ike. Ọ chọpụtakwara na ha anaghị emechara ndị ọzọ anyaụfụ. N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na ndị ihe ha nwere juru afọ na-enwekarị obi ụtọ, ha anaghịkwa echegbukarị onwe ha. N’eziokwu, ụfọdụ n’ime ndị kacha enwe obi ụtọ bụ ndị na-enwechaghị ego, karịchaa, ndị ji ihe ndị kacha mkpa ná ndụ, bụ́ ihe ndị ego na-enweghị ike ịzụta, kpọrọ ihe. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ha ji kpọrọ ihe bụ obi ụtọ mmadụ na-enweta ma ya na ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya na-anọrị.
IHE I NWERE IKE IME
Ejila onwe gị atụnyere ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i jiri obere ihe i nwere na-atụnyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ nwere, o nwere ike ime ka ihe ndị i nwere gharazie ịna-eju gị afọ, ma ọ bụdị mee ka i mewere ndị ọzọ anyaụfụ. Ihe ọzọ bụ na ụda akị ilu abụghị ụtọ ya. E nwere ụfọdụ ndị nwere ọtụtụ ihe, ma ha ji ezigbo ụgwọ. Nicole, onye bi na Senigal, kwuru, sị: “Ọ dịghị m mkpa inwe ọtụtụ ihe iji nwee obi ụtọ. Ihe m nwere juhaala m afọ, ana m enwe obi ụtọ, ọ bụrụgodị na ihe ndị ọzọ nwere ka nke m.”
Megodị ihe a: Ghara ịna-ele ebe ndị mmadụ na-egosi ihe ndị ha nwere ma ọ bụ ebe ha na-etinye ihe n’Ịntanet iji gosi otú ha nweruru ego ma ọ bụ ndụ okomoko ha na-ebi.
Gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị i nwere. Ọ bụrụ na obi na-adị mmadụ ụtọ maka ihe ndị o nwere, ihe o nwere na-eju ya afọ, ọ naghịkwa echekarị na o kwesịrị inwetakwu ihe. Roberton, onye si Heiti, kwuru, sị: “M na-ewepụta oge echebara ihe ọma ndị ọzọ meere mụ na ndị ezinụlọ m echiche. M na-agwazi ha na obi dị m ezigbo ụtọ maka ihe ha meere anyị. M na-akụzikwara nwa m nwoke dị afọ asatọ ka ọ na-ekele onye ọ bụla meere ya ihe ọma.”
Megodị ihe a: Nwee ebe ị ga na-ede ihe ọma meere gị. Kwa ụbọchị, dee ihe ọ bụla mere gị obi ụtọ na ya. O nwere ike ịbụ na ahụ́ siri gị ike, na gị na ndị ezinụlọ gị dị ná mma, na i nwere ezigbo ndị enyi, ma ọ bụ na ị hụrụ otú anyanwụ si maa mma mgbe ọ na-ada.
Ọ bụghị mgbe niile ka ihe anyị nwere na-eju anyị afọ. Ma, mbọ ọ bụla anyị gbara ka ihe anyị nwere ju anyị afọ kwesịrị ekwesị. Anyị kpebie na ihe anyị nwere ga-eju anyị afọ, ọ pụtara na anyị ekpebiela na anyị ga na-enwe obi ụtọ. A naghịkwanụ azụta obi ụtọ n’ahịa.