ONYE A KỌRỌ AKỤKỌ YA NA BAỊBỤL
Were Ife Jehova Ka Ihe Kacha Mkpa Ka Manen
Manen so ná ndị Chineke ji na-eduzi ọgbakọ dị n’Antiọk n’oge ndịozi. “Ya na Herọd onye na-achị ógbè ahụ gụkọrọ akwụkwọ.” (Ọrụ 13:1) N’ihi ya, o doro anya na Manen gụrụ ezigbo akwụkwọ. O nwekwara ike ịbụ na a mụrụ ya n’ezinụlọ bara ọgaranya.
N’agbanyeghị ụdị ezinụlọ Manen si, o kpebiri ịghọ Onye Kraịst ma na-akwado ọgbakọ. Ebe ọ bụ na ọ gụrụ akwụkwọ, marakwa ndị ọnụ na-eru n’okwu, ọ gaara eji ya enweta ihe ndị ga-abara naanị onwe ya uru. Mana, o meghị otú ahụ. Kama, o jeere ụmụnna ya ozi.
Akụkọ Manen na-egosi na ife Jehova dị mkpa karịa ịchọwa ịbụ onye a ma ama n’ụwa ma ọ bụ ịchụ ego. Dị ka Manen, anyị kwesịrị iwere ofufe Jehova ka ihe dị mkpa karịa ịbụ aka ji akụ̀ ma ọ bụ ịbụ onye a ma ama n’ụwa. (Mat. 6:33) Ihe ọzọ bụ na, n’agbanyeghị na anyị ma na agụmakwụkwọ dị mkpa, anyị “na-achọpụta ihe ndị ka mkpa,” ma na-agbalịsi ike ka ihe ndị ọzọ ghara igbochi anyị iwere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa.—Fil. 1:9, 10.