MEE 11 RUO 17, 2026
ABỤ NKE 7 Jehova Bụ Ike Anyị
Tụkwasị Eze Kacha Elu Obi
“Jehova, . . . ọ bụ naanị gị bụ Onye Kacha Elu n’ụwa niile.”—ỌMA 83:18.
IHE A GA-AMỤ
Isiokwu a ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova bụ Ọkaakaa Eluigwe na Ụwa nakwa na ọ ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị ma ugbu a ma n’ọdịnihu.
1. Olee ihe ọjọọ ndị mere Job?
JOB bụ nwoke nwere okwukwe dịrị ndụ n’oge ochie. Ọtụtụ ihe ọjọọ mere ya n’otu ntabi anya. Ụmụ ya niile nwụrụ, e zuru anụmanụ ya ụfọdụ, gbuo ndị nke fọrọ afọ, gbuokwa ndị ohu ya. Ọ dakwara ezigbo ọrịa. Ihe ọzọ bụ na ihe a niile mere ka ọtụtụ ndị kwụsị ịkwanyere ya ùgwù. Ndị sị na ha bụ ndị enyi ya gwakwara ya ihe ndị gbawara ya obi. O nwedịrị mgbe o ruru, otú obi si jọọ nwunye ọma Job njọ emee ka ọ gwa ya, sị: “Kpọọ Chineke iyi nwụọ.” (Job 2:9; 15:4, 5; 19:1-3) Ihe ndị a mere Job gaara eme ka ọ kwụsị ịtụkwasị Jehova obi, mee ka o mewe ya obi abụọ na Jehova ga-echebeli ndị hụrụ ya n’anya ma na-efe ya.
2-3. Gịnị nwere ike ịna-eme anyị obi abụọ? Oleekwa ihe anyị ga-amụta n’akwụkwọ Job?
2 Mgbe ụfọdụ, nsogbu ndị nwere ike ime ka anyị kwụsị ịtụkwasị Jehova obi na-abịara anyị. Anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, taakwa akpụ.’ (2 Tim. 3:1) Nsogbu zowere anyị ka mmiri, obi nwere ike ịna-ajọ anyị njọ, ya adị anyị ka e nweghị mgbe ihe ga-adịrị anyị mma. Ụdị ihe a emeela ka ọ na-eme ụfọdụ ndị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ ha n’anya n’eziokwu.
3 Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emetụla gị, adala mbà. Job mụtara na Jehova na-anapụta ndị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ. Dịkwa ka Job, anyị ga-atụkwasịli Nna anyị nke eluigwe obi anyị niile. Iji nyere anyị aka ime ya, ka anyị leba anya n’akwụkwọ Job ka anyị hụ otú o si eme ka obi sie anyị ike n’ụzọ ihe abụọ. Nke mbụ, ọ bụ naanị Jehova bụ Eze Kacha Elu n’eluigwe na n’ụwa. Nke abụọ, Chineke anyị bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nwere ikike ịhụ na nzube ya mezuru na ikike ichebe ndị ya ka ha na ya na-adị n’ezigbo mma.
SETAN BỊARA SORO HA
4. Gịnị mere mgbe ndị mmụọ ozi zukọtara n’ihu Jehova n’eluigwe?
4 Otu ụbọchị, “ụmụ ezi Chineke” zukọtara n’ihu Jehova n’eluigwe. Baịbụl kwuru na “Setan bịakwara soro ha.” (Job 1:6) Nke a bụ nke mbụ aha ahụ bụ́ “Setan” pụtara na Baịbụl. Ihe mere e ji akpọ ya aha ahụ bụ na ọ na-emegide Jehova. Jehova kwere ka Setan nọrọ ná nnọkọ ahụ n’agbanyeghị na ọ naghịzi efe ya. Ọ bụzi onye iro Jehova, onye iro ndị mmụọ ozi ya, na onye iro ụmụ mmadụ na-erubere Jehova isi. Ihe Jehova kwuru na Jenesis 3:15 gosiri na Setan esoghịzi n’ezinụlọ ya. N’ihi ya, Setan esoghị n’ezinụlọ Jehova dị n’eluigwe, nke bụ́ “nwaanyị ahụ” ga-amụta “nwa” ahụ e kwere ná nkwa.
5. Gịnị ka anyị ga-amụta ma anyị leba anya n’ihe e kwuru ná nnọkọ ahụ e nwere n’eluigwe?
5 Jehova mere ka e dee ihe mere ná nnọkọ ahụ na Baịbụl. Ihe ndị Setan kwuru mere ka o doo anya na obi tara ya mmiri nakwa na ọ kpọrọ ndị na-efe Jehova asị. (Job 1:9; i nwere ike ịtụle Mkpughe 12:10.) Ihe a mere n’eluigwe Jehova mere ka e dee na Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na ọ na-eji ike ya eme ihe ziri ezi mgbe niile. Ọ na-egosikwa na ebe ọ bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, e nwere ihe ndị ọ na-ekwe ndị ọzọ mee na ihe ndị ọ na-anaghị ekwe ha mee.
JEHOVA NA-EKPEBI IHE Ọ NA-EKWE KA NDỊ ỌZỌ MEE
6. Olee otú Jehova si gosi na ọ bụ ya nwere ikike ikpebi ihe a ga-eme ná nnọkọ ahụ e nwere n’eluigwe? (Job 1:7, 8)
6 Gụọ Job 1:7, 8. Jehova gosiri na ọ bụ ya nwere ikike ikpebi ihe a ga-eme ná nnọkọ ahụ. Ọ jụrụ Setan, sị: “Ì leruola ohu m Job anya?” Jehova ma na anya Setan adịla n’ebe Job nọ. Ka anyị lee otú Jehova ga-esi jiri ike ya nyere Job aka.
7. Dị ka e kwuru na Job 1:10, 11, gịnị ka Setan kwuru na ọ bụ ya mere ụmụ mmadụ ji na-efe Jehova?
7 Gụọ Job 1:10, 11. Jehova bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa. O nwere ike ime ihe ọ bụla ọ chọrọ. Ọ makwa ihe kacha mma ọ ga-eme mgbe niile. (Jere. 32:17; Dan. 4:35) Ma, Setan kwuru na Jehova na-eji ike ya eme ihe na-adịghị mma. Ihe okwu ya pụtara bụ na ihe mere Jehova ji emere ma Job ma ụmụ mmadụ ndị ọzọ ihe ọma bụ ka ha nwee ike ịna-efe ya. Ọ pụtakwara na ụmụ mmadụ na-efe Jehova naanị n’ihi ihe ọma ọ na-emere ha. Gịnị ka Jehova mere?
8-9. Gịnị ka Jehova nyere Setan iwu ka ọ ghara ime? Maka gịnị? (Job 1:12) (Kọwaakwa foto.)
8 Gụọ Job 1:12. Jehova hapụrụ Setan ka o gosi ma ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu. Mana Jehova gwara ya ihe ọ na-agaghị eme. Jehova gwara ya hoo haa, sị: “Emetụla [Job] aka.” Jehova nọ n’ihu ndị niile nọ ná nnọkọ ahụ gwa Setan ihe ọ na-agaghị eme. Setan agakwanụghị anwa anwa mee ihe ahụ Jehova sị ya emela n’ihi na o nweghị ikike ime ya. Ọ ka dịkwa otú ahụ taa. Jehova si otú ahụ jiri ike ya chebe Job, gosikwa na ọ bụ Chineke ịhụnanya ma na-ekpe ikpe ziri ezi.
9 Mbọ mbụ Setan gbara ka Job kwụsị ife Jehova kụrụ afọ n’ala. Job akwụsịghị ife Nna ya nke eluigwe. (Job 1:22) Ma, Ekwensu anwachabeghị Job.
Jehova hapụrụ Setan ka ọ nọrọ n’ihu ndị mmụọ ozi ndị ọzọ bo ya na ụmụ mmadụ ebubo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)
10. Gịnị mere Jehova ji hapụ Setan ka ọ nwaa Job ọzọ? (Job 2:2-6)
10 Gụọ Job 2:2-6. Na nke ugbu a, Setan kpebisiri ike ime ka Job kwụsị ife Jehova. O kwuru na Job ga-ekwujọ Chineke ka o nwee ike ịzọ ndụ ya. Iji gosi na ihe Setan kwuru bụ ụgha, Jehova kwere ka Setan mee ka Job daa ezigbo ọrịa. Mana, e nwekwara iwu Jehova nyere Setan. Ọ sịrị ya: “Egbula ya egbu.” Setan agaghị egbuli Job n’ihi na Jehova agaghị ekwe ka o gbuo ya. Jehova sikwa otú a gosi na ọ bụ Onye Kacha Elu n’ihi na Setan agaghị emeli Job ihe Jehova na-ekweghị ka o mee ya.
JEHOVA MERE KA AHỤHỤ JOB NA-ATA KWỤSỊ
11. Ozugbo Jehova kwụsịrị Setan ịnwa Job, olee otú o si gọzie Job? (Job 42:10-13)
11 Gụọ Job 42:10-13. Mgbe o doro anya na Job agaghị akwụsị irubere Jehova isi, Jehova mere ka Setan kwụsị ịnwa ya, meekwa ka ahụhụ Job na-ata kwụsị. Onye Mmegide ahụ emelighịkwa ka Chineke ghara ichebe Job na ịgọzi ya.
12. Mee ihe atụ gosiri ihe Jehova meere ụfọdụ ndị ohu ya tụkwasịrị ya obi na ọ ga-echebe ha.
12 N’oge ikpeazụ a, Jehova ejirila ike ya nyere ọtụtụ ndị ohu ya aka. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1945, ndị amị manyere Ndịàmà Jehova dị narị abụọ na iri atọ (230) ka ha gaa ogologo ije nwere ike ịta isi ha, malite n’ebe a tụrụ ha mkpọrọ na Jamanị ruo n’osimiri. Ma, e nweghị ihe mere onye ọ bụla n’ime ha. Ha dere gbasara otú Jehova si chebe ha. Ha kwuru na Jehova chebere ha otú ahụ o si chebe ndị Hibru atọ ahụ a tụbara n’ime ọkụ na-enwusi ike. Ha esighịdị anwụrụ ọkụ anwụrụ ọkụ mgbe ha pụtara. Ọ bụkwa otú ahụ ka Jehova si napụta ụmụnna ndị a n’ọnwụnwa a siri ezigbo ike. Ma, okwukwe ha sikwuru ike n’ihi na Jehova mere ka ha dị ike. Ọ dịkwa ha otú ọ dị Daniel, onye Jehova napụtara mgbe a tụbara ya n’olulu ọdụm. Malite mgbe ahụ gawa, ha kpebisiri ike ife Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Ha kwukwara na ife Jehova ruo mgbe ebighị ebi bụ ihe ọma kachanụ nwere ike imere ha.—I nwere ike ịtụle Daniel 3:27; 6:22.
13. Gịnị ka obi kwesịrị isi gị ike na ya ma ọnwụnwa bịara gị? (Kọwaakwa foto.)
13 E nwere mgbe o nwere ike ịdị anyị ka à tụbara anyị n’olulu ọdụm. (1 Pita 5:8-10) Mgbe ụfọdụ, ike ụwa nwere ike ịgwụ anyị, anyị ana-echekwa ma è nwere mgbe nsogbu anyị ga-ebi. N’ụdị oge ahụ, icheta akụkọ Job nwere ike ịbara anyị uru. Ka obi sie anyị ezigbo ike na Jehova ga-eji ike ya kwụsị ahụhụ anyị na-ata, ma ọ́ bụghị ugbu a, ya abụrụ n’ụwa ọhụrụ. Ọ gaghị ekwe ka ụwa ochie a gafee oge o kpebiri ọ ga-eji ebibi ya.
Jehova ga-akwụsị ahụhụ ndị ohu ya ji obi ha niile na-efe ya na-ata (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)
JEHOVA HỤRỤ NDỊ OHU YA N’ANYA
14-15. Olee otú ọ na-adị Jehova ịgọzi ndị ohu ya tụkwasịrị ya obi? (Job 14:15) (Kọwaakwa foto.)
14 Gụọ Job 14:15. Nna anyị nke eluigwe anaghị ahapụ ndị ohu ya tụkwasịrị ya obi. Ọ hụrụ ha n’anya nke na ha nwụọ, ọ ga-akpọlite ha. Ọ ga-ewepụ obi mgbawa ọnwụ kpatara.—Aịza. 65:17.
15 Ọ bụ eziokwu na Job biri n’ụwa Ekwensu na-achị, ihe Baịbụl kọrọ gosiri na Jehova mere ka ahụ́ dị Job mma ọzọ, meekwara ya ọtụtụ ihe ọma karịa otú o meere ya na mbụ. Ihe ọma ndị ahụ Jehova meere ya bụ iji tụpenyetụ ya azụ̀ ihe ọma ndị ọ ga-emere ya n’ọdịnihu. Jehova gosiri na ọ chọrọ ka ndị ohu ya na-enwe ezigbo obi ụtọ nakwa ka ndụ na-atọ ha ụtọ. N’eziokwu, Jehova ga-enye ndị niile tụkwasịrị ya obi ohere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ Paradaịs. (Mkpu. 21:3, 4) Ebe Jehova bụ Eze Kacha Elu, ọ chọrọ ime ya. Icheta ihe a na-akasi anyị obi ma ọnwụnwa bịara anyị.
Mgbe a nwachara Job ọnwụnwa, Jehova gọziri ya na nwunye ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)
16. Olee ihe ọzọ mere anyị ga-eji tụkwasị Jehova obi na ọ bụ Eze Kacha Elu?
16 Ọ bụ eziokwu na Jehova mere ka Job dịrị ogologo ndụ, ma o mechara nwụọ. Ma, ebe ọ bụ na Jehova bụ Eze Kacha Elu, ọ ga-akpọliteli ya n’ọnwụ. (Diut. 32:39) N’ihi ya, e nweghị onye ọ bụla ga-emeli ka ọ ghara ịkpọlite ndị ọ hụrụ n’anya n’ọnwụ. Ọ ga-akpọlitekwa ha n’oge ọ chọrọ.—Rom 8:38, 39.
TỤKWASỊ JEHOVA OBI GỊ NIILE
17. Gịnị gosiri na mbọ Setan na-agba ikpochapụ ndị ohu Jehova na-akụ afọ n’ala?
17 Akụkọ Job mere ka e nwee ezigbo ihe mere anyị ga-eji tụkwasị Jehova obi anyị niile. Obi dị anyị ụtọ na mbọ Setan na-agba ibibi ndị Jehova na-akụ afọ n’ala. Taa, ihe dị ka nde mmadụ itoolu (9,000,000) ji obi ha niile na-efe Jehova. Ihe a na-egosi na ọ bụ Eze Kacha Elu. Kemgbe ụwa, anyị na-ahụ na ngwá ọgụ ọ bụla e ji na-alụso ndị ohu Jehova ọgụ anaghị enwe isi. (Aịza. 54:17) Ọtụtụ ndị ọchịchị siri ike na ndị isi okpukpe enwebeghị ike ikpochapụ ndị ohu Jehova yiri ndị na-enweghị onye na-echebe ha. E nweghịkwanụ ihe ọ bụla ga-akwụsịli anyị ịna-akọrọ ndị mmadụ eziokwu gbasara Jehova nakwa ịna-egosi na Setan bụ onye ụgha na ogbu mmadụ. Ọ bụrụgodị na anyị anwụọ, anyị ma na Jehova ga-akpọlite ndị na-efe ya.—Hos. 13:14.
18. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike maka ọdịnihu?
18 Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe mere ná ndụ Job, ọ na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike na Jehova ga-anọnyere anyị n’ọdịnihu n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. N’oge oké mkpagbu, Setan ga-ewere ndị Chineke ka anụ oriri. Ọ ga-adịkwa ndị òtù ya ka hà ga-eji ụkwụ zọgbuo ndị ohu Jehova. Mana, dị ka Jehova mere n’oge Job, ọ gaghị ekwe ka Setan kpatara ndị ya nsogbu ọ bụla ga-adịru ebighị ebi. Oge Jehova ga-ewepụ ahụhụ niile Setan kpataara ụmụ mmadụ ji ọsọ na-abịa. A ga-atụba Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis ruo otu puku (1,000) afọ. (Luk 8:31; Mkpu. 20:1-3) A ga-emecha bibie Setan na ndị niile na-akwado ya. (Mkpu. 20:10) Dị ka Jehova kwuru, a ga-egwepịa Setan isi, ya bụ, a ga-ebibi ya kpamkpam.—Jen. 3:15; Rom 16:20.
19. Olee otú Jehova ga-esi gọzie ndị tụkwasịrị ya obi ha niile? (Kọwaakwa foto.)
19 Ndị ji obi ha na-efe Jehova na-atụsi anya ike mgbe a ga-eme ka ụmụ mmadụ zuo okè ma na-enwe obi ụtọ n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ. Ndụ ga-atọgbu onwe ya karịadị ka anyị na-atụ anya ya. Jehova kwere nkwa, sị: “Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpu. 21:5) Gịnị ka ọ pụtara? Kemgbe ihe mere n’ogige Iden mechara, nke ahụ ga-abụ nke mbụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-agaghịzi enwe ike ịkpatara ụmụ mmadụ nsogbu ma ọ bụ mee ka ha mee ihe ọjọọ. Obi ga-eru anyị nnọọ ala. Nchegbu ndị juru n’ụwa ochie a agaghịzi adị. Ndị ga-agafe Amagedọn ga-ahụ ọtụtụ ọrụ ebube. Ndị ọrịa ga-agbake. A ga-amalite ịkpọlite ndị anyị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ndụ ga-adịzi otú Nna anyị nke eluigwe chọrọ ka ọ dịrị.
Jehova ga-agọzi ndị ohu ya diri ọnwụnwa n’oge gara aga (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)
20. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?
20 N’oge ikpeazụ a, ọnwụnwa nwere ike ịbịakwuru anyị. Anyị kwesịkwara inwe obi ike iji die ya. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịtụkwasị Jehova obi anyị niile ma na-akwado ọchịchị ya. Ka anyị gosi na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya, na-emekwa ka a mata na Setan bụ onye ụgha. N’eziokwu, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ijere Jehova bụ́ Eze Kacha Elu ozi, ihe ga-adịrị anyị mma n’ọdịnihu n’ihi na Jehova chọsiri ike ịkwụ ndị ji obi ha niile na-efe ya ụgwọ. Ọ ga-akwụkwa ha ụgwọ.
ABỤ NKE 153 Nye M Obi Ike