Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Febụwarị p. 32
  • Mụta Ịtụ Egwu Chineke Ka Obedaya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mụta Ịtụ Egwu Chineke Ka Obedaya
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inweta Obi Ike Site n’Inwe Okwukwe na Ịtụ Egwu Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-atụ Egwu Jehova?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Obadaịa, Jona, na Maịka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Febụwarị p. 32

ONYE A KỌRỌ AKỤKỌ YA NA BAỊBỤL

Mụta Ịtụ Egwu Chineke Ka Obedaya

Ọ bụ Obedaya na-elekọta ụlọ Eze Ehab, bụ́ eze ọjọọ kwere ka a na-efe Bel ebe niile n’Izrel. Ma, Obedaya “si na nwata” mụta ịtụ egwu Jehova. (1 Eze 18:1-13) N’ihi ya, mgbe Jezibel bụ́ nwunye eze nyere iwu ka e gbuo ndị amụma Jehova niile, Obedaya ma na o kwesịrị ịkata obi nyere ha aka. Ọ dịghịdị mfe izo otu onye amụma. Ma, Obedaya zoro otu narị (100) ndị amụma, na-enyekwa ha nri n’agbanyeghị na e nwere ụnwụ nri n’obodo ahụ. Chegodị otú o si siere ya ike izo ha ka ọtụtụ ndị amụma ụgha na-ejere eze na nwunye ya ozi ghara ịhụ ha.​—1 Eze 18:19.

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka nwoke a na-atụ egwu Chineke? Obedaya na-atụ egwu Ehab. Ma nke ọ na-atụ Chineke karịrị. Ọ bụ ya mere ka ọ kata obi chebe ụmụnna ya n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ya. Anyị kwesịrị ịmụta ịtụ egwu Chineke, karịchaa ma ọ bụrụ na a machiri Ndịàmà Jehova iwu n’ebe anyị bi. Ụdị egwu a ga-eme ka anyị kata obi nyere ụmụnna anyị a na-akpagbu aka.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya