ONYE A KỌRỌ AKỤKỌ YA NA BAỊBỤL
Mụta Ịtụ Egwu Chineke Ka Obedaya
Ọ bụ Obedaya na-elekọta ụlọ Eze Ehab, bụ́ eze ọjọọ kwere ka a na-efe Bel ebe niile n’Izrel. Ma, Obedaya “si na nwata” mụta ịtụ egwu Jehova. (1 Eze 18:1-13) N’ihi ya, mgbe Jezibel bụ́ nwunye eze nyere iwu ka e gbuo ndị amụma Jehova niile, Obedaya ma na o kwesịrị ịkata obi nyere ha aka. Ọ dịghịdị mfe izo otu onye amụma. Ma, Obedaya zoro otu narị (100) ndị amụma, na-enyekwa ha nri n’agbanyeghị na e nwere ụnwụ nri n’obodo ahụ. Chegodị otú o si siere ya ike izo ha ka ọtụtụ ndị amụma ụgha na-ejere eze na nwunye ya ozi ghara ịhụ ha.—1 Eze 18:19.
Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka nwoke a na-atụ egwu Chineke? Obedaya na-atụ egwu Ehab. Ma nke ọ na-atụ Chineke karịrị. Ọ bụ ya mere ka ọ kata obi chebe ụmụnna ya n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ya. Anyị kwesịrị ịmụta ịtụ egwu Chineke, karịchaa ma ọ bụrụ na a machiri Ndịàmà Jehova iwu n’ebe anyị bi. Ụdị egwu a ga-eme ka anyị kata obi nyere ụmụnna anyị a na-akpagbu aka.