Ì Chetara?
Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’afọ a nke ọma? Ngwa, lee ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:
Gịnị mere anyị ji eto Jehova?
Anyị na-eto Jehova n’ihi na anyị na-akwanyere ya ezigbo ùgwù ma hụ ya n’anya. Anyị na-etokwa ya n’ihi na anyị chọrọ ka ndị ọzọ mata ya.—w25.01, peeji nke 3.
Olee otú anyị ga-esi na-agbagharakwu ndị mejọrọ anyị?
Ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị ileghara otú obi dị anyị anya, ma ịkwụsị ibu iwe n’obi ga-enyere anyị aka ka anyị ghara iji obi ọjọọ emeso ndị ọzọ ihe.—w25.02, peeji nke 15 na nke 16.
Gịnị mere ụmụnna nwoke na-eto eto ji kwesị ime ka Mak?
Mak dị njikere ijere Jehova na ụmụnna ya ozi. N’agbanyeghị na e mere ya ihe ọ ga-abụ na o wutere ya nke ukwuu, ọ kwụsịghị ijere ụmụnna ya ozi. Ya na Pọl na ụmụnna ndị ọzọ ma nke a na-akọ ka dịkwa ná mma.—w25.04, peeji nke 27.
Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe o kpere ekpere, sị: “Emeela m ka ha mara aha gị”? (Jọn 17:26)
Ndị na-eso ụzọ Jizọs ma aha Chineke. Ma, Jizọs mere ka ha mata ụdị onye Jehova bụ, ma ihe bụ́ nzube ya, ihe ndị ọ na-eme, na àgwà ya.—w25.05, peeji nke 20 na nke 21.
Ọ bụrụ na anyị amara ebe ike anyị ruru, gịnị ka anyị ga-aghọta?
Anyị ga-aghọta na ọ bụghị ihe niile ka anyị ma. Dị ka ihe atụ, anyị amaghị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa ma ọ bụ otú Jehova ga-esi enyere anyị aka n’oge ahụ. Anyị amaghịkwa ihe ga-eme echi ma ọ bụkwanụ otú Jehova maruru anyị.—w25.06, peeji nke 15 ruo na nke 18.
Gịnị ka anyị ga-eme ka okwu ihu ọha ma ọ bụ isiokwu e wepụtara maka ọhaneze baara anyị uru?
Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee ihe ndị e ji mee ka ndị e bu n’obi wepụta ya kweta na ihe a Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu? È nwere ihe atụ dabara adaba e mere m ga-eji akụziri mmadụ eziokwu a? Olee onye isiokwu a nwere ike ịmasị?’—w25.07, peeji nke 19.
Gịnị ka akụkọ Devid na-akụziri anyị gbasara otú Jehova si agbaghara mmehie?
Devid mere ụfọdụ mmehie dị oké njọ. Ma, mgbe o ji obi ya niile chegharịa, Jehova gbaghaara ya. (1 Eze 9:4, 5) Chineke gbaghara anyị mmehie, ọ na-echefu ya kpamkpam, ọ naghịkwa eji maka ya ata anyị ahụhụ ọzọ.—w25.08, peeji nke 17.
Ọ bụrụ na e nwere ihe siiri onye ị na-amụrụ ihe ike nghọta, gịnị ka ị ga-eme?
Ọ bụrụ na ị gbalịa ike gị jiri Baịbụl kụziere ya ihe nke ọma, ma ya aka na-esiri ya ike ịghọta ya, mụrụnụ ihe na-aga, e mechaa unu elebagharịa ya anya.—w25.09, peeji nke 24.
Baịbụl kwuru na mmehie nwere “ike dị aghụghọ.” (Hib. 3:13) Olee otú ọ bụ?
Ezughị okè na-eme ka anyị chọwa ime ihe ọjọọ. Ọ na-emekwa ka anyị nwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya.—w25.10, peeji nke 16.
Olee ihe atọ nwere ike ime ka ekpere anyị na-akakwu mma?
(1) Anyị nwere ike ịna-eche banyere ụdị Chineke Jehova bụ. (2) Anyị nwere ike iche gbasara ihe na-esiri anyị ike ma gwa ya Jehova, dị ka ịgbaghara mmadụ. (3) Anyị nwere ike ghara ịgba ekpere anyị ọsọ. O nwere ike ime ka anyị gwakwuo Jehova otú obi dị anyị.—w25.10, peeji nke 19 na nke 20.
Olee otú anyị nwere ike isi enyere ndị agadi aka?
Anyị nwere ike ịna-aga eleta ha mgbe niile ma ọ bụ na-akpọ ha n’ekwentị. Anyị nwekwara ike iso ha gaa ụlọ ọgwụ ma ọ bụkwanụ anyị na ha esoro si n’ụzọ dị iche iche na-ekwusa ozi ọma.—w25.11, peeji nke 6 na nke 7.
Gịnị na gịnị ka Ndị Kraịst nwere ike ime ka agbamakwụkwọ ha mee ka e too Jehova?
Rubenụ isi n’ihe iwu obodo unu kwuru. Gbaanụ mbọ ka agbamakwụkwọ unu na oriri agbamakwụkwọ unu gosi na unu bụ ndị mmụọ Chineke na-edu. Meenụ ka uwe unu ga-eyi n’ụbọchị ahụ dị mma n’anya. Unu etinyekwala aka n’omenala ọ bụla na-adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru. Wetuonụ obi kpaa ihe ndị unu kwesịrị ịkpa ma unu haziwe agbamakwụkwọ unu.—w25.12, peeji nke 21 ruo na nke 24.