Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Disemba p. 31
  • Ì Chetara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Chetara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Chetara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Nkebi nke 1
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Disemba p. 31

Ì Chetara?

Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’afọ a nke ọma? Ngwa, lee ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Gịnị mere anyị ji eto Jehova?

Anyị na-eto Jehova n’ihi na anyị na-akwanyere ya ezigbo ùgwù ma hụ ya n’anya. Anyị na-etokwa ya n’ihi na anyị chọrọ ka ndị ọzọ mata ya.​—w25.01, peeji nke 3.

Olee otú anyị ga-esi na-agbagharakwu ndị mejọrọ anyị?

Ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị ileghara otú obi dị anyị anya, ma ịkwụsị ibu iwe n’obi ga-enyere anyị aka ka anyị ghara iji obi ọjọọ emeso ndị ọzọ ihe.​—w25.02, peeji nke 15 na nke 16.

Gịnị mere ụmụnna nwoke na-eto eto ji kwesị ime ka Mak?

Mak dị njikere ijere Jehova na ụmụnna ya ozi. N’agbanyeghị na e mere ya ihe ọ ga-abụ na o wutere ya nke ukwuu, ọ kwụsịghị ijere ụmụnna ya ozi. Ya na Pọl na ụmụnna ndị ọzọ ma nke a na-akọ ka dịkwa ná mma.​—w25.04, peeji nke 27.

Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe o kpere ekpere, sị: “Emeela m ka ha mara aha gị”? (Jọn 17:26)

Ndị na-eso ụzọ Jizọs ma aha Chineke. Ma, Jizọs mere ka ha mata ụdị onye Jehova bụ, ma ihe bụ́ nzube ya, ihe ndị ọ na-eme, na àgwà ya.​—w25.05, peeji nke 20 na nke 21.

Ọ bụrụ na anyị amara ebe ike anyị ruru, gịnị ka anyị ga-aghọta?

Anyị ga-aghọta na ọ bụghị ihe niile ka anyị ma. Dị ka ihe atụ, anyị amaghị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa ma ọ bụ otú Jehova ga-esi enyere anyị aka n’oge ahụ. Anyị amaghịkwa ihe ga-eme echi ma ọ bụkwanụ otú Jehova maruru anyị.​—w25.06, peeji nke 15 ruo na nke 18.

Gịnị ka anyị ga-eme ka okwu ihu ọha ma ọ bụ isiokwu e wepụtara maka ọhaneze baara anyị uru?

Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee ihe ndị e ji mee ka ndị e bu n’obi wepụta ya kweta na ihe a Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu? È nwere ihe atụ dabara adaba e mere m ga-eji akụziri mmadụ eziokwu a? Olee onye isiokwu a nwere ike ịmasị?’​—w25.07, peeji nke 19.

Gịnị ka akụkọ Devid na-akụziri anyị gbasara otú Jehova si agbaghara mmehie?

Devid mere ụfọdụ mmehie dị oké njọ. Ma, mgbe o ji obi ya niile chegharịa, Jehova gbaghaara ya. (1 Eze 9:4, 5) Chineke gbaghara anyị mmehie, ọ na-echefu ya kpamkpam, ọ naghịkwa eji maka ya ata anyị ahụhụ ọzọ.​—w25.08, peeji nke 17.

Ọ bụrụ na e nwere ihe siiri onye ị na-amụrụ ihe ike nghọta, gịnị ka ị ga-eme?

Ọ bụrụ na ị gbalịa ike gị jiri Baịbụl kụziere ya ihe nke ọma, ma ya aka na-esiri ya ike ịghọta ya, mụrụnụ ihe na-aga, e mechaa unu elebagharịa ya anya.​—w25.09, peeji nke 24.

Baịbụl kwuru na mmehie nwere “ike dị aghụghọ.” (Hib. 3:13) Olee otú ọ bụ?

Ezughị okè na-eme ka anyị chọwa ime ihe ọjọọ. Ọ na-emekwa ka anyị nwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya.​—w25.10, peeji nke 16.

Olee ihe atọ nwere ike ime ka ekpere anyị na-akakwu mma?

(1) Anyị nwere ike ịna-eche banyere ụdị Chineke Jehova bụ. (2) Anyị nwere ike iche gbasara ihe na-esiri anyị ike ma gwa ya Jehova, dị ka ịgbaghara mmadụ. (3) Anyị nwere ike ghara ịgba ekpere anyị ọsọ. O nwere ike ime ka anyị gwakwuo Jehova otú obi dị anyị.​—w25.10, peeji nke 19 na nke 20.

Olee otú anyị nwere ike isi enyere ndị agadi aka?

Anyị nwere ike ịna-aga eleta ha mgbe niile ma ọ bụ na-akpọ ha n’ekwentị. Anyị nwekwara ike iso ha gaa ụlọ ọgwụ ma ọ bụkwanụ anyị na ha esoro si n’ụzọ dị iche iche na-ekwusa ozi ọma.​—w25.11, peeji nke 6 na nke 7.

Gịnị na gịnị ka Ndị Kraịst nwere ike ime ka agbamakwụkwọ ha mee ka e too Jehova?

Rubenụ isi n’ihe iwu obodo unu kwuru. Gbaanụ mbọ ka agbamakwụkwọ unu na oriri agbamakwụkwọ unu gosi na unu bụ ndị mmụọ Chineke na-edu. Meenụ ka uwe unu ga-eyi n’ụbọchị ahụ dị mma n’anya. Unu etinyekwala aka n’omenala ọ bụla na-adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru. Wetuonụ obi kpaa ihe ndị unu kwesịrị ịkpa ma unu haziwe agbamakwụkwọ unu.​—w25.12, peeji nke 21 ruo na nke 24.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya