Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Nọvemba p. 28-29
  • ‘Ka Anyị Na-adị n’Otu Otú Mmụọ Nsọ Mere Ka Anyị Dịrị’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ka Anyị Na-adị n’Otu Otú Mmụọ Nsọ Mere Ka Anyị Dịrị’
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘NA-AGBASI MBỌ IKE’ KA ANYỊ NA-ADỊ N’OTU
  • Jehova Na-achịkọta Ezinụlọ Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Na-eme Ka E Too Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Jigide Ịdị n’Otu na Mgbe Ikpeazụ A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ezi Ịdị n’Otu Ndị Kraịst—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Nọvemba p. 28-29
Ebe ụmụnna zukọrọ n’ụlọ otu nwanna na-eri nri, obi ana-atọ ha ụtọ.

‘Ka Anyị Na-adị n’Otu Otú Mmụọ Nsọ Mere Ka Anyị Dịrị’

PỌL onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs, sị: “Na-edirinụ ibe unu ihe n’ihi na unu hụrụ ha n’anya. Unu na ibe unu dịrị n’udo, na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu na-adị n’otu otú mmụọ nsọ mere ka unu dịrị.”​—Efe. 4:2, 3.

Ọ bụ “mmụọ nsọ” Chineke na-eme ka anyị ‘dịrị n’otu.’ Ma, ihe Pọl kwuru gosiri na anyị agaghị adịli n’otu n’agbaraghị ya mbọ ọ bụla. Ònye ga-agba mbọ ahụ? Ọ bụ Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịgbasi mbọ ike ‘ka anyị na-adị n’otu otú mmụọ nsọ mere ka anyị dịrị.’

Dị ka ihe atụ, ka e were ya na mmadụ nyere gị ụgbọala ọhụrụ. Ònye ga na-elekọta ya? Azịza ya doro anya. Ị gaghị ata onye nyere gị ụgbọala ahụ ụta ma o mebie n’ihi na i lekọtaghị ya nke ọma.

Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Chineke na-eme ka anyị na-adị n’otu, ma, ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị n’aka ịhụ na anyị nọgidere na-adị n’otu. Ọ bụrụ na e nwere nwanna anyị na ya na-adịghị ná mma, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-agba mbọ ka mụ na ya kpezie ka ọgbakọ nwee ike na-adị n’otu?’

‘NA-AGBASI MBỌ IKE’ KA ANYỊ NA-ADỊ N’OTU

Ihe Pọl kwuru gosiri na ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adị mfe anyị na ụmụnna anyị ịna-adị n’otu, karịchaa ma e nwee onye nke kpasuru anyị iwe. Ọ̀ pụtara na ọ bụ mgbe niile ka anyị kwesịrị ịgakwuru nwanna mejọrọ anyị ka anyị na ya kwuo gbasara ya? Ọ bụghị mgbe niile. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ịgakwuru nwanna a ọ̀ ga-eme ka ihe ka mma ka ọ̀ bụ ka ọ ka njọ?’ Mgbe ụfọdụ, ihe ka mma ime bụ ileghara ihe ahụ anya ma ọ bụ ịgbaghara onye ahụ.​—Ilu 19:11; Mak 11:25.

Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwanna kpebiri ileghara ihe e mere ya anya. 1. Ebe otu nwanna na-abara ya mba. 2. Ebe ọ na-eche ihe nwanna ahụ mere ya. 3. Ebe ọ na-agụ Baịbụl ma na-atụgharị uche na ya.

Jụọ onwe gị, sị, ‘Ịgakwuru nwanna a ọ̀ ga-eme ka ihe ka mma ka ọ̀ bụ ka ọ ka njọ?

Pọl onyeozi kwuru ka anyị ‘na-ediri ibe anyị ihe n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya.’ (Efe. 4:2) Otu akwụkwọ kwuru na ihe a nwere ike ịpụta “ịnabata ha otú ha dị.” Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-ekweta na ụmụnna anyị bụ ndị mmehie otú anyịnwa bụkwa. N’eziokwu, anyị na-agbalịsi ike ‘ịna-eyiri àgwà ọhụrụ.’ (Efe. 4:23, 24) Ma, ọ gaghị adịchara anyị mfe mgbe niile. (Rom 3:23) Ịghọta ihe a ga-enyere anyị aka ịna-ediri ibe anyị ihe ma na-agbaghara ibe anyị. Ọ ga-eme ka anyị ‘dịrị n’otu otú mmụọ nsọ mere ka anyị dịrị.’

Ọ bụrụ na anyị ana-agbaghara ihe ọjọọ e mere anyị ma na-echefu ya, anyị na ‘ibe anyị ga na-adị n’udo.’ Okwu Grik a sụgharịrị ‘ịdị n’udo’ ná Ndị Efesọs 4:3 pụtara “akwara ndị na-ejikọta ọkpụkpụ.” Akwara ndị ahụ na-esi ezigbo ike. E nwere ike iji udo tụnyere akwara ndị ahụ. Udo na ịhụnanya na-enyere anyị aka ka anyị na ibe anyị na-adị n’otu n’agbanyeghị nghọtahie ọ bụla anyị na ha nwere.

N’ihi ya, ọ bụrụ na nwanna akpasuo gị iwe, mee ihe wutere gị, ma ọ bụ na o nwere àgwà na-ewe gị iwe, gbalịa na-enwere ya ọmịiko kama ịna-ahụ naanị ihe na-adịghị mma ọ na-eme. (Kọl. 3:12) Ebe ọ bụ na anyị niile ezughị okè, ọ ga-abụ na e nweela mgbe i mejọrọ mmadụ. Iburu ihe a n’obi ga-enyere gị aka ịna-agbalịsi ike ‘ka anyị na-adị n’otu otú mmụọ nsọ mere ka anyị dịrị.’

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya