Isiokwu Na-enyere Ụmụ Nwaanyị A Na-emegbu Emegbu Aka
“A NA-EMEGBU ọtụtụ nde ụmụ nwaanyị n’ụwa niile. Ì so ná ndị a na-emegbu? Chọpụta ihe mere Chineke ejighị ihe gbasara ichebe ụmụ nwaanyị egwu egwu nakwa ihe ọ ga-eme gbasara mmegbu a na-emegbu ha.”
Ọ bụ ihe a ka e ji malite isiokwu gbara na jw.org bụ́ “Ichebe Ụmụ Nwaanyị—Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ya.” Ná ngwụcha isiokwu ahụ, e nwere ebe i nwere ike ịpị aka ya egosi gị ebe ị ga-ewere nke ị ga-ebipụtali ebipụta. Ị ga-apịajili ya, ya aghọọ traktị nwere peeji anọ. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Stacy bi n’Amerịka sịrị: “M bipụtara ya ọtụtụ, mụ na nwanna nwaanyị ọzọ ejiri ha gaa n’ebe a na-elekọta ụmụ nwaanyị ndị a na-emegbu emegbu.”
Otu nwaanyị na-arụ ebe ahụ gwara ụmụnna nwaanyị ahụ ka ha nyekwuo ya traktị ahụ ka o kesaara ndị ọzọ bi ebe ahụ. Ihe a mere ka e nye mmadụ iri anọ ọzọ traktị ahụ na kaadị jw.org iri atọ. N’oge ọzọ ha gara, onyeisi ebe ahụ kwuru ka e gosi ndị bi ebe ahụ otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl.
Nwanna Nwaanyị Stacy na ụmụnna nwaanyị abụọ ọzọ gakwara n’ebe ọzọ a na-elekọta ụmụ nwaanyị a na-emegbu emegbu nye ha traktị ahụ ise, ha ekwuokwa ka e wetakwuoro ha. Otu nwaanyị na-arụ ebe ahụ sịrị: “Akwụkwọ a ga-enyere ụmụ nwaanyị nọ ebe a aka.” Ọ sịkwara: “Akwụkwọ a dị anyị mkpa.” Mgbe ọzọ ha gara ebe ahụ, ndị bi ebe ahụ zukọtara ka ha hụ otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl, mmadụ abụọ n’ime ha ekwuo na ha ga-abịa ọmụmụ ihe ná ngwụcha izu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Nwanna Nwaanyị Stacy sịrị: “Ọ tụrụ anyị n’anya ịhụ otú obi si dị ndị mmadụ ụtọ mgbe ha nwetara akwụkwọ a. Ọ bụrụ na mmadụ ebipụta akwụkwọ a, pịajie ya, ọ bụ otu ụzọ mara mma anyị ga-esi ezi ụmụ nwaanyị ndị a na-emegbu emegbu ozi ọma Alaeze Chineke. Mgbe anyị hụrụ otú ndị mmadụ si nabata akwụkwọ a, o mere anyị obi ụtọ. Anyị na-atụkwa anya ịhụ otú Jehova ga-esi na-enyere anyị aka ka anyị na-ezikwu ụmụ nwaanyị ndị a ozi ọma.”