Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị bụ “nzube” Jehova ọ ga-eme ka ọ dịrị n’obi ndị ọchịchị n’oge na-adịghị anya?
Mkpughe 17:16, 17 kwuru gbasara mmalite oké mkpagbu. Ọ sịrị: “Mpi iri ahụ na anụ ọhịa ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ asị, nara ya ihe niile o nwere ma gbaa ya ọtọ. Ha ga-erikwa anụ ya ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam. N’ihi na Chineke mere ka imezu nzube ya dịrị ha n’obi, ya bụ, ka ha jiri otu obi nye anụ ọhịa ahụ alaeze ha.” N’oge gara aga, akwụkwọ anyị kwuru na “nzube” ahụ Jehova ga-eme ka ọ dịrị n’obi ndị ọchịchị bụ ibibi okpukpe ụgha.
Ma anyị kwesịrị ịgbanwe ihe a. “Nzube” ahụ Jehova ga-eme ka ọ dịrị n’obi ndị ọchịchị bụ ka ha “nye anụ ọhịa ahụ alaeze ha.” Ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị a iji ghọta otú amụma a ga-esi emezu.
Olee ndị e kwuru gbasara ha n’amụma ahụ? “Nwaanyị akwụna ahụ,” nke a na-akpọkwa “Babịlọn Ukwu,” nọchiri anya okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. ‘Anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie’ nọchiri anya Òtù Mba Ụwa. E hiwere ya na nke mbụ ya n’afọ 1919 ka ha mee ka udo na-adị n’ụwa. Ihe a na-akpọbu ya bụ Njikọ Mba Niile. (Mkpu. 17:3-5) “Mpi iri” ahụ nọchiri anya ọchịchị niile na-akwado anụ ọhịa ahụ.
Gịnị jikọrọ nwaanyị akwụna ahụ na anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie? Nwaanyị akwụna ahụ “nọ ọdụ n’elu” anụ ọhịa ahụ. Ihe ọ pụtara bụ na ọ na-akwado ya ma na-atụrụ ya ụka.
Gịnị ga-eme nwaanyị akwụna ahụ? Anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ na-akwado ya “ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ asị” nke na ha ga-anapụ ya ihe niile o nwere, gosikwa onye ọ bụla otú ọ dịruru ná njọ. Ha ga-ebibikwa ya kpamkpam otú Jehova kwuru. (Mkpu. 17:1; 18:8) Ọ bụ otú a ka a ga-esi bibie okpukpe ụgha niile. Ma, tupu ya emee, Jehova ga-eme ka ndị ọchịchị mee ihe a na-emetụbeghị.
Gịnị ka Jehova ga-eme ka ndị ọchịchị mee? Ọ ga-eme ka imezu “nzube ya” dịrị n’obi ha, ya bụ, ka ha “nye anụ ọhịa ahụ [na-acha uhie uhie] ike na ikike ha,” ya bụ, Òtù Mba Ụwa. (Mkpu. 17:13) Chegodị ihe nke ahụ pụtara. Ndị ọchịchị hà ga-ekpebi n’onwe ha inyefe anụ ọhịa ahụ ike na ikike ha? Mba. Amụma ahụ gosiri na ọ bụ Chineke ga-eme ka ha mee ya. (Ilu 21:1; i nwere ike ịtụle Aịzaya 44:28.) Ihe a ọ̀ ga-eji nwayọọ nwayọọ mee? Mba. Ọ ga-eme na mberede. Anụ ọhịa ahụ e nyere ikike ga-emezuzi ihe Jehova kwuru gbasara okpukpe ụgha niile, ya bụ, ibibi ha kpamkpam.
Gịnịzi ka anyị ga-atụ anya ya? Anyị ekwesịghị ịtụ anya na anyị ga na-anụ n’akụkọ ụwa na ndị ọchịchị ejirila nwayọọ nwayọọ na-akwadokwu Òtù Mba Ụwa. Ihe anyị kwesịrị ịtụ anya ya bụ na na mberede, Jehova ga-eme ka ndị ọchịchị niile nye Òtù Mba Ụwa ikike ha. Ihe a mee, anyị ga-amata na oké mkpagbu achọwala ibido. Ma, “ka anyị mụrụ anya ma na-eche echiche nke ọma” n’ihi na ihe ga-agbanwe na mberede n’oge na-adịghị anya.—1 Tesa. 5:6.