Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb26 Mach p. 6-7
  • Mach 23-29

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mach 23-29
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2026
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2026
mwb26 Mach p. 6-7

MACH 23-29

AỊZAYA 48-49

Abụ nke 89 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Na-ege Jehova Ntị Ka I Rite Uru”

(Nkeji 10)

Jehova na-akụziri ndị ohu ya ihe (Aịza. 48:17; it “Onye Na-akụzi Ihe, Ịkụzi Ihe” ¶2)

Anyị kwesịrị ịhọrọ ịna-ege Jehova ntị ma na-eme ihe ọ na-akụziri anyị (Aịza. 48:18a; ijwbq isiokwu nke 44 ¶2-3)

Anyị mee otú ahụ, udo anyị na-enwe ga-aha “ka osimiri,” anyị agaghịkwa akwụsị ime ezi omume “otú ahụ ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị n’oké osimiri” (Aịza. 48:18b; lv 199 ¶8)

Ebe nwanna nwaanyị na-aga n’akụkụ oké osimiri n’uhuruchi.

NKỌWA: Okwu Hibru a sụgharịrị “udo” nwere ike ịpụta ahụ́ isi mmadụ ike, obi iru ya ala, mmadụ ịnọ n’ebe ọ na-enweghị ihe ga-eme ya, ihe ịdịrị mmadụ ná mma, na mmadụ na ibe ya ịbụ enyi.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 49:8​—Gịnị ka amụma a na-ekwu gbasara ya? (it “Oge A Na-emere Ndị Mmadụ Amara” ¶1-3)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Aịza. 48:9-20 (th ihe ọmụmụ nke 11)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kpọọ onye ikwu gị kwụsịrịla ịbịa ọmụmụ ihe ka ọ bịa gere okwu ihu ọha pụrụ iche, bịakwa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 5 nọmba nke 3)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kọwaara onye na-eche echiche ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ihe ndị ọ ga-ahụ ma ọ bịa. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 5) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Mgbe e mechara Ncheta Ọnwụ Jizọs, zaa onye nwere mmasị bịaranụ ajụjụ ndị o nwere. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 107

7. Ihe Ị Ga-eme Ka Ụbọchị Kacha Mkpa n’Afọ Baara Gị Uru

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Afọ ọ bụla anyị gara Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị na-egosi na anyị na-erube isi n’iwu Jizọs nyere anyị, na-egosikwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta Jehova nyere anyị. (Luk 22:19) Ihe a bụkwa oge anyị ji echebara otú Jehova na Ọkpara ya hụruru anyị n’anya echiche. (Gal. 2:20; 1 Jọn 4:9, 10) Gịnị ka anyị ga-eme iji kwadebe obi anyị maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa iji gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ? Olee otú anyị ga-esi enyere ndị nwere mmasị aka imekwa otú ahụ?

  • N’ụbọchị ọ bụla, gụọ ebe ndị e dere ka a gụọ na Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, chebakwara ihe ị gụrụ echiche

  • Chebara ihe mgbapụta ahụ echiche nakwa otú i kwesịrị isi na-ebi ndụ iji gosi na obi dị gị ụtọ maka onyinye a Jehova na Jizọs nyere anyị

  • Gbasie mbọ ike n’ịkpọ ndị mmadụ, ma ndị ị ma, ma ndị ikwu gị, ma ndị bi n’ókèala unu, ka ha bịa gere okwu ihu ọha pụrụ iche ma soro anyị mee Ncheta Ọnwụ Jizọs

  • Jiri ihu ọchị nabata ndị ọbịa bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma si n’ala ala obi gị kelee ha. Ọ bụ eziokwu na ị ga-agbalị ka i nyere ndị i ji aka gị kpọọ ezigbo aka, echefukwala ndị nke bịara n’onwe ha maka na ha natara akwụkwọ ịkpọ òkù. Kpọọ ha ka gị na ha nọrọ

  • Dị njikere ịza ajụjụ ndị bịaranụ jụrụ

  • Anya kwesịrị iru gị ala ka ị nabata ndị kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe. Anya kwesịrị ịkacha eru ndị okenye ala ka ha nwee ike ịnabata ndị e kewapụrụ n’ọgbakọ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs

Foto si na vidio bụ́: “Jizọs ‘Bịara Ịchọ na Ịzọpụta Ihe Furu Efu.’ ” Ebe ụmụnna nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mgbede a na-aga inwe Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha ji obi ụtọ na-akparịta ụka.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Jizọs “Bịara Ịchọ na Ịzọpụta Ihe Furu Efu.” Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị ka ị mụtara gbasara otú ọ dịruru ná mkpa ka anyị jiri obi ụtọ na-anabata ndị kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe ma ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

    Foto si na vidio bụ́: “Jizọs ‘Bịara Ịchọ na Ịzọpụta Ihe Furu Efu.’ ” Ebe nwanna nwaanyị kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs, nwanna nwaanyị ọzọ amakụọ ya ma nabata ya nke ọma.

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 72-73

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 134 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya