MACH 16-22
AỊZAYA 45-47
Abụ nke 2 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. “Abụ M Chineke. E Nweghịkwa Onye Dị Ka M”
(Nkeji 10)
E nweghị onye dị ka Jehova (Aịza. 46:9; w20.06 5 ¶14)
E nweghị ihe ga-egbochili Jehova imezu uche ya (Aịza. 46:10, 11; cl 42 ¶14; it “Ndị Izrel A Dọọrọ n’Agha Si Babịlọn Lọta” ¶1)
Ndị tụkwasịrị arụsị obi agaghị enwe obi ụtọ (Aịza. 46:6, 7; w99 5/15 14 ¶18-19)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Aịza. 46:10—Jehova ọ̀ ma na Adam na Iv ga-emehie “tupu” ha emehie? (w11 1/1 14 ¶2-3)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 45:1-11 (th ihe ọmụmụ nke 5)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Kọwaara onye na-abụghị onye chọọchị ihe bụ́ Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 5 nọmba nke 3)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa onye nataburu gị akwụkwọ i ji kpọọ ya ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 9 nọmba nke 5)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
Abụ nke 38
7. Naanị Jehova Na-enyere Anyị Aka Mgbe Niile
(Nkeji 7) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Nsogbu bịara anyị, naanị Onye anyị ga-atụkwasịli obi anyị niile na ọ ga-enyere anyị aka bụ Chineke anyị, bụ́ Jehova.—Hib. 13:5, 6.
Gụọ Abụ Ọma 55:22. Gị na ụmụnna kwurịtazie ihe ndị a.
Na nke ọ bụla n’ime ha, dee otu ụzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi nakwa otu ụzọ o si enyere anyị aka.
Anyị enweghịzi ọrụ ma ọ bụ na ọ na-esiri anyị ike ịkpata ego anyị ga-eji na-egboro ndị ezinụlọ anyị mkpa ha
Ndị ọchịchị nyere iwu ka anyị ghara ịna-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma
Ọrịa ji anyị aka ọjọọ
Ọdachi dakwasịrị anyị, dị ka ọdachi na-emere onwe ya ma ọ bụ na mmadụ nwụnahụrụ anyị
8. Akụkọ Si n’Aka Ndị Na-ahụ Maka Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Afọ 2026
(Nkeji 8) Okwu.
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 70-71