FEBỤWARỊ 16-22
AỊZAYA 36-37
Abụ nke 150 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. “Atụla Egwu Maka Nkwulu A Ị Nụrụ”
(Nkeji 10)
Rabshake gara Jeruselem ka o menye ndị Jehova ụjọ (Aịza. 36:1, 2; it “Hezekaya” Nke 1 ¶14)
Ọ nwara ime ka ike gwụ ndị Jehova nakwa ka ọ dị ha ka ha enweghịzi olileanya (Aịza. 36:8; ip-1 387 ¶10)
Ọ kwara ha emo maka na ha tụkwasịrị Jehova na ndị isi ha obi (Aịza. 36:7, 18-20; ip-1 388 ¶13-14)
Ndị Jehova ekwesịghị ịtụ ndị na-eyi ha egwu ụjọ.—Aịza. 37:6, 7
IHE UNU NWERE IKE IJI EME OFUFE EZINỤLỌ: Leenụ VIDIO Bụ́ “Jehova, . . . Ọ Bụ Gị Ka M Tụkwasịrị Obi.” Unu lechaa ya, unu ekwurịtazie ihe ndị unu mụtara na ya.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Aịza. 37:29—Olee otú o si bụrụ na Jehova kere Eze Senakerib eriri e ji edu ịnyịnya n’agbata egbugbere ọnụ ya abụọ? (it “Eriri E Ji Edu Ịnyịnya” ¶4)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 37:14-23 (th ihe ọmụmụ nke 2)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 1 nọmba nke 4)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)
6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 5) Ihe Ngosi. ijwbq isiokwu nke 110 ¶1-4—Isiokwu: Gịnị Bụ Baptizim? (th ihe ọmụmụ nke 17)
Abụ nke 118
7. “Gịnị Kara Gị Obi?”
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
È nwetụla mgbe mmadụ kwara gị emo maka na i kweere na Chineke, maka na i kweere ihe Baịbụl kwuru, ma ọ bụ maka na i kpebiri ịbụ Onyeàmà Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ na ị maghị ihe ị ga-ekwu ekwu ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ụjọ bịara gị. Ihe ndị ọzọ na-ekwu nwedịrị ike ime ka ihe i kweere mewe gị obi abụọ. Olee ihe ị ga-eme ka ọ ghara ime gị otú ahụ?
Gụọ Aịzaya 36:4. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị mere obi ji kwesị ịka anyị na ihe ndị anyị kweere bụ eziokwu?
Kpọnye VIDIO Bụ́ Ihe Mere Mgbe M Na-eto Eto—Ànyị Kwesịrị Ikwere na Chineke Dị? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Elibaldo na Crystal mere iji mee ka obi kakwuo ha na ihe ndị ha kweere bụ eziokwu?
Gịnị mere obi ji sie gị ike na Chineke dị adị?
Olee amaokwu Baịbụl ndị mere ka obi kaa gị na . . .
Jehova hụrụ gị n’anya?
Jehova ga-enyere gị aka?
ị chọtala ndị bụ́ ndị Chineke?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 62-63