Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb26 Jenụwarị p. 14-16
  • Febụwarị 23–Mach 1

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Febụwarị 23–Mach 1
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2026
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2026
mwb26 Jenụwarị p. 14-16

FEBỤWARỊ 23–MACH 1

AỊZAYA 38-40

Abụ nke 4 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ebe onye ọzụzụ atụrụ ku nwa atụrụ n’ahụ́.

Ebe onye ọzụzụ atụrụ n’Izrel oge ochie ku nwa atụrụ n’ahụ́

1. “Ọ Ga-azụ Ìgwè Atụrụ Ya Otú Onye Na-azụ Atụrụ Si Azụ Atụrụ”

(Nkeji 10)

Jehova nyere anyị Okwu ya, bụ́ Baịbụl, ma chekwaa ya ka o jiri ya dọta anyị ka anyị na ya dịrị ná mma (Aịza. 40:8; w23.02 2-3 ¶3-4)

Ọ na-eji obiọma elekọta anyị (Aịza. 40:11; cl 68 ¶7)

Ọ ma anyị otu otu, ọ na-enyekwara anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị (Aịza. 40:26-29; w18.01 8 ¶4-6)

Ebe ndị okenye abụọ gara ileta otu nwanna nwaanyị na ụmụ ya abụọ n’ụlọ ha.

AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú obi dị gị gbasara Jehova n’ihi otú a e si kọwaa onye ọzụzụ atụrụ n’Aịzaya 40:11?

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 40:3​—Olee otú ihe e kwuru n’amaokwu a si mezuo n’oge Jizọs nọ n’ụwa? (ip-1 400 ¶7)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Aịza. 40:21-31 (th ihe ọmụmụ nke 11)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ka gị na mmadụ na-ekwurịta okwu, chọta otú ị ga-esi kọọrọ ya ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe n’oge na-adịbeghị anya. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ka gị na mmadụ na-ekwurịta okwu, chọta otú ị ga-esi kọọrọ ya banyere ọrụ ịkụzi Baịbụl ị na-arụ. (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 7 nọmba nke 5)

7. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) lff nchịkọta isi nke 18, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee. Jiri otu n’ime isiokwu ndị gbara ‘n’Ihe Ị Ga-elebakwu Anya’ nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka ọ ghọtakwuo otú Ndịàmà Jehova si hụ ibe ha n’anya. (lmd isi nke 11 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 160

8. Akụkọ Ozi Afọ Ije Ozi Gara Aga

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ị gụchaa akwụkwọ ozi si n’aka alaka ụlọ ọrụ banyere akụkọ ozi afọ ije ozi gara aga, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ndị ọzọ na-agba ume e kwuru n’Akụkọ Ozi Ndịàmà Jehova n’Ụwa Niile n’Afọ Ije Ozi 2025. Gbaa ndị nkwusa ụfọdụ i bu ụzọ gwa ajụjụ ọnụ. Ha ga-akọ ihe ndị na-agba ume mere n’ozi ọma ha gara n’afọ gara aga.

Foto ndị na-egosi: Ebe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-ekwusa ozi ọma n’ebe niile n’ụwa. 1. Otu nwanna nwaanyị ji akwụkwọ bụ́ “Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi” na-eduziri otu nwaanyị Baịbụl. 2. Otu di na nwunye na-agụrụ otu nwoke Baịbụl n’oge ha na-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ. 3. Nwanna nwaanyị na-ezi otu nwaanyị ozi ọma. 4. Otu di na nwunye na-agụrụ otu nwaanyị Baịbụl n’oge ha na-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ. 5. Otu di na nwunye ji broshọ bụ́ “Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi” na-eduziri otu nwoke Baịbụl. 6. Otu nwanna nwaanyị na-egosi otu nwaanyị vidio. 7. Otu di na nwunye ji asụsụ ndị ogbi na vidio na-ezi otu nwaanyị ozi ọma.

O si n’aka NASA/Visible Earth imagery

N’afọ 2025, ndị Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, mụọkwara ndị mmadụ Baịbụl

  • Olee ihe ndị na-agba ume ị hụrụ n’Akụkọ Ozi Afọ Ije Ozi 2025 ị ga-achọ ịkọ?

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 64-65

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 161 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya