Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 26
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 26
Abụ nke 63 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 13 ¶14-19 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Rom 13-16 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: “Na-amalitere Ndị Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa.” Okwu. I meechaa, mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Septemba. Gbaa mmadụ niile ume ka ha malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa.
Nkeji 10: Ụzọ Ndị E Si Ekwusa Ozi Ọma Ahụ—Ókèala Ọgbakọ na nke E Kenyere Gị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji 102, paragraf nke 3, ruo na peeji 104, paragraf nke 1. Gbaa ohu na-eje ozi nke na-ahụ maka ókèala ajụjụ ọnụ. Ọ ga-ekwu otú onye nkwusa ọ bụla nwere ike isi nweta ókèala nke ya nakwa otú onye nwetara ya ga-esi na-arụ ya.
Nkeji 10: Olee Ụdị Ndị Anyị Bụ? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’isiokwu nke mbụ n’akwụkwọ bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? Mee ihe ngosi ebe onye nkwusa na-akọwara onye ọ na-amụrụ Baịbụl ụdị ndị Ndịàmà Jehova bụ.
Abụ nke 116 na Ekpere