Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọgọst 26, 2013. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Olee ihe anyị mụtara n’otú ahụ Eze Herọd si nara otuto e kwesịrị inye naanị Chineke? (Ọrụ 12:21-23) [Julaị 1, w08 5/15 p. 32 para. 7]
2. Olee uru ọ ga-abara Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eto eto ma ha chebara otú Timoti si jee ozi echiche ma gbalịa na-eme ka ya? (Ọrụ 16:1, 2) [Julaị 8, w08 5/15 p. 32 para. 10]
3. Mgbe Prisila na Akwịla nụrụ otú Apọlọs si ‘na-ekwu okwu n’atụghị egwu’ n’ụlọ nzukọ dị n’Efesọs, olee otú ha si nyere ya aka? (Ọrụ 18:24-26) [Julaị 15, w10 6/15 p. 11 para. 4]
4. Olee ihe gosiri na Ndịàmà Jehova nwere ike ịgba ndị na-akpagbu ha akwụkwọ ka ha nwee ike inwere onwe ha na-ekwusa ozi ọma? (Ọrụ 25:10-12) [Julaị 22, bt p. 198 para. 6]
5. Olee otú Pọl onyeozi si nọgide na-ekwusa ozi ọma oge a tụrụ ya mkpọrọ na Rom? Oleekwa otú Ndịàmà Jehova taa si na-eme ka ya? (Ọrụ 28:17, 23, 30, 31) [Julaị 29, bt p. 215-217 para. 19-23]
6. Olee ihe mere Baịbụl ji sị na nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ bụ ihe rụrụ arụ? (Rom 1:26, 27) [Ọgọ. 5, g 4/12 p. 30 para. 7]
7. Olee otú ‘ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ’ n’afọ 33 O.A. ga-esi kpuchie “mmehie ndị e mere n’oge gara aga” tupu a kwụọ ya? (Rom 3:24, 25) [Ọgọ. 5, w08 6/15 p. 29 para. 6]
8. Olee ndokwa Jehova mere ma anyị nwee nsogbu ndị riri anyị ọnụ nke na anyị amaghịzi ihe anyị ga-ekpe n’ekpere? (Rom 8:26, 27) [Ọgọ. 12, w08 6/15 p. 30 para. 10]
9. Ná Ndị Rom 12:13 Pọl gwara anyị ka anyị ‘na-ele ọbịa,’ gịnị ka ihe ahụ o kwuru pụtara? [Ọgọ. 19, w09 10/15 p. 5-6 para. 12-13]
10. Ná Ndị Rom 13:14 Pọl gwara anyị ka anyị ‘yiri Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị ka uwe,’ olee otú anyị ga-esi eme ihe a o kwuru? [Ọgọ. 26, w05 1/1 p. 11-12 para. 20-22]