Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 13
IZU NA-AMALITE NA MEE 13
Abụ nke 4 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 9 ¶8-13 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọn 5-7 (Nkeji 10)
Nke 1: Jọn 6:22-40 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ọ Bụghị Chineke Kpatara Nsogbu Dị n’Ụwa—td 1A (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mee Ihe E Kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 15:37-40? (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Akwụkwọ A Ga-enye Ndị Mmadụ n’Ọnwa Mee na Jun. Okwu. Jiri nkeji ole na ole kwuo ihe mere traktị ndị a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Mee na Jun ga-eji amasị ndị bi n’ókèala unu. Meekwa ihe ngosi otú anyị nwere ike isi nye mmadụ otu n’ime traktị ndị ahụ mgbe anyị nọ n’ozi ọma ụlọ n’ụlọ. I nwekwara ike ime ihe ngosi abụọ.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Matiu 5:11, 12 na Matiu 11:16-19. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 10: “Gịnị Mere Anyị Ji Ekwusa Ozi Ọma?” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 91 na Ekpere