Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Eprel: Ụlọ Nche na Teta! Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Mee na Jun: Jiri traktị ọ bụla unu nwere gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ achọọ ka a mụwara ya Baịbụl, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi gosi ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị ejiri broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Julaị: Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?, Gee Chineke Ntị, na Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Ị gaa izi ndị Alakụba ozi ọma, nye ha broshọ bụ́ Real Faith—Your Key to a Happy Life ma ọ bụ The Guidance of God—Our Way to Paradise.
◼ Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga mba ọzọ ma buru n’obi iso ndị ebe ahụ gaa mgbakọ distrikti, i nwere ike gaa na www.jw.org mata ihe ụfọdụ dị gị mkpa gbasara mgbakọ ndị a ga-enwe ná mba ahụ. Ebe ị ga-aga na jw.org bụ ebe ahụ e dere “Lookup.” Ị pịa ya, ị ga-ahụ ebe e dere “Conventions.”
◼ Na Fraịdee, Mee 24, 2013, a ga-emechi Betel emechi. N’ihi ya, biko, unu abịala ka a kpọgharịa unu ma ọ bụ iburu akwụkwọ.