Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 29
IZU NA-AMALITE N’EPREL 29
Abụ nke 50 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 8 ¶14-20 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Luk 22-24 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa. Jiri ihe dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Mee. Gbaa mmadụ niile ume ka ha bịa ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Nkeji 10: Ozi Ọma nke A nke Alaeze. Okwu a ga-eji ịnụ ọkụ n’obi kwuo. O si n’akwụkwọ Rite Uru, peeji nke 279 ruo peeji nke 281.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Matiu 16:21-23 na Luk 9:22-26. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Abụ nke 117 na Ekpere