Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 22
IZU NA-AMALITE N’EPREL 22
Abụ nke 85 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 8 ¶8-13 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Luk 18-21 (Nkeji 10)
Nke 1: Luk 18:18-34 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Otú Chineke na Kraịst Si Bụrụ Otu—td 5CH (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Bụ Ịdị Umeala n’Obi? Olee Otú Anyị Si Achọ Ya? Gịnị Mere Ịdị Umeala n’Obi Ji Dị Mkpa?—Zef. 2:2, 3 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ọ Bụrụ na Mmadụ Asị, ‘Buru Ụzọ Kpeere M Ekpere Tupu Gị Eziwe M Ozi Ọma.’ Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: (1) Olee ihe Jizọs kwuru gbasara mmadụ ikpe ekpere n’ihu ọha iji mee ka ndị ọzọ mara na ya na-ekpe ekpere? (Mat. 6:5) (2) Olee otú Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha si na-ezi ozi ọma? (Mat. 10:12, 13) (3) Olee ihe Jizọs gwara anyị ka anyị mee ma anyị ruo n’ụlọ ndị mmadụ? (Mat. 10:7) (4) Mgbe ị gwachara onye nwe ụlọ ihe ndị a, olee otú ị ga-esi malite izi ya ozi ọma gbasara Alaeze Chineke? (Mat. 6:9, 10; Mkpu. 21:4) Gwa onye nkwusa ka o jiri nkeji ole na ole gosi otú e nwere ike isi zaa onye jụrụ anyị, sị, ‘Gịnị mere na unu anaghị ekpe ekpere?’
Nkeji 20: Ihe Mmadụ Kwesịrị Ime Ka A Ghara Ịtọrọ Ya. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’akwụkwọ ozi Ọktoba 28, 2010, nke e degaara ọgbakọ niile. Gụọnụ amaokwu Baịbụl ụfọdụ e dere n’akwụkwọ ozi ahụ. Jụọkwa ndị na-ege ntị ihe ha ghọtara na nke ọ bụla n’ime ha.
Abụ nke 70 na Ekpere