Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka Afọ 2009
Ntụziaka
Otú a ka a ga-esi eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’afọ 2009.
EBE IHE OMUME SI: Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ [bi12-IB], Ụlọ Nche [w-IB], Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ [lr-IB], na Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu (Nke dị na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ).
Ụlọ akwụkwọ ahụ kwesịrị ịmalite N’OGE, e kwesịkwara ịnabata ndị bịaranụ ma gbasozie ihe ndị a e depụtara n’okpuru ebe a. E mechaa ihe omume nke ọ bụla, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-akpọpụta onye ga-eme ihe omume nke na-eso ya.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BAỊBỤL: Nkeji 10. Okenye ruru eru ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru kwesịrị iji nkeji anọ mbụ tụlee ihe mmụta ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị dị n’ebe e kenyere ọgbakọ ịgụ na Baịbụl n’izu ahụ. Naanị mgbe a na-agaghị eme ya otú a bụ n’izu ọgụgụ Baịbụl si n’isiakwụkwọ ndị mbụ nke akwụkwọ Baịbụl. Mgbe ọ dị otú ahụ, ebe a ga-esi nweta ihe a ga-ekwu ná nkeji anọ mbụ ahụ bụ n’isiokwu bụ́ “Okwu Jehova Dị Ndụ” nke a malitere ibipụta n’Ụlọ Nche nke January 1, 2004. Dị ka ihe atụ, n’izu nke January 5, a ga-atụle isiakwụkwọ ise ndị mbụ nke Jenesis, n’ihi ya, onye ga-eme ya kwesịrị isi n’Ụlọ Nche nke January 1, 2004 na January 15, 2004 họrọ isi ihe ole na ole dị na Jenesis ọ ga-ekwu. O kwesịrị ikwu okwu ahụ otú ọ ga-abara ọgbakọ uru. Ma è si n’ọgụgụ Baịbụl dịịrị izu mee ihe omume a ma ọ bụ n’Ụlọ Nche, ebumnobi bụ́ isi e ji eme ya bụ iji nyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere ihe a na-atụle ji baa uru na otú o si baa uru. Onye na-eme ihe omume a kwesịrị ilezi anya ịhụ na ọ gafeghị nkeji anọ e nyere ya iji mee akụkụ mbụ nke ihe omume a. O kwesịrị ịhụ na ọ hapụụrụ ndị na-ege ntị nkeji isii ha ga-eji kwuo ná mkpirikpi na tịnkọm tịnkọm 30 ma ọ bụ ihe na-erughị ya, ihe masịrị ha n’ọgụgụ Baịbụl nke izu ahụ. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwazi ụmụ akwụkwọ e kenyere na klas ndị ọzọ ka ha gawa na klas ha.
IHE OMUME NKE 1: Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya. Nke a bụ ihe ọgụgụ nwanna nwoke ga-agụ. Nwa akwụkwọ ahụ kwesịrị ịgụ ebe e kenyere ya n’ekwughị okwu mmeghe ma ọ bụ nke mmechi. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-elekwasị anya karịsịa n’inyere ụmụ akwụkwọ aka ịgụ ihe otú a ga-aghọta ya, ịgụ ihe werewere, imesi okwu ike, ịgbanwe ụda olu, ịkwụsịtụ n’ebe ndị ọ dị mkpa, na ịgụ ihe otú ha si ekwu okwu.
IHE OMUME NKE 2: Nkeji 5. Ọ bụ nwanna nwaanyị ka a ga-ekenye ya. A ga-ekenye nwa akwụkwọ ahụ ọnọdụ okwu, ma ọ bụkwanụ ya ejiri aka ya họrọ otu site ná ndị ahụ dị na peeji nke 82 nke akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. E kwesịrị iji isiokwu e kenyere mee ihe omume a, meekwa ka isiokwu ahụ daba n’otu n’ime ọnọdụ ndị a na-ahụ n’ozi ubi n’ókèala ahụ. Mgbe a na-edeghị ebe ihe omume si, nwa akwụkwọ ga-eji aka ya chọta ihe ọ ga-eji kwuo okwu ya n’akwụkwọ anyị. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-elekwasị anya karịsịa n’otú nwa akwụkwọ ahụ si kọwaa isiokwu ahụ na otú o si nyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ na ịghọta isi ihe ndị dị n’okwu ya. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye nwa akwụkwọ ahụ otu onye inyeaka.
IHE OMUME NKE 3: Nkeji 5. E nwere ike ikenye nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị ihe omume a. Nwa akwụkwọ ahụ kwesịrị iji isiokwu e kenyere ya mee ihe omume ya. Mgbe a na-ekwughị ebe ihe omume a si, nwa akwụkwọ ga-eji aka ya chọta ihe ọ ga-eji kwuo okwu a n’akwụkwọ anyị. Mgbe e kenyere nwanna nwoke ihe omume a, o kwesịrị ikwu ya otú e si ekwu okwu ihu ọha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe ọ bụla e kenyere nwanna nwaanyị ihe omume a, e kwesịrị ime ya otú e kwuru ka e si na-eme Ihe Omume nke 2. Biko mara na ọ bụ naanị nwanna nwoke ka e kwesịrị ikenye isiokwu ọ bụla nwere akara kpakpando n’akụkụ ya, mgbe ọ bụla ọ dịkwa mkpa, e kwesịrị ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
NDỤMỌDỤ: Ihe na-agafeghị nkeji 2. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ agaghị ebu ụzọ kwuo nkà okwu nwa akwụkwọ na-arụ ọrụ na ya. E mechaa Ihe Omume nke 1, nke 2, na nke 3, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-aja nwa akwụkwọ ahụ mma n’ebe o mere nke ọma, ọ ga-ekwu kpọmkwem ihe ndị mere ka okwu ahụ baara ndị na-ege ntị uru, ọ ga na-ekwukarịkwa ihe akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi kwuru. Dabere ná mkpa nke nwa akwụkwọ nke ọ bụla, e nwere ike ịgakwuru ya n’azụ ma nyekwuo ya ndụmọdụ na-ewuli elu ma a gbasaa ọmụmụ ihe ma ọ bụ n’oge ọzọ.
OGE: Ọ dịghị ihe omume kwesịrị ịgafe oge e nyere maka ya, okwu onye ndụmọdụ ekwesịghịkwa ịgafe oge e nyere maka ya. E kwesịrị iji akọ kwụsị Ihe Omume nke 1, nke 2, na nke 3 mgbe oge ha zuru. Ọ bụrụ na ụmụnna na-achịkọta isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl erie oge, e kwesịrị inye ha ndụmọdụ n’azụ. Onye ọ bụla kwesịrị ilezi anya iji hụ na o righị oge. Ihe omume niile ga-ewe nkeji 30.
FỌM NDỤMỌDỤ: Ọ dị n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi.
ONYE NDỤMỌDỤ INYEAKA: Òtù ndị okenye nwere ike ịhọpụta onye okenye ruru eru, ma ọ bụrụ na e nwere, tụkwasị n’onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ka ọ bụrụ onye ndụmọdụ inyeaka. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị okenye n’ọgbakọ, e nwere ike ịdị na-ekenye okenye dị iche ruru eru ọrụ a n’afọ. Ọrụ onye ndụmọdụ inyeaka ga-abụ ịdị na-enye ụmụnna chịkọtara isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl ndụmọdụ n’azụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Ọ dịghị mkpa ka ọ na-enye ndụmọdụ mgbe ọ bụla ndị okenye ibe ya ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi mechara ihe omume.
NTỤLEGHACHI NKE IHE OMUME ỤLỌ AKWỤKWỌ IJE OZI ỌCHỊCHỊ CHINEKE: Nkeji 20. Kwa ọnwa abụọ, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a. Tupu ya eduziwe ya, a ga-ebu ụzọ tụlee isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl otú ahụ e si kọwaa ya n’elu. Ntụleghachi ahụ ga-adabere n’ihe a tụlere n’ọnwa abụọ bu ya ụzọ, gụnyere izu ahụ a na-atụle ya. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-aga mgbakọ sekit ma ọ bụ nwee onye nlekọta sekit n’izu a ga-eme Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, e kwesịziri ibufe ya n’izu na-esonụ, mezie Ihe Omume nke 1, nke 2, na nke 3 nke izu na-esonụ n’izu ahụ. E kwesịghị ịgbanwe ọgụgụ Baịbụl dịịrị izu ma ọ bụ ebe isi ihe sitere n’ọgụgụ Baịbụl izu sitere.
Usoro Ihe Omume
Jan. 5 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 1-5
Nke 1: Jenesis 3:1-15
Nke 2: Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu (lr-IB isi 1)
Nke 3: Olee Ihe Na-abụghị Ihe Efu? (1 Kọr. 15:58)
Jan. 12 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 6-10
Nke 1: Jenesis 9:1-17
Nke 2: Gịnị Bụ Mmehie Megide Mmụọ Nsọ? (td-IB 26D)
Nke 3: Akwụkwọ Ozi nke Si n’Aka Chineke Na-ahụ n’Anya (lr-IB isi nke 2)
Jan. 19 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 11-16
Nke 1: Jenesis 14:1-16
Nke 2: Onye Kere Ihe Niile (lr-IB isi nke 3)
Nke 3: Olee Otú Jehova Si Akpụ Anyị? (Aịza. 64:8)
Jan. 26 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 17-20
Nke 1: Jenesis 17:1-17
Nke 2: Gịnị Bụ Mkpụrụ Obi? (td-IB 24A)
Nke 3: Chineke Nwere Aha (lr-IB isi nke 4)
Feb. 2 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 21-24
Nke 1: Jenesis 22:1-18
Nke 2: “Onye A Bụ Ọkpara M” (lr-IB isi nke 5)
Nke 3: a Ụzọ Ndị Anyị Nwere Ike Isi Meghee Obi Anyị n’Otú Anyị Si Ahụ Ndị Ọzọ n’Anya (2 Kọr. 6:11-13)
Feb. 9 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 25-28
Nke 1: Jenesis 25:1-18
Nke 2: Onye Ozizi Ukwu ahụ Jeere Ndị Ọzọ Ozi (lr-IB isi nke 6)
Nke 3: Olee Ihe Dị Iche n’Etiti Mkpụrụ Obi na Mmụọ? (td-IB 24B)
Feb. 16 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 29-31
Nke 1: Jenesis 29:1-20
Nke 2: Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji ‘Kwụsị Ichegbu Onwe Anyị’ (Mat. 6:25)
Nke 3: Nrubeisi Na-echebe Gị (lr-IB isi nke 7)
Feb. 23 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 32-35
Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Mar. 2 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 36-39
Nke 1: Jenesis 39:1-16
Nke 2: Ndị Ọzọ Dị Elu Karịa Anyị (lr-IB isi nke 8)
Nke 3: Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ? (td-IB 27A)
Mar. 9 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 40-42
Nke 1: Jenesis 40:1-15
Nke 2: Ọ Dị Anyị Mkpa Iguzogide Ọnwụnwa (lr-IB isi nke 9)
Nke 3: b Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ịbụ Onye Na-eme Ihe Otú Masịrị Ya!
Mar. 16 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 43-46
Nke 1: Jenesis 44:1-17
Nke 2: Ike Jizọs Nwere n’Ebe Ndị Mmụọ Ọjọọ Nọ (lr-IB isi nke 10)
Nke 3: A Na-akpọ Ike Ndụ nke Mmadụ na nke Anụmanụ Mmụọ (td-IB 27B)
Mar. 23 Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 47-50
Nke 1: Jenesis 48:1-16
Nke 2: Ànyị Kwesịrị Ịtụ Ekwensu Egwu?
Nke 3: Enyemaka Site n’Aka Ndị Mmụọ Ozi Chineke (lr-IB isi nke 11)
Mar. 30 Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 1-6
Nke 1: Ọpụpụ 1:1-19
Nke 2: Jizọs Akụziere Anyị Ụzọ Isi Kpee Ekpere (lr-IB isi nke 12)
Nke 3: Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Jụ Ụdị Mgbaasị Niile? (td-IB 27CH)
Apr. 6 Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 7-10
Nke 1: Ọpụpụ 9:1-19
Nke 2: Ndị Ghọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs (lr-IB isi nke 13)
Nke 3: c Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Gosi na Ndị Galeshia 6:2 Emegideghị Ndị Galeshia 6:5?
Apr. 13 Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 11-14
Nke 1: Ọpụpụ 12:21-36
Nke 2: Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-agbaghara (lr-IB isi nke 14)
Nke 3: Ihe Mere Jehova Na-enweghị Ike Iji Soro n’Atọ n’Ime Otu (td-IB 5A)
Apr. 20 Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 15-18
Nke 1: Ọpụpụ 15:1-19
Nke 2: Gịnị Ka Izere Ofufe Ụgha Gụnyere?
Nke 3: Ihe Mmụta Banyere Inwe Obiọma (lr-IB isi nke 15)
Apr. 27 Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 19-22
Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
May 4 Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 23-26
Nke 1: Ọpụpụ 24:1-18
Nke 2: Olee Ihe Dị Mkpa n’Ezie? (lr-IB isi nke 16)
Nke 3: Ọkpara ahụ na Nna Ya Ahaghị (td-IB 5B)
May 11 Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 27-29
Nke 1: Ọpụpụ 29:1-18
Nke 2: Ụzọ Isi Nwee Obi Ụtọ (lr-IB isi nke 17)
Nke 3: d Iguzosi Ike n’Ihe nke Hiere Ụzọ na Ihe Ize Ndụ Dị na Ya
May 18 Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 30-33
Nke 1: Ọpụpụ 31:1-18
Nke 2: Otú Chineke na Kraịst si Bụrụ Otu (td-IB 5CH)
Nke 3: Ị̀ Na-echeta Ịsị I Meela? (lr-IB isi nke 18)
May 25 Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 34-37
Nke 1: Ọpụpụ 37:1-24
Nke 2: Ịlụ Ọgụ Ọ̀ Dị Mma? (lr-IB isi nke 19)
Nke 3: e Gịnị Bụ Ịnakwere Ihe Ọ Bụla, Oleekwa Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Zere Ya?
June 1 Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 38-40
Nke 1: Ọpụpụ 40:1-19
Nke 2: Ị̀ Na-achọ Ịbụ Onye Mbụ Mgbe Nile? (lr-IB isi nke 20)
Nke 3: Mmụọ Nsọ Abụghị Onye (td-IB 5D)
June 8 Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 1-5
Nke 1: Levitikọs 4:1-15
Nke 2: Ọ̀ Dị Ihe Ọ Bụla Anyị Kwesịrị Iji Tuo Ọnụ? (lr-IB isi nke 21)
Nke 3: f Olee Otú Ndị Kraịst Kwesịrị Isi Jiri Ike Na-eme Ihe?
June 15 Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 6-9
Nke 1: Levitikọs 8:1-17
Nke 2: Ọ Bụghị Chineke Kpatara Nsogbu Ụwa (td-IB 1A)
Nke 3: Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Na-agha Ụgha (lr-IB isi nke 22)
June 22 Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 10-13
Nke 1: Levitikọs 11:29-45
Nke 2: Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Arịa Ọrịa (lr-IB isi nke 23)
Nke 3: Ngọzi Ndị Na-eso Ụzọ E Mere Baptizim Na-enweta
June 29 Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 14-16
Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
July 6 Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 17-20
Nke 1: Levitikọs 19:1-18
Nke 2: Ihe Mere Chineke Ji Kwe Ka Ajọ Omume Dịrị (td-IB 1B)
Nke 3: Ya Adịla Mgbe Ị Ga-aghọ Onye Ohi! (lr-IB isi nke 24)
July 13 Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 21-24
Nke 1: Levitikọs 22:17-33
Nke 2: Ndị Na-eme Ihe Ọjọọ Hà Nwere Ike Ịgbanwe? (lr-IB isi nke 25)
Nke 3: Otú Ezi Ndị Kraịst Si Egosi na Ihe Banyere Ndị Ogbenye Na-emetụ Ha n’Obi
July 20 Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 25-27
Nke 1: Levitikọs 25:39-54
Nke 2: Ihe Mere O Ji Esi Ike Ime Ihe Ọma (lr-IB isi nke 26)
Nke 3: Chineke Na-egosi na O Nwere Obi Ebere Dị Ukwuu (td-IB 1CH)
July 27 Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 1-3
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 3:1-20
Nke 2: Ihe Mere Njide Onwe Onye Ji Dị Mkpa Iji Bụrụ Onye Dị Nwayọọ
Nke 3: Ònye Bụ Chi Gị? (lr-IB isi nke 27)
Aug. 3 Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 4-6
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 4:1-16
Nke 2: Ụzọ Isi Mata Onye A Ga-erubere Isi (lr-IB isi nke 28)
Nke 3: Alaeze Chineke Agwụla Ihe Ga-agwọta Nsogbu Ụwa (td-IB 1D)
Aug. 10 Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 7-9
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 9:1-14
Nke 2: Ọ̀ Bụ Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ Nile Na-amasị Chineke? (lr-IB isi nke 29)
Nke 3: Ụzọ Ndị Anyị Si Egosi na Anyị Na-eguzosi Ike n’Ihe Nye Jehova
Aug. 17 Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 10-13
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 13:17-33
Nke 2: Enyemaka Iji Merie Egwu Na-atụ Anyị (lr-IB isi nke 30)
Nke 3: Ezi Ndị Kraịst Niile Aghaghị Ịgbara Eziokwu Àmà (td-IB 18A)
Aug. 24 Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 14-16
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 14:26-43
Nke 2: Olee Ihe Ịhụ Iwu Chineke n’Anya Pụtara? (Ọma 119:97)
Nke 3: Ebe A Ga-enweta Nkasi Obi (lr-IB isi nke 31)
Aug. 31 Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 17-21
Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Sept. 7 Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 22-25
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 22:20-35
Nke 2: Otú E Si Chebe Jizọs (lr-IB isi nke 32)
Nke 3: Ihe Mere Anyị Ji Anọgide Na-aga na nke Ndị Mmadụ (td-IB 18B)
Sept. 14 Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 26-29
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 27:1-14
Nke 2: Gịnị Bụ Nduzi Echiche, Oleekwa Ihe Mere O Ji Dị Mkpa? (Efe. 6:4)
Nke 3: Jizọs Pụrụ Ichebe Anyị (lr-IB isi nke 33)
Sept. 21 Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 30-32
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 32:1-15
Nke 2: Gịnị Ga-eme Anyị Ma Anyị Nwụọ? (lr-IB isi nke 34)
Nke 3: Ịgba Àmà Na-eme Ka Ikpe Ọbara Ghara Ịma Anyị (td-IB 18CH)
Sept. 28 Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 33-36
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 33:1-23
Nke 2: Anyị Pụrụ Isi n’Ọnwụ Bilie! (lr-IB isi nke 35)
Nke 3: Ụzọ Ndị Alaeze Chineke Ji Karịa Ọchịchị Niile nke Ụmụ Mmadụ
Oct. 5 Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 1-3
Nke 1: Diuterọnọmi 2:1-15
Nke 2: Ihe Mere Chineke Akwadoghị Ife Ndị Nna Ochie Ofufe (td-IB 15A)
Nke 3: Olee Ndị A Ga-akpọlite n’Ọnwụ? Ebee Ka Ha Ga-ebi? (lr-IB isi nke 36)
Oct. 12 Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 4-6
Nke 1: Diuterọnọmi 4:15-28
Nke 2: Icheta Jehova na Ọkpara Ya (lr-IB isi nke 37)
Nke 3: Olee Mgbe E Nwere Ike Ikwu na Inwe Ntakịrị Ihe Ka Mma? (Ilu 15:16)
Oct. 19 Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 7-10
Nke 1: Diuterọnọmi 9:1-14
Nke 2: Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Hụ Jizọs n’Anya (lr-IB isi nke 38)
Nke 3: E Nwere Ike Ịsọpụrụ Mmadụ, Ma Naanị Chineke Ka A Ga-efe Ofufe (td-IB 15B)
Oct. 26 Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 11-13
Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Nov. 2 Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 14-18
Nke 1: Diuterọnọmi 15:1-15
Nke 2: Gịnị Ka Ịtụ Chineke Egwu Gụnyere?
Nke 3: Chineke Echeta Ọkpara Ya (lr-IB isi nke 39)
Nov. 9 Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 19-22
Nke 1: Diuterọnọmi 22:1-19
Nke 2: Ụzọ Isi Mee Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ (lr isi nke 40)
Nke 3: Amagedọn—Agha A Ga-Eji Kwụsị Ajọ Omume (td-IB 4A)
Nov. 16 Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 23-27
Nke 1: Diuterọnọmi 25:1-16
Nke 2: Ụmụaka Ndị Na-eme Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ (lr-IB isi nke 41)
Nke 3: g Olee Ihe Ndị Anyị Kwesịrị Iwere Dị Ka Ihe Ndị Dị Nsọ?
Nov. 23 Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 28-31
Nke 1: Diuterọnọmi 30:1-14
Nke 2: Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-arụ Ọrụ (lr-IB isi nke 42)
Nke 3: Ihe Mere Amagedọn Ga-eji Gosi Ịhụnanya Chineke (td-IB 4B)
Nov. 30 Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 32-34
Nke 1: Diuterọnọmi 32:1-21
Nke 2: Gịnị Bụ “Oké Ụbọchị Jehova”? (Zef. 1:14)
Nke 3: Olee Ndị Bụ Ụmụnne Anyị? (lr-IB isi nke 43)
Dec. 7 Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 1-5
Nke 1: Jọshụa 5:1-15
Nke 2: Ndị Enyi Anyị Kwesịrị Ịhụ Chineke n’Anya (lr-IB isi nke 44)
Nke 3: Gịnị Bụ Alaeze Chineke? Ụzọ Isi Gosi na Anyị Chọrọ Ya (lr-IB isi nke 45)
Dec. 14 Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 6-8
Nke 1: Jọshụa 8:1-17
Nke 2: Mmiri Ebibie Otu Ụwa—Ọ̀ Ga-eme Ọzọ? (lr-IB isi nke 46)
Nke 3: Gịnị Mere Ihe E Dere n’Ekliziastis 7:21, 22 Ji Bụrụ Ndụmọdụ Bara Uru?
Dec. 21 Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 9-11
Nke 1: Jọshụa 9:1-15
Nke 2: Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Mata na Amagedọn Dị Nso (lr-IB isi nke 47)
Nke 3: Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Udo Ga-adị na Ya—Ị Pụrụ Ibi na Ya (lr-IB isi nke 48)
Dec. 28 Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 12-15
Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
[Ihe odide ala ala peeji]
a Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya, ọ kachakwa mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
b Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya, ọ kachakwa mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
c Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya, ọ kachakwa mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
d Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya, ọ kachakwa mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
e Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya, ọ kachakwa mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
f Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya, ọ kachakwa mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
g Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya, ọ kachakwa mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.