Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe ndị mmadụ gosiri mmasị, nye ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? ma kọwaara ha ihe dị na ya iji mara ma ị̀ ga-amalite iduziri ha ọmụmụ Baịbụl. November: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekwuo na ha nwere ụmụaka, nye ha akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. January: E nwere ike inyefe akwụkwọ ọ bụla metụrụla ochie nke ka fọrọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ọ dịghị nke e nwere, nyefee akwụkwọ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe.
◼ Ihe ndị isi oche ndị nlekọta na ndị nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-eburu n’uche: Nhazi ọhụrụ ahụ e mere maka otú a ga-esizi na-enwe ọmụmụ ihe ọgbakọ ga-amalite n’izu nke December 29, 2008, a ga-egosikwa mgbanwe a n’Ozi Alaeze Anyị nke December 2008. Mgbe a na-eduzi Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ahụ, jidenụ n’aka na a gbasoro ntụziaka ndị dị n’okpuru Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bụ́ nke dị n’Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka Afọ 2009. A gaghị atụle nkà okwu ná mgbede ahụ.
◼ A ga-atụle vidio bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa January. Ọ bụrụ na o nwere onye chọrọ ya, o kwesịrị isi n’aka ọgbakọ tụọ ọda ya ozugbo o kwere mee.
◼ Ebe ọ bụ na November nwere ngwụsị izu ise zuru ezu, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ Ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nke a bụ Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka Afọ 2009, e kwesịkwara idebe ya ma na-elere anya na ya n’afọ 2009 dum.