Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/06 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 10/06 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa October: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, biko webata broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche. November: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? ma ọ bụ traktị ọzọ dabara adaba. December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible na Ị pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1991. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche!

◼ Ebe ọ bụ na December nwere Saturday na Sunday ise, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.

◼ Ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa a bu “Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2007,” e kwesịkwara idebe ya maka izo aka na ya n’ime afọ 2007 dum.

◼ A ga-atụle vidio bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge n’otu n’ime Nzukọ Ije Ozi a ga-enwe na January. Onye ọ bụla chọrọ ya na DVD ma ọ bụ na vidio kwesịrị isi n’aka ọgbakọ tụọ ọda ya ngwa ngwa o kwere mee.

◼ A gbanweela ihe ụfọdụ na nọmba telefon ndị dị n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Igieduma nakwa n’ọfịs anyị dị na Lagos. Nọmba telefon ndị ọhụrụ anyị nwere ugbu a bụ: nke Igieduma, 052-202020, 052-202062 (FAX), nke ọfịs anyị dị na Lagos, 01-8990090, 01-8990091, 01-5820604 (VOICE NA FAX), 01-5820459 (VOICE NA FAX). A ga-enwe onye ga na-aza fon site na Monday ruo na Friday, malite mgbe o ji ọkara gafee elekere asaa nke ụtụtụ (7:30) ruo mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke ehihie (11:45), ọ ga-amalitekwa ọzọ n’elekere mbụ nke ehihie (1:00) ruo n’elekere ise nke mgbede (5:00), ọ ga-anọkwa ya na Saturday, malite mgbe o ji ọkara gafee elekere asaa nke ụtụtụ (7:30) ruo mgbe o ji ọkara gafee elekere iri n’otu nke ụtụtụ (11:30). N’oge ndị ọzọ, ígwè telefon anyị ga-agwa ndị kpọrọnụ ka ha pịa nọmba ndị ha ga-eji enweta onye ha chọrọ ịkpọ ma ọ bụkwanụ ha apịa 0 ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka onye na-azara anyị fon nyere ha aka. Anyị ji ohere a echetara unu na ọ bụ n’aka òtù ndị okenye ọgbakọ ka e kwesịrị isi na-edeta akwụkwọ ozi ọ bụla a chọrọ idetara alaka ụlọ ọrụ banyere ihe ndị metụtara ọgbakọ.

◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs nke afọ 2007 na Sunday, April 15, 2007. A ga-ama ọkwa isiokwu nke okwu ihu ọha ahụ ka oge na-aga. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbakọ ná ngwụsị izu ahụ ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu ya tupu April 15.

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:

Watch Tower Publications Index—2004—Bekee

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?—Ná Mkpụrụ Akwụkwọ Okpotokpo—Bekee

◼ Kaseti Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? (kaseti ise dị n’otu ọ́bọ́)—Bekee

◼ DVD Ọhụrụ Ndị E Nwere:

Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ọ dị na DVD—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America

Chụsoo Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ—Ọ dị na DVD —Ụdị Asụsụ Ogbi nke America

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?—Ọ dị na DVD—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America

Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ—Ọ dị na DVD—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America

Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe—Ọ dị na DVD —Ụdị Asụsụ Ogbi nke America

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya