Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa October: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, biko webata broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche. November: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? ma ọ bụ traktị ọzọ dabara adaba. December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible na Ị pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1991. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche!
◼ Ebe ọ bụ na December nwere Saturday na Sunday ise, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ Ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa a bu “Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2007,” e kwesịkwara idebe ya maka izo aka na ya n’ime afọ 2007 dum.
◼ A ga-atụle vidio bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge n’otu n’ime Nzukọ Ije Ozi a ga-enwe na January. Onye ọ bụla chọrọ ya na DVD ma ọ bụ na vidio kwesịrị isi n’aka ọgbakọ tụọ ọda ya ngwa ngwa o kwere mee.
◼ A gbanweela ihe ụfọdụ na nọmba telefon ndị dị n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Igieduma nakwa n’ọfịs anyị dị na Lagos. Nọmba telefon ndị ọhụrụ anyị nwere ugbu a bụ: nke Igieduma, 052-202020, 052-202062 (FAX), nke ọfịs anyị dị na Lagos, 01-8990090, 01-8990091, 01-5820604 (VOICE NA FAX), 01-5820459 (VOICE NA FAX). A ga-enwe onye ga na-aza fon site na Monday ruo na Friday, malite mgbe o ji ọkara gafee elekere asaa nke ụtụtụ (7:30) ruo mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke ehihie (11:45), ọ ga-amalitekwa ọzọ n’elekere mbụ nke ehihie (1:00) ruo n’elekere ise nke mgbede (5:00), ọ ga-anọkwa ya na Saturday, malite mgbe o ji ọkara gafee elekere asaa nke ụtụtụ (7:30) ruo mgbe o ji ọkara gafee elekere iri n’otu nke ụtụtụ (11:30). N’oge ndị ọzọ, ígwè telefon anyị ga-agwa ndị kpọrọnụ ka ha pịa nọmba ndị ha ga-eji enweta onye ha chọrọ ịkpọ ma ọ bụkwanụ ha apịa 0 ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka onye na-azara anyị fon nyere ha aka. Anyị ji ohere a echetara unu na ọ bụ n’aka òtù ndị okenye ọgbakọ ka e kwesịrị isi na-edeta akwụkwọ ozi ọ bụla a chọrọ idetara alaka ụlọ ọrụ banyere ihe ndị metụtara ọgbakọ.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs nke afọ 2007 na Sunday, April 15, 2007. A ga-ama ọkwa isiokwu nke okwu ihu ọha ahụ ka oge na-aga. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbakọ ná ngwụsị izu ahụ ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu ya tupu April 15.
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:
Watch Tower Publications Index—2004—Bekee
Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?—Ná Mkpụrụ Akwụkwọ Okpotokpo—Bekee
◼ Kaseti Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:
Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? (kaseti ise dị n’otu ọ́bọ́)—Bekee
◼ DVD Ọhụrụ Ndị E Nwere:
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ọ dị na DVD—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America
Chụsoo Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ—Ọ dị na DVD —Ụdị Asụsụ Ogbi nke America
Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?—Ọ dị na DVD—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America
Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ—Ọ dị na DVD—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe—Ọ dị na DVD —Ụdị Asụsụ Ogbi nke America