Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2007
NTỤZIAKA
N’afọ 2007, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
EBE IHE OMUME SI: Bible Nsọ nke Union Version, Ụlọ Nche [w-IB], Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke [be-IB], na Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu (nke 1998) [td-IB].
E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata malite ụlọ akwụkwọ ahụ N’OGE, ma gaa n’ihu dị ka e depụtara n’okpuru. Mgbe e mesịrị ihe omume nke ọ bụla, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-akpọpụta onye ga-eme ihe omume nke na-esonụ.
NKÀ OKWU: Minit 5. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ, onye ndụmọdụ na-enyere ya aka, ma ọ bụ okenye ọzọ ruru eru ga-atụle otu nkà okwu nke ga-adabere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. (N’ọgbakọ ndị e nwere ndị okenye ole na ole, a pụrụ iji ndị ohu na-eje ozi ruru eru mee ihe.)
IHE OMUME NKE 1: Minit 10. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru kwesịrị ime nke a, ọ ga-adabere n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. A ga-ekwu ya dị ka okwu izi ihe nke ga-ewe minit iri. Nzube ya ekwesịghị ịbụ nanị ikwuzu ihe dị n’akwụkwọ ahụ, kama o kwesịrị ịbụ ilekwasị anya n’uru ihe ahụ a na-atụle bara, na-eme ka ihe ga-akasị baara ọgbakọ uru pụta ìhè. E kwesịrị iji isiokwu e nyere mee ihe. A na-atụ anya na ụmụnna e kenyere ihe omume a ga-elezi anya ka ha ghara ịgafe oge e nyere. A pụrụ inye ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha dị ka o si dị mkpa.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BIBLE: Minit 10. N’ime minit ise mbụ, okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru kwesịrị igosi otú akụkụ Bible ahụ si metụta mkpa e nwere n’ọgbakọ. Ọ pụrụ ikwu okwu n’akụkụ ọ bụla sitere n’ebe e kenyere maka ọgụgụ Bible n’izu ahụ. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị nchịkọta nke ihe ndị dị n’ebe e kenyere ka a gụọ. Nzube bụ́ isi e ji atụle ya bụ iji nyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere akụkụ Bible ahụ ji baa uru na otú o si baa uru. Ọkà okwu ahụ kwesịrị ilezi anya ka ọ ghara ịgafe minit ise e nyere maka akụkụ mbụ nke ihe omume ahụ. O kwesịrị ịhụ na o nyere ndị na-ege ntị minit ise ha ga-eji tinye ọnụ. E kwesịrị ịgwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu dị mkpirikpi (sekọnd 30 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) banyere ihe masịrị ha n’ọgụgụ Bible ahụ na uru ọ baara ha. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwazi ndị mmụta e kenyere na klas ndị ọzọ ka ha gawa n’ebe ndị ahụ.
IHE OMUME NKE 2: Minit 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya. Nke a bụ ihe ọgụgụ nwanna nwoke ga-agụ. Onye mmụta ahụ kwesịrị ịgụ ebe e kenyere ya n’ekwughị okwu mmeghe ma ọ bụ nke mmechi. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’inyere ndị mmụta aka iji nghọta, mmesi okwu ike kwesịrị ekwesị, mgbanwe ụda olu, na nkwụsịtụ kwesịrị ekwesị na-agụ ihe n’ụzọ na-aga were were, nakwa dị ka ha si ekwu okwu.
IHE OMUME NKE 3: Minit 5. Ọ bụ nwanna nwanyị ka a ga-ekenye ya. Ndị mmụta e nyere ihe omume a ga-eji aka ha họrọ ọnọdụ okwu ma ọ bụkwanụ e kenye ha otu site ná ndị ahụ e depụtara na peeji nke 82 n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. Onye mmụta ahụ kwesịrị iji isiokwu e kenyere ya mee ihe ma mee ka o kwekọọ n’otu n’ime ọnọdụ ndị a na-ahụ n’ozi ubi n’ókèala unu. Mgbe a na-ekwughị ebe ihe omume sitere, ọ ga-adị mkpa ka onye mmụta nweta ihe ọ ga-ekwu site n’ime nnyocha n’akwụkwọ anyị. E kwesịrị ikenye ndị mmụta ọhụrụ ihe omume ndị e gosiri ebe ha sitere. Ebe onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-elekwasị anya karịsịa bụ n’ụzọ onye mmụta ahụ si akọwapụta isiokwu ahụ na ụzọ o si na-enyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ na ịghọta isi ihe ndị dị n’okwu ya. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye onye mmụta otu onye inyeaka.
IHE OMUME NKE 4: Minit 5. Onye mmụta kwesịrị ịkọwapụta isiokwu e kenyere ya. Mgbe a na-ekwughị ebe ihe omume sitere, ọ ga-adị mma ka onye mmụta nweta ihe ọ ga-ekwu site n’ime nnyocha n’akwụkwọ anyị. Mgbe ọ bụ nwanna nwoke ka e kenyere ya, o kwesịrị iguzo n’ihu tebụl ikpo okwu mee ya. Ndị ọ ga na-agwa okwu bụ ndị na-ege ntị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe e kenyere nwanna nwanyị ihe omume a, e kwesịrị ime ya mgbe nile dị ka e kwuru ka e siri na-eme Ihe Omume nke 3. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ pụrụ ikenye nwanna nwoke Ihe Omume nke 4 mgbe ọ bụla ọ hụrụ na ọ dị mkpa ime otú ahụ. Biko rịba ama na ọ bụ nanị nwanna nwoke ka e kwesịrị ikenye isiokwu ọ bụla nwere akara kpakpando (*) n’akụkụ ya. Ọ ga-eguzo n’ihu tebụl ikpo okwu kwuo ya.
NDỤMỌDỤ: 1 minit. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ agaghị ekwu nkà okwu a chọrọ ka onye mmụta rụọ ọrụ na ya tupu onye mmụta ahụ emewe ihe omume ya. Mgbe e mesịrị ihe omume nke 2, nke 3, na nke 4, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu okwu na-ewuli elu banyere ihe ndị kwesịrị ịja mma n’ihe omume ahụ. Ebumnobi ya agaghị abụ nanị ịsị ya “i meela,” kama ọ ga-ekwukwa kpọmkwem ihe ndị mere ka ihe omume ya dị mma. Dị ka mkpa onye mmụta ọ bụla si dị, a pụrụ inyekwu ya ndụmọdụ na-ewuli elu nke na-agaghị abụ n’ihu ọha mgbe a gbasasịrị nzukọ ma ọ bụ n’oge ọzọ.
IDEBE OGE: Ọ dịghị okwu kwesịrị ịgafe oge e nyere maka ya, okwu onye ndụmọdụ ekwesịghịkwa ịgafe oge. E kwesịrị iji akọ kwụsị Ihe Omume nke 2 ruo nke 4 mgbe oge ha zuru. Ọ bụrụ na ụmụnna na-ekwu okwu mmeghe ndị dị ka nkà okwu, Ihe Omume nke 1, ma ọ bụ nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible erie oge, e kwesịrị inye ha ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha. Onye ọ bụla kwesịrị ilezi anya iji hụ na o righị oge. Ihe omume ahụ nile ga-ewe minit 45, n’agụnyeghị abụ na ekpere.
FỌM NDỤMỌDỤ OKWU: Ọ dị n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi.
ONYE NDỤMỌDỤ INYEAKA: Òtù ndị okenye nwere ike ịhọrọ onye okenye ruru eru, ma ọ bụrụ na e nwere, tụkwasị n’onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ka ọ na-arụ ọrụ dị ka onye ndụmọdụ inyeaka. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị okenye n’ọgbakọ, a pụrụ ikenye ndị okenye dịgasị iche iche, bụ́ ndị ruru eru, ọrụ a n’afọ nke ọ bụla. Ọrụ onye ndụmọdụ inyeaka ga-abụ inye ụmụnna mere Ihe Omume nke 1 na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha, ma ọ́ dị mkpa. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-enye ndụmọdụ mgbe ọ bụla ndị okenye ibe ya ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi mesịrị nke ọ bụla n’ime ihe omume ndị ahụ.
NTỤLEGHACHI: Minit 30. N’ọnwa abụọ ọ bụla, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi. Tupu e mewe ya, a ga-ebu ụzọ tụlee otu nkà okwu na isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible dị ka a kọwapụtara n’elu. Ntụleghachi ahụ ga-adabere n’ihe a tụlere n’ụlọ akwụkwọ n’ime ọnwa abụọ bu ya ụzọ, gụnyere izu ahụ a nọ na ya. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-aga mgbakọ sekit n’izu a ga-eme ntụleghachi, e kwesịrị iburu ntụleghachi ahụ (na ihe ndị ọzọ e mere ndokwa ime n’izu ahụ) bufee n’izu na-esote ya ma buru ihe omume nke izu na-esote ya budata n’izu ahụ. Ọ bụrụ na onye nlekọta sekit na-aga ileta ọgbakọ unu n’izu a ga-eme ntụleghachi, e kwesịrị iji abụ, nkà okwu, na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible nke izu ahụ mee ihe. Ihe Omume nke 1 (bụ́ nke a na-eme ma nkà okwu gasịa) kwesịrị isi n’usoro ihe omume nke izu na-eso ya. N’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke izu na-eso ya, a ga-eji nkà okwu na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible nke izu ahụ mee ihe, e mesịa ha, e mewezie ntụleghachi ahụ.
USORO IHE OMUME
Jan. 1 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 24-28 Abụ nke 33
Nkà Okwu: Ịkọwa Otú A Pụrụ Isi Jiri Ihe A Na-ekwu Mee Ihe (be-IB p. 158 para. 2-4)
No. 1: Ịkwadebe Okwu Onye Mmụta Maka Ụlọ Akwụkwọ (be-IB p. 43 para. 1–p. 44 para. 3)
No. 2: Aịsaịa 26:1-18
No. 3: td-IB 15A Ihe Mere na Chineke Adịghị Akwado Ife Ndị Nna Ochie Ofufe
No. 4: Olee Otú Anyị Pụrụ Isi ‘Yikwasị Onyenwe Anyị Jizọs Kraịst’? (Rom 13:14)
Jan. 8 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 29-33 Abụ nke 42
Nkà Okwu: Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịghọta Ihe A Na-ekwu (be-IB p. 159 para. 1-4)
No. 1: Iji Isiokwu na Ọnọdụ Okwu Na-eme Ihe (be-IB p. 44 para. 4–p. 46 para. 1)
No. 2: Aịsaịa 30:1-14
No. 3: td-IB 15B A Pụrụ Ịsọpụrụ Mmadụ, Ma Nanị Chineke Ka A Ga-efe
No. 4: Otú Anyị Si Mara na Jehova Chineke Hụrụ Ụmụaka n’Anya
Jan. 15 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 34-37 Abụ nke 222
Nkà Okwu: Okwu Ndị A Họọrọ Iji Mee Ihe (be-IB p. 160 para. 1-3)
No. 1: Na-ele Ihe Ziri Ezi na Ihe Ọjọọ Anya Dị Ka Jizọs Si Ele Ya (w05-IB 1/1 p. 9-10 para. 11-15)
No. 2: Aịsaịa 34:1-15
No. 3: Otú E Si Amụta Inwe Ezi Ịhụnanya
No. 4: td-IB 4A Amagedọn—Agha A Ga-eji Kwụsị Ajọ Omume
Jan. 22 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 38-42 Abụ nke 61
Nkà Okwu: Okwu A Na-aghọta Ngwa Ngwa (be-IB p. 161 para. 1-4)
No. 1: Ekwela Ka Mmegide Mee Ka Ị Daa (w05-IB 1/1 p. 15 para. 16-18)
No. 2: Aịsaịa 38:9-22
No. 3: td-IB 4B Ihe Mere Amagedọn Ji Bụrụ Ihe Na-egosi Ịhụnanya Chineke
No. 4: Ihe Mere Anyị Ga-eji Zere Ịdị Na-eche na Ndị Ọzọ Bu Ihe Ọjọọ n’Obi
Jan. 29 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 43-46 Abụ nke 113
Nkà Okwu: Ihe E Kwuru Inwetụ Ọdịiche na Ịbụ nke Ziri Ezi (be-IB p. 161 para. 5–p. 162 para. 4)
No. 1: Ihe Mere Anyị Ji Anakwere Ikpe Jehova (w05-IB 2/1 p. 23-24 para. 4-9)
No. 2: Aịsaịa 45:1-14
No. 3: td-IB 6A Baptizim—Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Kraịst
No. 4: a Ihe Mere Ndị Kraịst Ji Ezere Iji Onwe Ha Atụnyere Ndị Ọzọ
Feb. 5 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 47-51 Abụ nke 79
Nkà Okwu: Okwu Ndị Na-eme Ka Okwu Kpoo Ọkụ, Nwee Mmetụta, Ma Dị Ụtọ (be-IB p. 163 para. 1–p. 164 para. 2)
No. 1: Okwu Jehova Na-eme Ka Anyị Dị Ọcha Ma Na-enyere Anyị Aka Ikwesị Ntụkwasị Obi (w05-IB 4/15 p. 11-12 para. 5-11)
No. 2: Aịsaịa 50:1-11
No. 3: td-IB 6B Baptizim Adịghị Asachapụ Mmehie
No. 4: Bible Ò Kwuru Ka A Ghara Inye Onyinye?
Feb. 12 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 52-57 Abụ nke 139
Nkà Okwu: Okwu Ndị Kwekọrọ n’Ụkpụrụ Na-achị Ụtọ Asụsụ (be-IB p. 164 para. 3–p. 165 para. 1)
No. 1: Okwu Jehova Na-emesi Anyị Obi Ike (w05-IB 4/15 p. 13 para. 12-14)
No. 2: Aịsaịa 55:1-13
No. 3: Ibi Ndụ nke Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Bara Uru
No. 4: td-IB 7A Bible Bụ Okwu Chineke nke Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ
Feb. 19 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 58-62 Abụ nke 189
Nkà Okwu: Iji Ihe Ndepụta Eme Ihe (be-IB p. 166 para. 1–p. 167 para. 2)
No. 1: b Nzọpụta Nye Ndị Na-ahọrọ Ìhè Ahụ (w01-IB 3/1 p. 17-22)
No. 2: Aịsaịa 60:1-14
No. 3: Gịnị Mere Ịgbara Chineke Ohu Ji Bụrụ Ihe Kwesịrị Ekwesị?
No. 4: td-IB 7B Bible—Ihe Nduzi Bara Uru Maka Ụbọchị Anyị
Feb. 26 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 63-66 Abụ nke 141
Nkà Okwu: Ịhazi Echiche Dị n’Okwu Gị Ahazi (be-IB p. 167 para. 3–p. 168 para. 1)
Ntụleghachi
Mar. 5 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 1-4 Abụ nke 70
Nkà Okwu: Mee Ka Ihe Ndepụta Gị Dị Mfe (be-IB p. 168 para. 2–p. 169 para. 6)
No. 1: Okwu Chineke Wusiri Jeremaịa Ike (w04-IB 5/1 p. 8-9 para. 5-7)
No. 2: Jeremaịa 3:1-13
No. 3: Olee Ihe Na-eme Ka Mmadụ Nweta Ezi Obi Ụtọ?
No. 4: td-IB 7C Bible—Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
Mar. 12 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 5-7 Abụ nke 159
Nkà Okwu: Ịkọwapụta Okwu n’Ụzọ Ezi Uche Dị na Ya (be-IB p. 170 para. 1–p. 171 para. 2)
No. 1: Ịkwadebe Okwu A Ga-agwa Ọgbakọ (be-IB p. 47 para. 1–p. 49 para. 1)
No. 2: Jeremaịa 5:1-14
No. 3: td-IB 38A Mmịnye Ọbara Na-emebi Ịdị Nsọ nke Ọbara
No. 4: Itinye Ihe Mmụta Dị n’Ọpụpụ 14:11 n’Ọrụ n’Oge Anyị A
Mar. 19 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 8-11 Abụ nke 182
Nkà Okwu: Ikwu Okwu n’Ụzọ Ezi Uche Dị na Ya (be-IB p. 171 para. 3–p. 172 para. 5)
No. 1: Ịkwadebe Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi na Ihe Omume Ndị Ọzọ (be-IB p. 49 para. 2–p. 51 para. 1)
No. 2: Jeremaịa 10:1-16
No. 3: Olee Otú Anyị Si Mara na Ebreham, Job, na Daniel Nwere Okwukwe ná Mbilite n’Ọnwụ?
No. 4: td-IB 38B Mmadụ Ò Kwesịrị Ime Ihe Ọ Bụla A Sị Ya Mee Iji Zọpụta Ndụ Ya?
Mar. 26 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 12-16 Abụ nke 205
Nkà Okwu: Iji Nanị Ihe Ndị Dabara Adaba Eme Ihe (be-IB p. 173 para. 1-4)
No. 1: Ihe Mgbapụta ahụ Na-eme Ka Ezi Omume Chineke Pụta Ìhè (w05-IB 11/1 p. 13-14)
No. 2: Jeremaịa 12:1-13
No. 3: td-IB 40A Olee Mgbe Oge Ndị Jentaịl Gwụrụ?
No. 4: N’ụzọ Dị Anya Ka Onye Kraịst Kwesịrị Ịnya Isi?
Apr. 2 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 17-21 Abụ nke 30
Nkà Okwu: Ikwu Okwu n’Agụghị Ya Agụ (be-IB p. 174 para. 1–p. 175 para. 4)
No. 1: Ịkwadebe Okwu A Ga-ekwu n’Ihu Ọha (be-IB p. 52 para. 1–p. 54 para. 1)
No. 2: Jeremaịa 20:1-13
No. 3: td-IB 8A Gịnị Bụ Chọọchị Ndị Kraịst?
No. 4: c Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Ndụmọdụ Anya?
Apr. 9 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 22-24 Abụ nke 184
Nkà Okwu: Izere Nsogbu Ndị Dị n’Ikwu Okwu n’Agụghị Ya Agụ (be-IB p. 175 para. 5–p. 177 para. 2)
No. 1: Mkpebi Dị Iche Iche Ọkà Okwu Ga-eme (be-IB p. 54 para. 2-4; p. 55, igbe)
No. 2: Jeremaịa 23:1-14
No. 3: Ihe Mere Ịga Ozi Ọma Ji Enye Anyị Ọṅụ
No. 4: td-IB 8B Ọ̀ Bụ Pita Bụ “Nkume” Ahụ?
Apr. 16 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 25-28 Abụ nke 27
Nkà Okwu: Mgbe Ndị Ọzọ Chọrọ Ka A Kọwaara Ha Ihe (be-IB p. 177 para. 2–p. 178 para. 3)
No. 1: Zụlite Ikike Gị Dị Ka Onye Ozizi (be-IB p. 56 para. 1–p. 57 para. 2)
No. 2: Jeremaịa 26:1-15
No. 3: td-IB 35A Sayensị A Nwapụtara Na-akwado Ihe Bible Kọrọ Banyere Okike
No. 4: Olee Otú O Si Bụrụ na A Bụrụ Ala Ọnụ? (Jen. 3:17)
Apr. 23 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 29-31 Abụ nke 148
Nkà Okwu: N’ụzọ Mkparịta Ụka (be-IB p. 179-180)
No. 1: ‘Kpaa Ókè’ (be-IB p. 57 para. 3–p. 58 para. 2)
No. 2: Jeremaịa 31:1-14
No. 3: Gịnị Mere Ịdị Ukwuu Jehova Na-ejighị Nwee Nsọtụ?
No. 4: td-IB 35B Nke Ọ Bụla n’Ime Ụbọchị Ndị ahụ E Kere Ihe Ọ̀ Dị Nanị Awa 24?
April 30 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 32-34 Abụ nke 100
Nkà Okwu: Ọdịdị Ụda Olu (be-IB p. 181 para. 1-4)
Ntụleghachi
May 7 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 35-38 Abụ nke 165
Nkà Okwu: Ịchịkwa Otú I Si Eku Ume n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị (be-IB p. 181 para. 5–p. 184 para. 1; p. 182, igbe)
No. 1: Gbaa Ndị Na-ege Ntị Ume Iche Echiche (be-IB p. 58 para. 3–p. 59 para. 3)
No. 2: Jeremaịa 36:1-13
No. 3: td-IB 34A Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Elu Obe?
No. 4: Olee Otú Ndị Kraịst Pụrụ Isi Nagide Ọnọdụ nke Amaghị Ihe Echi Ga-abụ?
May 14 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 39-43 Abụ nke 56
Nkà Okwu: Ime Ka Uru Ahụ́ Ndị Kwedoro Ekwedo Ghara Ikwedokwa Ekwedo (be-IB p. 184 para. 2–p. 185 para. 2; p. 184, igbe)
No. 1: Gosi Otú A Pụrụ Isi Jiri Ya Mee Ihe, Setịpụkwa Ezi Ihe Nlereanya (be-IB p. 60 para. 1–p. 61 para. 3)
No. 2: Jeremaịa 39:1-14
No. 3: td-IB 34B Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ife Obe Ofufe?
No. 4: d Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Ji Agbalịsi Ike Ịhụ na Ha Etinyeghị Aka n’Omume Rụrụ Arụ Mgbe Ha Na-ekwu Okwu Ọlụlụ
May 21 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 44-48 Abụ nke 122
Nkà Okwu: E Gosiri Mmasị n’Ebe Onye nke Ọzọ Nọ (be-IB p. 186 para. 1-4)
No. 1: Ụzọ Isi Mee Ka Nkà Inwe Mkparịta Ụka Ka Mma (be-IB p. 62 para. 1–p. 64 para. 1)
No. 2: Jeremaịa 46:1-17
No. 3: Olee Otú Mmadụ Si Aghọgbu Onwe Ya, Oleekwa Otú Anyị Pụrụ Isi Nọrọ na Nche Megide Omume Dị Otú A?
No. 4: td-IB 41A Gịnị Kpatara Ọnwụ?
May 28 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 49-50 Abụ nke 95
Nkà Okwu: Ịṅa Ntị nke Ọma (be-IB p. 187 para. 1-5)
No. 1: Ụzọ Isi Gaa n’Ihu ná Mkparịta Ụka (be-IB p. 64 para. 2–p. 65 para. 4)
No. 2: Jeremaịa 49:14-27
No. 3: td-IB 41B Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Pụrụ Imerụ Gị Ahụ́?
No. 4: Ihe Mere Ndị Nne na Nna Ji Kwesị Ịdị Na-agụrụ Ụmụ Ha Ihe
June 4 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 51-52 Abụ nke 166
Nkà Okwu: Inyere Ndị Ọzọ Aka Inwe Ọganihu (be-IB p. 187 para. 6–p. 188 para. 3)
No. 1: Tụlee Ihe Banyere Ndidi Jeremaịa (w06-IB 2/1 p. 20 para. 14-16)
No. 2: Jeremaịa 52:1-16
No. 3: Mmadụ Ịchọ Inwere Onwe Ya Pụọ n’Ebe Chineke Nọ Bụ Ihe Nzuzu
No. 4: td-IB 41C Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Iso Ndị Ikwu Ha Nwụrụ Anwụ Kwurịta Okwu?
June 11 Ọgụgụ Bible: Abụ Ákwá 1-2 Abụ nke 129
Nkà Okwu: Inye Aka n’Ụzọ Bara Uru (be-IB p. 188 para. 4–p. 189 para. 4)
No. 1: Jehova Na-enye Olileanya n’Oge Iru Újú—Akụkụ nke 1 (w88-IB 9/1 p. 26)
No. 2: Abụ Ákwá 2:1-10
No. 3: td-IB 10A Ekwensu Ọ̀ Bụ Onye Dị Adị n’Ezie?
No. 4: Ihe Mere Ezigbo Obiọma Na-ejighị Bụrụ Adịghị Ike
June 18 Ọgụgụ Bible: Abụ Ákwá 3-5 Abụ nke 140
Nkà Okwu: A Kwanyeere Ndị Ọzọ Ùgwù (be-IB p. 190 para. 1–p. 191 para. 1)
No. 1: Jehova Na-enye Olileanya n’Oge Iru Újú—Akụkụ nke 2 (w88-IB 9/1 p. 27)
No. 2: Abụ Ákwá 4:1-13
No. 3: td-IB 10B Ekwensu—Onye A Na-adịghị Ahụ Anya nke Na-achị Ụwa
No. 4: e Ihe Mere na Ezi Ndị Kraịst Adịghị Etinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị
June 25 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 1-5 Abụ nke 1
Nkà Okwu: Igosi n’Ụzọ Nkwanye Ùgwù na Ị Hụrụ Mmadụ (be-IB p. 191 para. 2–p. 192 para. 1)
Ntụleghachi
July 2 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 6-10 Abụ nke 26
Nkà Okwu: Ikwu Okwu n’Ụzọ Nkwanye Ùgwù (be-IB p. 192 para. 2–p. 193 para. 2)
No. 1: f ‘Tụkwasị Obi Gị’ n’Ụlọukwu Chineke! (w99-IB 3/1 p. 8-13)
No. 2: Ezikiel 7:1-13
No. 3: Ihe A Chọrọ Mmadụ n’Aka Iji Bịaruo Jehova Nso (Jems 4:8)
No. 4: td-IB 10C Ihe Bible Kwuru Banyere Ndị Mmụọ Ozi Nupụrụ Isi
July 9 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 11-14 Abụ nke 112
Nkà Okwu: E Ji Nkwenye Kwuo Ya (be-IB p. 194 para. 1–p. 195 para. 2)
No. 1: Adala Mbà n’Ime Ihe Dị Mma (w05-IB 6/1 p. 29-30)
No. 2: Ezikiel 11:1-13
No. 3: td-IB 44A Ụwa—E Kere Ya Ka Ọ Bụrụ Paradaịs
No. 4: Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Ghọta Mkpughe 17:9-11?
July 16 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 15-17 Abụ nke 29
Nkà Okwu: Otú E Si Egosipụta Nkwenye (be-IB p. 195 para. 3–p. 196 para. 4)
No. 1: Guzogide Echiche Na-ezighị Ezi! (w05-IB 9/15 p. 26-28)
No. 2: Ezikiel 16:1-13
No. 3: Ihe Inwe Ezi Uche Pụtara (Ilu 13:16)
No. 4: td-IB 44B Ọ Dịghị Mgbe A Ga-akwụsị Ibi Ndụ n’Ụwa
July 23 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 18-20 Abụ nke 193
Nkà Okwu: E Gosipụtara Akọ Ma Guzosie Ike (be-IB p. 197 para. 1-3)
No. 1: Ịchọpụta Ihe Bụ́ Echiche Onye ahụ Jụrụ Ajụjụ (be-IB p. 66 para. 1–p. 68 para. 1)
No. 2: Ezikiel 18:19-29
No. 3: td-IB 29A Ị̀ Pụrụ Ịmata Ndị Bụ́ Ndị Amụma Ụgha?
No. 4: Ihe Àmà nke Na-egosi na Alaeze Chineke Amalitela Ịchị
July 30 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 21-23 Abụ nke 35
Nkà Okwu: Ịdị Akọ Mgbe A Na-agba Àmà (be-IB p. 197 para. 4–p. 198 para. 5)
No. 1: Mara Otú I Kwesịrị Isi Zaghachi (be-IB p. 68 para. 2–p. 70 para. 3)
No. 2: Ezikiel 23:1-17
No. 3: td-IB 19A Olee Ókè Ọgwụgwọ Ime Mmụọ Baruru n’Uru?
No. 4: Olee Ụzọ Kwesịrị Ekwesị Isi Na-ele Ịdị Ukwuu Anya?
Aug. 6 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 24-27 Abụ nke 37
Nkà Okwu: Jiri Okwu Kwesịrị Ekwesị Na-eme Ihe n’Oge Kwesịrị Ekwesị (be-IB p. 199 para. 1-4)
No. 1: Iji Akwụkwọ Ozi Na-ezirịta Ozi (be-IB p. 71-73)
No. 2: Ezikiel 24:1-14
No. 3: Olee Ụzọ Mozis Si Setịpụrụ Ndị Kraịst Ihe Nlereanya Magburu Onwe Ya?
No. 4: td-IB 19B Alaeze Chineke—Ihe A Ga-eji Gwọchapụ Ọrịa Nkịtị n’Ụzọ Na-adịgide Adịgide
Aug. 13 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 28-31 Abụ nke 123
Nkà Okwu: Iji Akọ Na-eme Ihe Mgbe Anyị na Ndị Ezinụlọ Anyị na Ndị Ọzọ Nọ (be-IB p. 200 para. 1-4)
No. 1: Nọgide Na-enwe Ọganihu (be-IB p. 74 para. 1–p. 75 para. 3)
No. 2: Ezikiel 28:1-16
No. 3: td-IB 19C Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa n’Oge A Esiteghị n’Aka Chineke
No. 4: Gịnị Ka Okwu ahụ Bụ́ “Kpọọ Asị” Pụtara n’Akwụkwọ Nsọ?
Aug. 20 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 32-34 Abụ nke 215
Nkà Okwu: Ọ Na-ewuli Elu Ma Bụrụ nke A Pụrụ Iji Mee Ihe (be-IB p. 202 para. 1–p. 203 para. 1)
No. 1: Jiri Onyinye Ndị I Nwere Na-eme Ihe (be-IB p. 75 para. 4–p. 77 para. 2)
No. 2: Ezikiel 34:1-14
No. 3: Olee Otú Mmụọ Chineke Si Enyere Anyị Aka?
No. 4: td-IB 19D Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche Ọ̀ Bụ Ihe Àmà Na-egosi na Mmadụ Nwere Ihu Ọma Chineke?
Aug. 27 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 35-38 Abụ nke 94
Nkà Okwu: Ime Ka Okwu Gị Bụrụ nke A Pụrụ Iji Mee Ihe (be-IB p. 203 para. 2–p. 204 para. 1)
Ntụleghachi
Sept. 3 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 39-41 Abụ nke 194
Nkà Okwu: Mgbe Gị na Ndị Kwere Ekwe Ibe Gị Na-enwe Mkparịta Ụka (be-IB p. 204 para. 2–p. 205 para. 4)
No. 1: N’ihi Gịnị Ka Okwu Chineke Ga-eji Na-atọ Anyị Ụtọ? (w05-IB 4/15 p. 15-16 para. 3-6)
No. 2: Ezikiel 40:1-15
No. 3: Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Ime Ka Chineke Ṅụrịa Ọṅụ n’Ezie?
No. 4: td-IB 11A Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?
Sept. 10 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 42-45 Abụ nke 77
Nkà Okwu: Nkwughachi Iji Mesie Okwu Ike (be-IB p. 206 para. 1-4)
No. 1: Mgbe Nká Na-aghọ “Okpueze nke Mara Mma” (w05-IB 1/15 p. 8-9)
No. 2: Ezikiel 43:1-12
No. 3: td-IB 13A Hel Abụghị Ebe A Na-ata Ndị Mmadụ Ahụhụ
No. 4: g Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Mata “Olu Ndị Bịara Abịa”? (Jọn 10:5)
Sept. 17 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 46-48 Abụ nke 164
Nkà Okwu: Ikwughachi Okwu Mgbe A Nọ n’Ozi Ubi na Mgbe A Na-ekwu Okwu n’Elu Ikpo Okwu (be-IB p. 207 para. 1–p. 208 para. 3)
No. 1: h Ngọzi Jehova ‘n’Ala’ Anyị (w99-IB 3/1 p. 18-23)
No. 2: Ezikiel 47:1-14
No. 3: td-IB 13B Ọkụ Bụ Ihe Atụ nke Mbibi
No. 4: i Ihe Mere Ndị Mụrụ Ụmụ Ịkụziri Ụmụ Ha Ife Chineke Ji Bụrụ Onyinye Kasị Mma Ha Pụrụ Inye Ụmụ Ha
Sept. 24 Ọgụgụ Bible: Daniel 1-3 Abụ nke 179
Nkà Okwu: A Kọwapụtara Isiokwu (be-IB p. 209 para. 1-3)
No. 1: j Mgbe Jehova Ziri Ndị Eze Ihe (w88-IB 12/1 p. 11-14)
No. 2: Daniel 2:1-16
No. 3: Ihe Mere E Ji Were Ọnụ Ọgụgụ ahụ Bụ́ 144,000 n’Ụzọ Nkịtị (Mkpu. 7:4)
No. 4: td-IB 13C Akụkọ Banyere Ọgaranya na Lazarọs Abụghị Ihe Àmà Na-egosi Ịta Ahụhụ Ebighị Ebi
Oct. 1 Ọgụgụ Bible: Daniel 4-6 Abụ nke 14
Nkà Okwu: Iji Isiokwu Kwesịrị Ekwesị Eme Ihe (be-IB p. 210 para. 1–p. 211 para. 1; p. 211, igbe)
No. 1: Olee Mgbe E Nwere Ezi Ihe Mere A Ga-eji Wee Iwe? (w05-IB 8/1 p. 13-15)
No. 2: Daniel 4:1-17
No. 3: Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Ṅomie Àgwà Ọma Mefiboshet?
No. 4: td-IB 42A Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Ememe Anya
Oct. 8 Ọgụgụ Bible: Daniel 7-9 Abụ nke 34
Nkà Okwu: E Mere Ka Ihe Ndị Bụ́ Isi Pụta Ìhè (be-IB p. 212 para. 1–p. 213 para. 1)
No. 1: Kwe Ka “Okwu Ọnụ” Jehova Na-echebe Gị (w05-IB 9/1 p. 28-31)
No. 2: Daniel 7:1-12
No. 3: td-IB 17A Iji Ihe Oyiyi Eme Ihe n’Ofufe Na-ewetara Chineke Nkọcha
No. 4: Olee Ụdị Ọṅụ Pụrụ Iche A Na-enweta Site n’Ịgachi Ozi Ọma Anya?
Oct. 15 Ọgụgụ Bible: Daniel 10-12 Abụ nke 210
Nkà Okwu: Ejila Ọtụtụ Isi Ihe Gabigara Ókè Eme Ihe (be-IB p. 213 para. 2–p. 214 para. 4)
No. 1: k Jehova Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ Maka Okwukwe na Obi Ike (w88-IB 12/1 p. 15-20)
No. 2: Daniel 11:1-14
No. 3: Otú Obi Umeala Pụrụ Isi Nyere Anyị Aka Idozi Nghọtahie
No. 4: td-IB 17B Ihe Iji Ihe Oyiyi Efe Ofufe Na-akpata
Oct. 22 Ọgụgụ Bible: Hosea 1-7 Abụ nke 66
Nkà Okwu: Okwu Mmeghe nke Na-akpasu Mmasị (be-IB p. 215 para. 1–p. 216 para. 5)
No. 1: Jehova Chineke Anyị Bụ Onye Ebere (w89-IB 3/1 p. 14-15)
No. 2: Hosea 5:1-15
No. 3: td-IB 17C Ọ Bụ Nanị Jehova Ka A Ga-efe Ofufe
No. 4: Ụzọ Ezi Ndị Kraịst Si Egosipụta na Ha Na-enwe Ndidi
Oct. 29 Ọgụgụ Bible: Hosea 8-14 Abụ nke 59
Nkà Okwu: Ịdọta Mmasị Ndị Mmadụ Mgbe Ị Nọ n’Ozi Ubi (be-IB p. 217 para. 1-4)
Ntụleghachi
Nov. 5 Ọgụgụ Bible: Joel 1-3 Abụ nke 166
Nkà Okwu: Kwuo Kpọmkwem Ihe Bụ́ Isiokwu Gị n’Okwu Mmeghe (be-IB p. 217 para. 5–p. 219 para. 2)
No. 1: Kpọkuo Aha Jehova Ma Nwee Nzọpụta! (w89-IB 3/15 p. 30-31)
No. 2: Joel 2:1-14
No. 3: Ihe Inwe “Ịhụnanya Zuru Okè” Pụtara” (1 Jọn 4:18)
No. 4: l td-IB 31A #Isonyere Okpukpe Ndị Ọzọ Abụghị Ụzọ Chineke
Nov. 12 Ọgụgụ Bible: Emọs 1-9 Abụ nke 211
Nkà Okwu: Okwu Mmechi nke Dị Irè (be-IB p. 220 para. 1-3)
No. 1: Ọdịda nke Otu Mba (w89-IB 4/1 p. 22-23)
No. 2: Emọs 2:1-16
No. 3: Ihe Mere Ihe Ime Mmadụ Tupu Ya Amụta Ihe Na-ejighị Bụrụ Ụzọ Kasị Mma Isi Mụta Ihe
No. 4: td-IB 31B Okpukpe Nile Hà Dịcha Mma?
Nov. 19 Ọgụgụ Bible: Obadaịa 1–Jona 4 Abụ nke 220
Nkà Okwu: Isi Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche (be-IB p. 220 para. 4–p. 221 para. 4)
No. 1: Ịdọ Aka ná Ntị Chineke Ndị Metụtara Gị (w89-IB 4/15 p. 30-31)
No. 2: Jona 1:1-17
No. 3: td-IB 20A Ndị Kraịst Kwesịrị Ịdị Na-eji Aha Chineke Eme Ihe
No. 4: Ihe Mere A Na-aghaghị Iji Nwee Paradaịs Ime Mmụọ Tupu E Nwewe Paradaịs Elu Ala
Nov. 26 Ọgụgụ Bible: Maịka 1-7 Abụ nke 18
Nkà Okwu: N’ozi Ubi (be-IB p. 221 para. 5–p. 222 para. 6)
No. 1: E Buliri Ikpe Ziri Ezi na Aha Jehova Elu (w89-IB 5/1 p. 14-15)
No. 2: Maịka 2:1-13
No. 3: Ihe Ịdị Umeala n’Obi Pụtara
No. 4: td-IB 20B Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Ịdị Adị Chineke
Dec. 3 Ọgụgụ Bible: Nehum 1–Habakuk 3 Abụ nke 137
Nkà Okwu: Izi Ezi nke Ihe E Kwuru (be-IB p. 223 para. 1-5)
No. 1: A Pụrụ Inwe Nzọpụta Mgbe Chineke Bọrọ Ọ́bọ̀ (w89-IB 5/15 p. 24-25)
No. 2: Habakuk 1:1-17
No. 3: td-IB 20C Ịmata Àgwà Chineke
No. 4: Ihe Mere na Ndụ Ebighị Ebi Agaghị Na-agwụ Ike
Dec. 10 Ọgụgụ Bible: Zefanaịa 1–Hagaị 2 Abụ nke 78
Nkà Okwu: “Na-ejidesi Okwu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi Aka Ike” (be-IB p. 224 para. 1-4)
No. 1: Chọọ Jehova Ma Jiri Obi Gị Nile Fee Ya (w89-IB 6/1 p. 30-31)
No. 2: Zefanaịa 3:1-17
No. 3: td-IB 20D Ọ Bụghị Mmadụ Nile Na-ejere Otu Chineke ahụ Ozi
No. 4: a Olee Otú Iji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe Si Emetụta Mmekọrịta Di na Nwunye?
Dec. 17 Ọgụgụ Bible: Zekaraịa 1-8 Abụ nke 209
Nkà Okwu: Inyocha Izi Ezi nke Ihe Ọmụma (be-IB p. 225 para. 1-3)
No. 1: Jehova Akpalie Mmụọ nke Ndị Ya (w89-IB 6/15 p. 30-31)
No. 2: Zekaraịa 7:1-14
No. 3: Olee Otú Ọhụụ Nnwogha ahụ Sirila Mezuo?
No. 4: td-IB 28A Ndịàmà Jehova Hà Bụ Okpukpe Ọhụrụ?
Dec. 24 Ọgụgụ Bible: Zekaraịa 9-14 Abụ nke 202
Nkà Okwu: Ndị Ọzọ Pụrụ Ịghọta Ya (be-IB p. 226 para. 1–p. 227 para. 1)
No. 1: Ezi Onyenwe Anyị Abịa Ikpe Ikpe (w89-IB 7/1 p. 30-31)
No. 2: Zekaraịa 10:1-12
No. 3: td-IB 21A Jizọs Kraịst—Ọkpara Chineke na Eze Chineke Họpụtara
No. 4: Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Dị Njikere Maka Mkpagbu?
Dec. 31 Ọgụgụ Bible: Malakaị 1-4 Abụ nke 118
Nkà Okwu: Ịkọwa Okwu Ndị A Na-amachaghị (be-IB p. 227 para. 2–p. 228 para. 1)
Ntụleghachi
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Kenye ya nwanna nwoke.
b Họrọ isi ihe ole na ole n’isiokwu a bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala unu.
c Kenye ya nwanna nwoke.
d Kenye ya nwanna nwoke.
e Kenye ya nwanna nwoke.
f Họrọ isi ihe ole na ole n’isiokwu a bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala unu.
g Kenye ya nwanna nwoke.
h Họrọ isi ihe ole na ole n’isiokwu a bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala unu.
i Kenye ya nwanna nwoke.
j Họrọ isi ihe ole na ole n’isiokwu a bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala unu.
k Họrọ isi ihe ole na ole n’isiokwu a bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala unu.
l Kenye ya nwanna nwoke.
a Kenye ya nwanna nwoke.