Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’October 30, 2006. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu September 4 ruo October 30, 2006. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka ahụ́ ruo anyị ala mgbe anyị na-ekwu okwu, oleekwa otú anyị pụrụ isi belata nchegbu anyị na-enwe mgbe anyị na-ekwu okwu? [be-IB p. 135 para. 5–p. 137 para. 2, igbe abụọ]
2. A jụọ anyị ajụjụ n’ihe anyị kweere, olee ihe mere o ji kwesị ka anyị gbalịa iji Bible zaa ya? [be-IB p. 143 para. 1-3]
3. Olee otú anyị pụrụ isi na-etinyekwu nkà n’ụzọ anyị si eji Bible eme ihe? [be-IB p. 144, igbe]
4. Gịnị mere iji Bible eme ihe mgbe nile ji dị mkpa mgbe anyị na-ezi ozi ọma, oleekwa otú anyị pụrụ isi gbaa ndị bịara nzukọ ọgbakọ ume ka ha jiri ya na-eme ihe? [be-IB p. 145-146, igbe abụọ]
5. Olee ihe abụọ anyị ga-eburu n’obi mgbe anyị chọrọ ka a sapeta akụkụ Akwụkwọ Nsọ? [be-IB p. 147 para. 2]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee ịdọ aka ná ntị e nyere n’Abụ Ọma nke 75 megide ịdị nganga? [w86-IB 12/15 p. 28 para. 7]
7. Gịnị bụ “egwu Jehova”? [w87-IB 5/15 p. 29 para. 3-4]
8. Olee ihe asaa ndị ahụ bụ́ ihe arụ n’anya Jehova? (Ilu 6:16-19) [w87-IB 5/15 p. 29 para. 12]
9. N’Ilu 2:1-5, gịnị ka agbamume ahụ bụ́ ịnọgide na-achọ ihe ọmụma, nghọta, na mmata ‘dị ka ọlaọcha na dị ka akụ̀ zoro ezo,’ pụtara? [be-IB p. 38 para. 4]
10. Gịnị mere inyere ndị dị ala aka ji yie ibinye Jehova ihe? [w87-IB 5/15 p. 29 para. 14-15]
ỌGỤGỤ BIBLE DỊỊRỊ IZU
11. Olee otú Devid si ‘dozie mkpụrụ obi ya, mee ka o dere duu, dị ka nwata nke e mere ka ọ hapụ ara si dị n’ahụ́ nne ya,’ oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ya? (Ọma 131:1-3)
12. Olee nkasi obi a pụrụ inweta n’okwu ndị ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee n’Abụ Ọma 139:7-12?
13. Olee ihe atụ ụfọdụ nke ịdị ukwuu Jehova ndị a kpọrọ aha n’Abụ Ọma 145, bụ́ ndị anyị pụrụ ito ya maka ha mgbe anyị na-ekpe ekpere nakwa mgbe anyị nọ n’ozi? (Ọma 145:3)
14. Olee otú egwu Jehova si bụrụ “mmalite ihe ọmụma” na “mmalite amamihe”? (Ilu 1:7; 9:10)
15. N’Ilu 7:1, 2, gịnị ka “okwu ọnụ m nile” na “ihe nile m nyere n’iwu” na-agụnye?