Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2006
Ntụziaka
N’afọ 2006, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
EBE IHE OMUME SI: Bible Nsọ nke Union Version, Ụlọ Nche [w-IB], Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke [be-IB], na Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè [yp-IB].
E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata malite ụlọ akwụkwọ ahụ N’OGE, mgbe ahụ gaa n’ihu n’usoro a:
NKÀ OKWU: Minit 5. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ, onye ndụmọdụ na-enyere ya aka, ma ọ bụ okenye ọzọ ruru eru ga-atụle otu nkà okwu nke dabeere n’akwụkwọ ọgụgụ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. (N’ọgbakọ ndị e nwere ndị okenye ole na ole, a pụrụ iji ohu na-eje ozi ruru eru mee ihe.)
IHE OMUME NKE 1: Minit 10. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru kwesịrị ime nke a, ọ ga-adaberekwa n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. A ga-ekwu ya dị ka okwu izi ihe nke ga-ewe minit iri n’enweghị ntụleghachi ajụjụ na azịza. Nzube ya ekwesịghị ịbụ nanị ikwuzu ihe dị n’akwụkwọ ahụ kama o kwesịkwara ịbụ iji lekwasị anya n’uru ihe ọmụma ahụ a na-atụle bara, na-eme ka ihe ga-akasị baara ọgbakọ uru pụta ìhè. E kwesịrị iji isiokwu e nyere mee ihe. A na-atụ anya na ụmụnna e kenyere okwu a ga-elezi anya ka ha ghara ịgafe oge e nyere. A pụrụ inye ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha dị ka o si dị mkpa.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BIBLE: Minit 10. N’ime minit ise mbụ, okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru kwesịrị igosi otú ihe ọmụma ahụ si metụta mkpa e nwere n’ọgbakọ. Ọ pụrụ ikwu okwu n’akụkụ ọ bụla sitere n’ebe e kenyere maka ọgụgụ Bible n’izu ahụ. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị nchịkọta nke ihe dị n’ebe e kenyere ka a gụọ. Nzube ya bụ́ isi bụ inyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere ihe ọmụma ahụ ji baa uru na otú o si baa uru. Ọkà okwu ahụ kwesịrị ilezi anya ịghara ịgafe minit ise e nyere maka akụkụ mbụ nke okwu ahụ. O kwesịrị ijide n’aka na o wepụtara minit ise ndị na-ege ntị ga-eji tinye ọnụ. E kwesịrị ịgwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu dị mkpirikpi (sekọnd 30 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) banyere ihe masịrị ha n’ọgụgụ Bible ahụ na abamuru ya. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwazi ndị mmụta e kenyere na klas ndị ọzọ ka ha gawa n’ebe ndị ahụ.
IHE OMUME NKE 2: Minit 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya. Nke a bụ ihe ọgụgụ nke nwanna nwoke ga-agụ. Onye mmụta ahụ kwesịrị ịgụ ihe e kenyere ya n’ekwughị okwu mmeghe ma ọ bụ nke mmechi. O kwesịrị ịgụ ihe e dere n’elu isiakwụkwọ Bible mgbe ọ na-agụ ihe omume sitere n’Abụ Ọma. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’inyere ndị mmụta aka iji nghọta, mmesi okwu ike kwesịrị ekwesị, mgbanwe ụda olu, na nkwụsịtụ kwesịrị ekwesị na-agụ ihe n’ụzọ na-aga were were, nakwa dị ka ha si ekwu okwu.
IHE OMUME NKE 3: Minit 5. Ọ bụ nwanna nwanyị ka a ga-ekenye nke a. Ndị mmụta e nyere ihe omume a ga-eji aka ha họrọ ọnọdụ okwu ma ọ bụkwanụ e kenye ha otu site n’ihe ndepụta dị na peeji nke 82 n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. Onye mmụta ahụ kwesịrị iji isiokwu e kenyere ya mee ihe. Mgbe a na-ekwughị ebe ihe omume sitere, ọ ga-adị mkpa ka onye mmụta nweta ihe ọ ga-ekwu site n’ime nnyocha n’akwụkwọ anyị. E kwesịrị ikenye ndị mmụta ọhụrụ ma ọ bụ ndị nke ka bụ́ ụmụaka ihe omume ndị e gosiri ebe ha sitere. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’ụzọ onye mmụta si akọwapụta isiokwu ahụ na ụzọ o si na-enyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ na ịghọta isi ihe ndị dị n’okwu ya. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye onye mmụta otu onye inyeaka.
IHE OMUME NKE 4: Minit 5. Onye mmụta kwesịrị ịkọwapụta isiokwu e kenyere ya. Mgbe a na-ekwughị ebe ihe omume sitere, ọ ga-adị mkpa ka onye mmụta nweta ihe ọ ga-ekwu site n’ime nnyocha n’akwụkwọ anyị. Mgbe ọ bụ nwanna nwoke ka e kenyere ya, o kwesịrị iguzo n’ihu tebụl ikpo okwu mee ya. Ndị ọ ga na-agwa okwu bụ ndị na-ege ntị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe e kenyere nwanna nwanyị ihe omume a, e kwesịrị ime ya mgbe nile dị ka a kọwapụtara maka Ihe Omume nke 3. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ pụrụ ikenye nwanna nwoke Ihe Omume nke 4 mgbe ọ bụla ọ hụrụ na ọ dị mkpa ime otú ahụ. Biko rịba ama na ọ bụ nanị nwanna nwoke ka e kwesịrị ikenye isiokwu ọ bụla nwere akara kpakpando “*” n’akụkụ ya. Ọ ga-eguzo n’ihu tebụl ikpo okwu kwuo ya.
IDEBE OGE: Ọ dịghị okwu kwesịrị ịgafe oge e nyere maka ya, okwu onye ndụmọdụ ekwesịghịkwa ịgafe oge. E kwesịrị iji akọ kwụsị Ihe Omume nke 2 ruo nke 4 mgbe oge ha zuru. Ọ bụrụ na ụmụnna na-ekwu okwu mmeghe metụtara nkà okwu, Ihe Omume nke 1, ma ọ bụ nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible agafee oge, e kwesịrị inye ha ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha. Mmadụ nile kwesịrị ilezi anya ịhụ na ha agafeghị oge ha. Usoro ihe omume ahụ dum ga-ewe minit 45, n’agụnyeghị abụ na ekpere.
NDỤMỌDỤ: 1 minit. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eji ihe na-agafeghị otu minit kwuo okwu na-ewuli elu n’akụkụ kwesịrị ịja mma n’okwu ahụ mgbe onye mmụta nke ọ bụla mesịrị ihe omume ya. Ebumnobi ya agaghị abụ nanị ịsị ya “i meela” kama ịdọrọ uche gaa kpọmkwem n’ihe ndị mere ka ihe omume ya dị mma. Dị ka mkpa onye mmụta ọ bụla si dị, a pụrụ inyekwu ya ndụmọdụ na-ewuli elu nke na-agaghị abụ n’ihu ọha mgbe a gbasasịrị nzukọ ma ọ bụ n’oge ọzọ.
ONYE NDỤMỌDỤ INYEAKA: Òtù ndị okenye pụrụ ịhọrọ onye okenye ruru eru, ma ọ bụrụ na e nwere, tụkwasị n’onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ka ọ na-arụ ọrụ dị ka onye ndụmọdụ inyeaka. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị okenye n’ọgbakọ, a pụrụ ikenye ndị okenye dịgasị iche iche bụ́ ndị ruru eru, ọrụ a n’afọ nke ọ bụla. Ọrụ onye ndụmọdụ inyeaka ga-abụ inye ụmụnna mere Ihe Omume nke 1 na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha, ma ọ́ dị mkpa. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-enye ndụmọdụ mgbe ọ bụla ndị okenye ibe ya ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi kwusịrị nke ọ bụla n’ime okwu ndị ahụ.
FỌM NDỤMỌDỤ OKWU: Ọ dị n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi.
NTỤLEGHACHI: Minit 30. N’ọnwa abụọ ọ bụla, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi. Tupu e mewe ya, a ga-ebu ụzọ tụlee otu nkà okwu na isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible dị ka a kọwapụtara n’elu. Ntụleghachi ahụ ga-adabere n’ihe a tụlere n’ụlọ akwụkwọ n’ime ọnwa abụọ bu ya ụzọ, gụnyere izu ahụ a nọ na ya. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-aga mgbakọ sekit n’izu a ga-eme ntụleghachi, e kwesịrị iburu ntụleghachi ahụ (na ihe ndị ọzọ e mere ndokwa ime n’izu ahụ) bufee n’izu na-esote ya ma buru ihe omume nke izu na-esote ya budata n’izu ahụ. Ọ bụrụ na onye nlekọta sekit na-aga ileta ọgbakọ unu n’izu e nwere ntụleghachi, e kwesịrị iji abụ, nkà okwu, na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible mee ihe otú ahụ e si dokwaa ya. E kwesịrị ịgbaso usoro ihe omume nke izu na-esote ya ma a bịa n’Ihe Omume nke 1 (bụ́ nke a na-eme ma nkà okwu gasịa). N’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke izu na-eso ya, a ga-eji nkà okwu na nchịkọta nke ihe isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible nke izu ahụ mee ihe, e mesịa ha, e mewezie ntụleghachi ahụ.
USORO IHE OMUME
Jan. 2 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 29-32 Abụ nke 91
Nkà Okwu: Rite Uru Zuru Ezu Site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (be-IB p. 5 para. 1–p. 8 para. 1)
No. 1: Na-enweta Obi Ụtọ n’Okwu Chineke (be-IB p. 9 para. 1-5)
No. 2: 2 Ihe E Mere 30:1-12
No. 3: Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Ji Ezere Ikwu Okwu Rere Ure
No. 4: Ihe ‘Ịsọpụrụ Nne Gị na Nna Gị’ Pụtara (yp-IB isi nke 1)
Jan. 9 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 33-36 Abụ nke 144
Nkà Okwu: Ịgụzi Ihe Agụzi (be-IB p. 83 para. 1-5)
No. 1: 2 Ihe E Mere—Ihe Mere O Ji Baa Uru (w85-IB 11/1 p. 29 para. 1–p. 31 para. 1)
No. 2: 2 Ihe E Mere 34:1-11
No. 3: Otú Ndị Ntorobịa na Ndị Mụrụ Ha Pụrụ Isi Na-aghọta Ibe Ha (yp-IB isi nke 2 p. 18-19, 22-25)
No. 4: Ya Adịla Mgbe Ihere Ga-eme Gị Ịgbaso Ụkpụrụ Omume Ọma nke Bible
Jan. 16 Ọgụgụ Bible: Ezra 1-5 Abụ nke 137
Nkà Okwu: Otú E Si Agụzi Ihe Agụzi (be-IB p. 84 para. 1–p. 85 para. 3)
No. 1: Jehova Emezuo Nkwa Ya!—Akụkụ nke 1 (w86-IB 2/15 p. 29)
No. 2: Ezra 1:1-11
No. 3: Uru Ndị A Na-erite n’Ihi Inwe Akọ na Uche Dị Ọcha
No. 4: Ihe Mere Ndị Ntorobịa Ji Kwesị Ịdị Na-akọrọ Ndị Mụrụ Ha Ihe Dị Ha n’Obi (yp-IB isi nke 2 p. 20-21)
Jan. 23 Ọgụgụ Bible: Ezra 6-10 Abụ nke 106
Nkà Okwu: E Kwuru Okwu n’Ụzọ Doro Anya (be-IB p. 86 para. 1-6)
No. 1: Jehova Emezuo Nkwa Ya!—Akụkụ nke 2 (w86 2/15 p. 30)
No. 2: Ezra 6:1-12
No. 3: Ihe Mere Ndị Mụrụ Ụmụ Na-ejighị Ekwe Ka Ụmụ Ha Nwere Nnọọ Onwe Ha (yp-IB isi nke 3 p. 26-33)
No. 4: aEchiche Chineke Banyere Alụmdi na Nwunye
Jan. 30 Ọgụgụ Bible: Nehemaịa 1-4 Abụ nke 161
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Kwuo Okwu n’Ụzọ Doro Anya (be-IB p. 87 para. 1–p. 88 para. 3)
No. 1: Ezi Ofufe Enwee Mmeri (Nehemaịa 1-6) (w86-IB 6/1 p. 21 para. 1-19)
No. 2: Nehemaịa 2:1-10
No. 3: Ụdị Nchebe Kasị Mkpa
No. 4: Mmadụ Iso Ụmụnne Ya Dịrị ná Mma (yp-IB isi nke 6)
Feb. 6 Ọgụgụ Bible: Nehemaịa 5-8 Abụ nke 40
Nkà Okwu: Ịkpọzi Okwu Akpọzi—Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche (be-IB p. 89 para. 1–p. 90 para. 3)
No. 1: Na-agụ Bible Kwa Ụbọchị (be-IB p. 10 para. 1–p. 12 para. 3)
No. 2: Nehemaịa 5:1-13
No. 3: Ihe Mere Ịhapụ Ụlọ Na-ejighị Bụrụ Ebe O Biri (yp-IB isi nke 7)
No. 4: “Chebe Obi Gị” (Ilu 4:23)
Feb. 13 Ọgụgụ Bible: Nehemaịa 9-11 Abụ nke 159
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Meziwanye Ihe Ma A Bịa n’Ịkpọzi Okwu Akpọzi (be-IB p. 90 para. 4–p. 92)
No. 1: Ịmụta Udo Kama Ịmụ Agha (w04-IB 1/1 p. 6 para. 8–p. 7 para. 6)
No. 2: Nehemaịa 10:28-37
No. 3: Ihe Àmà Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya
No. 4: Imete Ezi Ndị Enyi (yp-IB isi nke 8 p. 65-67, 70-72)
Feb. 20 Ọgụgụ Bible: Nehemaịa 12-13 Abụ nke 118
Nkà Okwu: Ikwu Okwu n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ (be-IB p. 93 para. 1–p. 94 para. 3)
No. 1: A Maliteghachi Ezi Ofufe (Nehemaịa 7-13) (w86-IB 6/1 p. 22 para. 1-21)
No. 2: Nehemaịa 13:1-14
No. 3: Inyere Enyi Gị nke Dabara n’Ezigbo Nsogbu Aka (yp-IB isi nke 8 p. 68-69)
No. 4: bEgwuregwu Vidio Ndị A Na-eme Ihe Ike na Ha Abụghị Maka Ndị Kraịst
Feb. 27 Ọgụgụ Bible: Esta 1-5 Abụ nke 215
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Meziwanye Ihe Ma A Bịa n’Ikwu Okwu n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ (be p. 94 para. 4–p. 96 para. 3, n’agụnyeghị igbe dị na p. 95)
Ntụleghachi
Mar. 6 Ọgụgụ Bible: Esta 6-10 Abụ nke 74
Nkà Okwu: Ịnagide Ịsụ Nsụ (be-IB p. 95, igbe)
No. 1: cNnapụta Chineke ná Mkpochapụ (w86-IB 7/1 p. 27-28)
No. 2: Esta 6:1-10
No. 3: Okwu Dị Nro Pụrụ Ime Ka Ọnụma Laghachi Azụ
No. 4: Ihe Mere Nrụgide Ndị Ọgbọ Ji Emetụta Ndị Ntorobịa (yp-IB isi nke 9 p. 73-76)
Mar. 13 Ọgụgụ Bible: Job 1-5 Abụ nke 160
Nkà Okwu: Ịkwụsịtụ Iji Kebie Okwu na Iji Gbanwee Echiche Okwu (be-IB p. 97 para. 1–p. 98 para. 5)
No. 1: dJob Tachiri Obi—Anyị Pụkwara! (w94-IB 11/15 p. 10-14)
No. 2: Job 2:1-13
No. 3: Ịnagide Nrụgide Ndị Ọgbọ (yp-IB isi nke 9 p. 76-80)
No. 4: Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Ji Ezere Ịtamu Ntamu
Mar. 20 Ọgụgụ Bible: Job 6-10 Abụ nke 214
Nkà Okwu: Ịkwụsịtụ Iji Mesie Okwu Ike, Ịkwụsịtụ Iji Gee Ntị (be-IB p. 99 para. 1–p. 100 para. 3)
No. 1: Otú Ụkpụrụ Ime Mmụọ Si Kara Mma (w04-IB 10/15 p. 4 para. 2–p. 5 para. 3)
No. 2: Job 7:1-21
No. 3: Ihe Ịdị Ọcha n’Obi Pụtara
No. 4: Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ọdịdị Dị Mkpa? (yp-IB isi nke 10)
Mar. 27 Ọgụgụ Bible: Job 11-15 Abụ nke 8
Nkà Okwu: Imesi Echiche Okwu Ike n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị (be-IB p. 101 para. 1–p. 102 para. 3)
No. 1: “Lezienụ Anya Otú Unu Si Aṅa Ntị” (be-IB p. 13 para. 1–p. 14 para. 4)
No. 2: Job 12:1-25
No. 3: Gịnị Ka Onye Kraịst Na-eburu n’Uche Wee Na-ahọrọ Uwe? (yp-IB isi nke 11 p. 90 ruo p. 94 para. 1)
No. 4: Ihe Mere Ozi Ọma Ji Enye Anyị Ọṅụ
Apr. 3 Ọgụgụ Bible: Job 16-20 Abụ nke 50
Nkà Okwu: Imeziwanye Ihe Ma A Bịa n’Imesi Echiche Okwu Ike (be-IB p. 102 para. 4–p. 104 para. 3)
No. 1: Otú Anyị Si Egosipụta Ịhụnanya Anyị Nwere n’Ebe Chineke Nọ (w04-IB 3/1 p. 19-21)
No. 2: Job 16:1-22
No. 3: Otú Jehova Si Adọta Ndị Mmadụ Ife Ya Ofufe
No. 4: Uru ‘Uwe A Haziri nke Ọma, nke E Merukwara Ihe n’Ókè na Ya’ Bara (yp-IB isi nke 11 p. 94 para. 2 ruo p. 96)
Apr. 10 Ọgụgụ Bible: Job 21-27 Abụ nke 119
Nkà Okwu: E Mesiri Echiche Ndị Bụ́ Isi Ike (be-IB p. 105 para. 1–p. 106 para. 1)
No. 1: Ụkpụrụ Ime Mmụọ Na-eweta Ụgwọ Ọrụ (w04-IB 10/15 p. 5 para. 4–p. 7 para. 2)
No. 2: Job 24:1-20
No. 3: Jehova Na-enye Ike Karịrị Ike Nkịtị
No. 4: Otú Mmadụ Ga-esi Mee Ka Onwe Ya Na-amasị Ya (yp-IB isi nke 12 p. 98 ruo p. 101 para. 2)
Apr. 17 Ọgụgụ Bible: Job 28-32 Abụ nke 100
Nkà Okwu: Ụda Olu Kwesịrị Ndị Ị Na-agwa Okwu (be-IB p. 107 para. 1–p. 108 para. 4)
No. 1: Ịṅa Ntị ná Nzukọ Nakwa ná Mgbakọ (be-IB p. 15 para. 1–p. 16 para. 5)
No. 2: Job 29:1-25
No. 3: Kpachara Anya Banyere Ịbụ Onye Onwe Gị Juru Afọ n’Ụzọ Dị Njọ (yp-IB isi nke 12 p. 101 para. 3 ruo p. 103)
No. 4: Ihe Mere Ụzọ Jizọs Si Ezi Ihe Ji Ju Ìgwè Mmadụ Anya
Apr. 24 Ọgụgụ Bible: Job 33-37 Abụ nke 94
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Meziwanye Ụda Olu Gị (be-IB p. 108 para. 5–p. 110 para. 2)
Ntụleghachi
May 1 Ọgụgụ Bible: Job 38-42 Abụ nke 154
Nkà Okwu: Mgbanwe Ụda Olu—Na-eweli Ma Na-eweda Olu Gị (be-IB p. 111 para. 1–p. 112 para. 2)
No. 1: eỤgwọ Ọrụ Job—Isi Iyi nke Olileanya (w94-IB 11/15 p. 15-20)
No. 2: Job 38:1-24
No. 3: Olee Otú Aịsaịa 60:22 Si Na-emezu Taa?
No. 4: Gịnị Na-akpata Ịda Mbà n’Obi? (yp-IB isi nke 13 p. 104 ruo p. 106 para. 2)
May 8 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 1-10 Abụ nke 168
Nkà Okwu: Mgbanwe Ụda Olu—Na-agbanwe Ọ̀tụ̀tụ̀ Ịgba Ọsọ n’Okwu Gị (be-IB p. 112 para. 3–p. 113 para. 1)
No. 1: fOnye Ọbụ Abụ Abụọ Abụ Otuto Jehova (w86-IB 8/15 p. 26-27)
No. 2: Abụ Ọma 4:1-5:12
No. 3: Ịmata Ịda Mbà n’Obi na Ime Ka Ọ Kwụsịlata (yp-IB isi nke 13 p. 106 para. 3 ruo p. 111 para. 2)
No. 4: Ijigide Ụkpụrụ nke Okwu Na-enye Ezi Ndụ
May 15 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 11-18 Abụ nke 217
Nkà Okwu: Mgbanwe Ụda Olu—Na-agbanwe Ọdịdị Ụda Olu Gị (be-IB p. 113 para. 2–p. 114 para. 3)
No. 1: gChere Jehova (w86-IB 10/15 p. 26-27)
No. 2: Abụ Ọma 14:1-16:6
No. 3: N’Ụzọ Ndị Dị Aṅaa Ka Ezi Ndị Kraịst Na-esighị Bụrụ Akụkụ nke Ụwa?
No. 4: Otú E Si Achụ Ịda Mbà n’Obi (yp-IB isi nke 13 p. 111 para. 3 ruo p. 114)
May 22 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 19-25 Abụ nke 23
Nkà Okwu: Jiri Mmetụta Kwuo Okwu (be-IB p. 115 para. 1–p. 116 para. 4)
No. 1: Ezi Uche Na-eweta Amara (w04-IB 7/15 p. 27 para. 4–p. 28 para. 4)
No. 2: Abụ Ọma 22:1-22
No. 3: Otú Mmadụ Ga-esi Nọrọ Nanị Ya Ma Owu Agaghị Ama Ya (yp-IB isi nke 14 p. 115-117)
No. 4: hOlee Ihe Ndị Bụ́ Ihe Ncheta Chineke, N’ihi Gịnịkwa Ka Anyị Ji Kwesị Ịṅa Ntị na Ha?
May 29 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 26-33 Abụ nke 203
Nkà Okwu: Ịnụ Ọkụ n’Obi nke Kwesịrị Ihe A Na-ekwu (be-IB p. 116 para. 5–p. 117 para. 4)
No. 1: Ị Pụrụ Imeziwanye Ikike Icheta Ihe Gị (be-IB p. 17 para. 1–p. 19 para. 1)
No. 2: Abụ Ọma 30:1-31:8
No. 3: N’Ụzọ Ndị Dị Aṅaa Ka Eziokwu ahụ SI Eme Ka Mmadụ Pụọ n’Ohu?
No. 4: Ihe Ngwọta Maka Owu Ọmụma (yp-IB isi nke 14 p. 118-120)
June 5 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 34-37 Abụ nke 167
Nkà Okwu: Igosi Mmetụta Ịhụnanya (be p. 118 para. 1–p. 119 para. 5)
No. 1: Ike nke Ekpere (w04-IB 8/15 p. 18 para. 6–p. 19 para. 10)
No. 2: Abụ Ọma 34:1-22
No. 3: Ighọta Ihe Ime Ihere Bụ (yp-IB isi nke 15 p. 121-123 para. 1)
No. 4: Olee Ụdị Ikpere Arụsị Anyị Na-aghaghị Ịgbanahụ?
June 12 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 38-44 Abụ nke 216
Nkà Okwu: Igosipụta Ụdị Mmetụta Ndị Ọzọ (be p. 119 para. 6–p. 120 para. 5)
No. 1: Ọrụ Mmụọ Chineke Na-arụ n’Icheta Ihe (be-IB p. 19 para. 2–p. 20 para. 3)
No. 2: Abụ Ọma 40:1-17
No. 3: Ezigbo Sayensị Adịghị Emegide Bible
No. 4: Otú E Si Akwụsị Ime Ihere (yp-IB isi nke 15 p. 123 para. 2 ruo p. 126)
June 19 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 45-51 Abụ nke 104
Nkà Okwu: Mkpa Mmegharị Ahụ́ na Ọdịdị Ihu Dị (be-IB p. 121 para. 1-4)
No. 1: Olee Mgbe Jizọs Ga-abịa? (w04-IB 3/1 p. 16, igbe)
No. 2: Abụ Ọma 46:1-47:9
No. 3: Ịnagide Ọnwụ nke Onye A Hụrụ n’Anya (yp-IB isi nke 16)
No. 4: Olee Otú Onye Kraịst Pụrụ Isi Dị Ike Mgbe Ọ Na-adịghị Ike? (2 Kọr. 12:10)
June 26 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 52-59 Abụ nke 103
Nkà Okwu: Imegharị Ahụ́ na Igosipụta Ọdịdị Ihu Mgbe Ị Na-ekwu Okwu (be-IB p. 122 para. 1–p. 123 para. 3)
Ntụleghachi
July 3 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 60-68 Abụ nke 45
Nkà Okwu: Ile Ndị Ị Na-ezi Ozi Ọma Anya (be-IB p. 124 para. 1–p. 125 para. 4)
No. 1: Ihe Ịdị Umeala n’Obi Jehova Pụtaara Anyị (w04-IB 11/1 p. 29-30)
No. 2: Abụ Ọma 60:1-61:8
No. 3: Ikere Òkè n’Ihe Omume Ndị Kraịst Ọ̀ Na-eme Ka Anyị Nwere Onwe Anyị Ịghara Ịgbaso Iwu Chineke?
No. 4: Otú Ndị Kraịst Si Ele Ịga Akwụkwọ Anya (yp-IB isi nke 17)
July 10 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 69-73 Abụ nke 225
Nkà Okwu: Ile Ndị Ị Na-agwa Okwu Anya Mgbe Ị Na-eme Ihe Omume (be-IB p. 125 para. 5–p. 127 para. 1)
No. 1: N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe? (be-IB p. 21 para. 1–p. 23 para. 3)
No. 2: Abụ Ọma 71:1-18
No. 3: Otú Mmadụ Ga-esi Gbatawakwuo Ihe n’Ụlọ Akwụkwọ (yp-IB isi nke 18)
No. 4: iIhe Mere Ndị Kraịst Na-aghaghị Iji Bụrụ Ndị Na-adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu
July 17 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 74-78 Abụ nke 28
Nkà Okwu: Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Mgbe Ị Nọ n’Ozi Ubi (be-IB p. 128 para. 1–p. 129 para. 1)
No. 1: Jiri Ezi Ebumnobi Na-agụ Ihe (be-IB p. 23 para. 4–p. 26 para. 4)
No. 2: Abụ Ọma 75:1-76:12
No. 3: Gịnị Ka Ịchọ Jehova Na-agụnye? (Zef. 2:3)
No. 4: Izere Mmaja n’Ụlọ Akwụkwọ (yp-IB isi nke 19)
July 24 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 79-86 Abụ nke 112
Nkà Okwu: Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Mgbe Ị Nọ n’Elu Ikpo Okwu (be-IB p. 129 para. 2–p. 130 para. 1)
No. 1: “Ụlọikwuu nke Ndị Ziri Ezi Ga-ama Akwụkwọ Dị Ka Ihe A Kụrụ Akụ” (w04-IB 11/15 p. 26 para. 1–p. 28 para. 2)
No. 2: Abụ Ọma 82:1-83:18
No. 3: Mmadụ na Onye Nkụzi Ya Ịdị ná Mma (yp-IB isi nke 20)
No. 4: Ụmụ Mmadụ Na-ezughị Okè Hà Pụrụ Ime Ka Obi Dị Chineke Mma n’Ezie?
July 31 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 87-91 Abụ nke 57
Nkà Okwu: Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Mgbe Ị Na-agụ Ihe n’Ihu Ọha (be-IB p. 130 para. 2-4)
No. 1: Mgbe ‘Ihe Ọmụma Na-adị Mfe,’ Amamihe Ana-eduzikwa Anyị (w04-IB 11/15 p. 28 para. 3–p. 29 para. 7)
No. 2: Abụ Ọma 89:1-21
No. 3: Ịmụ Bible So n’Ụzọ Anyị Si Efe Ofufe
No. 4: Ụzọ Isi Chọta Ọrụ Ma Nọgide na Ya (yp-IB isi nke 21)
Aug. 7 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 92-101 Abụ nke 190
Nkà Okwu: Ịdị Ọcha n’Elu Ahụ́ Na-achọ Ozi Anyị Mma (be-IB p. 131 para. 1-3)
No. 1: Otú E Si Amụ Ihe (be-IB p. 27 para. 1–p. 31 para. 2)
No. 2: Abụ Ọma 92:1-93:5
No. 3: Họrọ Ọrụ Kasị Mma (yp-IB isi nke 22)
No. 4: Mkpa Ịnọgidesi Ike n’Omume Ọma Dị
Aug. 14 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 102-105 Abụ nke 1
Nkà Okwu: Otú Imeru Ihe n’Ókè na Uche Zuru Okè Si Emetụta Uwe na Ejiji Mmadụ (be-IB p. 131 para. 4–p. 132 para. 3)
No. 1: “Lee Ka Ọrụ Gị Si Baa Ụba nke Ukwuu, Jehova!” (w04-IB 11/15 p. 8-9)
No. 2: Abụ Ọma 104:1-24
No. 3: Ihe Mere Anyị Na-aghaghị Iji Nọrọ na Nche
No. 4: Ihe Mere Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye Ji Dị Njọ (yp-IB isi nke 23)
Aug. 21 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 106-109 Abụ nke 201
Nkà Okwu: Uru Uwe A Haziri nke Ọma Bara (be-IB p. 132 para. 4–p. 133 para. 1)
No. 1: Ndị Ntorobịa—Unu Agbasola Ndị Ọgbọ Unu n’Ajụghị Ase (w04-IB 10/15 p. 22 para. 4–p. 24 para. 5)
No. 2: Abụ Ọma 107:20-43
No. 3: Ụzọ Isi Zere Mmekọahụ Rụrụ Arụ (yp-IB isi nke 24)
No. 4: N’ụzọ Ndị Dị Aṅaa Ka Anyị Na-aghaghị Iṅomi Chineke?
Aug. 28 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 110-118 Abụ nke 125
Nkà Okwu: Ọdịdị Onwe Onye Dị Mma Adịghị Eweta Ihe Mkpọbi Ụkwụ (be-IB p. 133 para. 2-4)
Ntụleghachi
Sept. 4 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 119 Abụ nke 59
Nkà Okwu: Ịnọ Otú Dị Mma na Ihe Ndị E Ji Eme Ihe Ịdị Mma n’Anya (be-IB p. 133 para. 5–p. 134 para. 4)
No. 1: Ịmụ Ihe Na-enye Ụgwọ Ọrụ (be-IB p. 31 para. 3–p. 32 para. 4)
No. 2: Abụ Ọma 119:25-48
No. 3: Ihe Mere Anyị Ji Akwanyere Ndị Ọchịchị Ùgwù
No. 4: Mmadụ Imetọ Onwe Ya Ọ̀ Bụ Ihe Jọgburu Onwe Ya? (yp-IB isi nke 25)
Sept. 11 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 120-134 Abụ nke 65
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Belata Nchegbu n’Oge A Na-ekwu Okwu (be-IB p. 135 para. 1–p. 137 para. 2)
No. 1: Ụzọ Isi Mee Nnyocha (be-IB p. 33 para. 1-p. 35. para. 2)
No. 2: Abụ Ọma 121:1-123:4
No. 3: Mmadụ Izere Ọnyà nke Imetọ Onwe Ya (yp-IB isi nke 26)
No. 4: Gịnị Bụ Ikwufe Okwu Ókè, Oleekwa Otú Jizọs Si Jiri Nkà Okwu A Mee Ihe?
Sept. 18 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 135-141 Abụ nke 97
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Mee Ka Ahụ́ Na-eru Gị Ala (be-IB p. 137 para. 3–p. 138 para. 4)
No. 1: j“Gọzie Jehova”—n’Ihi Gịnị? (w86-IB 12/15 p. 28-29)
No. 2: Abụ Ọma 136:1-26
No. 3: N’ụzọ Dị Aṅaa Ka Nri Anyasị Onyenwe Anyị Ji Bụrụ Nri A Na-erikọ Ọnụ?
No. 4: Ihe Mere Ime Ihe n’Eziokwu Ji Bụrụ Ụkpụrụ Kasị Mma (yp-IB isi nke 27)
Sept. 25 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 142-150 Abụ nke 5
Nkà Okwu: Mkpa Ọ Dị Ime Ka Olu Dasikwuo Ụda Ike (be-IB p. 139 para. 1–p. 140 para. 2)
No. 1: kChineke Obi Ụtọ, Ndị Obi Ụtọ! (w87-IB 3/15 p. 20-21)
No. 2: Abụ Ọma 142:1-143:12
No. 3: Imeri Ịhụnanya Kpuru Ìsì (yp-IB isi nke 28)
No. 4: N’ụzọ Ndị Dị Aṅaa Ka Anyị Pụrụ Isi Bute Mkpa nke Ndị Ọzọ Ụzọ?
Oct. 2 Ọgụgụ Bible: Ilu 1-6 Abụ nke 111
Nkà Okwu: Jiri Ígwè Okwu Na-eme Ihe nke Ọma (be-IB p. 140 para. 3–p. 142 para. 1)
No. 1: Gee Amamihe Ntị Ma Jiri Ya Dị Ka Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa (Ilu 1-4) (w87-IB 5/15 p. 29 para. 1-11)
No. 2: Ilu 5:1-23
No. 3: Ụzọ Isi Mara Ma Mmadụ Ò Toruwo Ime Enyi Nwoke Ma Ọ Bụ Enyi Nwanyị (yp-IB isi nke 29 p. 225-231, 234-235)
No. 4: lAkọsala Akụkọ Ụgha (2 Tim. 4:4)
Oct. 9 Ọgụgụ Bible: Ilu 7-11 Abụ nke 73
Nkà Okwu: Iji Bible Azaghachi (be-IB p. 143 para. 1-3)
No. 1: Ụzọ Ndị A Pụrụ Isi Gosipụta Amamihe (Ilu 5-15) (w87-IB 5/15 p. 29 para. 12-27)
No. 2: Ilu 7:1-27
No. 3: Nnọpụiche Ndị Kraịst Na-enye Aka Eme Ka Òtù Ụmụnna Anyị Dị n’Otu
No. 4: Nwoke na Nwanyị Ime Enyi—Ihe Ize Ndụ Ọ̀ Dị na Ya? (yp-IB isi nke 29 p. 232-233)
Oct. 16 Ọgụgụ Bible: Ilu 12-16 Abụ nke 180
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Meziwanye Ihe n’Iji Bible Eme Ihe (be-IB p. 144 para. 1-4)
No. 1: Ịmụta Iji Ihe Ndị Ọzọ E Ji Eme Nnyocha Eme Ihe (be-IB p. 35 para. 3–p. 38 para. 4)
No. 2: Ilu 14:1-21
No. 3: Ịmata Mgbe A Dị Njikere Maka Alụmdi na Nwunye (yp-IB isi nke 30)
No. 4: Gịnị Pụrụ Inyere Anyị Aka Ige Ntị nke Ọma ná Nzukọ Ọgbakọ?
Oct. 23 Ọgụgụ Bible: Ilu 17-21 Abụ nke 131
Nkà Okwu: A Gbara Ume Iji Bible Eme Ihe (be-IB p. 145-146)
No. 1: Tụọ Egwu Jehova, Ị Ga-enwekwa Obi Ụtọ—Akụkụ nke 1 (Ilu 16-24) (w87-IB 5/15 p. 30 para. 1-10)
No. 2: Ilu 17:1-20
No. 3: Otú Ndị Kraịst Si Ele Ndị Agadi Anya
No. 4: Ịmata Ezi Ịhụnanya (yp-IB isi nke 31 p. 242-247, 250-251)
Oct. 30 Ọgụgụ Bible: Ilu 22-26 Abụ nke 9
Nkà Okwu: Mkpa Iwebata Akwụkwọ Nsọ n’Ụzọ Dị Irè Dị (be-IB p. 147 para. 1–p. 148 para. 2)
Ntụleghachi
Nov. 6 Ọgụgụ Bible: Ilu 27-31 Abụ nke 51
Nkà Okwu: Ịhọrọ Okwu Kwesịrị Ekwesị Iji Webata Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 148 para. 3–p. 149 para. 2)
No. 1: Tụọ Egwu Jehova, Ị Ga-enwekwa Obi Ụtọ—Akụkụ nke 2 (Ilu 25-31) ((w87-IB 5/15 p. 30 para. 11-29)
No. 2: Ilu 28:1-18
No. 3: Imeri Obi Mgbawa (yp-IB isi nke 31 p. 248-249)
No. 4: Ihe Mere na Anyị Ekwesịghị Ịdabere n’Ọdịdị Elu Ahụ́ nke Ndị Anyị Na-ezute n’Ozi Ubi Kpebie Ụdị Mmadụ Ha Bụ
Nov. 13 Ọgụgụ Bible: Eklisiastis 1-6 Abụ nke 25
Nkà Okwu: Imesi Okwu Ike n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị Na-agụnye Mmetụta (be-IB p. 150 para. 1-2)
No. 1: Ezi Ofufe Na-eju Afọ (Eklisiastis 1-6) (w87-IB 9/1 p. 30 para. 1–p. 31 para. 1)
No. 2: Eklisiastis 5:1-15
No. 3: Olee Otú E Si Zonahụ Ndị Amamihe na Ndị Nwere Ọgụgụ Isi Eziokwu Bible? (Mat. 11:25)
No. 4: Ụzọ Isi Mee Mbedo Ga-aga nke Ọma (yp-IB isi nke 32)
Nov. 20 Ọgụgụ Bible: Eklisiastis 7-12 Abụ nke 37
Nkà Okwu: Mesie Okwu Ndị Kwesịrị Ekwesị Ike (be-IB p. 150 para. 3–p. 151 para. 2)
No. 1: Okwu Amamihe (Eklisiastis 7-12) (w87-IB 9/1 p. 31 para. 2-20)
No. 2: Eklisiastis 9:1-12
No. 3: Ihe Ize Ndụ Ndị Dị ná Ndị Dị Afọ Iri na Ụma Ịṅụ Mmanya (yp-IB isi nke 33)
No. 4: Olee Ihe Dị Njọ Banyere Ekworo?
Nov. 27 Ọgụgụ Bible: Abụ nke Abụ 1-8 Abụ nke 11
Nkà Okwu: Ụzọ Dị Iche Iche E Si Emesi Okwu Ike (be-IB p. 151 para. 3–p. 152 para. 5)
No. 1: Ezi Ịhụnanya Na-enwe Mmeri! (w87-IB 12/15 p. 22-23)
No. 2: Abụ nke Abụ 7:1-8:4
No. 3: N’ihi Gịnị Ka Ndị Kraịst Ji Kwesị Ịdị Na-eyi Uwe Dị Mma n’Anya, nke Dị Ọcha, na nke Kwesịrị Ekwesị?
No. 4: Ihe Mere A Ga-eji Zere Ọgwụ Ọjọọ (yp-IB isi nke 34)
Dec. 4 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 1-5 Abụ nke 90
Nkà Okwu: E Ji Akwụkwọ Nsọ Mee Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi (be-IB p. 153 para. 1–p. 154 para. 3)
No. 1: aNṅụrị Ọṅụ Nye Ndị na-aga Ije n’Ìhè (w01-IB 3/1 p. 12-17)
No. 2: Aịsaịa 3:1-15
No. 3: Na-ahọ Ihe Ị Na-agụ Ahọ (yp-IB isi nke 35)
No. 4: bIhe Mere Ndị Kraịst Kwesịrị Iji “Ghara Ịdị Ngwa n’Inwe Ọnụma” (Jems 1:19)
Dec. 11 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 6-10 Abụ nke 204
Nkà Okwu: Ime Ka Nkọwa Akwụkwọ Nsọ Doo Anya (be-IB p. 154 para. 4–p. 155 para. 4)
No. 1: Ịkwadebe Ihe Ndepụta (be-IB p. 39-42)
No. 2: Aịsaịa 10:1-14
No. 3: N’ihi Gịnị Ka Inwe Ike Ịgbaghara Ji Dị Oké Mkpa?
No. 4: Na-achịkwa Ókè Ị Na-ekiriru TV (yp-IB isi nke 36)
Dec. 18 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 11-16 Abụ nke 47
Nkà Okwu: Tụgharịa Uche Site n’Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 155 para. 5–p. 156 para. 5)
No. 1: Ndị Ntorobịa—Kwenụ Ka Ndị Mụrụ Unu Nyere Unu Aka Ichebe Obi Unu (w04-IB 10/15 p. 20 para. 1–p. 22 para. 3)
No. 2: Aịsaịa 11:1-12
No. 3: Echiche Ziri Ezi Banyere Ntụrụndụ (yp-IB isi nke 37)
No. 4: Ezi Ndị Kraịst Agaghị Eso Lụọ Agha Amagedọn
Dec. 25 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 17-23 Abụ nke 53
Nkà Okwu: E Mere Ka Uru Ọ Bara Doo Anya (be-IB p. 157 para. 1–p. 158 para. 1)
Ntụleghachi
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Họrọ isi ihe ole na ole ndị dị n’ebe e kenyere gị ihe omume bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala ọgbakọ unu.
b Họrọ isi ihe ole na ole ndị dị n’ebe e kenyere gị ihe omume bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala ọgbakọ unu.
c Kenye ya nwanna nwoke.
d Kenye ya nwanna nwoke.
e Kenye ya nwanna nwoke.
f Kenye ya nwanna nwoke.
g Kenye ya nwanna nwoke.
h Họrọ isi ihe ole na ole ndị dị n’ebe e kenyere gị ihe omume bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala ọgbakọ unu.
i Họrọ isi ihe ole na ole ndị dị n’ebe e kenyere gị ihe omume bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala ọgbakọ unu.
j Kenye ya nwanna nwoke.
k Kenye ya nwanna nwoke.
l Họrọ isi ihe ole na ole ndị dị n’ebe e kenyere gị ihe omume bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala ọgbakọ unu.
a Kenye ya nwanna nwoke.
b Họrọ isi ihe ole na ole ndị dị n’ebe e kenyere gị ihe omume bụ́ ndị ga-akasị egbo mkpa e nwere n’ókèala ọgbakọ unu.