Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’October: A ga-enyefe magazin Ụlọ Nche na Teta! n’ọnwa ahụ nile. N’ebe e gosiri mmasị, biko webata broshuọ Na-achọ, ma gaghachi iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi. November: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwụkwọm nke Akụkọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla dị peeji 192 nke e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ nke ọgbakọ nwere. Ọ bụrụ na e nweghị ha, ị pụrụ inyefe akwụkwọ bụ́ Mankind’s Search for God, ma ọ bụ broshuọ Nọrọ na Nche!
◼ Ebe ọ bụ na e nwere ngwụsị izu ise zuru ezu n’ọnwa October, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ Ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa a bụ “Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2006,” e kwesịkwara idebe ya maka izo aka na ya n’ime afọ 2006 dum.