Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/00 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite March 13
  • Izu Na-amalite March 20
  • Izu Na-amalite March 27
  • Izu Na-amalite April 3
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 3/00 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite March 13

Abụ nke 118

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

15 min: “Anyị Na-ekwusa Ozi Ọma.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Nye ihe atụ nke isi ihe ndị na-ewuli elu sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị a pụrụ inweta site n’akwụkwọ Ihe Ọmụma mgbe a na-enyefe ya n’ozi.

20 min: “Ànyị Pụrụ Ime April 2000 Ọnwa Kasị Mma Anyị Nwetụrụla?” (Paragraf nke 1-11) Ajụjụ na azịza. Kwuo ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka e nwere n’ọgbakọ na nso nso a. Kpọọ ụfọdụ ndị so n’ime ha ka ha kọọ abamuru ndị ha na-enweta site n’ịmụba òkè ha na-ekere n’ozi. Gbaa ọgbakọ ume ịrụ ọrụ iji ruo ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu n’April. Tụleghachi iru eru ndị e depụtara n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 113-114. Ndị nkwusa chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka pụrụ inweta akwụkwọ ndejupụta ma a gbasaa nzukọ.

Abụ nke 187 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 20

Abụ nke 21

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: “Gịnị Ka M Pụrụ Ime?” Onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ esoro otu ohu na-eje ozi ma ọ bụ abụọ kwurịta isiokwu ahụ. N’ihi erughị eru dị iche iche, ndị nkwusa ụfọdụ pụrụ iche na ha nwere ike ịtụnye ụtụ dị nta n’ọrụ ọgbakọ na-arụ. Tụlee ụfọdụ n’ime ọtụtụ ụzọ anyị nile pụrụ isi tụnye ụtụ bara uru n’iwusi ọgbakọ ike na ime ka ọrụ Alaeze ahụ na-aga n’ihu. Mechie site n’igosi otú onye ọ bụla pụrụ isi “Kere Òkè n’Akụkọ Ozi Ikpeazụ.”—Lee Ozi Anyị, peji nke 108-110.

20 min: “Ànyị Pụrụ Ime April 2000 Ọnwa Kasị Mma Anyị Nwetụrụla?” (Paragraf nke 12-18) Ajụjụ na azịza. Mee ihe ngosi dị nkenke nke otú anyị pụrụ isi kpọọ ndị anyị maara òkù ịbịa Ememe Ncheta. Tụlee ọnwa April na 2000 Calendar ma kọwapụta ndokwa ọgbakọ mere maka nzukọ maka ije ozi. Chetara onye ọ bụla ka o mee ndokwa dị irè maka ikere òkè ruo n’ókè o kwere mee n’ozi ubi n’ọnwa ahụ, si otú a na-eburu n’obi mmadụ nile nọ n’ọgbakọ ikerezu òkè. Gbaa ndị nile nwere ike ime ya ume ịsụ ụzọ inyeaka na inweta akwụkwọ ndejupụta ma a gbasaa nzukọ.

Abụ nke 65 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 27

Abụ nke 119

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ha maka March. Maa ọkwa aha ndị nile ga-asụ ụzọ inyeaka n’April. Kọwaa na oge agafebeghị maka itinye akwụkwọ. Kọwapụta ndokwa dum e mere maka nzukọ maka ije ozi n’ọnwa ahụ. Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè n’ozi ná ngwụsị izu a, na-amalite ọnwa April n’ụzọ dị mma. Anyị ga-enyefe magazin Ụlọ Nche na Teta! n’ọnwa ahụ. Mee ka otu isiokwu na isi ihe kwesịrị ekwesị a pụrụ iji kwuo okwu pụta ìhè bụ́ nke a pụrụ iji mee ihe n’ụzọ dị irè n’inyefe mbipụta ndị ọhụrụ. Onye ọ bụla kwesịrị inwe broshuọ Na-achọ ma gbalịa iji ya malitere ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible.

10 min: Mkpa ọgbakọ.

25 min: “Jiri Akwụkwọ Anyị Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe.” Ntụle ajụjụ na azịza. Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 7, mee ihe ngosi abụọ ma ọ bụ atọ dị nkenke na-eji ụfọdụ n’ime aro ndị a tụrụ na paragraf nke 4-7.

Abụ nke 195 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 3

Abụ nke 72

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na ahụmahụ ozi ubi. Jiri ahụmahụ ndị a họtara bụ́ ndị mere n’ókèala unu na nso nso a mee ihe bụ́ ndị pụrụ ịgba ndị ọzọ ume ikere òkè.

17 min: “Ịmụ Amụma Daniel.” Ajụjụ na azịza. Kwuo okwu n’ụzọ dị mkpirikpi n’otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịmụ akwụkwọ Bible bụ́ Daniel. (Lee isi 1, paragraf nke 15-17, n’ime akwụkwọ Amụma Daniel.) Gbaa mmadụ nile ume ịgachi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ anya.

18 min: M̀ Kwesịrị Ịgba Àmà Mmehie Dị Oké Njọ? Okwu siri ike nke onye okenye ga-ekwu, nke lekwasịrị anya n’ebe ndị na-eto eto nọ. Ọtụtụ nsogbu ebilitewo n’ọha mmadụ nke oge a bụ́ ndị nweworo mmetụta dị oké njọ n’ahụ ndị na-eto eto: ụkpụrụ omume ọma nke na-ada ada, ime ihe ike nke na-arị elu, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na enweghị nkwanye ùgwù maka ịbụisi. Ụfọdụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na-ebi ụdị ndụ abụọ, na-ezochi àgwà ọjọọ ha. Nke a na-etinye ọdịmma ime mmụọ nke ọgbakọ dum n’ihe ize ndụ. Ụfọdụ na-eme mmehie dị oké njọ ma chọọ ikpuchi ya. Ọ bụrụ na ị mata na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị emebiwo iwu Chineke n’ụzọ dị oké njọ, gịnị ka i kwesịrị ime? Tụlee ụkpụrụ e depụtara na Levitikọs 5:1. (Lee Ụlọ Nche August 15, 1997, peji nke 27-30.) Zoo aka n’akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, peji nke 68-69, ma kọwaa ihe mmadụ kwesịrị ime n’ọnọdụ dị otú ahụ.

Abụ nke 68 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya