‘Gịnị Ka M Pụrụ Ime?’
1 ‘Gịnị ka m pụrụ ime?’ Obi abụọ adịghị ya na ajụjụ ahụ dị n’obi ndị so ná ntakịrị ìgwè ọmụmụ Bible ahụ Charles Taze Russell haziri n’afọ ndị 1870. Ka ha na-aghọtakwu uche Chineke, ndị mmụta Bible oge mbụ ahụ aghaghị icheworịị ihe ha pụrụ ime iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere nzube Chineke. Iji ihe ọmụma Bible ha na-enweta jezuo ụwa dum bụ oké ọrụ n’ezie.
2 Ọ bụụrụ anyị ihe obi ụtọ na ha meriri ihe ịma aka ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Onye ọ bụla mere òkè ya, nke yiri ka ọ dị ntakịrị, nke mere na taa, Ndịàmà Jehova abụrụwo ndị a maara n’ụwa nile—nzukọ nke nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị nkwusa Alaeze isii ndị na-eje ozi n’ihe dị ka ọgbakọ 90,000 n’ala na n’àgwàetiti 234!—Aịsa. 60:22.
3 Nye Nkwado Zuru Ezu: Ọ dị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị kere òkè ụfọdụ ná nnukwu ọrụ ahụ Jisọs buru amụma na a ga-arụ na mgbe ikpeazụ a. (Mak 13:10) N’ezie, a gaghị ahapụrụ nanị ndị okenye ọnụ ọgụgụ ha dị ntakịrị ọrụ a; ọrụ nkwusa ahụ adịghịkwa nanị n’ubu ndị ọsụ ụzọ. N’ezie, onye Kraịst ọ bụla raara onwe ya nye nwere ọrụ dị mkpa ọ ga-arụ. Anyị nile pụrụ ikere òkè n’ụdị ụfọdụ nke ọrụ nkwusa. (1 Tim. 1:12) Ruo n’ókè ọ bụla anyị na-eme nke a, anyị na-abara onwe anyị na ndị ọzọ uru.—1 Tim. 4:16.
4 Onye ọ bụla pụkwara ịkwado òtù ụmụnna ndị Kraịst anyị n’ụzọ zuru ezu n’ụzọ ndị ọzọ dị mkpa. Anyị pụrụ ịkwado nzukọ ọgbakọ site n’ịdị na-agachi ha anya na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè na ha. (Abụ Ọma 122:1, 8, 9) Anyị pụrụ ime òkè anyị iji mee ka ọgbakọ na-adị ọcha n’omume. Anyị pụrụ inye nkwado ego maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ dị ka akpa anyị hà. Anyị pụrụ ikere òkè n’ihichasị Ụlọ Nzukọ Alaeze. Onye ọ bụla pụrụ ịkwalite mmụọ ịhụnanya na ịdị n’otu n’ọgbakọ site n’inyere ndị ọhụrụ, ndị na-eto eto, nakwa ndị agadi aka.—Kọl. 3:12, 14.
5 N’ihi ya ị pụrụ ịjụ sị, ‘Gịnị ka m pụrụ ime?’ Ọ bụ ezie na mgbalị ndị ị na-eme n’onwe gị pụrụ iyi ka ọ dị ntakịrị, site n’ime òkè gị, ị na-atụnye ụtụ n’inwe ọgbakọ siri ike, nke na-arụsi ọrụ ike na nke na-eme nke ọma. Ya mere anyị nile nwere òkè dị mkpa anyị na-ekere n’ịsọpụrụ aha Jehova!