Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/00 p. 1
  • ‘Gịnị Ka M Pụrụ Ime?’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Gịnị Ka M Pụrụ Ime?’
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-akwado Ọgbakọ Unu
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Inye Onwe Anyị n’Afọ Ofufo Maka Ezi Ọrụ Nile
    Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Olee Otú Ị Ga-esi Mee Ka Ọgbakọ Na-adị n’Otu?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ka E Wulie Ọgbakọ Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 3/00 p. 1

‘Gịnị Ka M Pụrụ Ime?’

1 ‘Gịnị ka m pụrụ ime?’ Obi abụọ adịghị ya na ajụjụ ahụ dị n’obi ndị so ná ntakịrị ìgwè ọmụmụ Bible ahụ Charles Taze Russell haziri n’afọ ndị 1870. Ka ha na-aghọtakwu uche Chineke, ndị mmụta Bible oge mbụ ahụ aghaghị icheworịị ihe ha pụrụ ime iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere nzube Chineke. Iji ihe ọmụma Bible ha na-enweta jezuo ụwa dum bụ oké ọrụ n’ezie.

2 Ọ bụụrụ anyị ihe obi ụtọ na ha meriri ihe ịma aka ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Onye ọ bụla mere òkè ya, nke yiri ka ọ dị ntakịrị, nke mere na taa, Ndịàmà Jehova abụrụwo ndị a maara n’ụwa nile—nzukọ nke nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị nkwusa Alaeze isii ndị na-eje ozi n’ihe dị ka ọgbakọ 90,000 n’ala na n’àgwàetiti 234!—Aịsa. 60:22.

3 Nye Nkwado Zuru Ezu: Ọ dị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị kere òkè ụfọdụ ná nnukwu ọrụ ahụ Jisọs buru amụma na a ga-arụ na mgbe ikpeazụ a. (Mak 13:10) N’ezie, a gaghị ahapụrụ nanị ndị okenye ọnụ ọgụgụ ha dị ntakịrị ọrụ a; ọrụ nkwusa ahụ adịghịkwa nanị n’ubu ndị ọsụ ụzọ. N’ezie, onye Kraịst ọ bụla raara onwe ya nye nwere ọrụ dị mkpa ọ ga-arụ. Anyị nile pụrụ ikere òkè n’ụdị ụfọdụ nke ọrụ nkwusa. (1 Tim. 1:12) Ruo n’ókè ọ bụla anyị na-eme nke a, anyị na-abara onwe anyị na ndị ọzọ uru.—1 Tim. 4:16.

4 Onye ọ bụla pụkwara ịkwado òtù ụmụnna ndị Kraịst anyị n’ụzọ zuru ezu n’ụzọ ndị ọzọ dị mkpa. Anyị pụrụ ịkwado nzukọ ọgbakọ site n’ịdị na-agachi ha anya na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè na ha. (Abụ Ọma 122:1, 8, 9) Anyị pụrụ ime òkè anyị iji mee ka ọgbakọ na-adị ọcha n’omume. Anyị pụrụ inye nkwado ego maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ dị ka akpa anyị hà. Anyị pụrụ ikere òkè n’ihichasị Ụlọ Nzukọ Alaeze. Onye ọ bụla pụrụ ịkwalite mmụọ ịhụnanya na ịdị n’otu n’ọgbakọ site n’inyere ndị ọhụrụ, ndị na-eto eto, nakwa ndị agadi aka.—Kọl. 3:12, 14.

5 N’ihi ya ị pụrụ ịjụ sị, ‘Gịnị ka m pụrụ ime?’ Ọ bụ ezie na mgbalị ndị ị na-eme n’onwe gị pụrụ iyi ka ọ dị ntakịrị, site n’ime òkè gị, ị na-atụnye ụtụ n’inwe ọgbakọ siri ike, nke na-arụsi ọrụ ike na nke na-eme nke ọma. Ya mere anyị nile nwere òkè dị mkpa anyị na-ekere n’ịsọpụrụ aha Jehova!

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya