Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 12/15 p. 26-29
  • Mkpebi nke Kwadoro Ime Nhọrọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpebi nke Kwadoro Ime Nhọrọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Iwu na Omume Ọha Mmadụ
  • Agbamume Dị Ịtụnanya
  • Mkpebi Ahụ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 12/15 p. 26-29

Mkpebi nke Kwadoro Ime Nhọrọ

Ọ DỊGHỊ onye na-akwado nhọrọ dabeere n’ihe ọmụma karịa Onye ahụ kasị dị ebube n’eluigwe na ala. Ọ bụ Onye Okike anyị. N’ịbụ onye nwere ihe ọmụma a na-akparaghị ókè banyere mkpa nke mmadụ, ọ na-enye ntụziaka, ịdọ aka ná ntị na nduzi n’ụba banyere ụzọ amamihe dị na ya ịgbaso. Ma, ọ dịghị eleghara nnwere onwe ime nhọrọ nke o nyere ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi anya. Onye amụma ya bụ́ Mosis gosipụtara echiche Chineke: “Ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị.”—Deuterọnọmi 30:19.

Ụkpụrụ a metụtara nkà ọgwụ na ahụ ike. E ji nke nta nke nta na-anabata echiche nke nhọrọ dabeere n’ihe ọmụma, ma ọ bụ nkweta dabeere n’ihe ọmụma na Japan nakwa n’ala ndị ọzọ bụ́ ebe ndị a na-adịghị anabatabu ya otú ahụ n’oge gara aga. Dr. Michitaro Nakamura nyere nkọwa a banyere nkweta dabeere n’ihe ọmụma: “Ọ bụ echiche nke bụ na onye dọkịta ga-akọwara onye ọrịa ahụ n’asụsụ dị mfe nghọta, ọrịa ọ na-arịa, atụmanya mgbake ya, usoro e ji agwọ ya, na ihe ọjọọ ndị ọ pụrụ ịrụpụta, na-asọpụrụ ikike onye ọrịa nwere ikpebiri onwe ya usoro a ga-eji agwọ ya.”—Japan Medical Journal.

Ruo ọtụtụ afọ, ndị dọkịta nọ na Japan ekwuwo ọtụtụ ihe mere ha ji na-eguzogide ụzọ a e si agwọ ndị ọrịa, ụlọikpe eyiwokwa ka ha na-akwado omume nke ndị ọrụ ahụ ike. N’ihi ya, ọ bụ ihe dị ịrịba ama mgbe Ọkàikpe Ukwu bụ́ Takeo Inaba nke Ụlọikpe Dị Elu nke Tokyo kwupụtara mkpebi nke kwadoro nhọrọ dabeere n’ihe ọmụma na February 9, 1998. Gịnị bụ mkpebi ahụ, oleekwa ihe wetara ihe iseokwu ahụ n’ụlọikpe?

Laa azụ na July 1992, Misae Takeda gbara afọ 63, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, jere n’Ụlọ Ọgwụ nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Sayensị Ọgwụ na Ahụ Ike nke Mahadum Tokyo. A chọpụtawo na o nwere akpụ dị oké njọ n’imeju ya, ya adịkwa mkpa ka a waa ya ahụ. N’ịchọsi ike irube isi n’iwu Bible megide iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, o mere ka ọchịchọ ya nke ịnara nanị ọgwụgwọ n’ejighị ọbara doo ndị dibịa bekee ya anya. (Jenesis 9:3, 4; Ọrụ 15:29) Ndị dibịa bekee ahụ nabatara idejupụta fọm ntọhapụ n’ibu ọrụ, bụ́ nke tọhapụrụ ha na ụlọ ọgwụ ahụ n’iburu ibu ọrụ ọ bụla ga-apụta site ná mkpebi ya. Ha mesiri ya obi ike na ha ga-eme dị ka ha kwekọrịtara.

Otú ọ dị, mgbe a wasịrị ya ahụ, ka ọgwụ na-eme ka mmadụ ghara ịma onwe ya ka na-akpa ike n’ahụ Misae, a mịnyere ya ọbara—nke megidere kpọmkwem ọchịchọ ya o mere ka ọ pụta ìhè. Mgbalị nile e mere iji zochie mmịnye ọbara ahụ a na-akwadoghị kụrụ afọ n’ala mgbe otu onye ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ kpugheere ya onye nta akụkọ. Dị ka ị pụrụ ịghọta, o gburu nwanyị a bụ́ ezi onye Kraịst mgbu n’obi mgbe ọ nụrụ banyere mmịnye ọbara ahụ ọ na-akwadoghị. Ọ tụkwasịwo ndị ọrụ ahụ ike ahụ obi, na-eche na ha ga-eme ihe ha kwuru ma sọpụrụ nkweta okpukpe ya. O weere okwu ahụ gaa n’ụlọikpe n’ihi nhụjuanya nke mmetụta uche mmebi a dị oké njọ e mebiri mmekọrịta dị n’etiti dọkịta na onye ọrịa kpataara ya, n’olileanya nke iguzobe ụkpụrụ nke ga-eme ka a ghara imeso ndị ọzọ mmeso ọjọọ dị otú ahụ n’ọrụ ahụ ike.

Iwu na Omume Ọha Mmadụ

Ndị ọkàikpe atọ nke Ụlọikpe Ógbè Tokyo nụrụ okwu ikpe ahụ ma kpelaara ndị dibịa bekee ahụ ikpe, si otú a megidekwa ikike nke nkweta dabeere n’ihe ọmụma. Ná mkpebi ha, bụ́ nke e kwupụtara na March 12, 1997, ha kwuru na mgbalị ọ bụla e mere iji nwee nkwekọrịta maka ọgwụgwọ n’ejitụghị ọbara adịghị irè. Echiche ha bụ na onye dibịa bekee ịbanye ná nkwekọrịta pụrụ iche nke ịghara ịmịnye ọbara ma ọ bụrụgodị na ọnọdụ dị oké njọ ebilite ga-abụ imegide kojo ryozoku,a ma ọ bụ ụkpụrụ nke ọha mmadụ. Echiche ha bụ na ibu ọrụ bụ́ isi nke onye dọkịta nwere bụ ịzọpụta ndụ n’ụzọ kasị mma ọ pụrụ isi mee ya, ya mere nkwekọrịta dị otú ahụ ga-abụ nke na-adịghị irè site ná mmalite, n’agbanyeghị nkweta okpukpe nke onye ọrịa ahụ. Ha kpebiri na n’ikpeazụ, echiche ọkachamara nke onye dibịa bekee kwesịrị ibute ọgwụgwọ ọ bụla nke onye ọrịa pụrụ ịchọworị ụzọ.

Ọzọkwa, ndị ọkàikpe ahụ kwuru na n’ihi otu ihe ahụ, ọ bụ ezie na a tụrụ onye dọkịta anya n’aka ịkọwa usoro bụ́ isi a ga-eji awa ahụ e mere atụmatụ ya, ihe ọjọọ ga-esi na ya pụta, na ihe ize ndụ ndị dị na ya, onye dibịa bekee “pụrụ ịhapụ ikwu ma ọ chọrọ inye ọbara ma ọ bụ na ọ chọghị.” Mkpebi ha bụ: “A pụghị ikpebi na ọ bụ ihe iwu na-akwadoghị ma ọ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị na ndị dọkịta ahụ dị ka Ndị Na-azara Ọnụ Ha ghọtara ọchịchọ nke Onye ahụ Gbara Akwụkwọ ịghara ịnara mmịnye ọbara n’ọnọdụ ọ bụla ma mee dị ka a ga-asị na ha ga-asọpụrụ ọchịchọ ya, ma sikwa otú a mee ka ọ nakwere ịwa ahụ ahụ a na-ekwu okwu ya.” Echiche ha bụ na ọ bụrụ na ndị dibịa bekee ahụ emeghị otú ahụ, onye ọrịa ahụ pụrụ ịjụworị ịwa ahụ ma si n’ụlọ ọgwụ ahụ laa.

Mkpebi ụlọikpe ahụ wụrụ ndị na-akwado nkweta dabeere n’ihe ọmụma akpata oyi n’ahụ ma wute ha. N’ikwu banyere mkpebi nke okwu ikpe Takeda na ihe ọ pụtara nye nkweta dabeere n’ihe ọmụma na Japan, Prọfesọ Takao Yamada, bụ́ oké mmadụ n’iwu banyere ihe ruuru mmadụ dere, sị: “Ọ bụrụ na e kwe ka echiche nke mkpebi a dịgide, ịjụ mmịnye ọbara na ụkpụrụ iwu nke nkweta dabeere n’ihe ọmụma ga-aghọ ọkụ kandụl ifufe na-achọ ifenyụ.” (Akwụkwọ iwu bụ́ Hogaku Kyoshitsu) O ji okwu ndị siri ike katọọ ọbara ahụ a mịnyere n’ike dị ka “imebi ntụkwasị obi n’ụzọ jọgburu onwe ya, nke yiri mwakpo mberede.” Prọfesọ Yamada gbakwụnyere na e kwesịghị “ịnabata ma ọlị” omume dị otú ahụ na-ebibi ntụkwasị obi.

Ọdịdị ime nwayọọ nwayọọ nke Misae mere ka o sie ike ịmara banyere ya. Ma n’ịghọta na ya pụrụ ikere òkè n’ịgbachitere aha Jehova na ụkpụrụ ezi omume ya banyere ịdị nsọ nke ọbara, o kpebisiri ike ime òkè nke ya. O degaara onye ndụmọdụ iwu ya akwụkwọ, sị: “Abụzi m nanị ájá, ọbụna dị ala karịa. Ihe mere e ji were onye na-erughị eru dị ka m mee ihe na-eju m anya. Ma mgbe m chọrọ ime nnọọ ihe Jehova—onye ahụ pụrụ ime ka nkume tie mkpu—na-ekwu, ọ ga-enye m ike.” (Matiu 10:18; Luk 19:40) Mgbe o guzoro n’elu ebe onye akaebe na-eguzo n’oge ikpe ahụ, o ji olu na-ama jijiji kọwaa ihe mgbu mmetụta uche o nwere n’ihi mgba okpuru ahụ. “Enwere m mmetụta nke onye e metọrọ emetọ, dị ka nwanyị e dinaworo n’ike.” Akaebe ya gbara ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ime ụlọikpe n’ụbọchị ahụ anya mmiri.

Agbamume Dị Ịtụnanya

N’ihi mkpebi nke Ụlọikpe Ógbè ahụ, e tinyere akwụkwọ mkpegharị ikpe ozugbo n’Ụlọikpe Dị Elu. Arụmụka malitere n’ụlọikpe mkpegharị ikpe ahụ na July 1997, Misae na-enweghịzi ume ugbu a ma ka nwee mkpebi siri ike nọ n’ebe ahụ n’oche nkwagharị. Ọrịa cancer ahụ amalitewo ịrịa ya ọzọ, ike na-agwụkwa ya karị. A gbara Misae ume nke ukwuu mgbe ọkàikpe ukwu ahụ, n’ịhazi okwu n’ụzọ pụrụ iche, mere ka ebe ụlọikpe ahụ gaje iche ihu doo anya. O mere ka ọ pụta ìhè na ụlọikpe mkpegharị ikpe ahụ ekwetaghị n’ihe ụlọikpe ahụ dị ala chọpụtara—na onye dibịa bekee nwere ikike ileghara ọchịchọ nke onye ọrịa anya, na-eme dị ka a ga-asị na ọ ga-eme ihe ha kwekọtara ma kpebie na nzuzo ime ihe ọzọ. Ọkàikpe ukwu ahụ kwuru na ụlọikpe ahụ agaghị akwado ụkpụrụ enyeghị nnwere onwe ime mkpebi bụ́ “Shirashimu bekarazu, yorashimu beshi,”b nke pụtara, “Mee ka ha ghara ịmara ihe na-arịa ha ma dabere” ná ndị ọrụ ahụ ike. Misae mesịrị kwuo, sị: “Obi tọrọ m nnọọ ụtọ ịnụ okwu ọkàikpe ahụ nke ile mmadụ anya n’ihu na-adịghị na ya, bụ́ nke dị nnọọ iche ná mkpebi nke Ụlọikpe Ógbè ahụ.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ihe a ka m nọworo na-ekpekuru Jehova n’ekpere.”

Misae nwụrụ n’ọnwa na-esonụ ka ezinụlọ ya na-ahụ n’anya na ndị ọrụ nke ụlọ ọgwụ ọzọ, bụ́ ebe a ghọtara ma sọpụrụ nkweta ya sitere n’obi eziokwu, gbara ya gburugburu. Ọ bụ ezie na ọnwụ ya wutere ha, nwa ya nwoke, bụ́ Masami, na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ahụ kpebiri isochi ikpe ahụ ruo n’ọgwụgwụ ya, n’ikwekọ n’ọchịchọ Misae.

Mkpebi Ahụ

N’ikpeazụ, ndị ọkàikpe atọ nke Ụlọikpe ahụ Dị Elu kwupụtara mkpebi ha na February 9, 1998, na-agbanwe mkpebi nke ụlọikpe ahụ dị ala. Ndị nta akụkọ, ndị nkà mmụta, na ndị ọzọ jiworo ikwesi ntụkwasị obi sochie ikpe ahụ anya jupụtara n’ụlọikpe ahụ dị ala. Akwụkwọ akụkọ na ụlọ ọrụ telivishọn ndị bụ́ isi kọrọ banyere mkpebi ahụ. Ụfọdụ n’ime isiakụkọ ndị ahụ bụ: “Ụlọikpe: Ndị Ọrịa Pụrụ Ịjụ Ọgwụgwọ”; “Ụlọikpe Dị Elu: Mmịnye Ọbara Imegide Ikike Mmadụ”; “Ikpe Amaa Dọkịta Mịnyere Ọbara n’Ike”; na “A Kwụọ Ndịàmà Jehova Ụgwọ Iti Aka n’Obi n’Ihi Mmịnye Ọbara.”

Akụkọ ndị a kọrọ banyere mkpebi ahụ ziri ezi ma dị mma nke ukwuu. The Daily Yomiuri kọrọ, sị: “Ọkàikpe Takeo Inaba kwuru na o kwesịghị ekwesị ndị dọkịta ịgbaso ọgwụgwọ nke onye ọrịa jụrụ.” O kwukwara n’ụzọ pụtara ìhè, sị: “Ndị dọkịta ahụ [mịnyere ọbara] napụrụ ya ohere nke ịhọrọ ọgwụgwọ ọ chọrọ.”

Asahi Shimbun kwupụtara na ọ bụ ezie na n’ọnọdụ a ụlọikpe ahụ chere na e nweghị ihe akaebe zuru ezu na-egosi na e nwere nkwekọrịta, bụ́ ebe òtù abụọ ahụ nọ kwenye na a gaghị eji ọbara eme ihe ọbụna n’ọnọdụ dị ize ndụ, ndị ọkàikpe ahụ ekwenyeghị n’ihe ụlọikpe ahụ dị ala kwuru banyere nkwekọrịta dị otú ahụ ịbụrịrị nke iwu kwadoro: “Ọ bụrụ na e nwere nkwekọrịta a tụlere nke ọma n’etiti òtù abụọ ahụ o metụtara nke bụ́ na e kwesịghị ịmịnye ọbara n’ọnọdụ ọ bụla, Ụlọikpe a adịghị ahụ ya dị ka ihe megidere iwu ọha mmadụ, n’ihi ya kwa, bụrụ ihe na-adịghị irè.” Ọzọkwa, akwụkwọ akụkọ a kwupụtara echiche ndị okàikpe ahụ nke bụ́ na “mmadụ ọ bụla gaje ịnwụ otu ụbọchị, nakwa na onye ọ bụla pụrụ ikpebi usoro ga-eduba n’oge ọnwụ ahụ.”

N’ezie, Ndịàmà Jehova enyochawo okwu a ma kwenyesie ike na ha na-ahọrọ ụzọ kasị mma isi ebi ndụ. Nke ahụ na-agụnye ịjụ ihe ize ndụ ndị a ma ama nke mmịnye ọbara ma kama nke ahụ ịnara ọgwụgwọ n’ejighị ọbara, bụ́ ndị e jiworo mee ihe n’ụzọ sara mbara n’ọtụtụ ala, ndị kwekọkwara n’iwu Chineke. (Ọrụ 21:25) Otu prọfesọ a maara nke ọma n’iwu e ji achị obodo bụ́ onye Japan kwupụtara, sị: “N’eziokwu, ọjụjụ a jụrụ ọgwụgwọ nke iji [mmịnye ọbara] eme ihe a na-ekwu banyere ya abụghị ihe metụtara ịhọrọ ‘otú a ga-esi nwụọ’ kama nke ahụ, ọ bụ otú a ga-esi dị ndụ.”

Mkpebi nke Ụlọikpe ahụ Di Elu kwesịrị ime ka ndị dibịa bekee mara na ikike iwu nyere ha erughị otú ụfọdụ ndị cheworo. O kwesịkwara ime ka ọtụtụ ụlọ ọgwụ ndị ọzọ hiwe ụkpụrụ nduzi. Ọ bụ ezie na ndị mmadụ n’ozuzu ha nakweere mkpebi a, ya ana-agbakwa ndị ọrịa ume, bụ́ ndị na-adịghị enwekarị ọnụ okwu n’ọgwụgwọ a na-enye ha, ọ bụghị mmadụ nile jiworo obi ha dum nabata ya. Ụlọ ọgwụ nke steeti na ndị dibịa bekee atọ ahụ etinyewo akwụkwọ mkpegharị ikpe n’Ụlọikpe Kasị Elu. Ya mere anyị aghaghị ichere iji hụ ma ụlọikpe kasị elu nke Japan ọ ga-akwadokwa ikike onye ọrịa nwere, dị ka Ọkaaka nke eluigwe na ala kwadoro.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Echiche iwu na-akọwaghị nke a hapụụrụ majie ịkọwa ma kwuo otú o si bata n’okwu.

b Nke a bụ ụkpụrụ nke ndị nwe obodo nke oge Tokugawa banyere otú ha kwesịrị isi chịa ndị nọ n’okpuru ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya