Ọkà Mmụta Enyegharịa Ihe Odide Bible Oge
Dị ka Carsten Peter Thiede, bụ́ onye Germany bụ́ ọkachamara n’ọmụmụ nke ihe odide papyrus, si kwuo, e nwere ihe àmà siri ike na e dere iberibe ihe odide atọ nke Oziọma Matiu (nke a maara dị ka Magdalen Papyrus) na narị afọ mbụ.
Mgbe o jisịrị iberibe ndị ahụ (nke nwere akụkụ ụfọdụ nke Matiu isi nke 26) tụnyere otu akwụkwọ ozi azụmahịa oge ochie a chọtara n’Ijipt, Thiede kwuru na akwụkwọ Ijipt ahụ ‘yichara nnọọ Magdalen Papyrus—n’ọdịdị ha n’ozuzu ya nakwa otú e si hazie ha na otú e si dee mkpụrụ okwu nke ọ bụla.’ Thiede na onye ya na ya so dee akwụkwọ bụ́ Matthew D’Ancona kwubiri n’akwụkwọ ha bụ́ Eyewitness to Jesus—Amazing New Manuscript Evidence About the Origin of the Gospels na myirita ndị dị n’etiti akwụkwọ abụọ ahụ na-egosi na e dere ha n’ihe dị ka otu oge. Ole mgbe? E nyere akwụkwọ azụmahịa ahụ oge ịbụ “‘N’afọ nke 12 nke Nero Onyenwe anyị, Epeiph 30’—nke bụ́ July 24, 66 [O.A.], dị ka kalenda anyị si dị.”
“Ọgụgụ oge nke a, ọ bụrụ na o ziri ezi, dị nnọọ ịrịba ama,” ka Prọfesọ Philip W. Comfort na-ekwu, n’otu isiokwu e bipụtara na Tyndale Bulletin, “n’ihi na ọ na-edote otu ihe odide nke Oziọma Matiu n’ime otu narị afọ ahụ e dere ya.” Ọ ga-emekwa ka Magdalen Papyrus bụrụ iberibe Oziọma kasị ochie dịnụ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]
Site n’ikike nke Onyeisi na Ndị Òtù Magdalen College, Oxford
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]
Magdalen Papyrus, bụ́ nke e gosiri otú ọ hà n’ezie