Ezinụlọ—Ọnọdụ Chọrọ Ime Ihe Ngwa Ngwa!
“HA WEE biri n’obi ụtọ ka nke ahụ gasịrị.” Ọnọdụ ahụ magburu onwe ya dị n’alụmdi na nwunye ole na ole taa. Nkwa agbamakwụkwọ ahụ nke ịhụrịta onwe ha n’anya ‘ma ọ dị mma ma ọ dị njọ n’ogologo oge ha abụọ ga-adị ndụ’ na-abụkarị okwu na-esighị n’obi. Ikwe omume nke inwe ezinụlọ obi ụtọ na-eyi ịgba chaa chaa nke yikarịrị ka a gaghị erite ya.
N’agbata 1960 na 1990, ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm mụbara ihe karịrị okpukpu abụọ n’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná mba ndị mepere emepe nke Ebe Ọdịda Anyanwụ. Ná mba ụfọdụ ha mụbara okpukpu anọ. Dị ka ihe atụ, kwa afọ a na-enwe ọlụlụ di na nwunye 35,000 na Sweden, ihe dịkwa ka ọkara n’ime ha ga-etisa, na-emetụta ihe karịrị ụmụaka 45,000. Ndị na-ebikọ ọnụ n’alụghị alụ na-ekewa ọbụna n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu, na-emetụtakwu ọtụtụ iri puku ụmụaka. Ihe yiri ya na-ewelite isi ná mba dị iche iche gburugburu ụwa, dị ka a pụrụ ịhụ n’igbe dị na peji nke 5.
N’eziokwu, ezinụlọ e kewara ekewa na ntisa nke alụmdi na nwunye abụghị ihe ọhụrụ n’akụkọ ihe mere eme. Usoro Iwu Hammurabi nke narị afọ nke 18 T.O.A. gụnyere iwu ndị kwere ka e nwee ịgba alụkwaghịm na Babylonia. Ọbụna Iwu Mosis, nke e guzobere na narị afọ nke 16 T.O.A., kwere ka e nwee ịgba alụkwaghịm n’Israel. (Deuterọnọmi 24:1) Otú ọ dị, ọ dịbeghị mgbe nkekọ ezinụlọ bụ nke na-esighị ike karịa ka ọ dị na narị afọ nke 20 nke a. Ihe karịrị afọ iri gara aga, otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ dere, sị: “Afọ 50 site ugbu a, o nwere ike anyị agaghịdị enwe ezinụlọ ọ bụla zuru ezu. A pụrụ ijiworị njikọta dị iche iche dochie ha.” Ihe na-eme kemgbe ahụ na-eyikwa ka ọ na-akwado echiche ya. Ndokwa ezinụlọ adakpọwo nnọọ ngwa ngwa nke na ajụjụ bụ́, “Ọ̀ ga-alanarị?” na-abụwanye nke dabara adaba.
N’ihi gịnị ka o ji na-esiri nnọọ ọtụtụ di na nwunye ike ịrapara n’ahụ ibe ha ma nọgide na-enwe ezinụlọ dị n’otu? Gịnị bụ isi ihe mere ka ndị ahụ bikọworo ọnụ ruo ogologo ndụ nwee ike ime otú ahụ, jiri obi ụtọ na-eme ememe mgbaafọ 25 na 50 ha gbara akwụkwọ? Ọ dabara na, na 1983, a kọrọ na otu nwoke na otu nwanyị nọ n’ebe bụbu repọblik Soviet bụ́ Azerbaijan mere ememe mgbaafọ 100 ha gbara akwụkwọ—mgbe ha dị afọ 126 na 116 n’otu n’otu.
Gịnị Na-eyi Ya Egwu?
N’ọtụtụ mba, ụfọdụ ihe mgbakwasị ụkwụ maka ịgba alụkwaghịm iwu kwadoro bụ ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, mmekpọ ọnụ nke uche ma ọ bụ anụ ahụ, mgbahapụ, aṅụrụma, enweghị ike ịtụwa ime, isi ezughị okè, ịlụ mmadụ abụọ, na iri ahụ nke ọgwụ ọjọọ. Otú ọ dị, ihe zuru ebe nile na-akpata ya karị bụ na àgwà bụ isi n’ebe alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ zuru ezu dị agbanwewo n’ụzọ dị ukwuu, karịsịa n’afọ iri ndị na-adịbeghị anya. Nkwanye ùgwù maka ndokwa e weere dị ka ihe dị nsọ eri ogologo oge adakpọwo. Ndị anyaukwu na-emepụta egwú, sinima, usoro ihe nkiri TV, na akwụkwọ ndị na-ewu ewu etowo ihe a na-akpọ nnwere onwe inwe mmekọahụ, omume rụrụ arụ, agụụ ịkwa iko, na ụzọ ndụ iche nanị banyere onwe onye. Ha akwalitewo omume nke mebiworo uche na obi nke ma ndị na-eto eto ma ndị agadi.
Njụta echiche e mere na 1996 gosiri na pasent 22 nke ndị America na-ekwu na di ma ọ bụ nwunye iso onye ọzọ nwee mmekọahụ pụrụ ịdị mma mgbe ụfọdụ nye alụmdi na nwunye. Mbipụta pụrụ iche nke akwụkwọ akụkọ Sweden kasị ukwuu, bụ́ Aftonbladet, gbara ndị inyom ume ịgba alụkwaghịm n’ihi na “ọ pụrụ nanị ịka mma.” Ụfọdụ ndị ọkà a ma ama n’akparamàgwà mmadụ na n’ihe banyere mmadụ echewo ọbụna na evolushọn “haziri” mmadụ ịgbanwe onye òtù ọlụlụ ya n’afọ ole na ole ọ bụla. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha na-enye echiche na di ma ọ bụ nwunye iso onye ọzọ nwee mmekọahụ na ịgba alụkwaghịm kwesịrị ekwesị. Ọbụna ụfọdụ na-arụ ụka na ịgba alụkwaghịm nne ma ọ bụ nna pụrụ ịdịrị ụmụaka mma, na-ejikere ha ịnagide ịgba alụkwaghịm nke ha otu ụbọchị!
Ọtụtụ ndị ntorobịa achọghịkwa ịdị ụdị ndụ ezinụlọ zuru ezu, na-enwe nna, nne, na ụmụaka. “Apụghị m iche echiche ịdị ndụ m nile na-enwe otu onye ibe,” bụ echiche na-ewu ewu. “Alụmdi na nwunye yiri Krismas, nanị akụkọ ifo. Ekweghị m nnọọ na ya,” ka otu nwa okorobịa dị afọ 18 bụ́ onye Denmark kwuru. “Echiche a na-enwe bụ, n’ihi gịnị ka m ga-eji enye onwe m nsogbu iso [ndị ikom] na-ebi ma na-asụ sọks ha,” ka Noreen Byrne nke Kansụl Mba Maka Ndị Inyom na Ireland kwuru. “Nanị jee soro ha gwuo egwu . . . Ọtụtụ ndị inyom na-ekpebi na ndị ikom adịghị ha mkpa iji nọgide na-adị ndụ.”
Ezinụlọ Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna Na-amụba
Gburugburu Europe, àgwà a edugawo ná mmụba dị ngwa nke ndị nne na-anọghị na di. Ụfọdụ ndị nne a na-anọghị na di bụ ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị na-eche na ime a na-emeghị atụmatụ ya abụghị ihie ụzọ. Ole na ole bụ ndị inyom chọrọ ịzụlite nwa ha nanị ha. Ihe ka ọtụtụ bụ ndị nne na-ebinyere nna nwa ha ruo oge ụfọdụ, n’enweghị atụmatụ ọ bụla ịlụ ya. Magazin bụ́ Newsweek bu akụkọ e dere n’ihu ya n’afọ gara aga n’ajụjụ bụ́ “Ọ̀ Bụ Ọnwụ nke Alụmdi na Nwunye?” O kwuru na pasent nke ụmụ ndị a na-amụ n’alụghị di na nwunye na-amụba ngwa ngwa na Europe nakwa na ọ dịghị onye yiri ka ọ na-eche banyere ya. Sweden pụrụ ịbụ nke kasị, na-enwe ọkara nke ụmụ ọhụrụ nile nọ n’ebe ahụ dị ka ndị a na-amụghị n’ime alụmdi di na nwunye. Na Denmark na Norway, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara, na France na England kwa, ihe dị ka 1 n’ime 3.
Na United States, ezinụlọ nwere nne na nna adalatawo nke ukwuu n’afọ iri ole na ole ndị gara aga. Otu akụkọ na-asị: “Na 1960, . . . pasent 9 nke ụmụaka nile biri n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna. Ka ọ na-erule 1990, ọnụ ọgụgụ ahụ gbagoro nke ukwuu ruo pasent 25. Taa, pasent 27.1 n’ime ụmụaka America nile bụ ndị a mụrụ n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna, bụ́ ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu. . . . Kemgbe 1970, ọnụ ọgụgụ nke ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna arịwo elu karịa okpukpu abụọ. A na-eyi ezinụlọ zuru ezu egwu taa nke na ọ pụrụ ịnọ n’ọnụ mkpochapụ, ka ụfọdụ ndị nchọpụta na-ekwu.”
Ná mba ndị Chọọchị Roman Katọlik tụfuworo ọtụtụ ikike ya inye ntụzi banyere omume, ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna na-amụba. Ihe na-erughị ọkara nke ezinụlọ ndị Itali nwere nne, nna, na ụmụaka, a na-ejikwa di na nwunye ndị na-enweghị nwa na ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna, edochizi anya ezinụlọ zuru ezu.
Ụlọ ọrụ na-elekọta ndị nọ ná mkpa ná mba ụfọdụ na-agba ndị mmadụ ume n’ezie ịghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ndị nne na-anọghị na di bụ́ ndị na-anata enyemaka ọha na eze agaghị enwetakwa ya ma ọ bụrụ na ha alụọ di. Ndị nne na-anọghị na di na Denmark na-enwetakwu onyinye ego nlekọta nwa, n’ógbè ụfọdụ kwa, ndị nne ka bụ ụmụaka na-enwetakwu ego, a na-akwụkwara ha ụgwọ ụlọ ha. N’ihi ya, ọ chọrọ ego. Alf B. Svensson na-azọrọ na ịgba alụkwaghịm na Sweden na-efu ndị na-atụ ụtụ isi agbata puku dollar 250 na 375 n’onyinye ego, ego mmachi akpa maka ụlọ, na enyemaka ọha na eze.
O yiri ka chọọchị Krisendọm enweghị ihe ha na-eme iji gbanwee ihe a na-ebibi ihe na-eme n’ime ezinụlọ dị iche iche. Ọtụtụ ndị pastọ na ndị ụkọchukwu na-agbaso nsogbu ezinụlọ nke ha mgba, n’ihi ya na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị na-enweghị ike inyere ndị ọzọ aka. Ọbụna o yiri ka ụfọdụ ha na-akwado ịgba alụkwaghịm. Aftonbladet nke April 15, 1996, kọrọ na pastọ Steven Allen si Bradford, England, hiwere ememe ịgba alụkwaghịm pụrụ iche, nke ọ tụrụ aro na o kwesịrị ịbụ omume iwu kwadoro na chọọchị Britain nile. “Ọ bụ ije ozi nke ịgwọ ọrịa iji nyere mmadụ aka ịnagide ihe meworo ha. Ọ na-enyere ha aka ịmata na Chineke ka hụrụ ha n’anya ma na-atọhapụ ha n’ihe mgbu ahụ.”
Ya mere olee ebe ndokwa ezinụlọ na-eche ihu? È nwere olileanya maka nlanarị ya? Ezinụlọ n’otu n’otu hà pụrụ ichekwa ịdị n’otu ha ebe ọ bụ na ha nọ n’okpuru iyi egwu dị ukwuu dị otú ahụ? Biko tụlee isiokwu na-esonụ.
[Igbe dị na peeji nke 5]
ALỤMDI NA NWUNYE KWA AFỌ MA E JIRI YA TỤNYERE ỊGBA ALỤKWAGHỊM NÁ MBA ỤFỌDỤ KWA AFỌ
MBA AFỌ ỌLỤLỤ ỊGBA ALỤKWAGHỊM
Australia 1993 113,255 48,324
Canada 1992 164,573 77,031
Cuba 1992 191,837 63,432
Czech Republic 1993 66,033 30,227
Denmark 1993 31,507 12,991
Estonia 1993 7,745 5,757
France 1991 280,175 108,086
Germany 1993 442,605 156,425
Japan 1993 792,658 188,297
Maldives 1991 4,065 2,659
Norway 1993 19,464 10,943
Puerto Rico 1992 34,222 14,227
Russian Federation 1993 1,106,723 663,282
Sweden 1993 34,005 21,673
United Kingdom 1992 356,013 174,717
United States 1993 2,334,000 1,187,000
(Dabeere na 1994 Demographic Yearbook, Mba Ndị Dị n’Otu, New York 1996)