Biko Sonyere Anyị Maka Ihe Omume Pụrụ Iche
Saturday, April 11, 1998
NDỊÀMÀ JEHOVA ji ikpo ọkụ na-akpọ gị òkù isoro ha cheta onyinye Chineke nyere Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Onyinye a megheere ihe a kpọrọ mmadụ olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16.
N’afọ a a ga-eme Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs mgbe anwụ dasịrị na Saturday, April 11. Ụbọchị ahụ kwekọrọ na Nisan 14 na kalenda Bible e ji ọnwa na-agụ. Biko chọpụta n’aka Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị maka ebe a ga-ezukọ na kpọmkwem oge a ga-eme ya.
Ị̀ maara banyere ihe ndị a merenụ n’ụbọchị ndị ikpeazụ nke Jisọs n’ụwa?