Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 11/1 p. 19-21
  • A Kwadoo Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe na Japan

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Kwadoo Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe na Japan
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Gịnị Na-ese?
  • Mkpebi Ikpe nke Ụlọikpe Ógbè Akpasuo Ndị Ma Ihe Merenụ
  • Omume Achọghị Ọdịmma Onwe Onye nke Ndị ahụ Gbara Akwụkwọ
  • Ịga Ụlọikpe Kasị Elu
  • Mmetụta Sara Mbara
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 11/1 p. 19-21

A Kwadoo Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe na Japan

RUO ọtụtụ afọ na Japan, ụmụ akwụkwọ na-eto eto bụ Ndịàmà Jehova echewo ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme ihu: Hà kwesịrị ịgbaso akọ na uche ha e ji Bible zụọ, ka hà kwesịrị ịgbaso usoro ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ nke na-emebi akọ na uche ha. Gịnị kpatara ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme ahụ? N’ihi na ọzụzụ egwuregwu ọgụ aka na ụkwụ bụ akụkụ mmụta mmega ahụ n’ụlọ akwụkwọ ha. Ndịàmà ahụ na-eto eto chere na ọzụzụ dị otú ahụ ekwekọghị n’ụkpụrụ Bible, dị ka nke a na-achọta n’Aịsaịa isi nke 2, amaokwu nke 4. Nke a na-agụ, sị: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”

Ebe ha na-achọghị ịmụta nkà ịlụ agha, bụ́ ndị gụnyere imerụ onye ọzọ ahụ, Ndịàmà na-eto eto bụ́ ndị Kraịst kọwaara ndị nkụzi ha na ha apụghị iji ezi akọ na uche kere òkè n’egwuregwu ọgụ aka na ụkwụ. Mgbe ha nwasịrị ịrụgide ụmụ akwụkwọ a ịnakwere usoro ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ ahụ, ọtụtụ ndị nkụzi nwere nghọta mesịrị kweta ịkwanyere akọ na uche nke ụmụ akwụkwọ ùgwù ma nye ihe omume ndị ọzọ.

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị nkụzi ghọrọ ndị a kpaliri mmetụta ha, ụlọ akwụkwọ ụfọdụ jụkwara inye Ndịàmà ahụ na-eto eto akara maka mmụta mmega ahụ. Na 1993, a jụrụ ikwe ka Ndịàmà itoolu ma ọ dịkarịa ala gafere na klas ọzọ, manyekwa ha ịkwụsị ije akwụkwọ ma ọ bụ chụọ ha n’ihi ekereghị òkè n’egwuregwu ọgụ aka na ụkwụ.

N’ụzọ doro anya, oge eruola ichebe ikike nke ndị Kraịst na-eto eto nwere inweta agụmakwụkwọ n’emebighị akọ na uche ha. Ụmụ akwụkwọ ise a jụrụ ibufe na klas nke abụọ na Kobe Municipal Industrial Technical College (nke a na-akpọ Kobe Tech ná mkpirikpi) kpebiri ịgba akwụkwọ.

Gịnị Na-ese?

N’oge opupu ihe ubi nke 1990 mgbe ụmụ akwụkwọ ise ahụ banyere Kobe Tech, ha kọwaara ndị nkụzi na ha apụghị ikere òkè n’ọzụzụ kendo (nkà iji mma agha alụ ọgụ nke Japan) n’ihi echiche ha dabeere na Bible. Ngalaba mmụta mmega ahụ megidesiri ike ma jụ inye ha ụzọ ndị ọzọ nke isi nweta akara maka mmụta mmega ahụ. N’ikpeazụ, ụmụ akwụkwọ ahụ dara ihe ọmụmụ mmụta mmega ahụ ahụ, n’ihi ya kwa ha aghaghị ịgụgharị klas mbụ (afọ mbụ na kọleji). N’April 1991 ha gbara akwụkwọ n’Ụlọikpe Ógbè Kobe, na-azọrọ na ihe ụlọ akwụkwọ ahụ mere megidere nnwere onwe ikpe okpukpe nke iwu kwadoro.a

Ụlọ akwụkwọ ahụ zọọrọ na inye ihe omume ndị ọzọ ga-apụta imelara otu òtù okpukpe ihe, ọ ga-esikwa otú a mebie nnọpụiche nke ụlọ akwụkwọ ọha. E wezụga nke ahụ, ha zọọrọ na ha enweghị ihe ndị a ga-eji mee ihe ma ọ bụ ndị ọrụ ga-enye usoro mmụta mmega ahụ ọzọ.

Mkpebi Ikpe nke Ụlọikpe Ógbè Akpasuo Ndị Ma Ihe Merenụ

Ka a nọ na-anụrụ okwu ikpe ahụ, abụọ n’ime ụmụ akwụkwọ ise ahụ dakwara ọzọ n’ule mmụta mmega ahụ, ebe atọ ndị ọzọ jisiri ike gafere n’ule ma gaa na klas ọzọ. Iwu ụlọ akwụkwọ ahụ kwuru na a pụrụ ịchụ ụmụ akwụkwọ ndị akara mmụta ha dị ala na ndị gụgharịrị otu klas n’afọ abụọ ọ bụla sochiri onwe ha. N’ihi nke a, otu n’ime ụmụ akwụkwọ abụọ ahụ kpebiri ịkwụsị ije akwụkwọ tupu a chụọ ya, ma onye nke ọzọ, bụ́ Kunihito Kobayashi, jụrụ ịkwụsị. Ya mere a chụrụ ya. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, nkezi akara Kunihito n’ihe ọmụmụ nile tinyere mmụta mmega ahụ, bụ́ nke ọ dara site n’inwe akara 48, bụ akara 90.2 n’ime 100. Ọ gbara onye mbụ na klas ya dị ụmụ akwụkwọ 42.

Na February 22, 1993, Ụlọikpe Ógbè Kobe kpelaara Kobe Tech ma kwuo, sị: “Ihe ụlọ akwụkwọ ahụ mere emebighị ihe iwu kwuru,” ọ bụ ezie na ọ ghọtara na “a pụghị ịgọpụ na n’ụzọ ụfọdụ a kpaara nnwere onwe ife ofufe nke ndị ahụ gbara akwụkwọ ókè site n’ọchịchọ ụlọ akwụkwọ ahụ chọrọ ka ha kere òkè n’ọzụzụ kendo.”

Dị ka Pọl onyeozi na narị afọ mbụ, ndị ahụ gbara akwụkwọ kpebiri itinye akwụkwọ mkpegharị ikpe n’aka ndị ọrụ iwu ka elu. (Ọrụ 25:11, 12) Ikpe ahụ gara n’Ụlọikpe Dị Elu nke Osaka.

Omume Achọghị Ọdịmma Onwe Onye nke Ndị ahụ Gbara Akwụkwọ

Otu onye ọkà mmụta a ma ama, bụ́ Prọfesọ Tetsuo Shimomura nke Mahadum Tsukuba, kwetara ịgba akaebe dị ka onye akaebe bụ́ ọkachamara n’Ụlọikpe Dị Elu nke Osaka. Dị ka ọkachamara ná mmụta na iwu, o mesiri ike otú ihe ụlọ akwụkwọ ahụ mere n’imeso ụmụ akwụkwọ ahụ si bụrụ nke echebaraghị ndị ọzọ echiche. Kunihito Kobayashi kwuru uche ya n’ụlọikpe ahụ, omume obi eziokwu ya metụkwara ndị nọ n’ụlọikpe ahụ n’obi. Ọzọkwa, na February 22, 1994, Òtù Ndị Ọkàiwu nke Kobe, n’ikwupụta na ihe ụlọ akwụkwọ ahụ mere megidere nnwere onwe ife ofufe nke Kunihito na ikike o nwere inweta agụmakwụkwọ, tụrụ aro ka ụlọ akwụkwọ ahụ nabataghachi ya.

Ka oge na-eru ka e nye mkpebi ikpe n’Ụlọikpe Dị Elu nke Osaka, ndị Kraịst nile na-eto eto o metụtara chọsiri ike iso na mgba ahụ ruo ná njedebe. Ha chere na ha na-alụ ọgụ iwu n’ihi ọtụtụ puku Ndịàmà na-eto eto bụ́ ndị na-eche otu ihe iseokwu ahụ ihu n’ụlọ akwụkwọ ndị dị na Japan. Ma ebe ọ bụ na a chụghị ha n’ụlọ akwụkwọ, o yikarịrị nnọọ ka ụlọikpe ahụ ọ ga-akagbu okwu ikpe ha. Ha pụkwara ịhụ na ọ bụrụ na ha ewepụ akwụkwọ ha gbara, a ga-eme ka ejighị ezi uche mee ihe nke ụlọ akwụkwọ ahụ n’ịchụ Kunihito pụta ìhè. N’ihi ya, ụmụ akwụkwọ ahụ nile ma e wezụga Kunihito kpebiri ịhapụ okwu ahụ.

Na December 22, 1994, Ọkàikpe Ukwu Reisuke Shimada nke Ụlọikpe Dị Elu nke Osaka kwupụtara mkpebi ikpe nke gbanwere mkpebi ikpe Ụlọikpe Ógbè Kobe. Ụlọikpe ahụ hụrụ na ihe mere Kunihito ji jụ ọzụzụ kendo ahụ ziri ezi nakwa na ọghọm ndị omume ya nke dabeere ná nkweta okpukpe ya wetaara ya dị ukwuu gabiga ókè. Ụlọ akwụkwọ ahụ, ka Ọkàikpe Ukwu Shimada kwuru, kwesịrị inyeworị ihe omume ndị ọzọ. Mkpebi ikpe a dị mma kpalitere nzaghachi dị mma n’obi nke ndị okwu banyere ihe ndị ruuru mmadụ metụtara. Otú ọ dị, ụlọ akwụkwọ ahụ tinyere akwụkwọ mkpegharị ikpe n’Ụlọikpe Kasị Elu nke Japan, na-anapụ Kunihito agụmakwụkwọ maka ihe karịrị otu afọ ọzọkwa.

Ịga Ụlọikpe Kasị Elu

Otu uche akwụkwọ akụkọ dị na Kobe Shimbun mesịrị kwuo, sị: “Òtù Ndị Nlekọta Ụlọ Akwụkwọ nke Kobe City na ụlọ akwụkwọ ahụ kwesịrị ịnabataghachiworị Maazị Kobayashi n’ụlọ akwụkwọ n’oge ahụ [mgbe Ụlọikpe Dị Elu nke Osaka nyesịrị mkpebi ikpe]. . . . Omume ịgba isi akwara ha na-adịghị mkpa anapụwo mmadụ oge dị mkpa n’oge ntorobịa ya.” N’agbanyeghị nke ahụ, Kobe Tech siri ọnwụ n’okwu a. N’ihi nke a, ọ ghọrọ isiokwu akụkọ zuru mba ahụ nile ọnụ. Ndị nkụzi na ndị isi ụlọ akwụkwọ ná mba ahụ nile hụrụ ihe merenụ, mkpebi sikwa n’aka ụlọikpe kasị elu ná mba ahụ ga-abụ ihe nlereanya siri ike nke iwu maka okwu ndị yiri ya n’ọdịnihu.

Na January 17, 1995, ihe dị ka otu izu mgbe ụlọ akwụkwọ ahụ tinyesịrị akwụkwọ mkpegharị ikpe n’Ụlọikpe Kasị Elu, ala ọma jijiji ahụ mere na Kobe metụrụ Ashiya City ebe Kunihito na ezinụlọ ya bi. N’ihe dị ka n’elekere anya ise na ọkara nke ụtụtụ ahụ, minit ole na ole tupu ala ọma jijiji ahụ emee n’ógbè ahụ, Kunihito hapụrụ ụlọ ya wee gawa ọrụ nwa oge ya. Ọ nọ na-agba ígwè ya n’okpuru Ụzọ Awara Awara Hanshin, mgbe ala ọma jijiji ahụ mekwara, ọ nọ na-akpụdewe akụkụ ahụ zere ézè. Ọ laghachiri ụlọ ozugbo wee hụ ka okpukpu mbụ nke ụlọ ya kụpịasịrị. Kunihito hụrụ na ya gaara etufuworị ndụ ya n’ụzọ dị mfe n’ala ọma jijiji ahụ wee kelee Jehova maka ikwe ka ọ lanarị. A sị na ọ nwụrụ, o yiri ka okwu kendo ahụ gaara ebi n’enweghị mkpebi ikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu.

Ụlọikpe Kasị Elu na Japan na-atụlekarị mkpegharị ikpe nanị n’akwụkwọ ma kpebie ma mkpebi ikpe nke ụlọikpe ka ala ha ziri ezi ma ọ bụ na ha ezighị ezi. Ọ gwụla ma e nwere ezigbo ihe mere a ga-eji gbanwee mkpebi ikpe nke ụlọikpe ka ala, a dịghị enwe nnụrụ okwu ikpe. Ụlọikpe ahụ adịghị agwa ndị o metụtara mgbe ọ ga-ekwupụta echiche ya. Ya mere ọ bịara Kunihito na mberede n’ụtụtụ nke March 8, 1996, mgbe a gwara ya na a ga-enye mkpebi ikpe n’ụtụtụ ahụ. N’ụzọ nyere ya ọṅụ na obi ụtọ, ọ nụrụ na Ụlọikpe Kasị Elu akwadowo mkpebi ikpe nke Ụlọikpe Dị Elu nke Osaka.

Ndị ọkàikpe anọ, nke Ọkàikpe Shinichi Kawai bụ onye isi oche ha, kwekọrịtara na “e kwesịrị ile omume ndị a na-ekwu banyere ha anya dị ka nke jọgburu onwe ha n’ụzọ e si eme ihe n’ọha, na-agafe ikike iwu nyere ya, n’ihi ya kwa bụrụ nke iwu na-akwadoghị.” Ụlọikpe ahụ kwetara n’ọjụjụ obi eziokwu Kunihito jụrụ ịnara ọzụzụ kendo ma kwuo, sị: “Ihe mere onye ahụ a gbara akwụkwọ mkpegharị ikpe ji jụ ikere òkè n’ọzụzụ kendo si n’obi eziokwu ma bụrụ nke e jikọtara ya na ntọala nke okpukpe ya n’ụzọ chiri anya.” Ụlọikpe Kasị Elu kpebiri na ụlọ akwụkwọ ahụ gaara, kwesịkwa inye ụzọ ndị ọzọ ka e wee nwee ike ịkwanyere nkweta okpukpe nke onye ahụ a gbara akwụkwọ mkpegharị ikpe ùgwù.

Mmetụta Sara Mbara

Obi abụọ adịghị ya na mkpebi ikpe a ga-esetịpụ ihe nlereanya ọma maka nnwere onwe ife ofufe n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Japan Times kwuru, sị: “Mkpebi ikpe ahụ bụ nke mbụ Ụlọikpe Kasị Elu meworo n’okwu agụmakwụkwọ na nnwere onwe ikpe okpukpe.” Otú ọ dị, mkpebi ikpe ahụ adịghị ewepụ ibu ọrụ nke nwa akwụkwọ ọ bụla na-eto eto nwere iwere nguzo ya nke akọ na uche mgbe ọ na-eche ule okwukwe ihu.

Prọfesọ Masayuki Uchino nke Mahadum Tsukuba kwuru na otu n’ime isi ihe kpaliri ndị ọkàikpe ahụ inye Kunihito mmeri bụ na ọ bụ “nwa akwụkwọ nwere obi eziokwu nke nwere akara mmụta dị ịrịba ama.” Bible na-enye ndị Kraịst na-eche ule nke okwukwe ha ihu ndụmọdụ a: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ahụ n’ime ihe ahụ ha na-ekwutọ unu n’ime ya dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ.” (1 Pita 2:12) Ndị Kraịst na-eto eto bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ igosi na nguzo ha dabeere na Bible kwesịrị ekwesị ka ndị mmadụ kwanyere ya ùgwù site n’ibi ndụ ha dum dị ka ụkpụrụ Bible si dị.

Mgbe Ụlọikpe Kasị Elu nyesịrị mkpebi ikpe ya, a nabataghachiri Kunihito Kobayashi na Kobe Tech. Ihe ka ukwuu n’ụmụ akwụkwọ ha na Kunihito malitekọrọ akwụkwọ agụchaalarị. Ugbu a Kunihito na ụmụ akwụkwọ ndị o ji afọ ise tọọ na-amụkọ ihe. N’anya ọtụtụ ndị ụwa, o yiri ka afọ ise nke oge ntorobịa ya alaala n’iyi. Otú ọ dị, iguzosi ike n’ezi ihe nke Kunihito dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova Chineke, àjà ya abụghịkwa na nkịtị n’ezie.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa sara mbara, biko lee peji nke 10 ruo 14 nke mbipụta Teta! October 8 (Bekee), 1995, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Aka ekpe: Ebe obibi Kunihito mgbe ala ọma jijiji ahụ mesịrị

N’okpuru: Kunihito taa

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya