Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 11/1 p. 15
  • Nkasi Obi n’Ime Afọ Anọ nke Agha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkasi Obi n’Ime Afọ Anọ nke Agha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 11/1 p. 15

Nkasi Obi n’Ime Afọ Anọ nke Agha

N’IME afọ anọ nke agha a lụrụ n’ókèala nke ebe bụbu Yugoslavia, ọtụtụ ndị mmadụ nwere ihe isi ike na oké ụkọ. N’ime ha e nwere ọtụtụ narị Ndịàmà Jehova, ndị ji ikwesị ntụkwasị obi nọgide na-efe “Chineke nke nkasi obi nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3.

Na Sarajevo, ndị mmadụ nwekwuru ihe isi ike nke ibi n’obodo ukwu nke a wakporo n’oge nile nke agha ahụ. E nwere ụkọ ọkụ eletrik, mmiri, nkụ, na nri. Olee otú Ọgbakọ Sarajevo nke Ndịàmà Jehova si rụọ ọrụ n’okpuru ọnọdụ ndị a dị njọ? Ndị Kraịst sitere n’ala ndị agbata obi ha tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ iji bubata ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ihe enyemaka. (Lee Ụlọ Nche, November 1, 1994, peji nke 23-27.) Ọzọ, ụmụnna nọ na Sarajevo sooro ibe ha kerịta ihe ha nwere, na-etinye ikerịta ihe ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ. N’oge mwakpo ahụ, otu onye nlekọta bụ́ onye Kraịst sitere n’obodo ahụ nyere akụkọ na-esonụ:

“Anyị ji nzukọ anyị kpọrọ ihe nke ukwuu. Mụ na nwunye m, tinyere mmadụ 30 ọzọ, na-eji ụkwụ aga kilomita 15 [mile 9] iji ruo nzukọ. Mgbe ụfọdụ a mara ọkwa na a ga-enye mmiri mgbe a na-enwe nzukọ. Gịnị ka ụmụnna ga-eme? Ha ga-anọrọ n’ụlọ ka hà ga-aga nzukọ? Ụmụnna anyị họọrọ ịga nzukọ. Ụmụnna na-enyere ibe ha aka mgbe nile; n’agbanyeghị ihe ha nwere, ha na-ekerịta ya. Otu nwanna nwanyị nọ n’ọgbakọ anyị bi ná mpụga nke obodo ahụ, ná nso oké ọhịa; ya mere ọ dịtụụrụ ya mfe ịkpata ụfọdụ nkụ. Ọ na-arụkwa ọrụ n’ebe a na-eme bred, a na-ejikwa ntụ ọka akwụ ya ụgwọ ọnwa. Mgbe o kwere omume, ọ na-esi ogbe bred buru ibu ma were ya bịa nzukọ. Mgbe nzukọ ahụ gbasara, ka ọ na-apụ, ọ na-enye onye ọ bụla otu iberibe.

“Ọ dị mkpa na ọ dịghị nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị ọ bụla ga-enwe mmetụta mgbe ọ bụla nke ịbụ onye a gbahapụrụ. Ọ dịghị onye maara onye n’ime anyị ga-abụ onye ọzọ ga-enwe mkpa enyemaka n’ọnọdụ dị njọ. Mgbe ice jupụtara n’ụzọ, otu nwanna nwanyị adaakwa ọrịa, ụmụnna nwoke na-eto eto, siekwa ike dọkpụụrụ ya n’ụgbọ e ji ebu mmadụ n’elu ice gaa nzukọ.

“Anyị nile na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa, Jehova agọziwokwa mgbalị anyị. Ọ hụwo ọnọdụ ọjọọ anyị nọ na ya na Bosnia, ma o jiriwo mmụba gọzie anyị—mmụba anyị na-ahụbeghị tupu agha ahụ.”

N’otu aka ahụ, n’akụkụ ndị ọzọ agha tisara n’ebe bụbu Yugoslavia, Ndịàmà Jehova enwewo mmụba n’agbanyeghị oké ihe isi ike. Site n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Croatia e nwetara akụkọ a banyere otu ìgwè nke Ndịàmà: “Ụmụnna bi na Velika Kladuša nwere oge ihe isi ike gafere ókè ịgbaso mgba. A wakporo obodo ahụ ọtụtụ oge. Ụmụnna ahụ aghaghị ịkọwara ndị agha Croatia, Serbia, na ndị Alakụba dị iche iche nnọpụiche ha. N’eziokwu, ha aghaghị ịtachiri ọtụtụ ihe obi—ịga mkpọrọ, iti ihe, agụụ, ihe ize ndụ nke ọnwụ. Ma, ha nile nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ma nwee ihe ùgwù pụrụ iche nke ịhụ ngọzi Jehova n’ọrụ ha.”

N’agbanyeghị ihe isi ike ndị a, Ndịàmà Jehova nọ na Velika Kladuša na Bihać dị ya nso nọgidere na-enwe mmụba ka ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-eso ndị agbata obi ha na-ekerịta ozi nkasi obi Chineke. Ngụkọta nke ndị nkwusa Alaeze 26 sitere n’ebe abụọ a na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi 39!

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya