Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 2/15 p. 30-31
  • Gịnị Ka Iwe Nwere Ime ná Ndụ nke Ohu Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Iwe Nwere Ime ná Ndụ nke Ohu Chineke?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Oké Mkpa Ọ Dị Ịchịkwa Ya
  • Izere Mmetụta Ya Ndị Na-ebibi Ihe
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 2/15 p. 30-31

Gịnị Ka Iwe Nwere Ime ná Ndụ nke Ohu Chineke?

NGOSIPỤTA mmadụ na-egosipụta iwe pụrụ ikwesị ekwesị ma ọ bụrụ na ọ dabeere n’ụkpụrụ. Mmadụ pụrụ izi ezi n’igosi iwe ezi omume. E nyere anyị iwu ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị.’ (Ndị Rom 12:9) Bible na-enye ọtụtụ ihe atụ nke iwe ezi omume.—Ọpụpụ 11:8; 32:19; Ọnụ Ọgụgụ 16:12-15; 1 Samuel 20:34; Nehemaịa 5:6; Esta 7:7; leekwa 2 Samuel 12:1-6.

Otú ọ dị, iwe mmadụ na-abụkarị nke na-enweghị ezi ihe kpatara ya, n’ọtụtụ oge kwa bụrụ nke a na-achịkwaghị achịkwa. Ọ na-abụkarị nke ihe na-ezughị ezu kpatara, a na-egosipụtakwa ya n’echebaraghị ihe ndị ọ ga-eweta echiche. Mgbe Jehova na-ebibighịzi Nineve, obi adịghị Jona ụtọ, “iwe ya ewee dị ọkụ.” Jona enweghị ebere, ọ dịkwa mkpa na Jehova aghaghị ịgbazi ya olu. (Jona 4:1-11) Eze Uzaịa nke Juda were iwe mgbe ndị nchụàjà Jehova gbaziri ya olu, o wee gaa n’ihu n’ụzọ mpako ya, nke mere e ji taa ya ahụhụ. (2 Ihe Emere 26:16-21) Nganga Neaman sitere na ndụmọdụ amamihe na-adịghị na ya kpataara ya iwe na ọnụma, na-afọ nke nta ka ọ kpata ntụfu nke ngọzi Chineke.—2 Ndị Eze 5:10-14.

Oké Mkpa Ọ Dị Ịchịkwa Ya

Iwe na-enweghị ezi ihe kpatara ya na nke a na-achịkwaghị achịkwa edubawo ọtụtụ ndị n’ime mmehie ka ukwuu, ọbụna omume nke ime ihe ike. “Ken wee wee iwe dị ọkụ nke ukwuu” wee gbuo Ebel. (Jenesis 4:5, 8) Isọ chọrọ igbu Jekọb, bụ́ onye natara ngọzi nke nna ha. (Jenesis 27:41-45) Sọl n’ọnụma ya tụrụ Devid na Jonatan ube. (1 Samuel 18:11; 19:10; 20:30-34) N’ịbụ ndị nkwusa Jisọs kpasuru iwe, ndị ahụ bịara n’ụlọ nzukọ na Nazaret nwara isi ná mpempe ugwu tụpụ ya. (Luk 4:28, 29) Ndị ndú okpukpe a kpasuru iwe “weere otu obi nukwasị [Stifen]” ma jiri nkume tụgbuo ya.—Ọrụ 7:54-60.

Iwe, ọbụna mgbe e nwere ezi ihe kpatara ya, ọ bụrụ na a chịkwaghị ya achịkwa, pụrụ ịdị ize ndụ, na-arụpụta ihe ọjọọ. Simeọn na Livaị nwere ihe mere ha ga-eji eweso Shekem iwe n’ihi ịmetọ nwanne ha nwanyị bụ́ Daịna, ọ bụ ezie na ụta ụfọdụ dịịrị Daịna . Ma ogbugbu e gburu ndị Shekem n’ụzọ ebere na-adịghị ya bụ ntaramahụhụ gafere ókè inye. N’ihi ya nna ha bụ́ Jekọb katọrọ iwe ha nke a na-achịkwaghị achịkwa, na-abụ ya ọnụ. (Jenesis 34:1-31; 49:5-7) Mgbe a kpasuru mmadụ oké iwe, onye ahụ kwesịrị ịchịkwa iwe ya. Mkpesa na nnupụisi nke ụmụ Israel kpasuru Mosis, bụ́ nwoke kachasị dị umeala n’obi n’elu ala, ime omume iwe a na-achịkwaghị achịkwa nke ọ nọ na ya ghara ido aha Jehova nsọ, bụkwa nke e kworo n’ihi ya taa ya ahụhụ.—Ọnụ Ọgụgụ 12:3; 20:10-12; Abụ Ọma 106:32, 33.

A na-agụnyekọ ọnụma n’ebe ọrụ ọjọọ ndị ọzọ nke anụ ahụ dị, ndị dị ka agụụ ịkwa iko, ikpere arụsị, ịgwọ nsí, na ịṅụbiga mmanya ókè. Ihe ndị dị otú ahụ ga-egbochi mmadụ iketa Alaeze Chineke. (Ndị Galetia 5:19-21) A gaghị ewebata okwu iwe n’ọgbakọ. Ndị ikom na-anọchi anya ọgbakọ n’ekpere kwesịrị ịbụ ndị na-enweghị iwe na obi dị ilu. (1 Timoti 2:8) E nyere ndị Kraịst iwu ka ha ghara ịdị ngwa iwe iwe, na-agwa ha na iwe mmadụ adịghị arụpụta ezi omume Chineke. (Jemes 1:19, 20) E nyere ha ndụmọdụ ‘ịchara iwe ahụ ụzọ’ na ịhapụrụ Jehova ịbọ ọ́bọ̀. (Ndị Rom 12:19) A gaghị eji nwoke eme ihe dị ka onye nlekọta n’ọgbakọ Chineke ma ọ bụrụ na ọ na-ewekarị iwe.—Taịtọs 1:7.

Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ iwe iwe mgbe ụfọdụ, mgbe ụfọdụkwa nwee ezi ihe kpatara ya, o kwesịghị ikwe ka ọ ghọọrọ ya mmehie site n’ibu ya n’obi ma ọ bụ na-anọgide n’ọnọdụ onye a kpasuru iwe. O kwesịghị ikwe ka anyanwụ wakwasị ya n’ọnọdụ ahụ, n’ihi na ọ ga-esi otú ahụ nye Ekwensu ohere iji ya mee ihe dị ya mma. (Ndị Efesọs 4:26, 27) Karịsịa ọ bụrụ ihe banyere iwe dị n’etiti ụmụnna ndị Kraịst, o kwesịrị iwere nzọụkwu ndị kwesịrị ekwesị iji mee udo ma dozie okwu ahụ n’ụzọ Chineke nyere. (Levitikọs 19:17, 18; Matiu 5:23, 24; 18:15; Luk 17:3, 4) Akwụkwọ Nsọ na-adụ ọdụ na anyị kwesịrị iche mkpakọrịta anyị nche n’akụkụ a, ghara iso onye na-ewekarị iwe ma ọ bụ na-enwe ọnụma na-akpakọrịta, si otú a na-ezere ọnyà maka mkpụrụ obi anyị.—Ilu 22:24, 25.

Jisọs Kraịst, mgbe ọ bụ mmadụ n’elu ala, nyere anyị ihe nlereanya zuru okè. Ihe ndekọ nke ndụ ya akọghị otu mgbe o were iwe a na-achịkwaghị achịkwa ma ọ bụ ebe o kwere ka mmebi iwu, nnupụisi, na mmaja nke ndị iro Chineke kpasuo ya iwe ná mmụọ ma mee ka o gosipụta ụdị ihe ahụ n’ebe ndị na-eso ụzọ ya ma ọ bụ ndị ọzọ nọ. N’otu oge ịma etili nke obi ndị Farisii “na-ewute Ya nke ukwuu,” o lekwara ha anya n’iwe. Ọrụ ọzọ sochiri nke ahụ bụ ọrụ ịgwọ ọrịa. (Mak 3:5) N’oge ọzọ, mgbe ọ chụpụrụ ndị na-emetọ ụlọ nsọ Chineke ma na-emebi Iwu Mosis site n’ime ụlọ Jehova ụlọ ịzụ ahịa, ọ bụghị site n’iwe nke a na-achịkwaghị achịkwa, nke ọ na-adịghị ezi ihe kpatara ya. Kama nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi e duziri n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ihi ụlọ Jehova.—Jọn 2:13-17.

Izere Mmetụta Ya Ndị Na-ebibi Ihe

Ọ bụghị nanị na iwe na-enwe mmetụta ọjọọ n’ahụ ike ime mmụọ anyị kama ọ na-arụpụta mmetụta dị ukwuu n’ahụ nkịtị. Ọ pụrụ ịkpata ọbara mgbali elu, mgbanwe akwara, nsogbu usoro iku ume, mkpaghasị imeju, mgbanwe nke ụzọ ahụ si agbapụta olu ilu, inwe mmetụta n’akụkụ ahụ bụ́ pancreas. Iwe na ọnụma, dị ka mmetụta uche ndị siri ike, abụrụwo nke ndị dibịa depụtara dị ka ihe ndị na-etinye ihe na, na-eme ka ọ ka njọ, ma ọ bụ ọbụna na-akpata ụdị ọrịa ndị dị ka ụkwara asthma, nsogbu anya, ọrịa akpụkpọ ahụ, ọnyá afọ, na nsogbu ezé na ịgbari nri. Ọnụma na oké iwe pụrụ ịkpaghasị usoro iche echiche nke na mmadụ apụghị inwe nkwubi okwu ezi izu dị na ya ma ọ bụ nwee ezi mkpebi. Ihe na-esokarị iwe iwe n’azụ bụ oge nke ịda mbà n’uche nke gafere ókè. Ya mere ọ bụ ihe amamihe dị na ya ọ bụghị nanị n’echiche okpukpe kamakwa n’echiche nkịtị ịchịkwa iwe na ịchụso udo na ịhụnanya.—Ilu 14:29, 30; Ndị Rom 14:19; Jemes 3:17; 1 Pita 3:11.

Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, oge ọgwụgwụ bụ oge nke ọnụma na oké iwe, mba nile na-ewe iwe n’ihi na Jehova ewegharawo ikike ya ịchị achị, Ekwensu kwa n’ịbụ onye a chụdara n’elu ala, “na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 11:17, 18; 12:10-12) N’inwe ọnọdụ ndị dị otú ahụ siri ike, onye Kraịst ga-eme nke ọma ịchịkwa mmụọ ya, na-ezere mmetụta uche na-ebibi ihe nke iwe.—Ilu 14:29; Eklisiastis 7:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya