Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 2/15 p. 32
  • Eziokwu Nke Oziọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eziokwu Nke Oziọma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 2/15 p. 32

Eziokwu Nke Oziọma

ỤLỌ akwụkwọ Kọleji Magdalen dị n’Oxford, England, anọwo na-eji ntakịrị iberibe ihe odide atọ nke Oziọma Matiu, nke a maara dị ka P64, kemgbe 1901. Ruo oge ụfọdụ, ndị ọkà mmụta kwenyere na ọ dị laa azụ n’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ nke abụọ O.A.

Na nso nso a, Carsten P. Thiede, bụ́ ọkachamara n’ọmụmụ nke ihe odide papyrus na Paderborn, Germany, hụrụ maka nnyocha nke P64 nke e weturu anya n’ala mee, bụ́ nke ihe mejupụtara ya bụ akụkụ nke amaokwu 10 malite na Matiu isi nke 26. Gịnị si na ya pụta? Mgbe ọ na-ede ihe n’akwụkwọ Zeitschrift für Papyrologie und Epigraphik (Akwụkwọ Ihe Odide Papyrus na Ihe Odide Oge Ochie), Thiede na-akọwa iberibe akwụkwọ ndị ahụ nke Oxford dị ka “iberibe codex ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, ikekwe (ọ bụ ezie na ọ bụchaghị) nke dị tupu AD 70.”

Ihe ndị Thiede kwuru kpasuru nnọọ ọtụtụ okwu n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi na n’etiti ndị ọkà mmụta. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe a nakweere ugbu a dị ka akụkụ kasị ochie fọdụrụ n’ihe odide sitere n’Oziọma ndị ahụ bụ P52, nke bụ́ iberibe nke Oziọma Jọn malite n’ihe dị ka 125 O.A., ma ọ bụ ihe na-agafeghị narị afọ nke abụọ.

Ma a ga-anabata n’ọha oge ọhụrụ ahụ e nyere iberibe papyrus P64 ahụ bụ nke a ka ga-ahụ. Ka o sina dị, oge nke mbụ ahụ e nyere abụghị nanị na ọ ga-eme P64 iberibe Oziọma kachasị ochie dịnụ; ọ ga-emekwa ka e nwee ihe àmà ọzọ nke na-egosi na Oziọma Matiu bụ nke e dere n’ezie na narị afọ mbụ, ma eleghị anya ọbụna tupu 70 O.A., mgbe ọtụtụ ndị ji anya ha hụ ihe ndị mere ná ndụ Jisọs ka dị ndụ ịkwado eziokwu nke Oziọma ahụ.

[Foto dị na peeji nke 32]

Site n’ikike nke President and Fellows of Magdalen College, Oxford.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya