Olileanya M Nwere Kemgbe Ndụ M—ịghara Ịnwụ Ma ọlị
DỊ KA HECTOR R. PRIEST SI KỌỌ
“A pụghị ịgwọ ọrịa cancer ahụ agwọ,” ka dọkịta kwuru. “Ọ dịghị ihe ọzọ anyị nwere ike imere gị.” E mere nchọpụta ọrịa ahụ ihe karịrị afọ iri gara aga. Ma m ka nwere olileanya ahụ dabeere na Bible nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala n’anwụghị anwụ ma ọlị.—Jọn 11:26.
NDỊ mụrụ m bụ ndị Methodist nwere obi eziokwu ndị na-ejechi chọọchị anya ná ntakịrị ime obodo bụ́ Eketahuna, nke dị nso n’ugbo ezinụlọ anyị. A mụrụ m ná ntakịrị ndagwurugwu mara mma a na-akọ ugbo na ya bụ́ Wairarapa, nke dị ihe dị ka 130 kilomita n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ugwu nke Wellington, New Zealand. N’ebe ahụ anyị na-enwe mmasị ikiri ugwu ndị jupụtara na snow, mmiri dị ọcha ndị si n’ugwu na-agbapụta, ugwu nta dị iche iche, na mbara ala ndị na-emepụta nri.
Na Chọọchị Methodist, a kụziiri anyị na ezi mmadụ nile ga-eje eluigwe ma na ndị ọjọọ ga-eje hell, ebe ịta ahụhụ n’ime ọkụ. O kweghị m nghọta ihe mere na Chineke, ọ bụrụ na ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ biri n’eluigwe, o tinyeghị ha n’ebe ahụ site ná mmalite. Ana m atụ ọnwụ egwu mgbe nile ma na-eche ọtụtụ mgbe ihe mere anyị ga-eji na-anwụ. Na 1927, mgbe m dị afọ 16, ọdachi dakwasịrị ezinụlọ anyị. Ọ bụ nke ahụ dujere m n’ịchọ azịza nye ajụjụ m nile.
N’ihi Gịnị Ka Reg Ji Nwụọ?
Mgbe nwanne m nwoke bụ́ Reg dị afọ 11, ọ dara ezigbo ọrịa. Dọkịta apụghị ikwu ihe na-arịa ya, o nweghịkwa ike inyere ya aka. Mama m kpọrọ onye okwuchukwu Methodist. O kpeere Reg ekpere ma nke a akasighị mama m obi. N’ezie, ọ gwara onye okwuchukwu ahụ na ekpere ya arụpụtaghị ihe ọ bụla.
Mgbe Reg nwụrụ, mama m ga-agwa onye ọ bụla na mmadụ nile okwu iji gbalịa imejụ akpịrị ịkpọ nkụ ya maka azịza ndị bụ eziokwu n’ihe kpatara nwa ya nwoke na-eto eto ga-eji nwụọ. Ka ọ nọ na-agwa otu onye oji ego achụ ego nọ n’obodo okwu, ọ jụrụ ma ọ̀ maara ihe ọ bụla banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ọ maghị, ma o kwuru, sị: “Ọ dị onye hapụrụ otu akwụkwọ n’ebe a nke ị pụrụ ịbịa were.”
Mama m ji akwụkwọ ahụ laa n’ụlọ wee malite ịgụ ya. Ọ pụghị idoru ya ala. Nwayọọ nwayọọ ọnọdụ ya dum gbanwere. Ọ gwara ezinụlọ anyị, sị, “Nke a bụ ya; nke a bụ eziokwu ahụ.” Akwụkwọ ahụ bụ The Divine Plan of the Ages, mpịakọta nke mbụ nke Studies in the Scriptures. Enwere m obi abụọ na mbụ ma gbalịa ịrụ ụka ihe akwụkwọ ahụ kwuru banyere nzube nke Onye Okike. N’ikpeazụ arụmụka m nile kwụsịrị.
Ịnakwere Eziokwu Bible
Echere m, sị, ‘Cheedị echiche ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, n’anwụghị ma ọlị!’ Olileanya dị otú ahụ bụ ihe mmadụ ga-atụ anya ya site n’aka Chineke nke na-ahụ n’anya. Elu ala bụ́ paradaịs! Ee, nke a bụ maka mụ.
Mgbe ha mụtasịrị eziokwu ndị a magburu onwe ha, mama m na ụmụnna nwanyị ndị Kraịst atọ sitere Wellington—ụmụnna nwanyị bụ́ Thompson, Barton, na Jones—ga-apụ ruo ọtụtụ ụbọchị n’otu oge, na-agbasa mkpụrụ Alaeze ahụ n’ebe nile n’ime ime obodo. Ọ bụ ezie na papa m enweghị mmụọ ozi ala ọzọ nke mama m nwere, ọ kwadoro ya n’ọrụ ya.
Ekwenyesiri m ike n’eziokwu ahụ, ma ruo oge ụfọdụ emere m ihe dị nta banyere ihe ndị m kwere na ha. Na 1935, alụrụ m Rowena Corlett, ka oge na-agakwa e ji otu nwa nwanyị bụ́ Enid, na otu nwa nwoke bụ́ Barry, gọzie anyị. Arụrụ m ọrụ dị ka onye na-agba mgbere anụ ụlọ, na-azụta ọtụtụ puku anụ ụlọ site n’aka ndị ọrụ ugbo gbara anyị gburugburu. Mgbe ndị ọrụ ugbo a ga na-akparịta banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, obi ga-adị m ụtọ mgbe m ga-agwa ha, sị: “Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime mgbalị ndị a nke ụmụ mmadụ nke ga-aga nke ọma. Alaeze Chineke bụ nanị ọchịchị ga-adị irè.”
N’ụzọ dị mwute, aghọrọ m onye ụtaba riri ahụ; mgbe nile m na-akpụ siga n’ọnụ m. Ka oge na-aga ahụ ike m dakpọrọ, e nyekwara m àkwà n’ụlọ ọgwụ n’ihi nsogbu afọ na-egbu mgbu. A gwara m na m nwere ajọ ọzịza nke akpụkpọ ahụ nke ime akpa afọ na eriri afọ, nke ise siga m kpatara. Ọ bụ ezie na m hapụrụ àgwà ahụ, ọtụtụ mgbe m na-arọ nrọ na m na-ese siga na-adịghị agwụ agwụ. Lee aha ihe iri ahụ jọgburu onwe ya nke ụtaba pụrụ ịbụ!
Mgbe m hapụsịrị ụtaba, emere m mgbanwe ndị ọzọ dị mkpa. Na 1939, mgbe m dị 28 afọ, e mere m baptism n’Osimiri Mangatai nke dịdewere ụlọ anyị n’obodo ahụ. Robert Lazenby, bụ́ onye mesịrị lekọta ọrụ nkwusa ahụ na New Zealand, mere ogologo njem site na Wellington bịa iji kwuo okwu baptism ahụ n’ụlọ anyị na ime m baptism. Malite n’oge ahụ gaa n’ihu, aghọrọ m Onyeàmà Jehova nwere obi ike.
Ịhazi Ọrụ Nkwusa Ahụ
Mgbe e mesịrị m baptism, a họpụtara m ịbụ onye nlekọta nke Ọgbakọ Eketahuna. Nwunye m, bụ́ Rowena, anakwerebeghị eziokwu Bible. Otú ọ dị, emere m ka ọ mara na m gaje ịkpọ Alf Bryant isi Pahiatua bịa iji gosi m ụzọ e si agba àmà n’ụzọ kwesịrị ekwesị site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Achọrọ m ịhazi ọrụ nkwusa ahụ na iji nwayọọ nwayọọ rụzuo ókèala anyị.
Rowena sịrị: “Hector, ọ bụrụ na ị gaa ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ, agaghị m anọ ebe a mgbe ị ga-alọta. M na-ahapụ gị. Ibu ọrụ gị dị n’ebe a—n’ụlọ, n’ebe ezinụlọ gị dị.”
Amaghị m ihe m ga-eme. N’obi abụọ, ejikeere m. ‘Aghaghị m ime ya,’ ka m nọgidere na-eche n’ime onwe m. ‘Ndụ m dabeere na ya, otú a kwa ka ọ dị ndụ ndị ezinụlọ m.’ Ya mere, emesiri m Rowena obi ike na achọghị m ime ihe ga-ewute ya n’ụzọ ọ bụla. Agwara m ya na m hụrụ ya n’anya nke ukwuu, ma n’ihi na o metụtara aha na ọbụbụeze Jehova, tinyere ndụ anyị onwe anyị, aghaghị m ime nkwusa n’ụzọ dị otú a.
Mụ na Alf gara n’ọnụ ụzọ nke mbụ, o butekwara ụzọ n’ikwu okwu. Ma mgbe ahụ ahụrụ m onwe m ka m na-eweghara mkparịta ụka ahụ, na-agwa onye nwe ụlọ na ihe na-eme n’ụbọchị anyị yiri ihe mere n’ụbọchị Noa nakwa na anyị aghaghị ime ihe banyere ijide nzọpụta anyị n’aka. (Matiu 24:37-39) Ahapụrụ m akwụkwọ nta ụfọdụ n’ebe ahụ.
Ka anyị pụsịrị, Alf sịrị: “Olee ebe i si nweta ihe ọmụma ahụ nile? Adịghị m gị mkpa. Gawa n’onwe gị, anyị ga-arụzukwa okpukpu abụọ nke ókèala ahụ.” Ya mere, ọ bụ ihe anyị mere.
Ka anyị na-ala, amaghị m ihe ga-anọ na-echere anyị. N’ụzọ juru m anya ma nyekwa m ọṅụ, Rowena kwadebere otu iko tii na-echere anyị. Izu abụọ n’ihu nwunye m sonyeere m n’ozi ihu ọha ahụ ma ghọọ ezi ihe nlereanya nke ịnụ ọkụ n’obi ndị Kraịst.
Ndị so ná ndị mbụ ghọrọ Ndịàmà Jehova ná ndagwurugwu anyị nke a na-akọ ugbo na ya bụ Maud Manser, nwa ya nwoke, bụ́ William, na nwa ya nwanyị, bụ́ Ruby. Di Maud bụ nwoke nwere àgwà ndị na-akpasu iwe ma nwee obi ọjọọ. Otu ụbọchị mụ na Rowena rutere n’ugbo ha ịkpọrọ Maud gaa ozi. William na-eto eto emeworị ndokwa ka anyị jiri ụgbọ ala ya gaa, ma nna ya bu ihe ndị ọzọ n’uche.
Ọ dịghị onye ahụ ruru ala. Agwara m Rowena ka o kuru nwa anyị nwanyị bụ́ Enid. Abanyere m n’ụgbọ ala William wee si n’ebe a na-adọba ụgbọ ala nyapụta ya ngwa ngwa ebe Maazị Manser mere ngwa ngwa ịnwa imechi ibo ụzọ nke ebe ahụ a na-adọba ụgbọ ala tupu anyị enwee ike ịpụta. Ma o melighị ya. Mgbe anyị gatụrụ ntakịrị n’ụzọ mbata, anyị kwụsịrị, m wee si n’ụgbọ ala ahụ pụta ịbịa zute Maazị Manser bụ́ onye iwe juru obi. Agwara m ya, sị: “Anyị na-eje ozi ubi, Oriakụ Manser sokwa anyị eje.” Arịọrọ m ya arịrịọ, iwe ya dajụlatatụkwara. N’ileghachi anya azụ, ikekwe m gaara emeworị ihe n’ụzọ dị iche, ma ka e mesịrị o nwere mmasị karị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ọ ghọrọ Onyeàmà.
E nwere nanị ndị Jehova ole na ole n’afọ ndị ahụ, anyị nwekwara mmasị ma rite uru n’eziokwu site n’ọbịbịa nke ndị ozi oge nile ndị na-anọnyere anyị n’ugbo anyị. Ndị ọbịa a gụnyere Adrian Thompson na nwanne ya nwanyị bụ́ Molly, ha abụọ jechara klas ndị mbụ nke Watchtower Bible School of Gilead maka ndị ozi ala ọzọ ma jee ozi n’ala ọzọ na Japan na Pakistan.
Ahụmahụ Oge Agha
Na September 1939, Agha Ụwa nke Abụọ malitere, n’October 1940 kwa, gọọmenti mba New Zealand machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu. A kpụpụrụ ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ndị Kraịst n’ụlọikpe ndị dị n’ala ahụ. E tinyere ụfọdụ n’ogige ọrụ mmanye ma kewapụ ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha iche. Ka agha ahụ na-aga n’ihu, ọ bụ ezie na anyị nwere ebe a na-azụ ehi, m nọ na-eche ma à ga-akpọ m maka ozi agha. A maziri ọkwa na ọ dịghịkwa ndị ọrụ ugbo ọ bụla ọzọ a ga-akpọpụ n’ọrụ ha maka ozi agha.
Mụ na Rowena gara n’ihu n’ozi ndị Kraịst anyị, onye ọ bụla n’ime anyị nọ na-etinye ihe karịrị 60 hour kwa ọnwa n’ọrụ ime nkwusa. N’ime oge a, enwere m ihe ùgwù nke inyere Ndịàmà na-eto eto aka bụ́ ndị na-ejigide nnọpụiche ndị Kraịst ha. Ekwuchiteere m ha ọnụ ha n’ụlọikpe ndị dị na Wellington, Palmerston North, Pahiatua, na Masterton. A na-enwekarị otu onye ụkọchukwu nke ga-eso n’òtù na-ahụ maka idebanye aha n’ozi agha, ọ bụkwa ihe obi ụtọ ikpughe nkwado na-abụghị nke ndị Kraịst nke ha na-akwado ọrụ agha.—1 Jọn 3:10-12.
Otu abalị ka mụ na Rowena nọ na-amụ Ụlọ Nche, ndị ọrụ nchọpụta ihe wakwasịrị anyị. E nwetara akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ụlọ anyị n’ihi nnyocha e mere. “A pụrụ ịtụ unu mkpọrọ n’ihi nke a,” ka ha gwara anyị. Mgbe ndị ọrụ nchọpụta ahụ banyere n’ụgbọ ala ha ịpụ, ha chọpụtara na breeki akpọchiela, ụgbọ ala ahụ agakwaghị ihu ma ọ bụ azụ. William Manser nyere aka dozie ụgbọ ala ahụ, anyị anụkwaghị mkpatụ ndị ahụ ọzọ.
N’oge mmachibido iwu ahụ, anyị ga-ezochi akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ụlọ nke dị n’akụkụ dịpụrụ adịpụ n’ugbo anyị. N’etiti abalị, m ga-eje n’alaka ụlọ ọrụ New Zealand ma jiri akwụkwọ kwajuo ụgbọ ala m. M ga-eburuzi ya lọta n’ụlọ ma debe ya n’ebe ahụ dịpụrụ adịpụ. Otu abalị ka m bịarutere n’alaka ahụ iburu ihe na nzuzo, na mberede a gbanyere ọkụ ebe nile! Ndị uwe ojii tiri mkpu, sị: “Anyị ejidela gị!” Otú ọ dị, n’ụzọ na-eju anya, ha hapụrụ m ka m lawa n’ekwughị ogologo okwu.
Na 1949, mụ na Rowena rere ugbo ahụ wee kpebie ịsụ ụzọ ruo mgbe ego anyị gwụrụ. Anyị kwafere n’otu ụlọ dị na Masterton wee soro Ọgbakọ Masterton sụọ ụzọ. N’ime afọ abụọ, e guzobere Ọgbakọ Featherston, na-enwe ndị nkwusa 24 na-arụsi ọrụ ike, ejekwara m ozi dị ka onye isi oche ndị nlekọta. Mgbe ahụ, na 1953, enwere m ihe ùgwù nke ịga United States ije mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova nke ga-ewe ụbọchị asatọ na Ámá Egwuregwu Yankee dị na New York City. Rowena enweghị ike iso m jee n’ihi na ọ dị mkpa ka o lekọta nwa anyị nwanyị bụ́ Enid, onye rịara ọrịa nsogbu ụbụrụ nke na-akpata ahụ mkpọnwụ.
Mgbe m laghachisịrị New Zealand, aghaghị m ịrụ ọrụ ego. Anyị laghachiri n’Ọgbakọ Masterton, bụ́ ebe a họpụtara m ịbụ onye isi oche ndị nlekọta. N’ihe dị ka n’oge a, William Manser zụtara ebe a na-eme ihe ngosi bụ́ Little Theater dị na Masterton, nke a ghọkwara Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ dị na Wairarapa. N’afọ ndị 1950, ọgbakọ anyị nwere uto mara mma n’ime mmụọ na n’ọnụ ọgụgụ. Ya mere, mgbe onye nlekọta sekit bịara, ọtụtụ mgbe ọ ga-agba ndị tozuru okè ume ịkwaga n’akụkụ ndị ọzọ nke mba ahụ iji nye aka n’ọrụ nkwusa n’ebe ahụ, ọtụtụ mekwara otú ahụ.
Ezinụlọ anyị nọgidere na Masterton, n’ime ọtụtụ afọ iri ndị sochikwara, ọ bụghị nanị na m nwere ọtụtụ ihe ùgwù n’ime ọgbakọ kama enwekwara m ọtụtụ ihe omume ma ná mgbakọ mba ma nke mba nile. Rowena ji ịnụ ọkụ n’obi kere òkè n’ozi ubi, na-enyere ndị ọzọ aka mgbe nile ime otú ahụ.
Ịtachi Obi n’Ule Dị Iche Iche nke Okwukwe
Dị ka e kwuru ná mmalite, na 1985, a chọpụtara na m nwere ọrịa cancer a na-apụghị ịgwọ agwọ. Lee ka mụ na nwunye m na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ Rowena, tinyere ụmụaka anyị, si chọọ iso n’ọtụtụ nde ndị dị ndụ ugbu a ndị na-agaghị anwụ ma ọlị! Ma ndị dọkịta zilagara m n’ụlọ ịnwụ. Otú ọ dị, nke mbụ ya, ha jụrụ m otú m si lee nchọpụta ọrịa ahụ anya.
“M ga-anọgide na-enwe obi iru ala ma na-enwe olileanya,” ka m zaghachiri. N’ezie, ilu Bible ghọrọ ihe na-ewusi m ike: “Ndụ nke anụ ahụ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.”—Ilu 14:30.
Ndị ọkachamara ahụ n’ịgwọ ọrịa cancer toro okwu ndụmọdụ Bible ahụ. “Echiche uche ahụ bụ 90 pasent nke ngwọta nye ndị na-arịa ọrịa cancer,” ka ha kwuru. Ha tụkwara aro ka e nye m ọgwụgwọ ụzarị ọkụ ruo izu asaa. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, e mesịrị m merie ọrịa cancer ahụ.
N’ime oge a siri ike, e tiri m otu ihe otiti siri ike. Nwunye m mara mma, nke na-eguzosi ike n’ihe, nwere ọbara ọgbụgba n’ụbụrụ ma nwụọ. Enwetara m nkasi obi site n’ihe nlereanya nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi e dekọrọ n’ime Akwụkwọ Nsọ na n’otú Jehova si mee ka ihe gaziere ha ka ha na-ejigide iguzosi ike n’ezi ihe ha. N’ụzọ dị otú a, olileanya m n’ime ụwa ọhụrụ ahụ nọgidere na-egbukepụ egbukepụ.—Ndị Rom 15:4.
Ka o sina dị, enwere m oké ịda mbà n’obi ma chọọ ịkwụsị ije ozi dị ka onye okenye. Ụmụnna ndị nọ n’ógbè anyị gbara m ume ruo mgbe m nwetaghachiri ike ịga n’ihu. N’ihi nke a, enwewo m ike ije ozi n’akwụsịghị akwụsị dị ka onye okenye na onye nlekọta bụ́ onye Kraịst kemgbe 57 afọ gara aga.
Iji Obi Ike Chee Ọdịnihu Ihu
Ijere Jehova ozi n’afọ ndị a nile abụwo ihe ùgwù dị ukwuu. Lee ọtụtụ ngọzi m nweworo! O yighị ihe dịteworo anya mgbe m, dị ka onye dị afọ 16, nụrụ ka mama m tiri mkpu, sị: “Nke a bụ ya; nke a bụ eziokwu ahụ!” Mama m bụgidere Onyeàmà na-ekwesị ntụkwasị obi, nke na-anụ ọkụ n’obi ruo n’oge ọnwụ ya na 1979, mgbe ọ dị ihe karịrị 100 afọ. Nwa ya nwanyị na ụmụ ya nwoke isii ghọkwara Ndịàmà na-eguzosi ike n’ihe.
Ọchịchọ m na-ere ka ọkụ bụ ịdị ndụ hụ ka e wepụrụ aha Jehova n’ụta nile. M̀ ga-enweta olileanya m nwere kemgbe ndụ m nke anwụghị ma ọlị? N’ezie, a ka na-atụ anya nke ahụ. Otú ọ dị, enwere m obi ike na ọtụtụ, ee, ọtụtụ nde ga-emesịa nweta ngọzi ahụ. Ya mere, oge nile m dị ndụ, m ga-eji olileanya nke ịbụ onye a gụnyekọtara ná ndị ga-adị ndụ n’anwụghị ma ọlị kpọrọ oké ihe.—Jọn 11:26.
[Foto dị na peeji nke 28]
Nne m
[Foto dị na peeji nke 28]
Mụ na nwunye m na ụmụ m