Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 2/1 p. 32
  • Akwụkwọ Abụ Kasị Amasị Irina

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụkwọ Abụ Kasị Amasị Irina
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 2/1 p. 32

Akwụkwọ Abụ Kasị Amasị Irina

N’OGE na-adịbeghị anya, e mere Irina, bụ́ nwatakịrị nwanyị dị afọ itoolu nke si Sofia, Bulgaria, baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ na-enwe mmasị ịbụ abụ ma na-enwe mmasị karịsịa n’abụ ndị dị n’akwụkwọ Sing Praises to Jehovah. Ya mere, Irina mere ya ihe mgbaru ọsọ ya iburu abụ ole na ole n’isi kwa ọnwa.

Otu n’ime ihe ọmụmụ ndị kasị amasị Irina n’ụlọ akwụkwọ bụ egwú. Ya mere onye nkụzi na-akụziri ya egwú were iwe mgbe Irina jụrụ iso gụọ egwú n’òtù ukwe ụlọ akwụkwọ ahụ. N’ihi gịnị ka Irina ji jụ? Ọ chọpụtara na ihe dị ukwuu n’egwú a ga-achọ ka ọ gụọ na-eto ndị dike nke mba na ememe ndị malitere n’ịgọ mmụọ. Abụ ụfọdụ ọbụna na-akwado nnupụisi na ime ihe ike ma na-akwalite echiche dị iche iche nke mba. Echiche Irina n’okwu a ekweghị onye nkụzi ahụ nghọta. Irina kpebiri idere onye nkụzi ahụ akwụkwọ ozi na-akọwapụta nkweta okpukpe ya—ma ọ rụpụtaghị ihe ọ bụla.

Nna Irina chepụtara otu ihe. O nyere onye nkụzi ahụ otu n’ime akwụkwọ ahụ, bụ́ Sing Praises to Jehovah, nke nwere abụ ndị ahụ Irina na-enwe mmasị ịbụ. Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, onye nkụzi ahụ kpọbatara Irina n’ime ọnụ ụlọ a na-anọ agụ egwú. Ọ gwara Irina ka ọ bụọ ụfọdụ n’ime abụ ndị kasị amasị ya site n’akwụkwọ ahụ—n’ihu ụmụ klas ya—ebe onye nkụzi ahụ ga-eji ngwa egwú piano soro ya na-abụ. Ihe omume ahụ nọruru ihe karịrị otu hour! Onye nkụzi ahụ aghaghị ikwenye na akwụkwọ abụ kasị amasị Irina nwere olu ụtọ ụfọdụ ndị mara mma.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya