Ugwu nke ‘Na-emegharị Ahụ’
N’AKỤKỤ ọdịda anyanwụ Ireland, ọdịdị ịpị ọnụ nke Croagh Patrick pụrụ iche n’ugwu ndị dị ya gburugburu. Kwa afọ, na Sunday ikpeazụ n’ọnwa July, elu ugwu ahụ na-eyi ka ọ na-emegharị ahụ mgbe ihe ruru 30,000 mmadụ, ma ụmụaka ma ndị agadi, na-arịru ọnụ ọnụ nke ugwu ahụ (765 mita) na njem ala nsọ a na-eme kwa afọ.
Taa, ndị na-eme njem ala nsọ na-arịgo ma na-arịda n’okporo ụzọ dị warara, mkputamkpu, dịkwa ize ndụ n’ebe ụfọdụ. N’ezie, ebe ngwụsị nke elu ugwu ahụ (ihe dị ka 300 mita) kpọdara akpọda gabiga ókè, bụrụkwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nkume ndị na-esighị ike n’ala mejupụtara ya, na-emezi ka ịrị ugwu ahụ dị ize ndụ, na-agwụkwa ike.
Ụfọdụ ga-agba ụkwụ nkịtị rịa ugwu a, ole na ole ọbụna ga-eji ikpere ha rịtọpụ akụkụ ụfọdụ. N’oge ndị gara aga, njem ala nsọ ahụ na-amalite n’ọchịchịrị abalị.
N’ihi gịnị ka Croagh Patrick ji bụrụ ahụmahụ dị oké mkpa otú a nye ọtụtụ ndị?
E Guzobewo Ya Eri Ogologo Oge Dị Ka Ebe Ime Njem Ala Nsọ
Ná mmalite nke narị afọ nke ise O.A., Chọọchị Roman Katọlik zipụrụ Patrick dị ka bishọp onye ozi ala ọzọ gaa Ireland. Nzube ya bụ́ isi bụ ịtọghata ndị Ireland bata n’Iso Ụzọ Kraịst, n’afọ nile ya kwa nke ime nkwusa na ịrụ ọrụ n’etiti ndị ahụ, e kwuru na ọ bụ Patrick tọrọ ntọala maka Chọọchị Katọlik n’ebe ahụ.
Ọrụ ya bugara ya ọtụtụ ebe ná mba ahụ dum. Otu n’ime ha bụ akụkụ ọdịda anyanwụ Ireland bụ́ ebe, dị ka ụfọdụ ndị si kwuo, ọ nọrọ 40 ụbọchị ehihie na abalị n’otu elu ugwu nke e mesịrị gụọ aha ya—Croagh Patrick (nke pụtara “Ugwu Patrick”). O buru ọnụ, kpeekwa ekpere n’ebe ahụ maka ihe ịga nke ọma nke ọrụ ọ bịara ịrụ.
N’ime ọtụtụ afọ gafeworonụ, ọtụtụ akụkọ mgbe ochie ebilitewo banyere ihe ndị ọ rụrụ. Otu n’ime ndị a kasị mara bụ na ka ọ nọ n’elu ugwu ahụ, Patrick chụpụrụ agwọ nile na Ireland.
Akụkọ ọdịnala na-ekwu na o wuru otu ntakịrị chọọchị n’ọnụ ọnụ ugwu ahụ. Ọ bụ ezie na ihe owuwu ahụ apụwo n’anya kemgbe, ntọala mbụ ahụ ka dị, gburugburu ebe ahụ tinyere ugwu ahụ abụwokwa ebe ime njem ala nsọ eri ọtụtụ afọ.
Ihe Ndị Mejupụtara Njem Ala Nsọ Ahụ
Nye onye meworo agadi ma ọ bụ onye ịrị ugwu na-amaghị ahụ, nanị ịrịgo na ịrịtu ugwu ahụ dị kilomita ise n’emerụghị ahụ bụ ịrụzu oké ihe n’onwe ya.
Ìgwè ndị nlekọta ndị dị njikere ilekọta ụdị mmerụ ahụ dị iche iche nọ n’ebe ndị dị mkpa n’okporo ụzọ ahụ.
E nwere ebe atọ ma ọ bụ ebe nkwụsị, n’ogologo ụzọ ahụ ebe ndị na-eme njem ala nsọ na-eme ihe omume dị iche iche nke ịkwa ụta n’ihi mmehie. A kọwara ndị a n’ụzọ zuru ezu na bọọdụ ịma ọkwa nke dị n’ala ala ugwu ahụ.—Lee igbe.
N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Arị Ya?
N’ihi gịnị ka ọtụtụ ji eme njem ala nsọ nke a siri ike? N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji eru n’ókè dị otú ahụ mgbe ha na-arị ya?
Ụfọdụ kwenyere na site n’ikpe ekpere n’oge njem ala nsọ ahụ, o yikarịrị ka a ga-anụ arịrịọ ha nile maka abamuru onwe onye. Ndị ọzọ na-eme ya ná nchụso nke mgbaghara mmehie maka mmejọ ụfọdụ. Nye ndị ọzọ, nke a bụ ụzọ isi gosi ekele. N’ezie, ọtụtụ na-eje n’ihi akụkụ mmekọrịta ọha na eze ya. Otu onye ọnụ na-eru n’okwu kwuru na ọ bụ ‘ngosipụta nke mmụọ imekọ ihe ọnụ na ịhụnanya mmadụ na ibe ya.’ O kwukwara na ịrị Croagh Patrick “bụ ụzọ ha si agbaso nzọụkwụ St. Patrick nakwa isi gosipụta na ha matara ụgwọ ha ji ya n’okwukwe.” O kwukwasịrị na, nke kasị mkpa, ịrị ugwu ahụ bụ “otu ụdị nke ọpịpịa n’ihi na ndọlị anụ ahụ dị na ya bụ n’ezie ihe omume ịkwa ụta n’ihi mmehie. Ịrị ugwu ahụ nke nta nke nta ruo n’ọnụ ọnụ ya bụ omume nke inwe mwute dị ogologo.”
Otu nwoke ji nganga kwuo na ya arịwo ugwu ahụ 25 ugboro! O mere ya, ka o kwuru, “iji nyetụ onwe m ọpịpịa n’ihi mmehie m!” Nwoke ọzọ kwuru nnọọ, sị, “A dịghị amụta ihe ma a taghị ahụhụ!”
Ọ bụ ezie na ọ dịghị mkpa, ọtụtụ na-agba ụkwụ nkịtị arị ugwu ahụ. N’ihi gịnị ka ha ji eme nke ahụ? Nke mbụ, ha na-ele ala ebe ahụ anya dị ka nke dị “nsọ,” ya mere ha na-eyipụ akpụkpọ ụkwụ ha. Nke abụọ, ọ bụ n’ikwekọ ná nzube ha bụ́ ‘imetụ ọpịpịa.’ Nke a kwa na-akọwa ihe mere ụfọdụ ji ọbụna eji ikpere eme ihe omume nke ebe nkwụsịtụ ndị ahụ.
Ndị A Kpaliri Inwe Ekele n’Ebe Onye Okike Nọ
Ma gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ enweghị otu ụdị echiche ahụ nke ndị na-eme njem ala nsọ nwere bụ́ ndị na-arị ugwu ahụ n’ụbọchị ndị pụrụ iche? A pụrụ ịrị ugwu ahụ mgbe ọ bụla ma e nwee ihu igwe dị mma na akpụkpọ ụkwụ siri ike. Anyị arịghị ya ụbọchị ìgwè ndị na-eme njem ala nsọ na-arị ya. Ọtụtụ ugboro n’oge ndị anyị kwụsịtụrụ izuru ike, anyị nwere ike ịtụgharị uche n’ịrị ugwu ahụ n’onwe ya na mmetụta o nweworo n’ahụ ọtụtụ ndị. N’iji uche na-eche ka ọtụtụ puku ndị na-eme njem ala nsọ na-arị ugwu a siri ike ọrịrị ma na-eme ihe omume nke ọpịpịa n’ihi mmehie, a manyere anyị iche, sị, ‘Nke a ọ̀ bụ ihe Chineke na-achọ? Ememe okpukpe nke ịrị ugwu ma ọ bụ ịga gburugburu ihe ncheta dị iche iche ka a nọ na-ekwughachi ekpere ugboro ugboro ọ̀ na-adọta onye ọ bụla nso n’ezie n’ebe Chineke nọ?’ Gịnị banyere ndụmọdụ Jisọs nke dị na Matiu 6:6, 7 banyere ekpere ndị a na-ekpe ugboro ugboro?
N’ezie, anyị arịghị ugwu ahụ iji nweta ahụmahụ okpukpe. Ma, anyị nwere mmetụta nke ịnọdewe Onye Okike anyị nso karị n’ihi na anyị pụrụ inwe ekele maka ihe ndị o kere, ebe ugwu n’ebe ọ bụla ọ dị bụ akụkụ nke ihe ịtụnanya ndị dị n’ụwa. Site n’ọnụ ọnụ ugwu ahụ anyị nwere ike ikiri ọdịdị mbara mara mma n’enweghị ihe ọ bụla kpuchiri anyị ụzọ, ọbụna na-ahụ ụsọ Oké Osimiri Atlantic. Ụmụ obere àgwàetiti ndị na-egbukepu egbukepu n’ọnụ mmiri ndị dị anyị n’okpuru n’otu akụkụ dị nnọọ iche pụọ n’ógbè ugwu ahụ dị mkputamkpu, nke tọgbọkwa chakoo n’akụkụ nke ọzọ.
Anyị chere banyere ebe nkwụsịtụ atọ ahụ. Anyị chetara okwu ndị Jisọs kwuru n’onwe ya, mgbe ọ gwara ezi ụmụazụ ya, sị: “Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu, dị ka ndị mba ọzọ na-eme: n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ọtụtụ okwu ha na-ekwu.”—Matiu 6:7.
Anyị chọpụtara na ugwu ahụ aghọọla akụkụ nke ọdịnala nke jikọtaworo ọtụtụ puku mmadụ n’ememe okpukpe ahụ siri ike. Anyị tụlere otú nke ahụ si dị iche ná nnwere onwe nke Jọn onyeozi kwuru maka ya mgbe ọ sịrị: “Ka anyị debe ihe nile [Chineke] nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.”—1 Jọn 5:3.
Mkpapụ anyị tọrọ anyị ụtọ, gụnyere ịrị elu Croagh Patrick. Ọ kpaliri anyị ilepụ anya n’ihu mgbe ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ n’ọdịnala ndị na-adịghị na Bible ma nwee ike ife Onye Okike na-ahụ n’anya nke ụwa ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:24.
[Igbe dị na peeji nke 27]
Ihe Ndị Bụ́ Isi na Njem Ala Nsọ
Onye ọ bụla na-eme njem ala nsọ nke rịgoro ugwu ahụ n’Ụbọchị St. Patrick ma ọ bụ n’ime ụbọchị asatọ ahụ nke ememe, ma ọ bụ n’oge ọ bụla ọzọ n’ime ọnwa June, July, August na September, NA-EKPEKWA EKPERE N’IME MA Ọ BỤ N’EBE DỊDEWERE ỤLỌ EKPERE AHỤ maka nzube nile nke Popu pụrụ inweta mgbaghara mmehie ya nile ma ọ bụrụ na o jee Nkwupụta na Oriri Dị Nsọ n’Ọnụ Ọnụ Ugwu ahụ ma ọ bụ n’ime izu ahụ.
EBE NDỊ A NA-AKWỤSỊTỤKARỊ
E nwere “ebe nkwụsịtụ” atọ (1) N’ala ala nke ugwu ahụ pịrị ọnụ ma ọ bụ Leacht Benain, (2) N’ọnụ ọnụ ugwu ahụ, (3) Roilig Muire, ma a gatụkwuo site n’akụkụ nke Lecanvey [obodo] dị n’akụkụ ugwu ahụ.
Ebe Nkwụsịtụ nke Mbụ - LEACHT BENAIN
Onye ahụ na-eme njem ala nsọ na-agagharị gburugburu ikpó nkume ahụ ugboro asaa na-ekpe ekpere Nna Anyị Bi n’Eluigwe 7, Ekele Marịa 7, na otu Okwukwe Ndị Ozi.
Ebe Nkwụsitụ nke Abụọ - ỌNỤ ỌNỤ UGWU AHỤ
(a) Onye ahụ na-eme njem ala nsọ na-egbu ikpere n’ala ma kpee ekpere Nna Anyị Bi n’Eluigwe 7, Ekele Marịa 7 na otu Okwukwe Ndị Ozi
(b) Onye ahụ na-eme njem ala nsọ na-ekpe ekpere n’ebe dịdewere Ụlọ Ekpere ahụ maka nzube nile nke Popu.
(ch) Onye ahụ na-eme njem ala nsọ na-aga gburugburu Ụlọ Ekpere ahụ ugboro 15 na-ekpere ekpere Nna Anyị Bi n’Eluigwe 15, Ekele Marịa 15 na otu Okwukwe Ndị Ozi
(d) Onye ahụ na-eme njem ala nsọ na-aga gburugburu Leaba Phadraig [Àkwà Patrick] ugboro 7 na-ekpe ekpere Nna Anyị Bi n’Eluigwe 7, Ekele Marịa 7 na otu Okwukwe Ndị Ozi
Ebe Nkwụsịtụ nke Atọ - ROILIG MUIRE
Onye ahụ na-eme njem ala nsọ na-aga gburugburu ikpó nkume nke ọ bụla ugboro 7, na-ekpe ekpere Nna Anyị Bi n’Eluigwe 7, Ekele Marịa 7 na otu Okwukwe Ndị Ozi na nke ọ bụla [ọ dị ikpó atọ], n’ikpeazụ gaa gburugburu Roilig Muire ahụ dum ugboro 7 na-ekpe ekpere.