“Ire Nnu” na Mozambique
FRANCISCO COANA, bụ́ onye òtù nke kọmitii mba Mozambique, nọrọ afọ iri ‘n’ogige nzigharị ihe.’ Ọ na-akọ ahụmahụ ya: “Amaara m na anyị ga-anọ ebe a ruo oge ụfọdụ, ya mere ajụrụ m onye nlekọta sekit ma m̀ nwere ike ịga n’ihu dị ka onye ọsụ oge nile. Ma olee otú m ga-esi nwee ike itinye oge zuru ezu n’ozi ihu ọha, ebe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mmadụ nile nọ n’ogige ndị ahụ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova? Ekwuru m na m ga-apụ jee Milange, obodo dị 47 kilomita site n’ebe ahụ, iji chọta ndị a ga-ekwusara ozi ọma.
“Ọ bụ ezie na n’ụzọ iwu e nyeghị anyị ohere ịhapụ ogige ahụ, iwu a esighị ike. M ka pụrụ icheta ịbanye n’ime ọhịa, na-egbu ikpere n’ala, na-ekpekwa ekpere maka ụzọ isi mee nkwusa gwa ndị obodo. Jehova zara n’oge na-adịghị anya.
“Ejekwuuru m otu nwoke nwere ịnyịnya ígwè, mụ na ya kwekọrịtakwara. O kwetara na ọ bụrụ na mụ akọọrọ ya ala ya dị eka abụọ tupu oge udu mmiri, ọ ga-eji ịnyịnya ígwè a kwụọ m ụgwọ ọrụ. Ya mere etinyere m ụtụtụ ọ bụla n’ịkọ ubi ya. Jehova gọziri ndokwa nke a, ebe m mesịrị nweta ịnyịnya ígwè m.
“Ihe ọ rụpụtara bụ na m nwere ike iru obodo Milange ahụ buru ibu ma jiri ozi ọsụ ụzọ m gaa n’ihu n’ụzọ dị irè n’ubi a na-arụpụta ihe. Ebe ọ bụ na a machibidoro ọrụ anyị iwu, aghaghị m ịtụpụta atụmatụ iji mee ka ndị mmadụ mata eziokwu ahụ. Ka m fọkpunyesịrị akwụkwọ na magazin n’okpuru uwe m, eji m akpa kporotụ nnu wee na-eregharị nnu. Kama ịdị na-ere ya meticais 5, m na-ere ya meticais 15. (Ọ bụrụ na ọ dị ọnụ ala nke ukwuu, ndị mmadụ ga-azụkọrọcha ya, agaghị m enwekwa nnu ọ bụla iji na-eme nkwusa!) Otú ka mkparịta ụka m si aga:
“‘Ndeewo! Ana m ere nnu taa.’
“‘Ego olè?’
“‘Meticais 15.’
“‘Mba, mba. Ọ dị oké ọnụ!’
“‘Ee, ekwetara m na ọ dị oké ọnụ. Ma ọ bụrụ na i chere na ọ dị oké ọnụ ugbu a, chetụkwuo n’ihi na ọ ga-adị oké ọnụ karị n’ọdịnihu. Ị̀ maara na e buru nke a n’amụma n’ime Bible?’
“‘Agụtatụbeghị m nke ahụ na Bible mụ.’
“‘Ee, ọ dị n’ebe ahụ. Weta Bible gị, ka m gosi gị ya.’
“Otú a, mkparịta ụka ga-amalite na-eji Bible ya eme ihe, ka nke m wee nwee ike ịnọgide n’okpuru uwe m. M ga-ezo aka ná Mkpughe isi 6, banyere ọnọdụ ndị dị oké njọ na ụkọ ihe oriri. Ọ bụrụ na m hụ nzaghachi dị mma, m ga-ewepụta akwụkwọ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi ma ọ bụ Ozi Ọma Nke Geme Ka I Nwee Obi-utọ wee malite ọmụmụ Bible kpọmkwem.
“Ihe si na ya pụta bụ na m nwere ike ịmalite otu ìgwè nke mmadụ 15 nwere mmasị na Milange. Ma ọ dịghị anya ndị ọchịchị wee mata banyere ọrụ anyị. Otu ụbọchị ka m nọ na-eduzi otu ọmụmụ Bible, ndị uwe ojii wabatara wee jide anyị. A kpụgara anyị nile gụnyere ụmụaka ndị e nwere n’ezinụlọ ahụ n’ụlọ mkpọrọ dị n’ógbè ahụ. Ka anyị nọsịrị otu ọnwa n’ebe ahụ, e zighachiri anyị nile n’ogige ahụ.”
Ahụmahụ ndị a emeghị ka ịnụ ọkụ n’obi nke ụmụnna anyị belata. Kama nke ahụ, Francisco na ezinụlọ ya, tinyere ọtụtụ ụmụnna ha ndị nọ n’ogige ndị ahụ, na-efe ofufe ma na-eme nkwusa ugbu a n’okpuru ọnọdụ nnwere onwe na Mozambique.