Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 4/15 p. 29
  • “Ire Nnu” na Mozambique

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ire Nnu” na Mozambique
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 4/15 p. 29

“Ire Nnu” na Mozambique

FRANCISCO COANA, bụ́ onye òtù nke kọmitii mba Mozambique, nọrọ afọ iri ‘n’ogige nzigharị ihe.’ Ọ na-akọ ahụmahụ ya: “Amaara m na anyị ga-anọ ebe a ruo oge ụfọdụ, ya mere ajụrụ m onye nlekọta sekit ma m̀ nwere ike ịga n’ihu dị ka onye ọsụ oge nile. Ma olee otú m ga-esi nwee ike itinye oge zuru ezu n’ozi ihu ọha, ebe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mmadụ nile nọ n’ogige ndị ahụ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova? Ekwuru m na m ga-apụ jee Milange, obodo dị 47 kilomita site n’ebe ahụ, iji chọta ndị a ga-ekwusara ozi ọma.

“Ọ bụ ezie na n’ụzọ iwu e nyeghị anyị ohere ịhapụ ogige ahụ, iwu a esighị ike. M ka pụrụ icheta ịbanye n’ime ọhịa, na-egbu ikpere n’ala, na-ekpekwa ekpere maka ụzọ isi mee nkwusa gwa ndị obodo. Jehova zara n’oge na-adịghị anya.

“Ejekwuuru m otu nwoke nwere ịnyịnya ígwè, mụ na ya kwekọrịtakwara. O kwetara na ọ bụrụ na mụ akọọrọ ya ala ya dị eka abụọ tupu oge udu mmiri, ọ ga-eji ịnyịnya ígwè a kwụọ m ụgwọ ọrụ. Ya mere etinyere m ụtụtụ ọ bụla n’ịkọ ubi ya. Jehova gọziri ndokwa nke a, ebe m mesịrị nweta ịnyịnya ígwè m.

“Ihe ọ rụpụtara bụ na m nwere ike iru obodo Milange ahụ buru ibu ma jiri ozi ọsụ ụzọ m gaa n’ihu n’ụzọ dị irè n’ubi a na-arụpụta ihe. Ebe ọ bụ na a machibidoro ọrụ anyị iwu, aghaghị m ịtụpụta atụmatụ iji mee ka ndị mmadụ mata eziokwu ahụ. Ka m fọkpunyesịrị akwụkwọ na magazin n’okpuru uwe m, eji m akpa kporotụ nnu wee na-eregharị nnu. Kama ịdị na-ere ya meticais 5, m na-ere ya meticais 15. (Ọ bụrụ na ọ dị ọnụ ala nke ukwuu, ndị mmadụ ga-azụkọrọcha ya, agaghị m enwekwa nnu ọ bụla iji na-eme nkwusa!) Otú ka mkparịta ụka m si aga:

“‘Ndeewo! Ana m ere nnu taa.’

“‘Ego olè?’

“‘Meticais 15.’

“‘Mba, mba. Ọ dị oké ọnụ!’

“‘Ee, ekwetara m na ọ dị oké ọnụ. Ma ọ bụrụ na i chere na ọ dị oké ọnụ ugbu a, chetụkwuo n’ihi na ọ ga-adị oké ọnụ karị n’ọdịnihu. Ị̀ maara na e buru nke a n’amụma n’ime Bible?’

“‘Agụtatụbeghị m nke ahụ na Bible mụ.’

“‘Ee, ọ dị n’ebe ahụ. Weta Bible gị, ka m gosi gị ya.’

“Otú a, mkparịta ụka ga-amalite na-eji Bible ya eme ihe, ka nke m wee nwee ike ịnọgide n’okpuru uwe m. M ga-ezo aka ná Mkpughe isi 6, banyere ọnọdụ ndị dị oké njọ na ụkọ ihe oriri. Ọ bụrụ na m hụ nzaghachi dị mma, m ga-ewepụta akwụkwọ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi ma ọ bụ Ozi Ọma Nke Geme Ka I Nwee Obi-utọ wee malite ọmụmụ Bible kpọmkwem.

“Ihe si na ya pụta bụ na m nwere ike ịmalite otu ìgwè nke mmadụ 15 nwere mmasị na Milange. Ma ọ dịghị anya ndị ọchịchị wee mata banyere ọrụ anyị. Otu ụbọchị ka m nọ na-eduzi otu ọmụmụ Bible, ndị uwe ojii wabatara wee jide anyị. A kpụgara anyị nile gụnyere ụmụaka ndị e nwere n’ezinụlọ ahụ n’ụlọ mkpọrọ dị n’ógbè ahụ. Ka anyị nọsịrị otu ọnwa n’ebe ahụ, e zighachiri anyị nile n’ogige ahụ.”

Ahụmahụ ndị a emeghị ka ịnụ ọkụ n’obi nke ụmụnna anyị belata. Kama nke ahụ, Francisco na ezinụlọ ya, tinyere ọtụtụ ụmụnna ha ndị nọ n’ogige ndị ahụ, na-efe ofufe ma na-eme nkwusa ugbu a n’okpuru ọnọdụ nnwere onwe na Mozambique.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya