Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 11/1 p. 23-27
  • Inyere Ezinụlọ Anyị nke Ndị Kwere Ekwe na Bosnia Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inyere Ezinụlọ Anyị nke Ndị Kwere Ekwe na Bosnia Aka
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Hà Bụ Mgbalị Ndị Kụrụ Afọ n’Ala?
  • Irute Travnik
  • Ịga Zenica
  • Ịlaghachi Ụlọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 11/1 p. 23-27

Inyere Ezinụlọ Anyị nke Ndị Kwere Ekwe na Bosnia Aka

NDỊÀMÀ JEHOVA adịghị ekere òkè ma ọlị n’esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:16) Otú ọ dị, n’ịgbaso ndụmọdụ Pọl ime ihe ọma “karịsịa nye ezinụlọ anyị nke ndị kwere ekwe,” ha na-agbata ngwa ngwa inyere ndị Kraịst ibe ha aka n’ebe agha tikpọsịrị. (Ndị Galetia 6:10, Beck) Ka oge oyi nke 1993-1994 na-eru nso, Ndịàmà si Austria na Croatia tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ iji nyere ezinụlọ ha nke ndị kwere ekwe aka na Bosnia. Ihe na-esonụ bụ akụkọ ha.

Malite March ruo October 1993, e nweghị ohere ọ bụla ibuga ihe enyemaka na Bosnia. Otú ọ dị, ná mmalite October, ndị ọchịchị gosiri na ọ pụrụ ikwe omume ibuga ngwongwo. Nke a ka ga-abụ ihe omume dị ize ndụ, ebe e nwere oké ịlụ ọgụ n’ihu agha nile nke Bosnia.

Ka o sina dị, na Tuesday, October 26, 1993, gwongworo anyị hapụrụ Vienna na-ebu tọn 16 nke nri na nkụ maka ndị Kraịst ibe anyị na Bosnia. Anyị yi baajị mgbakọ distrikti anyị maka ịkọwa ndị anyị bụ.

Ka anyị rutere n’ókèala Croatia na Bosnia, e duuru anyị gaa n’otu ogige ndị agha ebe e nyochasịrị gwongworo anyị nile nke ọma. A jụrụ arịrịọ anyị ime njem gabiga ala Serbia. A ga-ekwe ka anyị gaa n’ihu nanị site n’etiti Bosnia​—⁠kpọmkwem gabiga ebe a na-alụ agha!

Hà Bụ Mgbalị Ndị Kụrụ Afọ n’Ala?

Ka ndị ndú bụ́ ndị agha duuru anyị site n’otu ebe nnyocha gaa n’ọzọ, anyị nụrụ ụda ogbunigwe ndị sitere n’ụgbọ agha na égbè dị iche iche. N’abalị, anyị mere njem gabiga oké ọhịa dị iche iche na-abụ ndị ụgbọ agha abụọ na otu ụgbọ ala jeep na-edu. Gwongworo anyị ji nwayọọ nwayọọ gbebata n’ihu ọgbọ agha! Ihe nile gara nke ọma ruo n’ụtụtụ mgbe a wụrụ mgbọ ndị fefere isi anyị, ọ dịkwara anyị mkpa izo n’azụ otu ugwu. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọgbụgba égbè ahụ kwụsịrị, anyị gakwara n’ihu ná njem anyị.

Mgbe anyị rutere n’otu ogige, ọfịsa na-elekọta ya jụrụ anyị ndị anyị bụ na ihe anyị chọrọ. “Ihe unu na-eme aghaghị ịkụ afọ n’ala,” ka o kwuru mgbe anyị kwusịrị nzube anyị. “Unu enweghị ohere ọ bụla nke isi n’ogige ahụ laa n’udo, ọbụna ịga mita ole na ole. E nwere oké ụnwụ nri ná mba a nke na ndị mmadụ ga-awakpo unu ma zuru ihe unu bu.” Ọ gbara anyị ume ịtụgharị ma laghachi.

Mgbalị anyị hà bụ ‘ndị na-aghaghị ịkụ afọ n’ala’? Ọ̀ bụ ihe efu ịtụ anya na anyị pụrụ ịgabiga ebe ndị agha tikpọsịrị na ebe agụụ na-agụgbu ndị mmadụ ma ka chebe ihe anyị bu na ndụ anyị? A ghaghị ime mkpebi siri ike. Anyị anụworị ụda égbè na ntiwapụ na-adachi nti nke bọmbụ dị iche iche. Ka anyị na ndị soja ahụ nọrọ ọnọdụ abalị, anyị pụrụ ịhụ na ha dị njikere maka ndọlị nile nke agha. Ha yi uwe mgbochi mgbọ, burukwa ihe agha ndị bụ ọkpọka. Ọbụna osi nri bu otu égbè na-awụpụ mgbọ n’azụ ya. Leekwa anyị n’ebe ahụ na-eyi uwe elu nkịtị, eriri olu, na baajị! Ọ̀ bụ ihe amamihe ịga n’ihu?

Irute Travnik

Nanị olileanya anyị nwere, dị ka o yiri, bụ iso òtù nke atọ n’agha a mee nkwekọrịta. Ụtụtụ na-esonụ anyị jụrụ otu nwa agbọghọ ma ọ maara ebe anyị ga-achọta ogige bụ́ isi nke òtù ahụ. “Ọ dịghị anya,” ka ọ sịrị. “Sinụ n’ime ọhịa a gabiga, unu ga-ahụ otu ụlọ bụbu ụlọ ọgwụ.” Ọ dị anyị ọkụ n’ahụ ịga. Ọ tụrụ ndị soja ahụ n’anya na anyị nwara ịhapụ ogige ahụ n’ebughị ihe agha.

Ụlọ ọgwụ oge mbụ ahụ dakasịrị adakasị, ma otu ọfịsa nọ ya. O kwetara inye aka, na-atụrụ anyị aro ibu ụzọ gwa ọchịagha ya. O ji ụgbọ ya a gbajasịrị agbajasị buru anyị n’oké ọsọ gaa n’ebe ihu agha. Anyị kwụsịrị n’otu ụlọ ebe ọchịagha ahụ nabatara anyị n’otu ọnụ ụlọ gbara ọchịchịrị.

“N’abalị gara aga anyị chọrọ ịkwa unu mgbọ,” ka ọ sịrị. “Gịnị ka unu chọrọ?”

“Anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị chọkwara ibugara ụmụnna anyị ihe enyemaka.”

O juru ya anya nke ukwuu​—⁠metụkwa ya n’obi⁠—​n’ihi na ruo ọtụtụ izu ọ dịghị ụgbọ ihe enyemaka nwara ịbata Bosnia. Mgbe e nyochasịrị anyị nke ọma, e nyere anyị ihe nnwapụta e dere ede. N’abalị gara aga anyị chere na anyị enweghị ohere ọ bụla ịga n’ihu ná njem anyị, ma ugbu a anyị pụrụ ịga n’ihu n’enweghị ndị ndú!

Anyị gbaara gabiga oké ọhịa ndị ahụ, na-agafe ọtụtụ ebe nnyocha, na mgbe ụfọdụ anyị na-agabiga ihu agha. N’agbanyeghị ihe ize ndụ ahụ, anyị rutere Travnik n’udo. Otu soja nụrụ maka ọbịbịa anyị gbagara n’otu ụlọ ebe ụmụnna anyị zukọrọ. “Ndị òtù unu bu gwongworo ndị ahụ nọrọ ebe a!” ka o tiri ná mkpu. Ị pụrụ ịtụ anya ọṅụ ha nwere. Anyị bubara nri n’ụlọ ahụ, kwuo okwu ole na ole, ma mgbe ahụ anyị aghaghị ịga n’ihu. Chi na-eji, njem dị ize ndụ nke 32 kilomita dịkwa n’ihu.

Ịga Zenica

Ụgbọ ndú duziiri anyị ụzọ gabiga oké ọhịa ndị ahụ n’oké ọsọ. Ụfọdụ kwuru na ọ dịghị ihe ga-eme ka anyị ruo Zenica n’udo, ma anyị ruru. Obi mwute yiri ka o rikpuwo obodo ahụ. E nweghị ọkụ ọ bụla, e nweghịkwa ụgbọ ala ọ bụla n’ụzọ. A wakporo Zenica site n’akụkụ nile, na-akpata oké ụnwụ nri na obi nkoropụ.

Ka anyị gbaara na-agabiga okporo ámá, anyị hụrụ otu ihe dị ịtụnanya​—⁠ụmụnna nwanyị abụọ bụ́ ndị Kraịst ka ha na-agba àmà! N’ụbọchị bu ụzọ ná nzukọ ha, ka anyị chọpụtara, e kpebiri na ụmụnna nwoke ga-aga n’ime ọhịa ịchọ nri, ebe nri gwụsịworo. Anyị rutere nnọọ n’oge! Anyị butusịrị ihe dị n’otu gwongworo ndị ahụ n’elekere anya anọ nke ụtụtụ, mgbe ọ na-adịghị onye nọ n’okporo ámá.

N’ụbọchị na-esonụ, anyị gakwuuru otu ọchịagha, onye nwere oké ijuanya na anyị rutere Zenica. Anyị jụrụ ajụjụ ugbu a banyere ebe ọzọ anyị na-aga, Sarajevo.

“Ọ dịghị onye nwaworo ibu gwongworo banye ebe ahụ ruo ọtụtụ ọnwa,” ka ọchịagha ahụ kwuru. Ma o mesịrị nye anyị ikike ime njem gabiga ugwu ndị ahụ. “Ma ka m gwa unu, o siri ike,” ka ọ dọrọ aka ná ntị ya. “Ejighị m n’aka na gwongworo unu siruru ike imeli ya.”

Ọchịagha ahụ ekwubigaghị okwu ókè. Mgbe anyị nọ nanị 40 kilomita tupu e ruo Sarajevo, anyị aghaghị isoro ụzọ ọzọ dị 140 kilomita gabiga oké ọhịa ndị ahụ! Ọ dịghị mgbe anyị ga-echezọ njem nke isi Zenica gaa Jablanica na-agabiga Sarajevo bụ́ nke were ụbọchị atọ na abalị abụọ, ọtụtụ mgbe n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ nke nanị kilomita ise kwa hour. “Ụzọ” ahụ bụ warawara ụzọ ụgbọ agha gagbuworo. Anyị gbaara gabiga nkume na olulu ndị na-atụ egwu. Ọtụtụ mgbe anyị aghaghị ịgba n’enweghị ìhè, ugboro abụọ kwa ọ fọrọ nke nta ka gwongworo anyị nile mịchapụ n’ugwu ndị na-amị amị. Ụgbọ ndị agha na-eso ahịrị gwongworo anyị gbanwuru ọkụ ya nanị otu ugboro e wee gbaa ya égbè ozugbo ahụ. Mgbe ụfọdụ anyị aghaghị idozi àkwà mmiri ndị e mebiri emebi na taya.

Ka anyị rutere ná mpụga Sarajevo, anyị gara ịgwa ọchịagha na-elekọta ebe ahụ okwu. Ka anyị na-echere, anyị hụrụ otu gwongworo n’okporo ámá nke bu ozu mmadụ iri na ùkwù isi ndị mmadụ; ndị soja na-ahụ ọnụ maka ibughara ozu​—⁠ihe nkiri na-adịghị atọ ụtọ n’ezie, na-eme ka ọ gụsie anyị agụụ ike bụ́ ụbọchị ahụ mgbe agha ga-akwụsị.​—⁠Aịsaịa 2:4.

N’elekere anya 10:00 nke ụtụtụ, e mesịrị nye otu n’ime anyị ohere iso ọchịagha ahụ na ndị isi agha ya kwuo okwu n’otu ọnụ ụlọ gbara ọchịchịrị, nke nanị otu kandụl na-enye ìhè na ya.

“Olè ndị ka unu bụ?” ka ọchịagha ahụ jụrụ.

“Anyị bụ Ndịàmà Jehova. Anyị chọrọ ibugara Ndịàmà ibe anyị na Sarajevo nri.”

“Ùnu maara na e nwere ọtụtụ Ndịàmà Jehova na Sarajevo?”

“Ee, ọ bụ ya mere anyị ji nọrọ n’ebe a.”

Mgbe ahụ ọchịagha ahụ kpọrọ aha otu Onyeàmà. “Ùnu maara ya?”

“Ee, ọ bụ enyi anyị.”

“Ọ bụ enyi m kwa,” ka ọchịagha ahụ kwuru. “Anyị gakọrọ akwụkwọ. Kemgbe ọ ghọrọ Onyeàmà, m na-akwanyekwuru ya ùgwù ọbụna karị. O meworo unu ihe dị ukwuu. Biko gwakwuonụ anyị okwu banyere Ndịàmà Jehova.”

Mkparịta ụka were otu hour gara n’ihu, nke e tinyere magazin na broshuọ karịrị iri na abụọ mgbe ọ gasịrị. Mgbe e nwesịrị nzukọ nke abụọ, ọchịagha ahụ kwere ime ndokwa ndị pụrụ iche ka e wee bugara ụmụnna nọ na Sarajevo ihe enyemaka ndị ahụ.

Nke a abụghị ihe ntakịrị. Ihe dị ka 30 mmadụ, gụnyere ụfọdụ na-abụghị Ndịàmà, bu ngwugwu ndị dị 27 kilogram n’arọ. Ha rụrụ ọrụ site na 8:00 uhuruchi ruo 5:00 ụtụtụ n’abalị abụọ dị iche​—⁠ngụkọta nke hour 18. Otu okenye kọrọ na mgbalị enyemaka ndị ahụ metụrụ ndị agbata obi ya n’ahụ nke ukwuu nke na ha so ụmụnna anyị gbuo ikpere n’ala kelee Jehova! Ee, ha onwe ha natakwara nri ụfọdụ.

Cheedị echiche ọṅụ ụmụnna anyị nwere ịnata ihe dị ka 11,000 kilogram nke nri enyemaka! Ọnọdụ ahụ siri oké ike. N’obodo ahụ, otu kilogram nke ntụ achịcha bụ malite DM450 na DM1,000 ($300 na $660, U.S.). Otu ùkwù nkụ bụ ihe dị ka DM400 ($260, U.S.), otu lita petrol bụkwa DM30 ($20, U.S.).

O yiri ka e nyeghachiwo anyị ụgwọ ọrụ ugbu a maka ihe ize ndụ ọ bụla anyị chere ihu n’ụzọ. Obi dị anyị ụtọ ịhụ ọṅụ ụmụnna anyị mgbe ha natara ihe enyemaka nke a. Ọ bụ ahụmahụ nke ha​—⁠na anyị⁠—​na-agaghị echezọ echezọ. Ma ugbu a anyị aghaghị ịmalite iche echiche banyere ihe ịma aka nke ịlaghachi ụlọ.

Ịlaghachi Ụlọ

“Olee otú anyị ga-esi laghachi?” ka anyị jụrụ ọchịagha ahụ.

“Otu ụzọ ahụ unu si bịa,” ka ọ zaghachiri.

Ike gwụsịrị anyị, petrol anyị fọrọ ntakịrị, anyị enweghịkwa taya mgbanwegharị. Mmiri malitere izo, anyị apụghịkwa ịgbafere ụrọ. Anyị jụrụ ọchịagha ahụ ma anyị pụrụ ịga n’ụzọ ndịda.

“E nwere ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ n’ebe ahụ,” ka ọ sịrị. “Ọbụna òké apụghị ịgafere ya.” Ma, mgbe obere oge gafere, o chegharịrị echiche. “Nwaanụ ya,” ka o kwuru. “E kwuwerị, unu rutere ebe a.”

Anyị aghaghị ịhapụ otu gwongworo ma kee petrol ya n’etiti gwongworo atọ fọrọnụ. Anyị hapụrụ n’etiti abalị ma gbarakwa banye n’oké ọhịa ndị ahụ ọzọ.

Njem anyị ịla ụlọ agaghị werewere. Anyị zutere otu gwongworo ndị amị dara ada, dachitụ otu àkwà mmiri nke anyị ga-agafe. Anyị chọpụtara na ọ bụrụ na anyị pụrụ iwepụ nanị otu wheel ya, anyị ga-enwe ohere zuru ezu ịgafe.

Anyị rịọrọ otu soja bu ngwá agha. “Ànyị pụrụ iwepụ wheel ahụ ma tinyeghachi ya mgbe anyị gafesịrị àkwà mmiri a?”

“Ọ bụrụ na unu emetụ wheel ahụ aka, égbè m ga-enwe ọrụ ịrụ,” ka soja ahụ zaghachiri, na-atụ anyị égbè ya.

Anyị chere na ọ ga-aka mma ime kọfị ma nye soja ahụ otu iko. Ruo hour ole na ole, anyị kọọrọ ya banyere mgbakọ mba nile nke 1991, dị ka nke e nwere na Zagreb. Mgbe nke ahụ gasịrị, omume ya kara mma, o kwekwara ka anyị wepụ wheel ahụ.

Na Jablanica, otu n’ime anyị gwara otu ọchịagha banyere ụzọ anyị chọrọ iso. Ọ pụghị ikweta ihe ọ na-anụ. “Unu chọrọ ịgabiga Ndagwurugwu Neretva?”

Ihe mere o ji kụja kwere nghọta. Akụkụ ugwu nile nke Ndagwurugwu Neretva dị n’aka ìgwè ndị agha dị iche iche. Ha na-agbarịta onwe ha égbè mgbe nile. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 16, ụzọ ahụ na-amị amị. “Ọ bụ otú ahụ ka ụzọ ahụ dị,” ka ọchịagha ahụ kwuru, “ùnu chọkwara ịgabiga ya?”

Mgbe ọ tụlesịrị okwu ahụ, ọchịagha ahụ sịrị na anyị pụrụ ịga​—⁠ma nanị ma ndị ọfịsa eso anyị. Otú ọ dị, ndị ọfịsa ndị a enweghị mmasị iso anyị! N’ikpeazụ, anyị rịọrọ ka ha kpọtụrụ ndị nke ọzọ ma maa ọkwa ngabiga anyị. Anyị ga-agabiga n’enweghị ndị ndú n’ụtụtụ echi ya.

N’okpotokpo aka akwụkwọ, anyị biri aha na gwongworo anyị dị ka ndị bu ihe ọrụ ebere. Mgbe anyị kpesịrị ekpere, anyị gbaara banye ná ndagwurugwu ahụ. Anyị kwekọrịtara na ọ bụrụ na a gbaa anyị égbè, anyị agaghị agbasikwu ike ka a ghara inyo anyị enyo.

Anyị gabigara àkwà mmiri ahụ gaa n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ ma gaa n’ihu ná ndagwurugwu nke na-esonụ, na-agabiga ozu ụmụ anụ na gwongworo na ụgbọ agha ndị a gbajasịrị agbajasị. Na mberede, anyị hụrụ ebe e liri ogbunigwe n’ala n’okporo ụzọ, na-eme ka ọ ghara ikwe anyị omume ịgafe. Anyị gburu opi gwongworo ahụ ruo mgbe ndị soja abụọ si n’azụ otu nkume selite isi. “Olè ndị ka unu bụ? Gịnị ka unu chọrọ?” ka ha jụrụ.

Mgbe anyị kọwasịrị ndị anyị bụ, anyị jụrụ ma ha ga-emeghe ụzọ, ha wee kwere. N’ikpeazụ, anyị ruru akụkụ nke ọzọ.

Ọ tụrụ ndị soja n’ebe ahụ n’anya ịhụ anyị. Ha ji nwayọọ nwayọọ si n’ebe ndị ha zoro pụta, na-eru gwongworo ahụ nso ma na-atụdo anyị kpọmkwem égbè ha. Anyị gosiri akwụkwọ ikike ngafe anyị ha na efere laịsensị nọmba anyị, bụ́ ndị anyị wepụrụ maka nchebe mgbe anyị na-agabiga ọgbọ agha ahụ.

“Ọ dịghị onye na-atụ anya unu,” ka otu soja kwuru. “Olee otú unu si gafere?”

N’ekwekọghị n’ihe anyị rịọrọ, ọ dịghị onye ọ bụla n’ogige nche ndị a nke a gwara na anyị na-abịa! Ọfịsa ahụ gara n’ihu sị: “Anyị esiwo égbè anyị, anyị na-achọkwa ịmalite ịwụpụ mgbọ.”

Anyị jụrụ ihe mere na ha emeghị ya.

“Amaghị m,” ka soja ahụ zaghachiri. “Echere m na ọ bụ akara aka unu. Ma mgbe anyị lere unu anya n’enyo anyị ji ahụ ihe dị anya n’ọhịa, anyị hụrụ akwụkwọ mmapawa unu nke ‘ihe enyemaka ọrụ ebere,’ anyị amakwaghị ihe anyị ga-eme unu. Ya mere unu rutere n’udo.” Anyị mesịrị kpegara Jehova ekpere sitere n’ala ala obi nke ekele maka nchebe ya.

Ọ bụ ezie na ọnọdụ ndị ahụ siri ike, mmụọ nke ụmụnna anyị ndị nwoke na nwanyị na Bosnia na-akpali akpali. Ha na-ekerịta ihe anụ ahụ ndị ha nwere nakwa ọtụtụ okwu nke okwukwe na agbamume. Na Zenica, e nwere 40 Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike, gụnyere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche 2, ndị ọsụ ụzọ inyeaka 11, na ndị ọhụrụ 14 e mere baptism. Ndịàmà 65 na ndị ọsụ ụzọ inyeaka 4 ka nọ n’obodo Sarajevo na-eduzi 134 ọmụmụ Bible. Ndịàmà ahụ na-etinye ná nkezi 20 hour kwa ọnwa n’ịgwa ndị ọzọ banyere ozi ọma nke Alaeze Chineke.

N’eziokwu, Ndịàmà Jehova mejupụtara ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ndị kwere ekwe. Ha na-eji afọ ojuju na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ maka ọdịmma nke ndị ikwu ha n’okwukwe​—⁠ọbụna ndị ha na-ezutetụbeghị mbụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha hụrụ ha n’anya. Jisọs Kraịst sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) N’ezie otú a ka ọ dịworo n’ebe ezinụlọ anyị nke ndị kwere ekwe na Bosnia nọ.

[Map/Foto ndị dị na peeji nke 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Osimiri Adriatic

AUSTRIA

SLOVENIA

HUNGARY

CROATIA

BOSNIA

Travnik

Zenica

Sarajevo

SERBIA

[Foto]

Ibuga ihe enyemaka na Bosnia na Herzegovina

[Foto dị na peeji nke 26]

Ịrịfere n’akụkụ gwongworo dara ada chee ike n’elu

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya