Okwukwe Obi Ike nke Ụmụnna Anyị Ndị Rwanda
NÁ MMALITE 1994 e mere ka ụwa kụja site n’akụkọ nke oké mgbukpọsị malitere ịbịa site ná mba Africa bụ́ Rwanda. Ajọ agha obodo etiwapụwo—njedebe nke ọtụtụ narị afọ nke ibu iro.
N’ịbụ ndị ndakpọ kpam kpam nke iwu na usoro chere ihu, a manyere ihe karịrị 2,000 Ndịàmà Jehova na Rwanda ịgbalaga maka ndụ ha. Ihe dị ka 1,300 nwetara ebe mgbaba n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị iche iche na Zaire na Tanzania dị nso, ma ụfọdụ enweghị ike ịgbalaga n’oge. O wutere anyị ịkọ na ihe dị ka 400 ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị—ma ndị okenye ma ụmụaka, ha nile bụchakwa ndị nkịtị—anwụwo n’ara ọgbụgba nke ime ihe ike ahụ. Ndị Kraịst gburugburu ụwa nile na-eru újú maka mfu nke ndị ji obi ike na-eguzosi ike n’ezi ihe ma na-enwe nkasi obi ná nkwa Bible maka mbilite n’ọnwụ.—Jọn 11:25.
Olee otú ihe siworo dịrị ụmụnna nwoke na nwanyị ndị Rwanda bụ́ ndị lanarịrị? E zipụrụ ndị okenye site n’ọtụtụ mba ịga nyochaa ọnọdụ ahụ n’onwe ha. Otu akụkọ sịrị na ụmụnna ndị Rwanda ahụ echewo ọnọdụ ahụ ihu “n’ụzọ dị nnọọ ùgwù na n’obi ike.” Dị ka ihe atụ, otu n’ime arịrịọ mbụ ndị ụmụnna ahụ rịọrọ bụ maka akwụkwọ Bible. ‘O yiri ka ha na-enwe nchegbu karịsịa maka ịnata nri ime mmụọ karịa enyemaka anụ ahụ, ọ bụ ezie na ha nọ n’oké mkpa maka ọtụtụ ihe,’ ka akụkọ ahụ kwubiri. Ọ bụkwa ezie na ọnọdụ ndị e nwere n’ogige ndị ahụ adịghị mma, ‘akụkụ kasị ọcha bụ ebe ụmụnna anyị bi.’
Watch Tower Society ewepụtawo ego maka ịzụta nri, blanketi, uwe, akpụkpọ ụkwụ, na ọgwụ. Ụmụnna anyị na France enyewo ihe ná mmesapụ aka, ka ọ na-erukwa ná mmalite June, e bugaworo ụmụnna anyị ndị Rwanda nọ ná mkpa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ tọn abụọ nke ngwongwo.
N’ụzọ ihe ijuanya na-adịghị ya, ọnọdụ ndị a akpatawo ịgba àmà dị mma. Eziokwu ahụ bụ na ụmụnna anyị ndị Rwanda nwetara enyemaka na nkwado dị otú a site n’aka Ndịàmà ibe ha emetụwo ndị na-ekiri ihe na-emenụ n’obi, o kwewokwa omume iso ndị ọzọ kerịta enyemaka nke a. Ụfọdụ ekwuwo na Ndịàmà bụ nanị ndị ndị òtù okpukpe ha letaworo n’ogige ndị ahụ!
Ọnọdụ ọjọọ nke ụmụnna anyị ndị Rwanda na-echetara anyị na na “mgbe ikpeazụ” ndị a, mmadụ ga-abụ ndị “dị ka anụ ọhịa” na “ndị na-eme ihe ike.” (2 Timoti 3:1-5; Today’s English Version) Ọ bụkwa ezie na Jehova adịghị ekwe ndị ya nkwa nchebe ọrụ ebube site n’ihe ize ndụ anụ ahụ nile, ọ na-ekwe nkwa ichebe ọnọdụ ime mmụọ ha na mmekọrịta ha na ya na, n’oge ịchịisi Narị Afọ Iri Kraịst, ịkpọlite ndị lara n’iyi ugbu a. (Abụ Ọma 91:1-10) Ka ekpere anyị nke bụ ka Jehova kwagide ma nyere ụmụnna anyị ndị Rwanda bụ́ ndị lanarịrịnụ aka n’oge a nke ule nọgidere na-arị elu n’ihi ha.—Abụ Ọma 46:1.