Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Bible ọ̀ na-akwado ịdị adị nke “unicorn,” bụ́ ndị e hotara ná nsụgharị ụfọdụ?
Nsụgharị King James, Douay, na nsụgharị ndị ọzọ, hotara unicorn. Ma ọ dịghị otú ahụ ná nsụgharị ndị nke oge a, bụ́ ndị sụgharịrị asụsụ Hibru n’ụzọ ziri ezi.—Abụ Ọma 22:21; 29:6; 92:10 (21:22; 28:6; 91:11, Douay).
Ruo ọtụtụ narị afọ a kọwo ọtụtụ akụkọ na-emeghị eme banyere anụ nwere ahụ na isi ịnyịnya ma bụrụ nke nwere ụkwụ ele na ọdụdụ ọdụm. Ma eleghị anya ihe anụ nke a dị n’akụkọ e chepụtara echepụta nwere nke kasị dị iche bụ otu mpi hịkọrọ ahịkọ nke dị n’egedege ihu ya.a
“Ọ dị mgbe ndị mmadụ kwetara na mpi unicorn nwere ihe e ji agwọ nsí, n’oge Ụwa Na-emepebeghị Anya, a na-ere pawụda ndị e chere na e ji mpi ndị dị otú ahụ mee oké ọnụ. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwetara na e nwetara ihe yiri unicorn n’akụkọ na-emeghị eme nke ndị Europe na-akọ banyere enyi ọhịa.” (The World Book Encyclopedia) Ihe ncheta ụfọdụ nke ndị Asirịa na Babilọn na-egosipụta anụ ndị nwere otu mpi. A na-amata anụ ndị a ugbu a dị ka oké ele, ewu ọhịa, nne ehi, na oké ehi ndị e gosipụtara akụkụ ha, nke ụzọ e si ele ha anya na-egosipụtaghị mpi abụọ.
Nke a na-akpali mmasị nke ndị mmụta Bible n’ihi na ugbo itoolu Akwụkwọ nsọ zoro aka n’otu anụmanụ site n’okwu Hibru bụ reʼemʹ. (Ọnụ Ọgụgụ 23:22; 24:8; Deuterọnọmi 33:17; Job 39:9, 10; Abụ Ọma 22:21; 29:6; 92:10; Aịsaịa 34:7) Ruo ogologo oge ndị nsụgharị amaghị anụmanụ a na-ekwu okwu ya. Nsụgharị Septuagint nke Grik sụgharịrị reʼemʹ n’echiche nke ‘inwe otu mpi,’ ma ọ bụ unicorn. Nsụgharị Vulgate nke Latin sụgharịrị ya dị ka “enyi ọhịa.” Nsụgharị ndị ọzọ ji ‘ehi ọhịa,’ ‘anụ ọhịa,’ ma ọ bụ ‘atụ’ mee ihe. Robert Young degharịrị nnọọ okwu Hibru ahụ n’asụsụ Bekee dị ka “Reem,” n’ụzọ bụ isi na-ahapụ onye na-agụ akwụkwọ ya n’ọnọdụ nke amaghị ihe ọ na-agụ.
Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta nke oge a ewepụwo ọtụtụ mgbagwoju anya e nwere banyere reʼemʹ. Ndị na-ede akwụkwọ na-akọwa okwu bụ́ Ludwig Koehler na Walter Baumgartner na-egosi na ọ pụtara “ehi ọhịa,” nke nkà mmụta sayensị kọwaworo dị ka Bos primigenius. Nke a bụ otu “ìgwè dị n’ezinụlọ nke anụ ndị na-ata ahịhịa nwere oké mpi.” Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-akọwa, sị:
“Ihe odide ụfọdụ e dere n’ụdị nke abụ n’Agba Ochie na-ezo aka n’otu anụ siri ike, nke mpi ya mara mma a kpọrọ reʼemʹ. A sụgharịrị okwu a ịbụ ‘unicorn’ ma ọ bụ ‘enyi ọhịa’ n’ọtụtụ nsụgharị, ma ọtụtụ nsụgharị nke oge a na-ahọrọ ịkpọ ya ‘ehi ọhịa’ (aurochs), nke bụ ihe okwu Hibru ahụ bụ reʼemʹ pụtara n’ezie.”
Ebe ọ bụ na n’asụsụ Bekee e ji eme ihe ugbu a, okwu ahụ bụ “ox” (ehi) na-enwe echiche nke oké ehi a pịrị apị, nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures sụgharịrị reʼemʹ ịbụ “oké ehi bi n’ọhịa” n’ebe nile ọ pụtara nakwa n’ụzọ ziri ezi. O yiri ka oké ehi ndị bi n’ọhịa anwụchawo na narị afọ nke 17, ma ndị ọkà mmụta sayensị aghọtawo na ọ dị nnọọ iche n’ebe unicorn ahụ a na-akọ n’akụkọ ifo dị. Oké ehi ndị bi n’ọhịa nwere ahụ nke ịdị elu ya dị ihe dị ka 1.8 mita, ogologo ya dịkwa ihe dị ka 3 mita. Ịdị arọ ya pụrụ ịdị 900 kilogram, nke ọ bụla n’ime mpi ya pụrụ ịkarị 75 centimita n’ogologo.
Nke a kwekọrọ ná nhota ahụ Bible hotara reʼemʹ, ma ọ bụ oké ehi bi n’ọhịa. E ji ịdị ike ya na àgwà ya nke isi ọnwụ mara ya (Job 39:10, 11) tinyekwara ịdị garagara ya. (Ọnụ Ọgụgụ 23:22; 24:8) Ihe àmà na-egosi na o nwere mpi abụọ, ọ bụghị otu mpi dị ka nke unicorn ahụ a na-akọ n’akụkọ ifo. Mosis zoro aka n’ebe mpi ya abụọ dị mgbe ọ na-eme ihe atụ nke agbụrụ abụọ dị ike ga-ebilite site n’ụmụ Josef abụọ.—Deuterọnọmi 33:17.
Ya mere Bible adịghị akwado echiche nke na e nwere unicorn dị ka e si mara ya n’akụkọ ifo. O sere onyinyo ziri ezi, ọ bụ ezie na ọ bụ n’ụzọ a kpaara ókè, nke oké ehi bi n’ọhịa buru ibu ma na-akpali ịtụ egwu, bụ́ nke dịrị ndụ n’oge Bible na n’oge na-adịchaghị anya gara aga.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Professor Paul Haupt kọwara, sị: ‘N’ihe ndị a chọtara n’oge ụwa na-emepebeghị anya, e lere mpi enyi ọhịa ma ọ bụ ọdụ nke azụ narwhal (nke a kpọkwara azụ unicorn ma ọ bụ unicorn whale) anya dị ka mpi nke unicorn.’
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]
Treasury of Fantastic and Mythological Creatures: 1,087 Renderings from Historic Sources, nke Richard Huber dere/Dover Publications, Inc.