Ị Gaghị Enwe Ndakpọ Olileanya
O WERE otu di na nwunye nọ na Philippines ụbọchị abụọ iji rute n’ebe ahụ. Ha ji ụkwụ gaa 70 kilomita, na-eku ụmụ ha abụọ ka na-eto eto na-agabiga oké ọhịa jupụtara n’ahụhụ ndị na-amị ọbara nakwa n’osimiri ebe a na-enwe ikuku mmiri ozuzo. Ma ha kpebisiri ike na ọ gaghị efunahụ ha.
Ndị inyom abụọ na Zaire ji ụkwụ gaa ihe karịrị 500 kilomita, na-anọ n’ụzọ ruo ụbọchị 14, iji wee nọrọ n’ebe ahụ. Ọzọkwa na Zaire, otu nwoke dị 70 afọ bịarutere n’ebe ahụ site n’iji ịnyịnya ígwè ya gbaa 260 kilomita. A kụdaghị mmụọ ya site n’ịdị anya nke ebe ahụ ma ọ bụ site n’ihe isi ike ahụ. Ihe dị mkpa bụ ka ihe ahụ ghara ifunahụ ya.
Ebee ka ha nile na-aga? Ọ bụ n’otu n’ime nzukọ buru ibu nke Ndịàmà Jehova a na-enwe ná mba ha. N’agbanyeghịkwa otú njem ahụ si sie ike, ha nile chere na mgbalị ha mere kwesịrị ekwesị.
Ì mewo atụmatụ ọ bụla ịnọ ná Mgbakọ Distriktị “Ndị Na-enye Ìhè” nke afọ 1992? O yiri ka ị gaghị eme oké mgbalị dị ka nke ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi mere iji wee bịa. Ma ọbụna ma ọ bụrụ na ọ ga-ewe gị ime ihe ụfọdụ siri ike omume, anyị na-agba gị ume ka ị ghara ikwe ka ọ funahụ gị.
A kwadebewo ihe omume mara mma na nke bara oké uru. Ọ bụrụ na ị na-enwe mmasị ná mkpakọrịta ndị Kraịst, nweekwa mmasị ịmụta ụzọ e si enweta ezi udo, ihe ọdịnihu ga-eweta, na ụzọ ka mma isi mee uche Chineke, anyị pụrụ ikwe nkwa na ị gaghị enwe ndakpọ olileanya. Onyeàmà ọ bụla bi n’ógbè ebe i bi ga-agwa gị ebe na mgbe a ga-enwe mgbakọ nke kasị dịrị gị nso.