Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 6/1 p. 32
  • Ị Gaghị Enwe Ndakpọ Olileanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Gaghị Enwe Ndakpọ Olileanya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Ha Ji Na-eme Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke 1996
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Mgbakọ—Ihe Ọṅụ Ndị Na-egosipụta na Anyị Bụ Òtù Ụmụnna
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 6/1 p. 32

Ị Gaghị Enwe Ndakpọ Olileanya

O WERE otu di na nwunye nọ na Philippines ụbọchị abụọ iji rute n’ebe ahụ. Ha ji ụkwụ gaa 70 kilomita, na-eku ụmụ ha abụọ ka na-eto eto na-agabiga oké ọhịa jupụtara n’ahụhụ ndị na-amị ọbara nakwa n’osimiri ebe a na-enwe ikuku mmiri ozuzo. Ma ha kpebisiri ike na ọ gaghị efunahụ ha.

Ndị inyom abụọ na Zaire ji ụkwụ gaa ihe karịrị 500 kilomita, na-anọ n’ụzọ ruo ụbọchị 14, iji wee nọrọ n’ebe ahụ. Ọzọkwa na Zaire, otu nwoke dị 70 afọ bịarutere n’ebe ahụ site n’iji ịnyịnya ígwè ya gbaa 260 kilomita. A kụdaghị mmụọ ya site n’ịdị anya nke ebe ahụ ma ọ bụ site n’ihe isi ike ahụ. Ihe dị mkpa bụ ka ihe ahụ ghara ifunahụ ya.

Ebee ka ha nile na-aga? Ọ bụ n’otu n’ime nzukọ buru ibu nke Ndịàmà Jehova a na-enwe ná mba ha. N’agbanyeghịkwa otú njem ahụ si sie ike, ha nile chere na mgbalị ha mere kwesịrị ekwesị.

Ì mewo atụmatụ ọ bụla ịnọ ná Mgbakọ Distriktị “Ndị Na-enye Ìhè” nke afọ 1992? O yiri ka ị gaghị eme oké mgbalị dị ka nke ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi mere iji wee bịa. Ma ọbụna ma ọ bụrụ na ọ ga-ewe gị ime ihe ụfọdụ siri ike omume, anyị na-agba gị ume ka ị ghara ikwe ka ọ funahụ gị.

A kwadebewo ihe omume mara mma na nke bara oké uru. Ọ bụrụ na ị na-enwe mmasị ná mkpakọrịta ndị Kraịst, nweekwa mmasị ịmụta ụzọ e si enweta ezi udo, ihe ọdịnihu ga-eweta, na ụzọ ka mma isi mee uche Chineke, anyị pụrụ ikwe nkwa na ị gaghị enwe ndakpọ olileanya. Onyeàmà ọ bụla bi n’ógbè ebe i bi ga-agwa gị ebe na mgbe a ga-enwe mgbakọ nke kasị dịrị gị nso.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya