Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 6/1 p. 27-30
  • Mgbe M Hapụrụ Buchenwald, Achọtara M Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe M Hapụrụ Buchenwald, Achọtara M Eziokwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Njide
  • Mgbe Anyị Na-aga Germany
  • Ndụ M Na-adị Kwa Ụbọchị
  • Ìgwè Dị Iche
  • Ụgbọ Okporo Ígwè nke Ọnwụ
  • Nzọụkwụ Ọhụrụ
  • Jehova Nyeere Anyị Aka Ịlanahụ Ọchịchị Aka Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ọ Dịghị Ihe Ka Eziokwu ahụ Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 6/1 p. 27-30

Mgbe M Hapụrụ Buchenwald, Achọtara M Eziokwu

ETOLITERE m na Grenoble, France, n’afọ ndị 1930. Onye na-akụziri m asụsụ German, bụ́ nwoke onye France, bụ onye Nazi na-anụbiga ọkụ n’obi ókè. N’ụlọ akwụkwọ, ọ na-anọgide na-ekwu na asụsụ German “ga-aba uru” n’otu ụbọchị. Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị nkụzi anyị, bụ́ ndị jere Agha Ụwa Mbụ, na-enwe nchegbu banyere mbilite nke ọchịchị Nazi na Germany. Mụ onwe m nwekwara nchegbu ka ọ na-apụtawanye ìhè na agha na-eru dị ka mmiri.

N’afọ 1940, ná mmalite nke Agha Ụwa nke Abụọ, nwanne nna m nke m hụrụ n’anya nwụnahụrụ m n’otu ọgụ siri ike a lụrụ n’osimiri Somme. Enwere m obi ilu nke ukwuu, ma etorubeghị m ideba aha n’òtù Ndị Agha France. Otú ọ dị, mgbe afọ atọ gasịrị, n’oge ndị Germany weghaara France, e nyere m ohere iji nkà m nwere dị ka onye na-ese ụkpụrụ ihe owuwu mee ihe maka Ndị Agha Nguzogide nke France. Emere m nke ọma n’idegharị mbịanye aka, arụkwara m ọrụ n’imegharị stampụ rọba ndị Germany. Enwetara m afọ ojuju dị ukwuu site n’ịlụso ndị agha ahụ bụ́ ndị iro ọgụ n’ụzọ dị otú a nke na echiche usoro ọchịchị Kọmunism nke ndị òtù m nwere adịchaghị mkpa nye m n’oge ahụ.

Njide

Na November 11, 1943, Ndị Agha Nguzogide nke obodo ahụ kpọrọ òkù ka e mee ngagharị iji cheta ụbọchị a kwụsịtụrụ agha n’oge Agha Ụwa Mbụ. Ma ndị nche France na-eji ụgbọ ala akpagharị emechiwo ụzọ e si aga n’ákwà mmiri na-eduga n’ihe ncheta agha ahụ, ha gbakwara anyị ume ịlaghachi n’ebe anyị bi. Kama ime nke ahụ ndị ngagharị anyị kpebiri ịzọrọ ije gaa n’ihe ncheta agha e nwere n’obodo ahụ. Ma anyị chefuru otu ihe. Ihe ncheta ahụ adịghị anya site n’ebe ụlọ ọrụ ndị Gestapo dị.

Ngwa ngwa ndị agha bu égbè gbara ìgwè anyị gburugburu, bụ́ ndị kwụwara anyị n’ahụ ájá. Mgbe ndị agha ahụ bupụrụ anyị, ha chọtara ọtụtụ égbè aka tọgbọ n’ala. Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla kwuru na ọ bụ ya nwe ha, ndị agha tọhapụrụ nanị ndị inyom na ndị ntorobịa dị afọ 16 na ndị na-erubeghị. Otú a, mgbe m dị afọ 18, a tụrụ m mkpọrọ, mụ na 450 ndị mkpọrọ ndị ọzọ. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, e bugara anyị n’otu ogige ebe a na-anọ nwa oge nke dị nso na Compiègne, n’ebe ugwu France.

Mgbe Anyị Na-aga Germany

Na January 17, 1944, na nke mbụ ya—ma ọ bụ ihe mwute na ọ bụghị nke ikpeazụ—ezutere m ndị agha Germany e ji okwu bụ swastika n’aka ekpe na ndebiri okwu SS (Schutzstaffel) n’aka nri chọọ okpu agha ha mma. Ha chịkọtara ọtụtụ narị ndị mkpọrọ, anyị jikwa ụkwụ anyị gaa n’ogige Compiègne ahụ. E ji ụkwụ gbaba anyị n’ime ụgbọ ibu nke ụgbọ okporo ígwè. N’ime nanị ụgbọ ibu nke m nọ na ya, e nwere 125 ndị mkpọrọ. Ruo ụbọchị atọ na abalị abụọ, anyị erighị ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla. N’ime hour ole na ole, ndị na-adịghị ike atụboworị ma bụrụ ndị a na-azọ ụkwụ. Mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, anyị rutere na Buchenwald, nke dị nso na Weimar, n’ime ime Germany.

Mgbe a gbasịrị m ọgwụ ga-egbu ọrịa ọ bụla na-efe efe na mgbe a kpụsịrị m isi, e nyere m nọmba a ga-eji na-amata m bụ́ 41,101, a kpọkwara m “Onye Kọmunist Na-emenye Mmadụ Egwu.” N’otu oge a na-ebupụ ndị bu ọrịa na-efe efe n’ogige ahụ, ezutere m otu onye ụkọchukwu Dominica, bụ́ Michel Riquet, onye mesịrị ghọọ onye a ma ama n’oge agha ahụ maka okwuchukwu ya na Notre Dame Cathedral, Paris. Tinyere ndị ikom ndị ọzọ na-eto eto mụ na ha bụ ọgbọ, ajụrụ m ya ihe mere Chineke ji kwe ka ihe ụjọ ndị dị otú ahụ dịgide. Ọ zaghachiri, sị: “Ị ghaghị ịta ọtụtụ ahụhụ iji bụrụ onye kwesịrị ịga eluigwe.”

Ndụ M Na-adị Kwa Ụbọchị

Ndị nile bi na 61 ogige ndị ahụ nile na-ebili n’ihe dị ka ma o jiri ọkara gafee elekere 4:30 n’ụtụtụ. Anyị na-apụta gbara ahụ ọtọ ma jiri mmiri jụrụ oyi dị ka ice na-asa ahụ. Ma ahụ ọ̀ dị gị ma ahụ adịghị gị, onye ọ bụla ga-eme ihe e kwuru. Mgbe ahụ a na-eke anyị bredi—malite 200 ruo 300 gram nke bredi na-adịghị ụtọ ọ bụla kwa ụbọchị, ya na obere bọta na ihe na-eyichaghị jam. N’elekere 5:30 nke ụtụtụ, a na-achịkọta mmadụ nile maka ịkpọ aha. Lee ahụmahụ jọgburu onwe ya ọ bụ iji azụ anyị buru ndị nwụworo n’oge abalị! Ísì ọjọọ nke anwụrụ ọkụ ahụ na-esi ka ozu ndị ahụ na-ere ọkụ na-echetara anyị banyere ndị enyi anyị. Anyị jupụtara ná mmetụta nke ụjọ, enweghị olileanya, na ịkpọasị, n’ihi na anyị maara na anyị pụkwara isi otú ahụ nwụọ n’otu ụbọchị.

Ọrụ m na BAU II Kommando gụnyere igwu olulu ọ na-adịghị ihe e ji ya eme. Ozugbo anyị gwusịrị olulu ahụ dị mita abụọ, anyị na-ejikwa nlezianya kpochie ya. Ọrụ na-amalite n’elekere 6:00 nke ụtụtụ, na-enwe oge nkwụsịtụ dị ọkara hour n’oge ehihie, mgbe nke ahụ gasịrị anyị na-anọgide na-arụ ọrụ ruo 7:00 nke uhuruchi. Ịkpọ aha n’oge mgbede na-eyikarị ihe na-adịghị agwụ agwụ. Mgbe ọ bụla e nwere ọtụtụ ndị German nwụrụ n’ihu agha ndị Russia, ọ pụrụ iru n’etiti abalị.

Ìgwè Dị Iche

A pụrụ ịmata onye ọ bụla gbalịrị isi n’ogige ahụ gbapụ n’ihi na anyị nile kpụrụ isi ndị na-eyighị onwe ha. A kpọwara anyị isi ma ọ bụ kpụda ya ala n’etiti ma ọ bụ n’akụkụ. Otú ọ dị, ndị mkpọrọ ụfọdụ kpụrụ isi nkịtị. Olee ndị ha bụ? Onye isi ogige anyị zara ajụjụ anyị. “Ha bụ Bibelforscher (Ndị Mmụta Bible),” ka o kwuru. “Ma gịnị ka Ndị Mmụta Bible na-eme n’ogige ịta ahụhụ?” ka m nọ na-eche. “Ha nọ ebe a n’ihi na ha na-efe Jehova,” ka a gwara m. Jehova! Nke ahụ bụ mgbe mbụ m nụtụworo aha Chineke.

Emesịrị m mata ihe dị nta banyere Ndị Mmụta Bible. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị German. Ụfọdụ n’ime ha anọwo n’ogige ịta ahụhụ kemgbe etiti afọ ndị 1930 n’ihi na ha jụrụ irubere Hitler isi. Ha gaara enwere onwe ha, ma ha jụrụ ime ihe o kwuru. Ndị SS ahụ ji ha mee ihe dị ka ndị na-akpụcha ha isi, e nyekwara ha ọrụ ndị pụrụ iche chọrọ ndị a ga-atụkwasị obi, dị ka ịrụ ọrụ n’ogige ebe a na-ahazi ọrụ. Ihe kasị kpalie mmasị m bụ ịdị jụụ ha, enweghị ikpọasị ọ bụla ma ọ bụ mmụọ nke ime mkpesa na imegwara. Nke ahụ ekweghị m nghọta. Ọ bụ ihe mwute na amaghị m asụsụ German nke ọma iji soro ha kwurịta okwu n’oge ahụ.

Ụgbọ Okporo Ígwè nke Ọnwụ

Ka Njikọ ndị agha Britain na mba ndị ọzọ na-abịarute, e zigara ndị mkpọrọ n’ogige ndị bamiri n’ime, ma ogige ndị a na-ejubiga ókè. N’ụtụtụ nke April 6, 1945, ndị SS ahụ kpọọrọ 5,000 n’ime anyị, ma manye anyị iji ụkwụ gaa kilomita itoolu ruo Weimar. E ji obi ịta mmiri gbaa ndị na-apụghị ịgali égbè n’olu. Mgbe anyị mesịrị rute n’ogige Weimar, anyị rịbara n’ụgbọ ibu ndị a na-emechighị elu ha emechi, ụgbọ okporo ígwè ahụ wee pụọ. Ruo 20 ụbọchị ọ nọgidere na-agbafe otu ọdụ ụgbọ okporo ígwè na ibe ya n’akụkụ Germany nile, mesịakwa rute Czechoslovakia.

N’otu ụtụtụ, e chigharịrị akụkụ ụfọdụ nke ụgbọ okporo ígwè anyị gaa n’okporo ọzọ. Ndị agha bupụtara égbè ha ji akwa mgbọ, meghee ọnụ ụzọ nke otu ụgbọ ibu, ma gbuchapụ ndị mkpọrọ Russia nile nọ n’ime ya. N’ihi gịnị? Ndị mkpọrọ iri na abụọ egbuwo ndị nche ha wee gbafuo n’oge abalị. Ọbụna taa apụkwara m icheta otú ọbara si site n’ala ụgbọ ibu ahụ na-agụsịsị n’okporo ígwè ahụ.

N’ikpeazụ, ụgbọ okporo ígwè ahụ rutere na Dachau, bụ́ ebe Ndị Agha America tọhapụrụ anyị mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. N’oge nile ahụ anyị nọ na njem ahụ were 20 ụbọchị, nanị ihe anyị riri bụ jioko ndụ na mmiri. Anyị dị 5,000 mgbe anyị malitere, ma nanị 800 lanarịrị. Ọtụtụ ndị ọzọ nwụrụ mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị. Banyere m, anọ m n’elu ozu mmadụ n’ihe ka ọtụtụ n’oge njem ahụ.

Nzọụkwụ Ọhụrụ

Mgbe a tọhapụrụ m, ọ dịghị ihe ọzọ obi m gwara mee ma ọ bụghị inye òtù French Communist Party nkwado siri ike, ebe ọ bụ na esorowo m ọtụtụ ndị òtù ya nwee mkpakọrịta chiri anya—gụnyere ndị a ma ama—na Buchenwald. Aghọrọ m osote onye odeakwụkwọ ụlọ mkpọrọ na Grenoble, a gbakwara m ume inweta ọzụzụ a na-enye ndị isi na Paris.

Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya enwetara m nkụda aka. Na November 11, 1945, a kpọrọ anyị òkù ịbịa kere òkè n’ịkwụ n’ahịrị na Paris. Onye camarade na-edu ndị òtù anyị natara ego ụfọdụ iji hụ maka ebe anyị ga-ebi, ma otú ọ dị, o yighị ka ọ dị njikere iji ya meere anyị ihe. A kpaliri anyị ichetara ya banyere ụkpụrụ nke ime ihe n’eziokwu na ịbụenyi nke kwesịrị ime ka anyị dị n’otu. Emesịkwara m ghọta na ọtụtụ ndị a ma ama m maara enweghị nnọọ ihe ngwọta ọ bụla nye nsogbu nile nke ụwa. Ọzọkwa, ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-ekweghị na Chineke, ma mụ onwe m kwere na Chineke.

Emesịrị m kwaga na Lyons, bụ́ ebe m nọgidere na-arụ ọrụ dị ka onye na-ese ụkpụrụ ihe owuwu. Na 1954, Ndịàmà Jehova abụọ bụ́ ndị inyom bịara leta m, atụkwara m ụtụ magazin Teta! Mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, otu nwoke bịara ileta m, ya na otu n’ime ndị inyom ahụ kụworo aka n’ọnụ ụzọ m. Mụ na nwunye ghọtara na mberede na anyị abụọ nwere mmasị n’ihe ime mmụọ.

N’oge nkwurịta okwu ahụ nke sochirinụ na-aga n’ihu, echetara m ndị Bibelforscher ahụ nọ na Buchenwald bụ́ ndị ji okwukwe ha kpọrọ ihe. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka m matara na ndị Bibelforscher ndị a na Ndịàmà Jehova bụ otu ndị. Site n’ọmụmụ Bible, mụ na nwunye m weere ọnọdụ anyị n’ebe Jehova nọ, e wee mee anyị baptism n’April 1955.

M ka na-echeta ihe ndị ahụ merenụ dị ka à ga-asị na ha mere ụnyahụ. Adịghị m akwa arịrị maka ahụmahụ dị ike ndị m nwere n’oge gara aga. Ha emesiwo m ike, ha enyewokwara m aka ịhụ na ọchịchị ụwa nke a enweghị ihe ọ bụla ha ga-enye. Ọ bụ ezie na ahụmahụ ndị anyị nwere n’onwe anyị pụrụ nanị inyere ndị ọzọ aka ruo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, aga m enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na nke m pụrụ inyere ndị na-eto eto aka taa ịhụ aghụghọ ndị a na-aghọ n’ụwa nke a, wee si otú ahụ chọọ ụkpụrụ ndị dị mma, ndị ziri ezi n’ezi Iso Ụzọ Kraịst, dị ka Jisọs kụziri.

Taa, nhụjuanya na ikpe na-ezighị ezi bụ akụkụ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Dị ka ndị Bibelforscher ahụ nọ n’ogige ịta ahụhụ, mụ onwe m na-elekwa anya maka ọbịbịa nke ụwa ka mma, bụ́ ebe ịhụnanya ụmụnna na ikpe ziri ezi ga-ejupụta kama ihe ike na ịnụbiga ọkụ n’obi ókè n’echiche dị iche iche. Tupu nke ahụ emee, ana m agbalị ijere Chineke na Kraịst ozi ruo ókè kasị mma m pụrụ ime dị ka onye okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst, mụ na nwunye m, ụmụaka m, na ụmụ ụmụ m. (Abụ Ọma 112:7, 8)—Dị ka René Séglat si kọọ.

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

N’elu: Ịkpọ aha n’ogige ahụ

N’aka ekpe: Ọnụ ụzọ ámá e si abata na Buchenwald. Ihe odide ahụ na-agụ, sị: “Nye onye ọ bụla ihe ọ chọrọ”

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

N’elu: Ebe a na-agba ozu mmadụ ọkụ na Buchenwald

N’aka ekpe: Ndị mkpọrọ 16 n’ìgwè nke ọ bụla

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya