Owuwe ihe ubi bara ụba eweta ọṅụ na Taiwan
TAIWAN bụ agwaetiti nke dị 240 maịlụ [390 kilomita] n’ogologo, dịkwa 90 maịlụ [140 kilomita] n’obosara. N’inwe ọnụ ọgụgụ mmadụ karịrị 20,000,000, ọ bụ otu n’ime ebe ụmụ mmadụ kasị bijupụta n’ụwa. Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na ya na-asụ asụsụ Chinese ma ọ bụ Mandarin Chinese, dị ka ndị si n’Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-akpọ ya. Ma a na-asụkwa ọtụtụ ire okwu na ihe dị ka 13 asụsụ ndị agbụrụ dị iche iche n’ebe a.
N’ịbụ nke dị n’akara ahụ a na-adịghị ahụ anya nke gbara ụwa gburugburu, bụ Tropic of Cancer, Taiwan bụ agwaetiti nke nwere ala na-emepụta nri nke ọma, na-emepụta owuwe ihe ubi bara ụba nke osikapa na ihe ubi ndị ọzọ nke na ọ ghọwo mba na-ebugara mba ndị ọzọ ihe oriri. Otú ọ dị, otu ụdị owuwe ihe ubi ọzọ na-ewetara ndị na-ekere òkè na ya oké ọṅụ. Nke a bụ owuwe ihe ubi ime mmụọ nke ndị ahụ na-anara ‘ozi ọma alaeze ahụ’ nke ọma.—Matiu 24:14.
Ọkụkụ Mkpụrụ Mbụ Dị Nta
Ọrụ nke ịkụ mkpụrụ nke eziokwu Bible na Taiwan malitere n’ihe dị ka 60 afọ gara aga, mgbe otu onye nnọchianya Watch Tower Society si Japan bịa wee kwuo okwu ihu ọha ụfọdụ dabeere na Bible na Taipei, bụ́ isi obodo ya. Otu nwa okoro onye Japan aha ya bụ Saburo Ochiai nabatara ozi Alaeze ahụ nke ọma wee malite ịgwa ndị ọzọ okwu banyere ya n’oge na-adịghị anya. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ndị ozi oge nile abụọ si Japan gazuru agwaetiti ahụ, na-akụ mkpụrụ nke ozi ọma ahụ. N’ikpeazụ ndị ọchịagha Japan tụrụ ha mkpọrọ, bụrụkwa ndị e gburu n’ihi Alaeze Chineke. Ọtụtụ n’ime mkpụrụ ndị ahụ ha kụrụ pulitere ngwa ngwa n’etiti ndị agbụrụ Amis, ma ọ bụ nanị mmasị dị nta ka a chọtara n’etiti ọtụtụ ndị China ahụ bi n’ụsọ ọdịda anyanwụ nke agwaetiti ahụ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị okpukpe Buddha ma ọ bụ ndị okpukpe Tao.
Orụ owuwe ihe ubi ime mmụọ ahụ na Taiwan agawo n’ihu site ná mmalite ahụ dị nta, ruo n’ókè na taa, agwaetiti ahụ aghọwo ubi na-emepụta ihe nke ọma. Dị ka ihe atụ, n’ime afọ ise gara aga, e mere 529 mmadụ baptism, nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ site n’etiti ndị China bi n’ebe ahụ. Nke a wetara ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze nọ n’agwaetiti ahụ bịa n’ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 1,552 na 1989. Ee, ndị okpukpe Tao, okpukpe Buddha, na ndị na-aza ndị Kristian n’ọnụ na-anara ozi ọma ahụ, na-amụtakwa banyere Jehova Chineke! Ma gịnị ka ọ dị ka ya ịgwa ndị nwere nzụlite dị iche iche otú a okwu banyere Bible? Gịnịkwa ka a rụpụtaworo?
Ezi Nnabata Ọ Bụghị Ezi Mmasị
Ọrụ nkwusa ahụ na Taiwan bụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ, bụrụkwa ihe ịma aka n’ihi na ndị China bụ ndị nwere àgwà ịnabata mmadụ nke ọma dị ka ihe ha bu pụta ụwa. N’ozuzu ha, ha na-eji àgwà ọma gee ndị ọbịa ntị. Mgbe e chere ha akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ihu, ha na-anarakarị ya n’ihi àgwà ọma. N’ihi ya, ụfọdụ ndị ozi oge nile etinyewo ihe ruru 300 magazin ma ọ bụ nata 100 ụtụ magazin anyị dị iche iche n’ime otu ọnwa. N’ime ọtụtụ afọ gara aga, a hapụworo ndị mmadụ ọtụtụ Bible, akwụkwọ ukwu, magazin, na traktị dị iche iche. Ya mere, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka e jiworo nwee mmụba nke a pụrụ ịsị na ọ dị ala n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze?
Otu ihe kpatara ya metụtara echiche okpukpe Confucius nke kpụziworo echiche ndị mmadụ ruo ọtụtụ narị afọ. Dị ka Confucius si kwuo, onye nke “debere Ndị Mmụọ n’ebe dị anya site n’ebe ọ nọ n’ihi nsọpụrụ, bụ onye a pụrụ ikwu na o nwere amamihe.”a Echiche dị na ya bụ na onye maara ihe adịghị emikpukarị onwe ya n’ime ife ndị mmụọ ma ọ bụ chi dị iche iche ofufe. Otú a, ọtụtụ ndị pụrụ inwe mkpali ịchọ ịmata ihe banyere ozi Alaeze ahụ, ma ọ bu nanị ole na ole na-achọ imikpu onwe ha n’ọmụmụ Bible. Ọzọkwa, ọ bụ ezie na ndị China kwenyere n’ịdị adị nke ọtụtụ ndị mmụọ na ọtụtụ chi dị iche iche, echiche nke bụ na e nwere otu Onye Okike kasị elu bụ nnọọ ihe ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-amaghị. Ọzọkwa, ọ pụrụ ịbụ na ọbụna ndị ahụ a ma ama na Bible, dị ka Abraham na Devid abụghị oké ihe nye ha. N’ihi ya, ọ bụghị ihe siri ike ịhụta ihe mere o ji dị mkpa itinye oge na ndidi dị ukwuu iji nyere ndị bi ebe a aka ịnakwere Bible dị ka Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ ya, ijikwa wulite mmekọrịta onwe onye nke ha na Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova Chineke. Otú ọ dị, site n’enyemaka Jehova, a na-enyeghachi mgbalị ndị dị otú ahụ ụgwọ ọrụ.
Ihe Mkpali maka Ito Uto
Ruo ọtụtụ afọ, ọgbakọ dị iche iche nke ndị Jehova dị na Taiwan na-eji ụlọ nzukọ ndị ha natara ná ngó na-eme ihe maka nzukọ ha dị iche iche. E mere ka ndị okenye nọ n’otu ọgbakọ mata mkpa ọ dị inweta ebe ka mma maka nzukọ mgbe otu onye nwere mmasị kwuru, sị, “Ọ bụrụ na unu nwere eziokwu ahụ, gịnị ka unu na-eme n’ebe dị otú a? N’ihi gịnị ka unu na-enweghị ebe na-adịgide adịgide unu na-ezukọ?” Ya mere, site n’ịdabere na Jehova, ọgbakọ ahụ malitere ịchọ ebe kwesịrị ekwesị ha ga-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ikpeazụ, ha zụtara ọnụ ụlọ abụọ dịkọtara ọnụ n’otu nnukwute ụlọ, ugbu a kwa, ha nwere ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze.
N’ime afọ isii gara aga, e wuwo ma ọ bụ zụta 11 Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche na Taiwan. N’ọnọdụ nke ọ bụla nke a arụpụtawo owuwe ihe ubi bara ụba na ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị na-abịa nzukọ. Otu ihe atụ bụ ọgbakọ dị n’obodo ahụ dị n’ebe ndịda, bụ́ Tainan. Na 1981 nnukwu obodo nke a nke nwere 600,000 ndị bi na ya nwere nanị otu ọgbakọ nke 44 ndị nkwusa Alaeze. N’ihi mkpa ọ dị ha, ìgwè nke a kpebiri iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ha. N’inwe okwukwe na Jehova ga-agọzi ha, ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị nọ ebe ahụ gara n’ihu n’atụmatụ ahụ, ọ bụ ezie na ụlọ nzukọ ahụ ga-ewe ha ihe dị ka $200,000. Ụfọdụ ji ọlaedo e ji duo ha ụlọ nye onyinye; ndị ọzọ kagbugodịrị atụmatụ ha na-eme ije mba ofesị. Onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ahụ nyere nkwado zuru ezu. Mgbe ụmụnna ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society nụrụ banyere atụmatụ nke a, ha kpebiri iwu ebe obibi ndị ozi ala ọzọ n’elu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, wee si otú a na-anakwere ịkwụ ọka-ra nke ego ọ ga-ewe. E wuchara ụlọ nzukọ ahụ n’ime afọ abụọ. Gịnị si na nke a pụta? Ka ọ na-eru mgbe e wuchara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nọ n’ebe ahụ eruwo 74! Ka ọ dị ugbu a, ọgbakọ abụọ nke nwere ngụkọta nke 160 ndị nkwusa, ji ụlọ nzukọ ahụ na-eme ihe, e nwekwara nkezi nke ihe dị ka 250 ndị na-abịa nzukọ ndị a na-eme kwa izu. Ọgbakọ abụọ ahụ na-eme atụmatụ ugbu a iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke abụọ.
Owuwe Ihe Ubi n’Etiti Agbụrụ Dị Iche Iche
Owuwe ihe ubi n’etiti ndị agbụrụ dị iche iche ndị bi n’ụsọ ọwụwa anyanwụ nke Taiwan anọwokwa na-aga n’ihu eri mmalite nke ọrụ Alaeze ahụ n’agwaetiti ahụ. Ụfọdụ n’ime ndị Amis ndị bu ụzọ nata eziokwu ahụ ihe karịrị 50 afọ gara aga ka na-arụsi ọrụ ike. N’ime ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ, ha ezutewo ọtụtụ ihe ịma aka. N’oge ahụ ndị Japan weghaara ebe ahụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ọ dịrị mkpa na ha aghaghị ịmụta asụsụ Japanese. Mgbe e nyeghachiri China agwaetiti ahụ mgbe agha gwụsịrị, ọ dịrị mkpa na ha aghaghị ịmụta asụsụ Chinese. Ná mmalite afọ ndị 1960, ha chere ụdị ule ọzọ ihu. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị a ma ama n’etiti ndị agbụrụ Amis hapụrụ nzukọ dị ọcha nke Jehova ma ọ bụ gosi na ha ekwesịghị ekwesị iso ya na-emekọ ihe. N’oge ndị a nile, obere òtù nke Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nọgidere na-ejere Jehova ozi. Ọtụtụ n’ime ụmụ ụmụ nke ụmụnna nwoke na nwanyị ndị a meworo agadi, bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ihe, nọ ugbu a na-edu ndú n’ọrụ nkwusa ahụ.
Ndị si n’agbụrụ ndị ọzọ enwewokwa ọganihu ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, e nwere ìgwè kwesịrị ntụkwasị obi nke ndị nkwusa Alaeze n’etiti ndị agbụrụ Bunun. Ụfọdụ n’ime ndị nna nna ha nke oge na-adịbeghị anya gara aga bụ ndị na-egbu isi. Ugbu a, ndị a na-ekwusa ozi udo nke Alaeze Chineke. Ndị agbụrụ Lukai na Paiwan enwetawokwa ezi ịgba àmà, ọtụtụ ndị n’etiti ha emewokwa mgbanwe ndị bụ isi ná ndụ ha. Ba Chu Fu na-echetaghachi ahụmahụ ya, na-asị:
“A mụrụ m n’ebe ugwu nke Pingtung. Ebe nna m bụ onye chiifu nke agbụrụ Lukai, ndị mmadụ na-ewetara ya onyinye nke ihe oriri, ya mere, ọ dịghị mkpa ka anyị rụọ ọrụ ọ bụla siri ike. N’ihi ọnọdụ nke a, ewulitere m mmụọ nke oké mpako. Aghọrọ m ‘onye chiifu’ nke ìgwè ụmụ okorobịa bụ ndị omekome, na-eyi ụmụ mmadụ egwu, na-apụnarakwa ha ego. A na-atụ m egwu n’ime obodo nta anyị. Mgbe m gbara 22 afọ, eweere m otu n’ime ọtụtụ ndị enyi m nwanyị ịbụ nwunye m. Ma, ibi ndụ na-adịghị ọcha na ịṅụbiga mmanya ókè agbamiwo mkpọrọgwụ nke ukwuu n’ime m nke na ahụrụ m ndụ alụmdi na nwunye dị ka ihe siri ike nke ukwuu ịnakwere. N’oge na-adịghị anya, alụmdi na nwunye anyị gbasara, m wee laghachikwa n’ụzọ ndụ ochie m.
“N’ihe dị ka oge a, nwunye m malitere ije nzukọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova. Enweghị m mmasị na ya, na-agụkwa onwe m n’onye na-ekweghị na Chineke dị. Otú ọ dị, n’ihi mgbalị ịnụ ọkụ n’obi nke nwunye m ji obi eziokwu na-eme, na 1973, ekwenyere m iso ya gaa otu mgbakọ mba nile e mere na Taipei. Anyị na otu ezinụlọ Ndịàmà nọrọ. Obi ọma na àgwà akpaghị ókè nke nwanyị ahụ bụ onye China nwere mmetụta a na-apụghị ihichapụ ehichapụ n’ahụ m. Mgbe anyị laghachiri, amalitere m ịmụ Bible, jirikwa obi eziokwu mee mgbalị ime mgbanwe. E mere m baptism na 1974.
“Eri mgbe ahụ, e nwewo ọtụtụ ule dị iche iche. Otu n’ime ha bụ ịmụta otú e si agụ asụsụ Chinese. Owu ọmụma bụkwa ule ọzọ. N’ihi na e nweghị ụmụnna ndị tozuru okè mụ na ha ga-enwe mkpakọrịta ma ọ bụ ndị m ga-ejekwuru maka enyemaka, a gbara m ume ịdabere n’ebe Jehova nọ. Amụtara m inwe obi dị umeala nakwa ịrapara ná nzukọ Jehova. Gịnị si na nke a pụta? Taa, ndị nile nọ n’ezinụlọ m na-arụsi ọrụ ike n’eziokwu. Enwere m ihe ùgwù nke ịbụ ohu na-eje ozi n’ime ọgbakọ, bụ nke nwere 60 ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi ugbu a. Ọ bụ ezie na enweghị m nkà ọ bụla pụrụ iche, Jehova agọziwo, kwadookwa mgbalị m nile n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ.”
Owuwe Ihe Ubi ahụ Na-aga n’Ihu
Taiwan bụ nanị akụkụ dị nta nke ubi ahụ zuru ụwa ọnụ. Ma, okwu Jisọs ahụ, bụ́, “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole,” bụkwa eziokwu n’ebe a. (Matiu 9:37) N’afọ gara aga, 4,534 mmadụ bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst. Ka owuwe ihe ubi ahụ na-agakwa n’ihu iru ọgwụgwụ ya, ndị ọrụ ahụ ndị nọworo na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na Taiwan ji iti mkpu ọṅụ na-eweta ihe ubi.—Tụlee Abụ Ọma 126:5, 6.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a The Analects, vii 20, dị ka Arthur Waley si sụgharịa ya, n’akwụkwọ The Analects of Confucius, 1938, Vintage Books, New York.
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 31]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
JAPAN
CHINA
TAIWAN
PHILIPPINES
[Foto]
Ụlọ Nzukọ Alaeze e wuru ọhụrụ n’ụsọ ọwụwa anyanwụ nke Taiwan
Ndị nkwusa Alaeze na-ewetara ọtụtụ ndị bi n’ala ọma nke a ọṅụ