Oge Kachasị Mma ná Ndụ
Otu onye ntorobịa si Nigeria, West Africa, dere n’oge na-adịghị anya gara aga, sị: “N’oge gara aga, ana m eche na oge ntorobịa bụ oge kasị sie ike ná ndụ mmadụ, na oge kasịkwa nwee obi ụtọ bụ mgbe mmadụ ghọworo nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ mgbe o meworo okenye.”
Ma mgbe ahụ, nwa ntorobịa onye Africa nke a natara akwụkwọ ahụ bụ Ibu Nwa-okoro Na Agbọghọ-Gị—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya. O dere, si, “Unu emeela nke ukwuu. Akwụkwọ nke a enyeworo m aka n’ọtụtụ ụzọ.” O mechiri okwu ya na-asị: “Ugbu a, mgbe m gụsịworo akwụkwọ nke a, ana m aghọta na oge ntorobịa bụ oge kasị mma ná ndụ.”
Ndị ntorobịa bụ ndị na-etolite n’ime oge nsogbu ndị a na-eche ọtụtụ ọnọdụ ọhụrụ dị iche iche ihu, ha aghaghịkwa ime mkpebi ndị dị oké mkpa. Onye ntorobịa ò kwesịrị ise sịga ma ọ bu ịnara ọgwụ ọjọọ? Gịnị bụ àgwà kwesịrị ekwesị mgbe ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nọ? Gịnị banyere mmetọ ahụ onwe onye na idina ụdị onwe?
Ime mkpebi na-ezighị ezi pụrụ iduje n’ụdị obi mgbu na nsogbu dị iche iche. Akwụkwọ Ibu Nwa-okoro na Agbọghọ-Gị—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya na-atụle ajụjụ nile dị n’elu nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ a, biko dejupụta ma zite mpempe akwụkwọ nke a.
Ọ ga-amasị m ịnata akwụkwọ ahụ nwere 192 peji nke e kwesiri mkpo ya ike, bụ́ Ibu Nwa-okoro na Agbọghọ-Gị—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya. (Degara adres ahụ dị n’okpuru akwụkwọ maka ịmatakwu ihe banyere nke a.)