“Iguzosi Ike Dị ka Otu Ìgwè Atụrụ” na Chad
Dị ka ndị Kraịst ibe ha gburugburu ụwa, Ndịàmà Jehova nọ na Chad na-enwe mmasị ná mgbakọ ndị ahụ a na-eme otu ugbo n‘afọ ndị a kwadebere maka iwuli ha elu n‘ime mmụọ. Nke a bụ ihe ndekọ nke ojije e jere otu usoro ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị e nwere n ‘akụkụ ndịda nke mba nke a dị n ‘etiti Africa, nke ala gbara gburugburu.
N’ihi ịdị anya na ihe isi ike e nwere n‘ịga njem, mgbakọ ndị a na-enwe na Chad na-abụkarị n‘ìgwè nta dị iche iche, ọ bụkwa ihu eluigwe na-ekpebi mgbe a ga-eme ha. Malite na June ruo September, oge udu mmiri na-eme ka ịga njem bụrụ ihe siri ike, n’akụkụ ụfọdụ, bụrụkwa ihe a na-apụghị ime eme. A na-enwe ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị ahụ mgbe oge oké mmiri ozuzo ndị ahụ gasịworo. Oge ezumike a na-enwe n‘ogwugwu afo na-adi nnọọ mma maka ime mgbakọ distrikti ndị katụ ibu. Tupu mmiri ozuzo amalitekwa ọzọ na June, a na-enwe mgbakọ sekit ahụ na-adị ụbọchị abụọ.
Ọ BỤ ụbọchị Sunday nke nwere okpomọkụ, ọsụsọ na-agbakwa onye ọ bụla. Ụlọ nzukọ alaeze ahụ dị na N’Djamena, bụ́ isi obodo Chad, jupụtara na 184 mmadụ. N’agbanyeghị okpomọkụ ahụ, ha na-ege nnọọ ntị nke ọma n’okwu ahụ bụ isi, bụ́ “Iguzosi Ike n’Otu Mmụọ.” N’ụtụtụ ụbọchị ahụ, ha nwere obi ụtọ ịhụ ka mmadụ atọ gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri. Nke a bụ nke mbụ n’ime ụbọchị mgbakọ isii pụrụ iche ndị mụ na otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ebe ahụ nwere ihe ùgwù nke ije leta.
Isiokwu nke usoro ahụ bụ “Iguzosi Ike dị ka Otu Ìgwè Atụrụ,” masịrị nnọọ 267 Ndịàmà ahụ nọ na Chad nke ukwuu. Ha bi n’ebe dị anya site n’ebe ndị Kraịst ibe ha ndị nọ ná mba ndị ọzọ dị. Ma, nnata ha na-anata otu nri ime mmụọ ahụ na nlekọta e si n’otu ụzọ ahụ na-elekọta ha na-agba ha ume ịnọgide soro ụmụnna ha ndị nọ gburugburu ụwa na-arụkọ ọrụ n’ịdị n’otu. Ndụmọdụ bara uru ndị dị n’usoro ihe omume nke a wusikwara ha ike iguzosi ike megide mmetụta aghụghọ nile nke ụwa Setan na ifufe nke mkpagbu ma ọ bụ mmegide.
Na N’Djamena
E guzobere ọgbakọ mbụ nke Ndịàmà Jehova na Chad na N’Djamena na 1964. Ugbu a, o nwere ihe karịrị 90 ndị nkwusa nke ozi ọma Alaeze ahụ. Ọ bụ ihe obi ụtọ ilepụ anya n’ìgwè mmadụ ahụ wee hụ ndị nọworo na-eje ozi n’ikwesị ntụkwasị obi kemgbe oge a malitere ọrụ ahụ na Chad. Otu nwanna nwoke nwere ndị nwunye atọ mgbe ọ mụtara eziokwu Bible ahụ nke mbụ. N’oge na-adịghị anya ọ hụrụ mkpa ọ dị ime ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ Bible. O jere deba ọlụlụ di na nwunye nke ya na nwunye ya nke mbụ n’akwụkwọ iwu wee kewapụ onwe ya n’ebe ndị nke ọzọ nọ, ọ bụ ezie na o mere ndokwa a ga-eji na-elekọta ha. E mere ya baptism na 1973, ọ nọwokwa na-arụsi ọrụ ike eri mgbe ahụ.
Otu okenye ọgbakọ nke keere òkè n’usoro ihe omume ahụ agabigawo otu ule siri ike nke okwukwe. Na 1975, ọchịchị dị n’oge ahụ manyere onye ọ bụla ikere òkè n’omenala ụfọdụ ndị dabeere n’ife ndị nwụrụ anwụ ofufe; a pụrụ igbu onye ọ bụla nke jụrụ ime ya. Mgbe nwanna nwoke ahụ guzosiri ike ma jụ imebi okwukwe ya, ndị ọchịchị malitere ịchọgharị ya. Ọ bụ nanị mgbanwe ọchịchị e nwere n’oge ahụ dị oké mkpa zọrọ ya.
N’ụzọ nke Na-eje Pala
Mgbe anyị nọsịrị na N’Djamena, anyị malitere njem ịga n’ebe ndịda ije leta mgbakọ ise ndị fọdụrụnụ. Anyị esiwo ụzọ ahụ gaa na mbụ, ma ọ bụ nanị n’oge ọkọchị. Ugbu a, n’oge ọgwụgwụ September, n’oge udu mmiri na-achọ ịkwụsị, ihe nile na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, na-emekwa nnọọ nke ọma. Ọ bụ oge na-enye ọṅụ ịga njem. Anyị gafere ọtụtụ ugbo ebe a kụrụ ọka millet. Mkpụrụ ndị dị n’okporo ọka ogologo ndị ahụ amalitewo ịcha ugbu a. N’oge na-adịghị anya, a ga-achịkọta ha, chekpọọ ha, chekwaakwa ha n’ebe nchekwa ọka e ji ájá kpụọ, ndị a na-ewuli elu dị ka okoso e kpubere ihu n’ala, ndị jupụtara n’ime ime obodo ndị ahụ. Ọka millet bụ nri bụ isi nke ihe ka ọtụtụ ná ndị Chad na-eri. A na-asụ ya ná nnukwute íkwè e ji osisi mee, na-eji akaodo ndị na-adịkarị ogologo karịa onye ji ha na-eme ihe. Mgbe ahụ, a na-agwakọta ntụ́ ọka ahụ ná mmiri ọkụ na-agbọ agbọ wee kpụọ ya otú a ga-esuru ya n’ofe e ji ọkwụrụ ma ọ bụ ahụekere wee sie.
Anyị hụrụ ọtụtụ ubi ndị ọzọ ebe ndị a kụrụ osisi ogho ka anyị na-agbadakwu n’ebe ndịda. N‵ihi na ala dị larịị n‵akụkụ nke a nke mba nke a, mbara ala ndị ahụ jupụtara n‵okooko osisi yiri nnọọ ka à ga-asị na ha na-edetụ n‵igwe ojii. N‵oge na-adịghị anya, ezinụlọ dum ga-abanye n’ubi iji aka na-atụtụkọta ogho. Ogho bụ ihe ọkụkụ kasị na-enye Chad ego, e nwetakwara 133,000 tọn n’ubi na 1988. Ka ọ na-erule uhuruchi, anyị na-agafe ọdọ mmiri Lake Léré. N’ebe a, obodo ahụ nwere ugwu dị iche iche, ala makwara mma nke ukwuu, karịsịa n’oge nke a n’afọ. N’ihi na anyị rutere n’ebe ahụ kpọmkwem n’oge kwesịrị ekwesị, anyị nwere ike ịzụta azụ carp a ka gbutere mgbe ahụ, bụ́ ndị a na-eghe kpọmkwem n’akụkụ ụzọ. Ọ bụ nri nke onye ọ bụla nwe ụlọ na-enwe mmasị iche n’ibu ndị ọbịa.
Otu ihe nke na-eme ka ịga njem sie ike n’oge nke a n’afọ bụ na ọ bụrụ na mmiri ezoo, a na-edochisị ihe n’okporo ụzọ iji kwụsị ụgbọ ala ịgafe. N’ihi gịnị? Iji chebe okporo ụzọ ndị ahụ. Ya mere, obi mapụrụ anyị mgbe anyị hụrụ ka ihu eluigwe gbajiri oji na mberede. O doro anya na ọ gaghị amasị anyị ịkwụsị n’akụkụ ụzọ n‵okpuru mmiri ozuzo ahụ. Ma nke ka mkpa bụ na ọ ga-eme ka anyị ghara iru ụbọchị mgbakọ nke na-esonụ n’oge. Ọ bụ ihe obi ụtọ na akụkụ kasị ukwuu nke mmiri nke a zoro mgbe udu mmiri na-agwụzi agwụ eruteghị n’okporo ụzọ ahụ. Ọ bụ ezie na anyị aghaghị icheretụ ruo nwa mgbe nta n’ebe dị iche iche e mechisiworo ụzọ, mgbe oge gamiworo n’abalị ahụ, anyị rutere Pala n’udo n’enweghị mmerụ ahụ ọ bụla, bụ́ obodo nke nwere ihe dị ka 32,000 ndị bi na ya. Lee nnọọ oké ihe ngosi na-echere anyị! Ihu eluigwe ahụ nke ọnwa na-adịghị agba na ya nke dịrị mgbe mmiri ozuzo ahụ gasịrị mere ka anyị hụ kpakpando jupụtara n’ebe nile, hụkwa ụyọkọ kpakpando Milky Way ahụ, bụ́ ihe nkiri magburu onwe ya nke ọtụtụ ndị bi n’obodo ukwu na-adịghị ahụ mgbe ọ bụla. O chetaara anyị ihe mere anyị ji na-eguzosi ike—iji nye Onye Okike Ukwu ahụ nke eluigwe na ala dị ebube otuto.
Ọgbakọ nta abụọ na otu ìgwè dịpụrụ iche zukọtara na Pala. Ụmụnna atọ bụ ụmụ okorobịa ejiwo ụkwụ gaa ihe karịrị 60 maịlụ [100 kilomita] ịbịa mgbakọ nke a. Ebe ọ bụ na mgbakọ ndị a na-enwe n’ebe ndịda na-adị ntakịrị, e nwekwara nanị ndị okenye ọgbakọ ole na ole, a gụnyere akụkụ ụfọdụ nke usoro ihe omume ahụ e mere na N’Djamena na tepu wee kpọghachi ha n’ebe a. Nke a na-eme ka e nwee usoro ihe omume dị nnọọ mma ọ bụ ezie na ọ bụ ọnụ ọgụgụ mmadụ dị nta na-abịa. Anyị nwere obi ụtọ inwe otu onye maka baptism.
Ìgwè Ahụ Na-anụ Ọkụ n’Obi na Kélo
Ọzọ, anyị gara obere njem iru Kélo, ebe 194 mmadụ bịara maka usoro ihe omume ahụ na Sunday. Ọtụtụ ezinụlọ ndị kpọ ụmụntakịrị ejiwo ụkwụ gaa ihe karịrị 20 maịlụ [30 kilomita] ịbịarute n’ebe ahụ. A gaje ime ndị ọhụrụ abụọ raara onwe ha nye baptism. N’oge ọkọchị, baptism na-abụkarị ihe isi ike ma ọ bụrụ na e meghị mgbakọ ahụ n’ebe dị nso n’osimiri; ya mere, ọ dịwo mkpa ime ọtụtụ mmadụ baptism n’ime tankị mmiri. Ma ọnụnọ anyị nọ n’ebe ahụ n’oge ọgwụgwụ udu mmiri mere ka ihe dịtụ mfe. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịrị mkpa ịkwọrọ moto gaa ihe karịrị 12 maịlụ [20 kilomita] iji nweta ebe kwesịrị ekwesị.
Otu n’ime ndị ahụ gaje ime baptism bụ otu nwa agbọghọ onye e tinyeworo okwukwe ya n’ule nke ukwuu. Ndị mụrụ ya ekwewo ya ná nkwa ọlụlụ nye otu nwoke onye na-enweghị mmasị ọ bụla n’ịmụ Bible. Karịsịa, ọ masịrị nwoke ahụ karị ịgbaso omenala karịa usoro alụmdi na nwunye nke iwu kwadoro. Ebe ọ dị njikere ịkwụ ụgwọ isi nwanyị buru ibu, ndị mụrụ nwa agbọghọ ahụ rụgidesiri ya ike. Ọbụna na ọ dịrị mkpa ka ọ kwapụ jee n’ebe ọzọ ruo ogologo oge ụfọdụ iji wee zere njikọ ahụ akwụkwọ nsọ na-akwadoghị nke ezinụlọ ya chọrọ. O guzosiri ike gabiga ihe a nile wee nwee ezi ọganihu. Kemgbe o mesịrị baptism, mmegide ezinụlọ ya akwụsịwo. Anyị na-ekele Jehova na anyị nwere ndị dị otú ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’etiti anyị.
Ụmụnna ndị nọ n’ebe a nwere ihe ndị ọzọ mere ha ga-eji nye Jehova ekele. Chad tara ahụhụ otu ajọ agha obodo, e mesịa, na 1984, ụnwụ nri dị oké njọ. Otu onye okenye nọ n’ebe ahụ chetara na n’otu mgbe n’oge ụnwụ nri ahụ, na ya legharịrị anya gburugburu Ụlọ Nzukọ Alaeze wee na-eche ma ọ̀ dịkwa onye ọ bụla n’ime ndị nọ n’ebe ahụ ka ga-adị ndụ n’ime ọnwa ole na ole. Otú ọ dị, nzukọ Jehova wetara enyemaka n’ụdị nke ihe oriri, wee na-ebelata ọnọdụ ọjọọ ha. Obi ekele ha nwere maka nke ahụ ka a na-egosipụta ugbu a n’ịnụ ọkụ n’obi ha ji na-eje ozi. E nwere mmụọ ọsụ ụzọ siri ike na Kélo. N’October 1989, ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị nkwusa Alaeze nọ n’ebe ahụ dokwara ihe omume ha ka ha nwee ike ikere òkè n’ikwusa ozi ọma oge nile.
Ahụmahụ ha nwere n’oge ụnwụ nri ahụ kụziiri ha na ha onwe ha kwesịkwara ịbụ ndị na-emesapụ aka. N’afọ gara aga, otu onye okenye nọ n’ọgbakọ dara ọrịa na mberede wee nwụọ. Ọ hapụrụ ezinụlọ nke ụmụ itoolu, nke kasị obere n’ime ha dịkwa nanị ọnwa ole na ole. Nwunye ya chere nrụgide ezinụlọ ihu ikere òkè n’ememe iru újú ndị metụtara ife ndị nwụrụ anwụ ofufe. Ụmụnna nyere ya nkwado dị mkpa, nke mere na o nwere ike iguzogide nrụgide ahụ siri ike. Mgbe ahụ ọgbakọ ahụ rụrụ ọrụ iwutere ya na ụmụ ya ndị nke nta ụlọ, tinyekwara inyere ya aka n’ụzọ ihe onwunwe n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ. Nke a rụpụtara ezi ịgba àmà n’obodo ahụ, na-egosi ihe obi ụtọ nke Iso Ụzọ Kraịst nọ n’ọrụ na-arụpụta.—Ọrụ 20:35.
Koumra, Doba, na Bongor
Ebe ọzọ anyị kwụsịrị bụ Koumra. Ụzọ ndị e ji kọnkịrị rụọ mere ka njem ahụ dị 180 maịlụ [300 kilomita] dịtụ mfe karị. Mgbe anyị nọ n’ụzọ, anyị gabigara obodo Moundou, hụ ebe e nwere ụlọ ọrụ dị iche iche, nke nwekwara ihe karịrị otu narị puku ndị bi na ya. Iri mmadụ asaa na otu bịara na Koumra. Otu nwanna bụ nwa okoro nta onye na-agatụbeghị ụlọ akwụkwọ ọ bụla si n’ikpó okwu kwuo okwu. Ọ kọwara ụzọ usoro ihe omume ịmụ otú e si agụ na otú e si ede ihe, nke a na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze siworo nyere ya aka, meekwa ka o nwee obi ike nke dị ya mkpa. Ọ na-eduziri mmadụ anọ ndị ọzọ ọmụmụ Bible ugbu a.
Mgbe e nwesịrị ụbọchị mgbakọ ahụ pụrụ iche na Koumra, anyị tụgharịrị ịlaghachi N’Djamena, ebe ọzọ anyị ga-akwụsị bụkwa na Doba maka mgbakọ nke ise dị n’usoro ahụ. Otu mmiri ozuzo nke oge ọgwụgwụ udu mmiri mara ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-abịanụ, ha wee nọọ ọnọdụ abalị n’okporo ụzọ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, onye ọ bụla bịarutere n’oge maka mmalite nke usoro ihe omume ahụ na Doba. Iri mmadụ ise na otu bịara, otu onye wepụtakwara onwe ya maka baptism.
Ebe ikpeazụ anyị kwụsịrị bụ na Bongor. Ebe a bụ ógbè ebe a na-akọ osikapa, ọ tụkwara anyị n’anya ịhụ otú ala ebe ahụ si dị larịị. Ọnụ ọgụgụ ndị bịara na Bongor wetara ngụkọta nke ndị nile nụrụ usoro ihe omume ahụ na Chad ịbụ 630. Ebe e mekwara mmadụ abụọ ọzọ baptism, ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị e mere baptism bụ itoolu.
Nlaghachi anyị laghachiri N’Djamena mezuru njem anyị nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1,200 maịlụ [2,000 kilomita]. Ọ bụ ihe obi ụtọ iso ndị ohu Chineke mekọọ ihe, bụ́ ndị guzosiworo ike ruo ọtụtụ afọ, tinyekwara izute ọtụtụ ndị ọhụrụ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma dị ịtụnanya. Ịnụ ọkụ n’obi ha maka ije ozi ahụ bụ nnọọ ihe na-agba ume. N’October 1989, e nwere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke 267 ndị nkwusa na Chad, bụ́ ịrị elu 20 pasenti karịa nke afọ bu ya ụzọ.
Ịdị n’Otu Ọ Bụ Ezie Na Ha Nọ n’Ebe Dị Anya
Ịga njem gburugburu mba ahụ mere ka anyị ghọta oké ihe ịma aka ọ bụ ikwusa ozi ọma ahụ n’ala ebe a na-asụ ịhe karịrị 200 asụsụ dị iche iche. Ọ bụ ezie na asụsụ French na Arabic bụ asụsụ a na-ejikarị eme ihe na Chad, na nke ọ bụla n’ime ụbọchị mgbakọ ndị ahụ pụrụ iche, ọ dịrị mkpa ịsụgharị usoro ihe omume ahụ site na French gaa n’asụsụ dị iche. Ọbụna otú ahụ, ọtụtụ n’ime ndị bịara mgbakọ adịghị asụ asụsụ nke ndị ebe ahụ, ya mere ọ ka bụkwa ihe isi ike inyere ha aka ịghọta usoro ihe omume ahụ.
N’ebe nile anyị jere, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị lere anyị ọbịa nke ọma. N’ụzọ bụ isi, ihe anyị na-eri bụ nri ọka millet ma ọ bụ nri ntụ́ osikapa a kpụrụ akpụ na ofe e tinyere ihe ụtọ nke e hotaworo na mbụ. Mgbe ụfọdụ, otu nwa agbọghọ na-ebute nri ahụ n’efere tray nke e ji ákwà dị ọcha kpuchie. Ọ na-eburu nnọọ tray ahụ n’isi n’ụzọ ngala, ọ ga-amasịkwa gị nnọọ ịhụ ngala ya.
Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ebe ugwu Chad bụ ndị Alakụba; ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ebe ndịda bụ ndị Katọlik, Protestant, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị. Ọchịchị ndị ebe ahụ kwadoro ụkpụrụ echiche nke onye ọ bụla inwere onwe ya ikpe okpukpe masịrị ya, anyị nwekwara obi ụtọ na anyị nwere ike inwere onwe anyị izukọta ọnụ.
Usoro ihe omume nke ụbọchị mgbakọ ahụ pụrụ iche nyeere ìgwè nta nke Ndịàmà nọ na Chad aka ịghọta na ọ bụ ezie na ha nọ n’ebe dị anya site n’ebe ụmụnna ha ndị nọ n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa nọ, ha na ha dị n’otu n’ezie ’n’ime otu ìgwè atụrụ. O nyeere ha aka ‘iguzosi ike n’otu mmụọ’ n’agbanyeghị nrụgide na mmegide ndị ha na-enweta.—Ndị Filipaị 1:27.