Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
À PỤRỤ ịkpọ onye ọ bụla nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ n’ụzọ ajụjụ ọ bụla na-adịghị na ya? Olee otú i si atụ ịdị ukwuu mmadụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀? Ọ̀ bụ site n’inwe nkà ya n’ibu agha? ike ọkpụkpụ aka ya? ikike iche echiche ya?
Ọnya ọkà n’akụkọ ihe mere eme bụ H. G. Wells sịrị na a na-atụ ịdị ukwuu mmadụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site ‘n’ihe ọ hapụrụ ka ọ na-etolite, nakwa ma ò mere ka ndị ọzọ malite iche echiche n’ihe ndị dị ọhụrụ, na-eji ikike nke dịgidere mgbe ọ nwụsịrị.’ Ọ bụ ezie na Wells adịghị asị na ya bụ onye Kraịst, o kwetara, sị: “Ná nnwale nke a Jisọs guzopụtara dị ka onye mbụ.”
Aleksanda Onye Ukwu, Charlemagne (onye a kpọrọ “Onye Ukwu” ọbụna n’oge ndụ ya), na Napoleon Bonaparte bụ ndị ọchịchị dị ike. Site n’ọnụnọ ha nke a na-atụ egwu, ha nwere mmetụta dị ukwuu n’ebe ndị ha na-achị nọ. Ma, a sịrị na Napoleon kwuru, sị: “Jisọs Kraịst enwewo mmetụta ma chịa ndị nọ n’okpuru Ya n’anọghị n’anụ ahụ.”
Site n’ozizi ya magburu onwe ya na otú o si bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ha, Jisọs enwewo mmetụta dị ukwuu ná ndụ ụmụ mmadụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ. Dị ka otu onye na-ede ihe odide kwuru n’ụzọ ziri ezi: “E jikọta ndị agha nile zọworo ije, na ndị agha mmiri nile e guzobeworo, na òtù ndị ome iwu nile zukọworonụ, ndị eze nile chịtụworo, ha enwebeghị mmetụta ná ndụ mmadụ n’elu ụwa nke a ruo otú o meworo.”
Mmadụ nke Dịrị n’Akụkọ Ihe Mere Eme
Ma, n’ụzọ dị ịtụnanya, ụfọdụ na-asị na ọ dịghị mgbe Jisọs dịrị ndụ—na ọ bụ nchepụta nke ụfọdụ ndị ikom narị afọ mbụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. N’ịzaghachi ndị dị otú a na-arụ ụka, onye ọkà a ma ama n’akụkọ ihe mere eme, bụ́ Will Durant rụrụ ụka, sị: “Na ụmụ mmadụ efu ole na ole n’ime otu ọgbọ ga-azụlite ụdịdị onye nke dị ike nke ukwuu ma na-adọrọ mmasị, ụkpụrụ omume dị elu nke ukwuu na ọhụụ dị ebube banyere òtù ụmụnna nke ihe a kpọrọ mmadụ, ga-abụ ọrụ ebube siri ike ikwere nke ukwuu karịa nke ọ bụla e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ.”
Jụọ onwe gị, sị: Onye na-adịtụbeghị ndụ mgbe ọ bụla ọ̀ pụrụ inweworị mmetụta dị ịrịba àmà otú a n’akụkọ ihe mere eme mmadụ? Akwụkwọ ntụaka bụ The Historians’ History of the World kwuru, sị: “Ihe si n’ọrụ nile nke [Jisọs] dị ka ọ dị n’akụkọ ihe mere eme dị oké mkpa karịa ihe omume nke onye ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme, ọbụna ma e lee ya anya kpọmkwem n’ụzọ n’emetụtaghị okpukpe. Usoro oge ọhụrụ, bụ́ nke ndị kasị mepee anya n’ụwa kwere na ya, malitere ịgụ site n’ọmụmụ ya.”
Ee, chee echiche banyere ya. Ọbụna kalenda ndị e nwere n’oge a na-adabere n’afọ e chere na a mụrụ Jisọs. “A na-edepụta oge ndị dịrị tupu afọ ahụ dị ka B.C., ma ọ bụ before Christ (tupu Kraịst),” ka akwụkwọ bụ The World Book Encyclopedia kọwara. “A na-edepụta oge ndị dịrị mgbe afọ ahụ gasịrị dị ka A.D. ma ọ bụ anno Domini (n’oge Onyenwe anyị).”
Otú o sina dị, ndị nkatọ na-eme ka ọ pụta ìhè na ihe nile anyị maara n’ezie banyere Jisọs bụ nke a na-achọta na Bible. Ha na-asị na ọ dịghị ihe ndekọ ọzọ e nwere n’otu oge ahụ banyere ya nke dị. Ọbụna H. G. Wells dere, sị: “Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke Rom oge ochie lefuuru Jisọs anya kpam kpam; o meghị ihe ọ bụla pụtara ìhè n’ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nke oge ya.” Ma nke a ọ̀ bụ eziokwu?
Ọ bụ ezie na izo aka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme oge gboo zoro n’ebe Jisọs nọ dị nta, izo aka ndị dị otú ahụ dị adị n’ezie. Cornelius Tacitus, bụ́ onye Rom nke bụ onye ọkọ akụkọ ihe mere eme a maara aha ya dere, sị: “Aha ahụ bụ [Kristian] bụ nke e si na Kraịst nweta, bụ́ onye onye ọchịchị ahụ bụ Pọntiọs Paịlet gburu n’oge ọchịchị Taịberiọs.” Suetonius na Pliny nke Nta, bụ́kwa ndị Rom na-ede edemede n’oge ahụ zokwara aka n’ebe Kraịst nọ. Tụkwasịkwa, Flavius Josephus, nke bụ onye Juu narị afọ nke na-akọ akụkọ ihe mere eme dere banyere Jemes, bụ́ onye ọ kọwara dị ka “nwanne Jisọs, onye a kpọrọ Kraịst.”
Otú a, akwụkwọ bụ The New Encyclopædia Britannica na-ekwubi, sị: “Ihe ndekọ ndị a dịịrị onwe ha na-egosipụta na n’oge ochie ọbụna ndị mmegide nke Iso Ụzọ Kraịst adịghị mgbe ha rụrụ ụka banyere ịdị adị nke Jisọs, bụ́ nke a rụrụ ụka ya nke mbụ nakwa n’ihe ndabere ndị na-ezighị ezi ná ngwụsị narị afọ nke 18, n’oge narị afọ nke 19, na ná mmalite narị afọ nke 20.”
Otú ọ dị, n’ụzọ bụ isi, ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya nke narị afọ mbụ dekọrọ ihe nile a maara banyere Jisọs. E chebewokwa akụkọ ha n’Oziọma ndị ahụ—bụ́ akwụkwọ Bible ndị Matiu, Mak, Luk, na Jọn dere. Gịnị ka ihe ndekọ ndị a na-ekwu banyere onye Jisọs bụ?
N’ezie, Ònye Ka Ọ Bụ?
Ndị na-esonyere Jisọs na narị afọ mbụ tụgharịrị uche n’ajụjụ ahụ. Mgbe ha hụrụ ka Jisọs sitere n’ọrụ ebube mee ka oké osimiri nke ifufe na-enugharị dere jụụ site n’ịbara ya mba, ha jụrụ ná mgbagwoju anya, sị: “Ònye bụkwa onye a?” Mgbe e mesịrị, n’oge ọzọ, Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ̀ bụ ònye ka unu onwe unu sị na mụ bụ?”—Mak 4:41; Matiu 16:15.
Ọ bụrụ na a jụọ gị ajụjụ ahụ, olee otú ị ga-esi zaa? Jisọs ọ̀ bụ Chineke n’ezie? Ọtụtụ ndị taa na-asị na ọ bụ. Ma, ndị ha na ya kpakọrịtara adịghị mgbe ha kwere na ọ bụ Chineke. Nzaghachi Pita onyeozi nyere n’ajụjụ Jisọs bụ: “Gị onwe gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”—Matiu 16:16.
Ọ dịghị mgbe Jisọs kwuru na ya bụ Chineke, ma o mere ka anyị mara na ya bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, ma ọ bụ Kraịst. O kwukwara na ya bụ “Ọkpara Chineke,” ọ bụghị Chineke. (Jọn 4:25, 26; 10:36) Ma Bible adịghị asị na Jisọs bụ mmadụ dịkwa ka mmadụ ọ bụla ọzọ. Ọ bụ onye pụrụ nnọọ iche n’ihi na Chineke kere ya tupu ihe ọ bụla ọzọ. (Ndị Kọlọsi 1:15) Eri ọtụtụ ijeri afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, ọbụna tupu e kee elu na ala anya na-ahụ, Jisọs dịrị ndụ dị ka onye bụ mmụọ n’eluigwe ma nwee mmekọrịta chiri anya n’ebe Nna ya bụ Jehova Chineke nọ, bụ́ Onye Okike Ukwu ahụ.—Ilu 8:22, 27-31.
Mgbe ahụ, ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Chineke bufere ndụ nke Ọkpara ya n’ime akpa nwa nke otu nwanyị, Jisọs wee si otú a bụrụ nwa Chineke nke bụ mmadụ, onye a mụrụ dị ka e si amụ nwa site na nwanyị. (Ndị Galetia 4:4) Mgbe Jisọs na-etolite n’ime akpa nwa na mgbe ọ na-etokwa dị ka nwa okoro, ọ dabeere n’ebe ndị Chineke họpụtaworo ịbụ nne na nna elu ala ya nọ. Jisọs mesịrị toruo ogo nwoke, e mekwara ka o cheta n’ụzọ zuru ezu banyere mkpakọrịta ya na Chineke na mbụ n’eluigwe.—Jọn 8:23; 17:5.
Ihe Mere O Ji Bụrụ Onye Kasị Ukwuu
N’ihi na o ji nlezianya ṅomie Nna ya nke eluigwe, Jisọs bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Dị ka Ọkpara kwesịrị ntụkwasị obi, Jisọs ṅomiri Nna ya kpọmkwem nke na ọ pụrụ ịgwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.” (Jọn 14:9, 10) N’ọnọdụ nile n’ụwa ebe a, o mere dị nnọọ ka Nna ya, bụ́ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile gaara emeworị. Jisọs na-akọwa sị, “Ọ dịghịkwa ihe m na-eme n’onwe m, kama dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.” (Jọn 8:28) Ya mere mgbe anyị na-amụ ndụ Jisọs Kraịst, anyị na-ahụ n’ụzọ doro anya ihe Chineke dị ka ya dị ka a pụrụ isi kwuo ya.
Otú a, ọ bụrịị ezie na Jọn onyeozi kwetara na “ọ dịghị onye ọ bụla hụworo Chineke mgbe ọ bụla,” ọ ka pụkwara ide na “Chineke bụ ịhụnanya.” (Jọn 1:18; 1 Jọn 4:8) Jọn pụrụ ime otú a n’ihi na ọ maara banyere ịhụnanya Chineke site n’ihe ọ hụrụ n’ebe Jisọs nọ, onye bụ ngosipụta zuru okè nke Nna ya. Jisọs nwere ọmịiko, obi ọma, bụrụ onye wedara onwe ya n’ala, na onye a pụrụ ịbịakwute. Ndị na-adịghị ike na ndị a na-emegbu emegbu na-enwe ntụsara ahụ n’ebe ọ nọ, dịkwa ka ọ dị ụdị ndị nile—ndị ikom, ndị inyom, ụmụntakịrị, ndị ọgaranya, ndị ogbenye, ndị dị ike, ọbụna ndị na-eme oké mmehie. Ọ gwụla nanị ndị nwere obi ọjọọ bụ ndị na-enweghị mmasị n’ebe ọ nọ.
N’ezie, Jisọs akụzighịrị ndị na-eso ụzọ ya nanị ka ha hụrịta ibe ha n’anya, ma o gosiri ha otú ha ga-esi mee nke a. O kwuru sị, “Dị ka m hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya.” (Jọn 13:34) Ịmara “ịhụnanya Kraịst,” ka otu n’ime ndị ozi ya kọwara, “karịrị ọmụma nke ukwuu hie nne.” (Ndị Efesọs 3:19) Ee, ịhụnanya Kraịst gosipụtara karịrị ihe ọmụma e bu n’isi nke agụmakwụkwọ ma “na-arụgide” ndị ọzọ imeghachi n’otu aka ahụ. (2 Ndị Kọrint 5:14) Otú a, ihe ilereanya kasị ukwuu nke ịhụnanya Kraịst kpọmkwem bụ ihe mere ya nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Ịhụnanya ya emetụwo obi nke ọtụtụ nde ụmụ mmadụ eri ọtụtụ narị afọ gara aga ma nwee mmetụta dị mma n’ebe ndụ ha dị.
Ma, ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka, sị: ‘Lee mpụ nile e meworo n’aha Kraịst—Agha Ntụte ndị ahụ, Njụta Okwukwe, na agha ndị ahụ ọtụtụ nde ndị sị na ha bụ ndị Kraịst gburịtaworo ibe ha ndị nọ n’akụkụ nke ọzọ nke ọgbọ agha na ya.’ Ma eziokwu bụ na ndị dị otú a na-emegide okwukwu ha kwuru na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs. Ozizi ya nile na ụzọ ndụ ya na-akagbu omume ha. Ọbụna na a kpaliri onye Hindu bụ Mohandas Gandhi ikwu, sị: ‘Ahụrụ m Kraịst n’anya, ma ana m akọcha ndị Kristian n’ihi na ha adịghị adị ndụ dị ka Kraịst dịrị.’
Rite Uru Site n’Ịmụ Banyere Ya
N’ezie, ọ dịghị ihe ọmụmụ ọzọ ga-aka mkpa taa karịa ịmụ banyere ndụ na ije ozi Jisọs Kraịst. “Na-elegide Jisọs anya,” ka Pọl onyeozi gbara ume ya. “N’ihi na, tụgharịanụ uche n’onye ahụ.” Chineke n’onwe ya nyekwara iwu banyere Ọkpara ya, sị: “Nụrụnụ okwu ya.” Nke a bụ ihe akwụkwọ ahụ bụ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ga-enyere gị aka ime.—Ndị Hibru 12:2, 3; Matiu 17:5.
E mewo mgbalị igosi ihe nile mere n’oge ndụ Jisọs n’elu ala bụ́ ndị e depụtara n’Oziọma anọ ndị ahụ, gụnyere okwu ndị o kwuru na ihe atụ ndị o nyere na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ. Ruo ókè o kwere mee, a kọrọ ihe nile n’usoro otú ha si mee. Ná ngwụsị isiokwu nke ọ bụla, e depụtara akụkụ Bible ndị isiokwu ahụ dabeere na ha. A na-agba gị ume ịgụ akụkụ Akwụkwọ nsọ ndị a ma zaa ajụjụ ntụleghachi ndị e depụtara.
Otu onye mmụta na University of Chicago kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “E dewo ihe dị ukwuu banyere Jisọs n’ime iri afọ abụọ gara aga karịa otú e dere na puku afọ abụọ bu ụzọ.” Ma e nwere mkpa nke ịtụle n’onwe onye ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ, n’ihi na dị ka akwụkwọ bụ The Encyclopædia Britannica si kwuo: “Ọtụtụ ndị mmụta nke oge a etibawo onwe ha nke ukwuu na nkà nchepụta echiche ndị na-emegiderịta onwe ha banyere Jisọs na Oziọma ndị ahụ nke na ha elefuruwo anya ịmụ ebe ndị a e si nweta ha n’onwe ha.”
Mgbe e nwesịrị ntụle chiri anya n’ebughị ụzọ buru ihe ọ bụla ọzọ n’uche banyere ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ, anyị chere na ị ga-ekwere na ihe omume kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ weere ọnọdụ n’oge ọchịchị nke Siza Ọgọstọs nke Rom, bụ́ mgbe Jisọs nke Nazaret bịara iji nye ndụ ya n’ihi anyị.